Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ihe Ndị Na-emenye Ụjọ, Ihe Ndị Na-enyetụ Olileanya

Ihe Ndị Na-emenye Ụjọ, Ihe Ndị Na-enyetụ Olileanya

Ihe Ndị Na-emenye Ụjọ, Ihe Ndị Na-enyetụ Olileanya

“N’AKỤKỤ M NILE, ỤLỌ DỊ ICHE ICHE NỌ NA-AMA JIJIJI, ỌKỤ SIKWA NA HA NA-APỤTA. KA M NA-AGBA ỌSỌ, NDỊ MMADỤ NỌ N’AKỤKỤ NILE NỌ NA-EBE ÁKWÁ, NA-EKPE EKPERE MA NA-ETI MKPU MAKA ENYEMAKA. ECHERE M NA ỌGWỤGWỤ ỤWA ERUOLA.”—G. R., ONYE LANARỊRỊ ALA ỌMA JIJIJI.

KWA afọ, ọtụtụ nde ala ọma jijiji na-ewere ọnọdụ n’ime mbara ala anyị nke na-emegharị emegharị mgbe nile. N’ezie, anyị agaghị enwe mmetụta nke ihe ka ọtụtụ n’ime ha. * Otú ọ dị, ná nkezi, ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ ala ọma jijiji 140 n’otu afọ na-adị njọ ruo n’ókè nke na a na-akọwa ha dị ka ala ọma jijiji “kpara oké ike,” “nnukwu,” ma ọ bụ “oké” ala ọma jijiji. N’akụkọ ihe mere eme nile, ha akpatawo ọnwụ nke ọtụtụ nde mmadụ nakwa mbibi nke ihe onwunwe a na-apụghị ịgụta ọnụ.

Ala ọma jijiji na-enwekwa mmetụta dị ukwuu n’ahụ́ ndị lanarịrịnụ n’ụzọ mmetụta uche. Dị ka ihe atụ, mgbe ala ọma jijiji abụọ kpasịrị El Salvador aka ọjọọ ná mmalite afọ 2001, onye nhazi ọrụ nke kọmitii na-enye ndụmọdụ maka ahụ́ ike nke uche nke ministrị ahụ́ ike nke mba ahụ kwuru, sị: “Ndị mmadụ na-enwezi ụdị nsogbu uche nke e ji mwute, obi nkoropụ na iwe mara.” Ọ bụghị ihe ijuanya na ndị ọrụ ahụ́ ike nọ n’El Salvador kọrọ na e nwere ịrị elu dị pasent 73 n’ọnụ ọgụgụ ndị na-enwe ịda mbà n’obi na nchekasị. N’ezie, nnyocha ndị e mere na-egosi na n’ime mkpa ndị nọ n’ogige enyemaka dị iche iche nwere, nlekọta ahụ́ ike uche bụ nke abụọ, na-esote mkpa maka mmiri.

Ma okwu banyere ala ọma jijiji gụnyere ihe karịrị ọnwụ, mbibi ihe, na enweghị olileanya. N’ọtụtụ ọnọdụ, ọdachi ndị a emewo ka ndị mmadụ gosipụta obiọma na ịchụ onwe onye n’àjà n’ụzọ dị ịrịba ama. N’ezie, ụfọdụ ndị arụwo ọrụ n’esepụghị aka iji rụzie ihe owuwu ndị e bibiri nakwa iji dozie ndụ ndị ghasasịrị aghasasị. Omume ndị dị otú ahụ emewo ka e nwee olileanya ọbụna n’ọnọdụ ndị kasị emenye ụjọ, dị ka anyị ga-ahụ.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 3 Ndị a na-agụnye ụmụ obere ala ọma jijiji, bụ́ ndị ọtụtụ puku n’ime ha na-ewere ọnọdụ kwa ụbọchị.

[Foto dị na peeji nke 13]

N’Atens, Gris, otu nna enwee oké obi ụtọ ịchọpụta na a zọpụtawo nwa ya nwanyị dị afọ ise

[Ebe E Si Nweta Foto]

Foto AP/Dimitri Messinis