Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Nnyocha nke Ala Ọma Jijiji

Nnyocha nke Ala Ọma Jijiji

Nnyocha nke Ala Ọma Jijiji

“IBI N’ELU ALA KWỤSIRI IKE AMARAWO ANYỊ NNỌỌ AHỤ́ NKE NA MGBE MALITERE ỊMA JIJIJI OBI NA-EFU ANYỊ.”—AKWỤKWỌ BỤ́ “THE VIOLENT EARTH.”

“ALA ỌMA JIJIJI so n’ikike ndị e kere eke kasị ike nakwa ndị kasị ebibi ihe,” ka akwụkwọ bụ́ The World Book Encyclopedia na-ekwu. Nke ahụ abụghị ikwubiga okwu ókè, n’ihi na ike nke oké ala ọma jijiji na-akpa pụrụ iji 10,000 ugboro dị ike karịa ike bọmbụ atọm mbụ kpara! Ihe na-eme ka a tụkwuo oké ụjọ bụ eziokwu ahụ bụ́ na ala ọma jijiji pụrụ iwere ọnọdụ n’ụdị ihu igwe ọ bụla, n’oge ọ bụla n’afọ, nakwa n’oge ọ bụla n’ụbọchị. Ọ bụkwa ezie na ndị ọkà mmụta sayensị pụrụ ịma ebe ala ọma jijiji pụrụ iwere ọnọdụ, ha apụghị ikwu kpọmkwem mgbe ọ ga-eme.

Ala ọma jijiji na-ewere ọnọdụ mgbe oké nkume dị iche iche chipụrụ n’ọnọdụ ha n’ime ala. Ụdị ihe a na-eme n’esepụghị aka. Mgbe mgbe, ịma jijiji nke a na-akpata adịghị esi ike nke na a ga-anọ n’elu ala mara mgbe ha na-eme, ma ígwè ọrụ bụ́ seismograph pụrụ ịma mgbe ha na-eme ma dekọọ ha. * N’oge ndị ọzọ, ọnụ ọgụgụ dị ukwuu nke nkume na-agbawa, ha na-echipụkwa nke ukwuu nke na ha na-eme ka elu ala maa nnọọ jijiji.

Ma n’ihi gịnị ka e ji enwe mkpatụ mgbe nile n’ime ala? “A pụrụ inweta azịza ya ná nchepụta echiche e nwere banyere mgbanwe kọntinent mbara ala, bụ́ echiche nke gbanweworo kpam kpam echiche ndị e nwere na nkà mmụta sayensị banyere Elu Ala,” ka Ụlọ Ọrụ Mba nke Na-enye Ihe Ọmụma Banyere Ala Ọma Jijiji (NEIC) na-ekwu. “Anyị maara ugbu a na e nwere mbara ala kontinent asaa bụ́ isi, ndị e kewara gaa na mbara ala ndị ọzọ dị ntakịrị karị,” ka ụlọ ọrụ NEIC na-ekwukwa, “ha nile na-esite n’ebe ibe ha dị echipụ mgbe nile, n’ọ̀tụ̀tụ̀ dị n’agbata milimita 10 ruo 130 [ụzọ atọ n’ụzọ asatọ nke otu inch ruo inch ise] n’otu afọ.” Ihe ka ọtụtụ n’ala ọma jijiji ndị a na-enwe, ka ụlọ ọrụ NEIC na-ekwu, na-ewerekarị ọnọdụ n’ógbè ndị dị warara bụ́ ndị kewasịrị kontinent ndị ahụ. Ọ bụ n’ebe a ka pasent 90 nke nnukwu ala ọma jijiji pụrụ ime.

Otú Ọ Haruru na Otú Ọ Dịruru ná Njọ

A pụrụ ịchọpụta ókè ala ọma jijiji kparuru ike site n’otú ha haruru na otú ha dịruru ná njọ. Charles Richter mepụtara otu ihe ọ̀tụ̀tụ̀ n’afọ ndị 1930 maka ịtụ otú ala ọma jijiji haruru n’ihe ọ̀tụ̀tụ̀. Ka ọnụ ọgụgụ ụlọ ọrụ ndị na-eji ígwè seismograph eme ihe mụbara, e mepụtara ihe ọ̀tụ̀tụ̀ ndị ọhụrụ dabere ná nchepụta Richter. Dị ka ihe atụ, ihe ọ̀tụ̀tụ̀ a na-akpọ moment magnitude scale na-atụ ike e wepụtara n’ebe ala ọma jijiji si malite.

N’ezie, ihe ọ̀tụ̀tụ̀ ndị a adịghị egosi mgbe nile ókè ala ọma jijiji bibiruru ihe. Tụlee ihe banyere otu ala ọma jijiji weere ọnọdụ n’ebe ugwu Bolivia na 1994, nke ruru 8.2 n’ihe ọ̀tụ̀tụ̀, bụ́ nke a sịrị na o gburu nanị mmadụ ise. Ma, ala ọma jijiji nke mere na Tangshan, China na 1976—nke ruru 8.0 n’ihe ọ̀tụ̀tụ̀ bụ́ nke dị nta karị—kpatara ọnwụ nke ọtụtụ narị puku mmadụ!

