Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndị Kraịst Hà Kwesịrị Ịdị Na-atụ Anya Nchebe Chineke?

Ndị Kraịst Hà Kwesịrị Ịdị Na-atụ Anya Nchebe Chineke?

Echiche nke Bible

Ndị Kraịst Hà Kwesịrị Ịdị Na-atụ Anya Nchebe Chineke?

Bible na-ezokarị aka n’ikike Chineke nwere ichebe ndị na-efe ya pụọ ná mmerụ ahụ́. Eze Devid kwuru, sị: “Jehova, dọpụta m n’aka mmadụ ọjọọ; chebe m ka m ghara ịda n’aka nwoke na-eme ihe ike dị iche iche.” (Abụ Ọma 140:1) Taa, ọtụtụ n’ime ndị na-efe Chineke bụ́ ndị ime ihe ike, mpụ, ma ọ bụ ọdachi ndị na-emere onwe ha metụtaworo ejiriwo nnọọ obere ihe lanarị ọnwụ ma ọ bụ mmerụ ahụ́. Ụfọdụ ndị echewo ma Chineke ò nyere ha nchebe n’ụzọ ọrụ ebube n’oge ndị ahụ, karịsịa ebe ọ bụ na e nwere ọnọdụ ndị ọzọ mgbe ndị na-atụ egwu Chineke na-alanarịghị ma bụrụ ndị oké ọdachi metụtara, ọbụna bụrụkwa ndị nwụrụ ọnwụ ike.

JEHOVA Chineke ọ̀ na-echebe ụfọdụ ndị pụọ ná mmerụ ahụ́ ma hapụ ichebe ndị ọzọ? Ànyị kwesịrị ịtụ anya inweta nnapụta n’ụzọ ọrụ ebube pụọ n’ime ihe ike na ọdachi ndị nke taa?

Ihe Ndekọ Bible Banyere Nchebe n’Ụzọ Ọrụ Ebube

Bible nwere ọtụtụ ihe ndekọ na-ekwu banyere mgbe Chineke mere ihe n’ụzọ ọrụ ebube iji napụta ndị na-efe ya. (Aịsaịa 38:1-8; Ọrụ 12:1-11; 16:25, 26) Akwụkwọ Nsọ na-ekwukwa otú a na-esighị napụta ndị ohu Jehova pụọ n’ọdachi n’oge ndị ọzọ. (1 Ndị Eze 21:1-16; Ọrụ 12:1, 2; Ndị Hibru 11:35-38) Ya mere, o doro anya na Jehova pụrụ ikpebi inye nchebe n’ihi otu ihe ma ọ bụ otu nzube, mgbe ọ bụla ọ masịrị ya. N’ihi ya, mgbe a na-anapụtaghị Ndị Kraịst n’otu n’otu pụọ n’ọnwụnwa, ha ekwesịghị ikwubi na Chineke agbahapụwo ha. Anyị aghaghị ikweta na ihe ọjọọ ga-adakwasị ọbụna ndị ohu Jehova na-ekwesị ntụkwasị obi. N’ihi gịnị ka o ji dị otú ahụ?

Ihe Mere Ihe Ọjọọ Ji Adakwasị Ndị Ohu Chineke Na-ekwesị Ntụkwasị Obi

Otu ihe kpatara ya bụ na anyị nile ketara mmehie na ezughị okè n’aka Adam na Iv. N’ihi ya, anyị na-enwe atụmanya nke ihe mgbu, ahụhụ, na ọnwụ. (Ndị Rom 5:12; 6:23) Ihe ọzọ kpatara ya bụ na anyị na-ebi n’ụbọchị ikpeazụ. Bible kọwara ndị nke oge anyị dị ka “ndị na-enweghị obi mmadụ, ndị na-adịghị njikere ime nkwekọrịta ọ bụla, ndị nkwutọ, ndị na-enweghị njide onwe onye, ndị na-eme ihe ike ike, ndị na-enweghị ịhụnanya maka ezi ihe.” (2 Timoti 3:1-5) Ihe na-egosi nke a bụ njupụta nke idina mmadụ n’ike, ịtọrọ mmadụ, igbu ọchụ, na ajọ mpụ ndị ọzọ.

Ọtụtụ ndị ohu Chineke na-ekwesị ntụkwasị obi bi ma na-arụ ọrụ n’etiti ndị na-eme ihe ike, mgbe ụfọdụkwa, ha na-abụ ndị e lekwasịrị anya eme ha. Anyị pụrụ ịnọ n’ọnọdụ na-eyi ndụ egwu nanị n’ihi na anyị nọ n’ebe na-ekwesịghị ekwesị n’oge na-ekwesịghị ekwesị. Ọzọkwa, anyị na-eche ọnọdụ Solomọn kwupụtara ihu bụ́ mgbe o kwuru na “mgbe na ihe ndapụta na-adabara ha nile.”—Eklisiastis 9:11.

