Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ịnagide Ihe Ndị Ọ Na-akpata

Ịnagide Ihe Ndị Ọ Na-akpata

Ịnagide Ihe Ndị Ọ Na-akpata

“ANYỊ ANỌWO NA-EJE IJE KEMGBE ỤTỤTỤ. ANYỊ NA-AGBA ỌSỌ MAKA NDỤ ANYỊ. MMIRI ỌṄỤṄỤ ADỊGHỊ, NRI ADỊGHỊ. E BIBIELA ỤLỌ NILE.”—HARJIVAN, ONYE LANARỊRỊ ALA ỌMA JIJIJI DỊ 7.9 N’IHE Ọ̀TỤ̀TỤ̀ N’INDIA.

ỊBỤ onye ala ọma jijiji kpara aka ọjọọ na-atụ oké ụjọ. “Akwụkwọ si n’otu ebe nkowe ákwà e ji osisi rụọ nke dị mita 2.5 n’ịdị elu bụ́ nke dị n’isi ihe ndina m na-efesasị n’ebe nile gburugburu m,” ka otu onye lanarịrị ala ọma jijiji mere na Taiwan na 1999 na-echeta. ‘Okpuìgwè ọgba tum tum m zụrụ ọhụrụ si n’elu ebe nkowe ákwà m daa n’elu ihe ndina m n’akụkụ isi m. N’ụzọ megidere nzube e ji zụọ ya,’ ka ọ na-agbakwụnye, ‘ọ gaara egbu m.’

Mgbe A Lanarịsịrị Ala Ọma Jijiji

Ịlanarị ala ọma jijiji bụ ihe na-emenye ụjọ, ma ịlanarị otu bụ nanị mmalite ya. N’awa ndị na-esochi ihe omume ahụ, ndị ọrụ enyemaka na-eji obi ike agbalịsi ike ịchọta na ịgwọ ndị merụrụ ahụ́. Mgbe mgbe, ha na-eme otú ahụ ka a na-atụ egwu obere ala ọma jijiji ndị pụrụ isochi. “Anyị aghaghị ịkpachara nnọọ anya,” ka otu nwoke chere echiche igwupu otu ikpo unyí kpuchiri otu ógbè dị n’agbata obi ha mgbe e nwesịrị ala ọma jijiji n’oge na-adịbeghị anya n’El Salvador, kwuru. “Ọ bụrụ na ala emee mkpatụ ọzọ na mberede, ugwu a nile pụrụ ịdakpọsị.”

Mgbe ụfọdụ ndị mmadụ na-achụ onwe ha n’àjà n’ụzọ pụrụ iche iji nyere ndị ala ọma jijiji metụtara aka. Dị ka ihe atụ, mgbe otu oké ala ọma jijiji mere n’India ná mmalite afọ 2001, Manu, bụ́ nwoke meworo agadi nke bi ugbu a na United States, laghachiri n’ala nna ya. “Aghaghị m ịga,” ka ọ tụgharịrị n’uche, “ọ bụghị nanị iji nyere ezinụlọ m aka, kamakwa onye ọ bụla nke na-ata ahụhụ.” Manu hụrụ na ọnọdụ dị njọ n’ógbè ndị ọ gara. Ka o sina dị, o kwuru, sị: “Obi ike ndị mmadụ na-egosipụta dị ịtụnanya.” Otu odeakụkọ dere, sị: “Amaghị m ma ọ̀ dị onye ọ bụla n’ime ndị nile m maara nke na-enyeghị ihe ọ bụla o nwere ike inye—ụgwọ ọrụ otu ụbọchị, otu izu ma ọ bụ otu ọnwa, ụfọdụ n’ime ego ha debere n’ụlọ akụ̀ ma ọ bụ ihe ọ bụla ha nwere ike ime iji nye aka.”

