Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ala Ọma Jijiji, Amụma Bible, Na Gị Onwe Gị

Ala Ọma Jijiji, Amụma Bible, Na Gị Onwe Gị

Ala Ọma Jijiji, Amụma Bible, Na Gị Onwe Gị

TUPU ọnwụ ya, Jizọs buru amụma banyere ihe omume na ọnọdụ ndị ga-egosi na ụwa a abanyewo ná “ngwụsị nke usoro ihe a.” O kwuru na ihe ndị ga-aka oge ahụ akara bụ ọrịa na-efe efe, ụkọ nri, na agha dị ukwuu. Ọ kpọtụkwara “oké ala ọma jijiji” nke ga-eme “site n’otu ebe ruo ebe ọzọ,” aha. (Matiu 24:3, 7; Luk 21:10, 11) Jizọs ọ̀ nọ na-ezo aka n’oge anyị a?

Ọtụtụ ndị na-asị ee e. Ha na-azọrọ na ọnụ ọgụgụ ala ọma jijiji ndị meworonụ n’iri afọ ndị na-adịbeghị anya arịbeghị elu nke ukwuu. N’eziokwu, Ụlọ Ọrụ Mba United States nke Na-enye Ihe Ọmụma Banyere Ala Ọma Jijiji na-akọ na ala ọma jijiji ndị ruru 7.0 n’ihe ọ̀tụ̀tụ̀ ma ọ bụ karịa “nọgidere nnọọ na-eme n’ọ̀tụ̀tụ̀ ha jibu eme” na narị afọ 20 nile. *

Otú ọ dị, rịba ama na mmezu nke amụma Jisọs apụtaghị na a ga-enwe mmụba n’ọnụ ọgụgụ ma ọ bụ n’ịkpa ike nke ala ọma jijiji. Ihe Jizọs kwuru bụ na a ga-enwe oké ala ọma jijiji site n’otu ebe ruo ebe ọzọ. Ọzọkwa, o kwuru na ihe omume ndị a ga-aka akara “mmalite ihe ụfụ nke nhụjuanya.” (Matiu 24:8) A dịghị eji ọnụ ọgụgụ ala ọma jijiji merenụ ma ọ bụ ọnụ ọgụgụ ihe ọ̀tụ̀tụ̀ Richter gosiri atụ nhụjuanya n’ihe ọ̀tụ̀tụ̀, kama ọ bụ mmetụta ha nwere n’ebe ndị mmadụ nọ.

N’ezie ala ọma jijiji akpatawo ihe mgbu dị ukwuu n’oge anyị. N’eziokwu, na narị afọ nke 20, ọdachi ndị a egbuwo ọtụtụ nde mmadụ ma ọ bụ mee ka ha gharazie inwe ebe obibi. Ndị ọkachamara na-ekwu na a pụrụ igbochiwo ọtụtụ n’ime ọnwụ ndị a. “Ná mba ndị ka na-emepe emepe,” ka ụlọ ọrụ mgbasa ozi bụ́ BCC News na-ekwu, “ọchịchọ a na-achọ ụlọ ndị dị ọnụ ala, bụ́ ndị a ga-ewucha ngwa ngwa iji gboo mkpa mmepe na-adịwanye ngwa a na-enwe n’obodo dị iche iche na-emezi ka a ghara ilebachara ụkpụrụ iwu ụlọ anya nke ọma.” N’ikwu banyere ọdachi abụọ mere n’oge na-adịbeghị anya, Ben Wisner, bụ́ ọkachamara n’ọdachi ndị na-eme n’ebe ndị mepere emepe, na-ekwu, sị: “Ọ bụghị ala ọma jijiji gburu ndị a. Ọ bụ ngwakọta nke ihie ụzọ mmadụ, ịkpa àgwà ọ gbasaghị m, nrụrụ aka, na anyaukwu.”

Ee, mgbe ụfọdụ ihe ndị kasị akpata ọnwụ mgbe ala ọma jijiji mere bụ ọchịchọ ọdịmma onwe onye nanị na ụmụ mmadu ileghara ihe anya. N’ụzọ na-akpali mmasị, e mere ka àgwà ndị dị otú ahụ pụta ìhè n’amụma Bible ọzọ banyere “mgbe ikpeazụ” nke usoro ihe a. N’oge ahụ, ka Bible na-ekwu, ndị mmadụ ga-abụ “ndị na-eche nanị banyere onwe ha, ndị hụrụ ego n’anya,” na “ndị obi tara mmiri.” (2 Timoti 3:1-5, The Amplified Bible) Tinyere okwu Jisọs banyere ngwụsị nke usoro ihe a, amụma a na-enye ihe àmà doro anya na anyị na-eru nso n’oge mgbe Chineke ga-eme ka ụmụ mmadụ na-ahụju anya nwere onwe ha pụọ n’ihe nile na-akpata ihe mgbu na nhụjuanya ugbu a—gụnyere ala ọma jijiji.—Abụ Ọma 37:11.

Ị̀ ga-achọ ịmụtakwu banyere olileanya a dabeere na Bible? Kpọtụrụ Ndịàmà Jehova nọ n’ógbè gị, ma ọ bụ deta akwụkwọ n’adres kwesịrị ekwesị dị na peeji nke 5.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 3 Ụfọdụ ndị na-ekwu na akụkọ ọ bụla e nwetara banyere mmụba nke ọnụ ọgụgụ ala ọma jijiji ndị e nwere bụ nnọọ n’ihi ọganihu ndị e nwere na nkà na ụzụ, bụ́ nke na-eme ka e nwee ike ịchọpụtakwu ịma jijiji nke ime ala.