Ọzọkwa, Pọl onyeozi kwuru na a ga-akpagbu Ndị Kraịst n’ihi na ha na-efe Chineke. O kwuru, sị: “N’eziokwu, a ga-akpagbukwa ndị nile na-achọ ibi ndụ ná nsọpụrụ Chineke ná mmekọrịta nke ha na Kraịst Jizọs.” (2 Timoti 3:12) N’afọ ndị na-adịbeghị anya, nke a emewo n’ọtụtụ mba.

N’ihi ya, a dịghị agụpụ ndị na-atụ egwu Chineke ná ndị ime ihe ike, mpụ, ọdachi ndị na-emere onwe ha, ma ọ bụ ọnwụ mberede na-emetụta. Setan agbalịwo iji arụmụka bụ́ na Jehova na-agba ndị Ya ogige gburugburu nke mere na ha na-ebi ndụ n’enwetaghị ọdachi ọ bụla mee ihe. (Job 1:9, 10) Ọ bụghị otú ahụ ka ọ dị. Otú ọ dị, anyị pụrụ ijide n’aka na ọbụna mgbe Jehova na-ewetaghị nnapụta n’ụzọ ọrụ ebube pụọ n’otu ọnọdụ, ọ na-enye ndị ya nchebe.

Otú Jehova Na-esi Echebe Ndị Ya Taa

Site n’Okwu ya, Jehova na-enye nduzi nke na-echebe ndị ya. Ọnọdụ ime mmụọ na ihe ọmụma nke Bible pụrụ ime ka anyị nwee ezi echiche na anya udo, bụ́ ndị pụrụ inyere anyị aka izere mmehie ihe ndị na-adịghị mkpa na ime mkpebi ndị ezi uche dị na ha. (Abụ Ọma 38:4; Ilu 3:21; 22:3) Dị ka ihe atụ, ịṅa ntị na ndụmọdụ Bible banyere ụkpụrụ omume mmekọahụ, anyaukwu, iwe, na ime ihe ike echebewo Ndị Kraịst pụọ n’ọtụtụ ọdachi. Ọzọkwa, site n’esoroghị ndị ọjọọ na-akpachi anya, o yikarịghị ka anyị ga-anọ n’ebe a pụrụ inwe ọdachi—n’ebe na-ekwesịghị ekwesị n’oge na-ekwesịghị ekwesị. (Abụ Ọma 26:4, 5; Ilu 4:14) Ndị na-ebi ndụ n’ụzọ kwekọrọ n’ụkpụrụ Bible na-enwe ụkpụrụ ibi ndụ ka elu, bụ́ nke na-ewetakarị uche zuru okè na ahụ́ ike.

Ihe kasị enye nkasị obi bụ ịmata na ọ bụrụgodị na Chineke ekwe ka ihe ọjọọ mee, ọ ga-enye ndị na-efe ya ume dị mkpa iji nwee ike ịnagide ya. Pọl onyeozi na-emesi anyị obi ike, sị: “Chineke na-ekwesị ntụkwasị obi, ọ gaghịkwa ekwe ka a nwaa unu gabiga ihe unu pụrụ ịnagide, kama mgbe ọnwụnwa ahụ bịara ọ ga-emekwa ụzọ mgbapụ ka unu wee nwee ike idi ya.” (1 Kọrint 10:13) Bible na-ekwekwa nkwa maka “ike karịrị ike nkịtị” iji nyere anyị aka idi ọdachi.—2 Ndị Kọrint 4:7.

Chineke Na-eme Ihe Dị Ka Uche Ya Si Dị

Ndị Kraịst hà kwesịrị ịtụ anya ka Chineke napụta ha n’ụzọ ọrụ ebube mgbe ọ bụla ọdachi na-abịa? Ihe ndekọ Bible akwadoghị atụmanya dị otú ahụ.

N’ezie, Jehova Chineke pụrụ ịhọrọ ime ihe kpọmkwem n’ihi ohu ya ọ bụla. Ọ bụrụkwa na onye ọ bụla echee na ya ezerewo mmerụ ahụ́ site n’enyemaka Chineke, e kwesịghị ịkatọ ya. Ma mgbe Jehova họọrọ ịghara ime ihe ọ bụla, e kwesịghị iwere ya na obi adịghị ya mma n’ebe anyị nọ.

Ka anyị nwee obi ike na n’agbanyeghị ọnwụnwa anyị na-eche ihu ma ọ bụ ọnọdụ anyị nọ na ya, Jehova ga-enye ndị ohu ya na-ekwesị ntụkwasị obi nchebe, site n’iwepụ ọnọdụ ahụ, ma ọ bụ site n’inye anyị ume iji die ya, ma ọ bụkwanụ, ọ bụrụ na anyị anwụọ, site n’ịkpọlite anyị ịdị ndụ ruo mgbe ebighị ebi n’ụwa ọhụrụ ya.—Abụ Ọma 37:10, 11, 29; Jọn 5:28, 29.