Otú ọ dị, ọ bụ otu ihe ikpochasị ikpo unyí ma nye ndị merụrụ ahụ́ ọgwụgwọ; ọ bụ nnọọ ihe ọzọ ime ka ndụ ndị ihe oké egwu were obere oge tisasịrị dịghachi otú o kwesịrị. Tụlee ihe banyere Delores, bụ́ nwanyị ala ọma jijiji ahụ mere n’El Salvador bibiri ụlọ ya. “Nke a ka agha njọ,” ka ọ na-ekwu. “Ma ọ́ dịghị ihe ọzọ anyị nwere ụlọ n’oge agha.”

Dị ka e kwuru n’isiokwu anyị mbụ, mgbe ụfọdụ, a na-enwe mkpa dị ukwuu ọ bụghị nanị maka enyemaka ihe onwunwe kamakwa maka nkwado mmetụta uche. Dị ka ihe atụ, mgbe otu ala ọma jijiji bibiri obodo Armenia dị n’ebe odịda anyanwụ Colombia ná mmalite afọ 1999, ihe karịrị otu puku mmadụ nwụrụ, ọtụtụ ndị kwa nwere obi nkoropụ na ịda mbà n’obi. Dibịa na-agwọ ọrịa uche bụ́ Roberto Estefan, bụ́ onye ọdachi ahụ bibiri ụlọ ya nke nwere ọtụtụ ọnụ ụlọ, kwuru, sị: “Ebe ọ bụla ị gara, ndị mmadụ na-arịọ maka enyemaka. M gaa ịzụrụ ógbè achịcha, ihe ka ukwuu n’ime ndị na-ekele m na-ejikwa ohere ahụ agwa m banyere ụra ha na-adịghị ehi nke ọma na mwute ha na-enwe.”

Dị ka Dr. Estefan maara nke ọma, obi nkoropụ nke na-abịa mgbe ala ọma jijiji weresịịrị ọnọdụ pụrụ ịdị ukwuu. Otu nwanyị nke nyere onwe ya n’afọ ofufo iji nye aka n’iwu ogige enyemaka kwuru na ụfọdụ ndị nwere ọrụ adịghị echegbu onwe ha maka ịga ọrụ n’ihi na ha chere na ha ga-anwụ n’oge na-adịghị anya.

Ime Ka E Nwee Olileanya n’Oge Obi Nkoropụ

N’oge nsogbu dị otú ahụ, Ndịàmà Jehova na-agbalị inyere ndị lanarịrịnụ aka ọ bụghị nanị n’ụzọ anụ ahụ́ kamakwa n’ụzọ ime mmụọ nakwa n’ụzọ mmetụta uche. Dị ka ihe atụ, ozugbo ala ọma jijiji ahụ a kpọtụrụ aha na mbụ mesịrị na Colombia, alaka ụlọ ọrụ Ndịàmà Jehova dị ná mba ahụ haziri kọmitii na-ahụ maka ọnọdụ mberede. Ọtụtụ puku ndị ọrụ afọ ofufo bụ́ Ndịàmà si n’akụkụ nile nke mba ahụ nyere onyinye ihe oriri na ego. N’oge na-adịghị anya, e zigara tọn 70 nke ihe oriri n’ebe ndị ahụ o metụtara.

Mgbe mgbe, nkwado ime mmụọ na-adị mkpa karịsịa. N’otu ụtụtụ mgbe ala ọma jijiji ahụ mesịrị na Colombia, otu n’ime Ndịàmà Jehova hụrụ otu nwanyị nwere nnọọ nkụda mmụọ ka o ji ụkwụ na-agbada n’otu okporo ámá n’obodo Armenia bibiri ebibi. O jekwuuru nwanyị ahụ ma nye ya traktị bụ́ Olileanya Dị Aṅaa DịịrNdị Anyị Hụrụ n’Anya Nwụrụ Anwụ? *

