Nwa M Bu n’Afọ Nwụnahụrụ M
Nwa M Bu n’Afọ Nwụnahụrụ M
MONDAY, April 10, 2000, bụ ụbọchị na-ekpo ọkụ anyanwụ na-acha, n’ihi ya apụrụ m ịga ime ihe ụfọdụ. Adị m ime ọnwa anọ, ọ bụkwa ezie na ike adịchaghị m nnọọ, obi dị m ụtọ ịpụ apụ. Ma, ka m kwụ n’ahịrị n’ebe a na-akwụ ụgwọ ihe a zụrụ n’ụlọ ahịa na-ere ihe ndị e ji esi nri, ya adị m ka ọ̀ dị ihe na-eme m.
O mesịrị bụrụ ihe m tụrụ egwu ya mgbe m lọtara. Ọbara na-agba m—ihe na-emetụbeghị n’ugboro abụọ m dịworo ime—o mekwara ka m tụọ egwu! Akpọrọ m dọkịta m na fon, ma ọ tụrụ aro ka m chere ma bịa echi ya, ebe ọ bụkwarị na ọ bụ mgbe ahụ ka anyị yiri na m ga-aga ịhụ ya. Tupu mụ na di m enyiwe ụmụ anyị abụọ n’elu ihe ndina ha n’abalị ahụ, anyị kpekọrọ ekpere ọnụ, na-arịọ Jehova ka o nye anyị ike n’ụzọ ọ bụla ọ pụrụ ịdị anyị mkpa. N’ikpeazụ, ehiri m ụra.
Ma n’ihe dị ka elekere anya abụọ, etetara m na-enwe oké ihe mgbu. Ihe mgbu ahụ jiri nwayọọ nwayọọ belata, ma ka m na-ehiri ụra ọzọ, ọ malitere ọzọ, na nke ugbu a, ọ na-egbusi m mgbu ike. Ọbara gbasiwekwara m ike, achọpụtakwara m na akpa nwa m na-esekọtazi esekọta. Echesiri m echiche ike, na-agbalị icheta ma ọ̀ dị ihe m mere kpatara ihe a ji na-eme m, ma ọ dịghị ihe m chetara m na-emezighị.
Ka ọ na-erule n’elekere anya ise nke ụtụtụ, amatara m na aghaghị m ịga ụlọ ọgwụ. Mgbe mụ na di m rutere, obi ruru anyị ala ịnọ ná nlekọta nke onye ọrụ ahụ́ ike na-arụ ọrụ n’ọnụ ụlọ ọnọdụ mberede, bụ́ onye na-enye aka nke nwere nnọọ obiọma na ọmịiko. Mgbe awa abụọ gasịrị, dọkịta ahụ gwara anyị ihe anyị nọworo na-atụ egwu ya: Nwa m anwụnahụwo m.
N’ihi mgbaàmà ndị m hụrụ tupu oge ahụ, adị m njikere maka ihe a si na ya pụta, ejikwa m nnọọ obi ike nara akụkọ ahụ. Ọzọkwa, di m nọnyeere m n’oge ahụ nile, o nyekwara m nkwado dị ukwuu. Ma ebe ọ bụ na anyị ga-alazi n’ekughị nwa ọhụrụ, anyị nọ na-eche ihe anyị ga-agwa ụmụ anyị abụọ, bụ́ Kaitlyn, dị afọ isii, na David, dị afọ anọ.
Gịnị Ka Anyị Ga-agwa Ụmụ Anyị?
Ụmụ anyị maara na ihe adịzighị adịzi tupu ha alakpuo ụra, ma olee otú anyị ga-esi agwa ha na onye gaara abụ nwanne ha nke obere anwụwo? Anyị kpebiri ịgwa ha eziokwu. Mama m nyeere anyị aka n’akụkụ ahụ site n’ịgwa ụmụ anyị na anyị agaghị eku nwa ọhụrụ ahụ lọta. Mgbe anyị lọrutere, ha ji ọsọ bịa zute anyị ma bie anyị nnọọ ọma, sutụkwa anyị ọnụ. Ajụjụ mbụ ha jụrụ bụ, “Ahụ́ ọ̀ dịkwa nwa ọhụrụ ahụ?” Azalighị m ihe ọ bụla, ma di m, n’ijikọta anyị ọnụ, kwuru, sị: “Nwa ọhụrụ ahụ anwụwo.” Anyị jidere onwe anyị aka ma kwaa ákwá, bụ́ nke nyere aka mee ka anyị malite ịnagide ya.
Otú ọ dị, anyị adịchaghị njikere maka otú ụmụ anyị ga-esi meghachi omume mgbe e mesịrị. Dị ka ihe atụ, n’ihe dị ka izu abụọ mgbe ime m pụsịrị, a mara ọkwa n’ọgbakọ Ndịàmà Jehova dị n’ógbè anyị na otu Onyeàmà meworo agadi, onye bụ́kwa ezigbo enyi ezinụlọ anyị anwụwo. David, bụ́ onye dị afọ anọ, malitere ịkwa ákwá nke ukwuu, n’ihi ya di m kupụrụ ya èzí. Mgbe o mechisịrị ọnụ, David jụrụ ihe mere enyi ya ji nwụọ. Mgbe ahụkwa, ọ jụrụ ihe mere nwa ọhụrụ ahụ ji nwụọ. Ihe ọzọ o mere bụ na ọ sịrị papa ya: “Ị̀ ga-anwụ?” Ọ chọkwara ịmata ihe mere na Jehova Chineke ebibibeghị Setan ma malite “idozi ihe.” N’ezie, o juru anyị anya ịhụ ụdị ihe na-abata n’uche ya bụ́ obere nwa.