N’ụzọ dị iche n’otú ọ haruru, ndekọ nke ókè ọ dịruru ná njọ na-egosi mmetụta ala ọma jijiji nwere n’ebe ndị mmadụ nọ, n’ebe ihe owuwu dị, nakwa na gburugburu ebe obibi. Nke a bụ ihe ọ̀tụ̀tụ̀ na-akọwakwu ókè ala ọma jijiji kparuru ike n’ihe banyere mmetụta ya n’ebe ụmụ mmadụ nọ. E kwuwerị, ala ịma jijiji n’onwe ya adịghị emerụ ndị mmadụ ahụ. Kama nke ahụ, mgbidi ndị na-ada ada, paịpụ gas ndị na-agbawa agbawa na waya eletrik ndị na-adọbi adọbi, ihe ndị na-ada ada, na ihe ndị yiri ha, na-akpata ihe ka ukwuu ná mmerụ ahụ́ nakwa n’ọnụ ọgụgụ ndị na-anwụnụ.

Otu n’ime ihe mgbaru ọsọ nke ndị ọkachamara n’ịtụ ime mkpatụ nke ala n’ihe ọ̀tụ̀tụ̀ bụ inwe ike inye ịdọ aka ná ntị n’oge tupu ala ọma jijiji ana-amalite. A ka na-emepụta otu usoro ihe omume electronic bụ́ nke a kpọrọ Usoro Bụ́ Ọkpọka E Si Eme Nchọpụta Ma Na-eleru Ala Ịma Jijiji Anya. Dị ka akụkọ ụlọ ọrụ CNN kọrọ si dị, usoro a—tinyere ụzọ dị ngwa a na-esi enweta ihe ọmụma na ya nakwa ihe omume kọmputa ndị ka bụrụ ọkpọka—ga-enyere ndị ọrụ aka “inwe ike ikwu kpọmkwem n’ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ n’otu ntabi anya ebe ndị e nwere ịma jijiji kasị njọ nke ala ọma jijiji kpatara.” N’aka nke ya, nke a ga-eme ka ọ dịrị ndị ọchịchị mfe karị iziga ndị enyemaka n’ebe ndị o metụtara.

N’ụzọ doro anya, ịdị njikere maka ala ọma jijiji pụrụ ibelata mmerụ ahụ́, belata mbibi nke ihe onwunwe—nke kasị mkpa—zọpụta ndụ. Ma, ala ọma jijiji nọgidere na-eme. Ya mere, ajụjụ na-ebilite bụ́: Olee otú e siworo nyere ụfọdụ ndị aka ịnagide ihe ndị ọ kpatara?

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 4 Seismograph bụ ngwá ọrụ na-achọpụta ma na-edekọ ime mkpatụ nke ala n’oge ala ọma jijiji. E mepụtara nke mbụ n’afọ 1890. Taa, e nwere ihe karịrị ụlọ ọrụ 4,000 na-eji ígwè seismograph arụ ọrụ gburugburu ụwa.

[Chaatị dị na peeji nke 15]

(Ị chọọ ịhụ ebe e sere map a, gaa n’akwụkwọ a nke e biri ebi)

Ala Ọma Jijiji Ole?

Okwu Ndị E Ji Akọwa HaOtú Ọ HaruruNkezi A Na-enwe Kwa Afọ

Oké Ala Ọma Jijiji8 nakwa karịa1

Nnukwu Ala Ọma Jijiji7-7.918

Ala Ọma Jijiji Kpara Oké Ike6-6.9120

Ala Ọma Jijiji Na-adịghị Oké Njọ5-5.9800

Ala Ọma Jijiji Na-akpaghị Oké Ike4-4.96,200*

Obere Ala Ọma Jijiji3-3.949,000*

Ala Ọma Jijiji Dị Nnọọ Obere<3.0Otú Ọ Haruru 2-3: ihe dị ka 1,000 n’ụbọchị

Otú Ọ Haruru 1-2: ihe dị ka 8,000 n’ụbọchị

* Atụmatụ e mere.

[Ebe E Si Nweta Foto]

Ebe e si nweta ya: Ụlọ Ọrụ Mba Na-enye Ihe Ọmụma Banyere Ala Ọma Jijiji Site n’ikike nke USGS/Ụlọ Ọrụ Mba Na-enye Ihe Ọmụma Banyere Ala Ọma Jijiji, USA

[Ebe E Si Nweta Foto Dị na peeji 15]

Ihe ndekọ nke ime mkpatụ nke ala nke dị na peeji nke 14 na nke 15: Ndekọ ọnụ ọgụgụ e nwetara n’aka Ụlọ Ọrụ Na-eji ígwè Seismograph Eme Nnyocha na Berkeley