Nwanyị ahụ ji traktị ahụ laa n’ebe obibi ya ma gụọ ya nke ọma. N’oge ọzọ otu n’ime Ndịàmà Jehova bịara n’ụlọ ya, o nwere mkpali ịkọrọ ya ihe meworo ya. O mesịrị bụrụ na ala ọma jijiji ahụ bibiri ọtụtụ ụlọ ndị o nwere n’obodo ahụ, bụ́ ndị nọworo na-enye ya nnukwu ego. Ugbu a, ọ daala ogbenye. Ọ gwụchabeghịkwa. N’oge ala ọma jijiji ahụ, ụlọ nke ya na nwa ya nwoke dị afọ 25 bi dara, dagbuo nwa ya ahụ. Nwanyị ahụ gwara Onyeàmà ahụ bịara n’ụlọ ya na ọ dịtụbeghị mgbe ya nwere mmasị n’okpukpe ma na ugbu a ya nwere ọtụtụ ajụjụ. Traktị ahụ enyewo ya ezigbo olileanya. N’oge na-adịghị anya, a maliteere ya ọmụmụ Bible ebe obibi.

Ndịàmà Jehova nwere obi ike na a ga-enwe oge mgbe ọdachi ndị na-emere onwe ha, gụnyere ala ọma jijiji na-agaghịzi eyi ihe a kpọrọ mmadụ egwu. Isiokwu na-esonụ ga-akọwa ihe kpatara ya.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 12 Nke Ndịàmà Jehova bipụtara.

[Igbe dị na peeji nke 16]

Dịrị Njikere!

▪ Hụ na a kpọchiri ihe ndị na-eme ka mmiri dị ọkụ nakwa na ihe ndị dị arọ dị n’ala ụlọ ma ọ bụ n’ebe ala ala shelf.

▪ Kụziere ndị òtù ezinụlọ gị otú e si agbanyụ isi ọkụ eletrik nakwa gas na mmiri.

▪ Debe ihe e ji aghọ ọkụ na ihe a na-etinye ọgwụ ndị e ji eme ihe n’ọnọdụ mberede n’ụlọ gị.

▪ Debe obere redio e tinyere batrị ọhụrụ n’ụlọ.

▪ Soro ezinụlọ gị mụgharịa ihe ndị a ga-eme ma e nwee ala ọma jijiji, ma mesie ike mkpa ọ dị (1) ịnọ jụụ, (2) ịgbanyu stovu na ihe ndị na-eme ka mmiri dị ọkụ, (3) iguzoro n’ọnụ ụzọ ma ọ bụ ikpuba n’okpuru tebụl ma ọ bụ oche, nakwa (4) anọghị nso na windo, enyo, na mpio anwụrụ.

[Igbe/Foto dị na peeji nke 17]

ALA ỌMA JIJIJI NDỊ MERE N’IZREL

Izrel nwere “ihe ndekọ akụkọ ihe mere eme kasị ogologo n’ụwa banyere ala ọma jijiji bụ́kwa nke na-eme ugboro ugboro,” ka Prọfesọ Amos Nur na-ede. Ihe kpatara ya bụ na otu akụkụ nke Oké Ndagwurugwu Rift—ebe e nwere mgbawa n’ime ala n’etiti kọntinent Mediterranean na Arebia—gafere Izrel, site n’ebe ugwu gaa na ndịda.

