Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ọtụtụ Ọrụ nke Ndị Nne

Ọtụtụ Ọrụ nke Ndị Nne

Ọtụtụ Ọrụ nke Ndị Nne

Elekere 4:50 nke ụtụtụ. Alex, bụ́ nwa ọhụrụ, beere ákwá ma roro ụra rịgoro n’akụkụ Helen, bụ́ nne ya. Ụmụ ya abụọ ndị ọzọ—Penny (afọ 5) na Joanna (afọ 12)—na di ya, bụ́ Nick, nọ na-ehi ụra. Helen ekubata Alex n’àkwà ma nye ya ara. Ụra ekweghịzi atụ Helen.

Elekere 5:45 nke ụtụtụ. Helen ejiri nwayọọ gaa na kichin, gboo kọfị, ma gụwa akwụkwọ.

Elekere 6:15–7:20 nke ụtụtụ. Nick ebilie. Helen akpọtee Penny na Joanna, kwadebe nri ụtụtụ, rụọ ọrụ ụlọ ụfọdụ. N’elekere 7:15, Nick agawa ọrụ ma buga Joanna n’ụlọ akwụkwọ. Mama Helen abịa iku Alex.

Elekere 7:30 nke ụtụtụ. Helen ebuga Penny n’ụlọ akwụkwọ ọta akara ha. Oge Helen na-aga ọrụ enye ya ohere ịtụgharị uche n’ọnọdụ ịbụ nne. “Ọ bụ ọrụ kasị sie ike m rụtụworo,” ka o kwuru.

Elekere 8:10 nke ụtụtụ. Helen echee ọtụtụ ọrụ ọ ga-arụ n’ebe ọ na-arụ ọrụ ihu. Ọ na-enwe nchegbu na ịtụrụ ime ọzọ pụrụ ime ka ya ghara inwekwa ọrụ. Ego ọ na-akpatakwu dị ezinụlọ ha mkpa.

Elekere 10:43 nke ụtụtụ. Mgbe Helen tọgbọsịrị fon—a kpọọ ya na fon maka ụmụ ya—onye ọrụ ibe ya bụ́ Nancy akasie ya obi, sị: “Ị na-agbalịrị ha nnọọ.” Anya mmiri agbaa Helen.

Elekere 12:05 nke ehihie. Helen atabiri bred ma chewa echiche banyere mgbe ọ na-amụbeghị nwa ya nwanyị nke mbụ. Larịị azụ mgbe ahụ, ọ dị ihe ndị o mere atụmatụ iji oge ndị o nwere “ohere” mee. ‘Lee atụmanya na-apụghị imezu emezu nke ahụ bụ!’ ka o kwubiri.

Elekere 3:10 nke ehihie. Mgbe a kpọsịrị ya na fon ọtụtụ ugboro banyere nsogbu Alex na-enye, Helen ekwuo banyere nkekọ pụrụ iche dị n’etiti ya na ụmụ ya, sị: “Ọ dịbeghị onye ọzọ m hụworo n’anya otú a.” Mmetụta a miri emi nyeere ya aka imeri ihe isi ike ndị mbụ ọ na-atụghị anya ha.

Elekere 5:10 nke uhuruchi. Mgbe o butesịrị Joanna, Helen apụọ ịga mee ihe ụfọdụ. Ya akpọọ Nick ma chetara ya na ọ bụ ya ka o ruuru ịga bute Penny.

Elekere 6:00–7:30 nke uhuruchi. Mgbe ọ lọtara, Helen eweghara ‘ọrụ ilekọta Alex’ ka Nne Ochie zuru ike, ọ rụrụ ọrụ ụlọ, kwadebe nri abalị. Mgbe a jụrụ ya banyere ihe nwa ọhụrụ na-achọsi ike, Helen mara ọsụ, sị: “Ọ dịghị ihe ọzọ nwa ọhụrụ na-achọsi ike ma ọ bụghị nne ya kpam kpam: aka ya, ahụ́ ya, na mmiri ara ya, ma na-egbochi nne ya ihi ụra.”

Elekere 8:30–10:00 nke abalị. Helen enyere Joanna aka ime ihe omume e nyere ya n’ụlọ akwụkwọ bụ́ nke ọ ga-eme n’ụlọ, ya enyekwa Alex ara. Ka Nick na-agụrụ Penny ihe ruo ọkara awa, Helen arụkwuo ọrụ ụlọ.

Elekere 11:15 nke abalị. Mgbe Penny na Joanna lakpusịrị ụra, Alex ka mụ anya n’aka nne ya, mgbe e mesịziri, o hiiri ụra. “Echere m na o ruola mgbe ọ ga-alakpu,” ka Helen gwara Nick, bụ́ onye na-ero ụra.