N’ụzọ na-akpali mmasị, ụfọdụ ndị ọkà mmụta ihe ochie kweere na ndị injinia oge gboo ji usoro pụrụ iche mee ihe iji belata mbibi ndị ala ọma jijiji na-akpata. Nke a na nkọwa Bible banyere usoro iwu ihe Solomọn dabakọrọ: “Ogige ukwu nke dị gburugburu nwekwara arịrị atọ nke nkume a wara awa, na otu arịrị nke osisi cedar a wara awa; ọbụna dị ka ogige ime ime ụlọ Jehova si enwe, na dị ka ụzọ mbata ụlọ si enwe.” (1 Ndị Eze 6:36; 7:12, ọ bụ anyị dere okwu ụfọdụ n’aka akwụkwọ dị iche.) A hụwo ihe àmà nke usoro a nke itinye arịrị n’ime ihe owuwu e ji nkume wuo n’ọtụtụ ebe—gụnyere ọnụ ụzọ ámá dị na Megido, bụ́ nke e chere na a rụrụ n’oge Solomọn ma ọ bụ tupu mgbe ahụ. Ọkà mmụta bụ́ David M. Rohl kweere na arịrị ndị a pụrụ ịbụwo ndị e “tinyere ná mgbalị iji chebe ihe owuwu ahụ pụọ ná mbibi nke ala ọma jijiji.”

[Foto]

Mbibi ala ọma jijiji kpatara na Bet Sheʼan, Izrel

[Igbe/Foto ndị dị na peeji nke 18]

IHE OKÉ EGWU NKE WERE NKEJI ABỤỌ—AKỤKỌ OTU ONYE LANARỊRỊNỤ KỌRỌ

N’Ahmadabad, India, ezinụlọ anyị nọ na-ejikere maka agbamakwụkwọ nwa nwanne nna m. Na January 26, 2001, a kpọtere m n’ụra, ọ bụghị klọọkụ mgbaàmà kpọtere m, kama ọ bụ oké ịma jijiji ụlọ anyị na-ama. Anụrụ m ka kọbọd ndị e ji ígwè rụọ na-adagharị, mgbe ahụ ka m matakwara na nsogbu dị. Nwanne nna m nke nwoke nọ na-eti mkpu, sị, “Sinụ n’ụlọ a pụọ!” Mgbe anyị pụrụ n’èzí, anyị pụrụ ịhụ ka ụlọ ahụ na-ama jijiji site n’otu akụkụ gaa n’ọzọ. O yiri ka ò mere otú ahụ ruo ebighị ebi. Ma nke bụ́ eziokwu bụ na ịma jijiji ahụ were nanị nkeji abụọ.

Nchegbu nke ahụ wetara yiri ihe siri nnọọ ike ịnagide n’otu mgbe. Anyị jidere n’aka na ọ dịghị ihe mere ndị ezinụlọ anyị. Fon akwụsịla ịrụ ọrụ, ọkụ eletrik anyụwokwa, ya mere anyị apụghị ịmata ozugbo ọnọdụ ndị ikwu anyị n’obodo ndị gbara anyị gburugburu. Mgbe otu awa nke nchegbu gasịrị, anyị chọpụtara na ọ dịghị ihe mere ha. Ọ bụghị mmadụ nile nwere ihe ndabara ọma dị otú ahụ. Dị ka ihe atụ, n’Ahmadabad, ihe karịrị otu narị ụlọ dara, ihe karịkwara mmadụ 500 nwụrụ.

Mmadụ nile nọrọ n’oké egwu ruo ọtụtụ izu. Ndị mmadụ na-alaba ụra na-atụ ụjọ na ala ọma jijiji ọzọ ga-eme, dị ka e kwuworo na ọ ga-eme. Ịrụzigharị ihe ndị mebiri emebi agaghị ngwa ngwa, ọtụtụ ndị enweghịzikwa ebe obibi. Ihe a nile bụ n’ihi otu ala ọma jijiji nke were nanị nkeji abụọ ma bụrụ nke ga-adịgide n’uche anyị ruo mgbe ebighị ebi.—Dị ka Samir Saraiya si kọọ.

[Foto dị na peeji nke 16, 17]

Otu onye lanarịrị ala ọma jijiji ahụ mere n’India na January 2001 ka o ji foto nne ya, bụ́ onye nwụrụnụ nke a na-agba ozu ya ọkụ

[Ebe E Si Nweta Foto]

© Randolph Langenbach/UNESCO (www.conservationtech.com)