Kaitlyn jụkwara ọtụtụ ajụjụ. Mgbe o ji ụmụ bebi ya na-egwuri egwu, ọ na-emekarị ka otu nwa bebi ọ̀ na-arịa ọrịa, ebe ụmụ bebi ndị ọzọ na-aghọ ndị nọọsụ ma ọ bụ ndị òtù ezinụlọ. O ji akwụkwọ rụọ igbe dị ka ụlọ ọgwụ a na-elekọta nwa bebi, ọtụtụ mgbe ọ na-emekwa ka a ga-asị na otu n’ime ụmụ bebi ya anwụwo. Ajụjụ ndị ụmụ anyị na-ajụ na egwuregwu ndị ha na-egwu nyere anyị ọtụtụ ohere ịkụziri ha ihe ndị dị mkpa banyere ndụ na otú Bible pụrụ isi nyere anyị aka ịnagide ọnwụnwa. Anyị chetakwaara ha nzube Chineke ime ka ụwa ghọọ paradaịs mara mma, nke ụdị nhụjuanya na ihe mgbu nile—ọbụna ọnwụ—na-agaghị adị na ya.—Mkpughe 21:3, 4.
Otú M Si Nagide Mfu Ahụ
Mgbe mbụ m si ụlọ ọgwụ lọta, enweghị m ọnụ okwu, enwekwara m mkpasasị uche. Ihe ndị a ga-eme eme gbara m gburugburu, ma amaghị m nke m ga-amalite amalite. Akpọrọ m ọtụtụ ndị enyi m nweworo otu ụdị ahụmahụ ahụ, ha kasikwara m nnọọ obi. Otu ezigbo enyi m ziteere anyị okooko osisi ma kwuo na ya ga-akpọrọ ụmụ anyị ka ha na ya nọkọrịta n’ehihie ahụ. Enwere m nnọọ ekele maka ezi nchegbu ya na enyemaka ya bara uru!
Ahaziri m foto ezinụlọ anyị n’ọ́bọ́ foto. Ekiriri m ma chịlie uwe m zụụrụ nwa m bu n’afọ—nanị ihe a na-ahụ anya nke na-echetara m nwa ọhụrụ ahụ nwụnahụrụ m. Enwere m mmetụta dị iche iche ruo ọtụtụ izu. Ụbọchị ụfọdụ apụghị m ịkwụsị ịkwa ákwá—n’agbanyeghị nkwado nile m nwetara site n’aka ezinụlọ m na ndị enyi m. Mgbe ụfọdụ m na-eche na ara na-achọ ịgba m. Isoro ndị enyi m dị ime nọrọ siiri m ike karịsịa. Tupu mgbe ahụ, ana m eche na ime ọpụpụ bụ nanị “obere ihe” ná ndụ nwanyị, ihe anyị pụrụ ịnagide n’enweghị ọtụtụ nsogbu. Lee ka m si daa ya! *
Ịhụnanya—Ihe Ngwọta Kasị Mma
Ihe ngwọta dị irè m nwetara bụ ịhụnanya di m na Ndị Kraịst ibe m gosiri m, tinyere oge gabigaworonụ. Otu Onyeàmà siri nri abalị ma butere anyị ya. Otu onye okenye ọgbakọ na nwunye ya wetara okooko osisi na kaadị ekele, ha nọnyeere anyị ná mgbede ahụ. Anyị maara na ha enweghị nnọọ ohere, n’ihi ya nchebara echiche ha metụrụ anyị n’obi. Ọtụtụ ndị enyị anyị ndị ọzọ ziteere anyị kaadị na okooko osisi. Okwu dị mfe bụ́ “Anyị na-eche banyere unu” bụụrụ anyị nnọọ oké ihe! Otu onye òtù ọgbakọ dere, sị: “Anyị na-ele ndụ anya otú Jehova si ele ya—dị ka ihe dị nnọọ oké ọnụ ahịa. Ọ bụrụ na ọ na-ama mgbe otu egwele dara n’ala, ọ na-ama n’ezie mgbe nwa e bu n’afọ nwụrụ.” Nwunye nwa nwanne mama m dere, sị: “Ọrụ ebube nke ọmụmụ na ndụ na-eju anyị nnọọ anya, ọ na-ejukwa anyị anya mgbe a na-amụghị ya.”
Mgbe m nọ n’Ụlọ Nzukọ Alaeze ka izu ole na ole gasịrị, achọrọ m ịkwa ákwá, aghaghịkwa m ịpụ tupu nzukọ amalite. Ezi ndị enyi m abụọ bụ́ ndị hụrụ mgbe m bu anya mmiri pụọ bịara soro m nọdụ n’ime ụgbọala, jide m n’aka, ma mee ka m chịa ọchị. N’oge na-adịghị anya, anyị atọ baghachichara. Lee ihe ọṅụ ọ bụ inwe ndị enyi bụ́ ndị na-arapara “n’ahụ́ karịa nwanne”!—Ilu 18:24.
Ka akụkọ ahụ gbasara, o juru m anya ịmata na ọtụtụ Ndịàmà ibe m enwewo otu ahụmahụ ahụ. Ọbụna ụfọdụ ndị mụ na ha na-adịghị akpachi anya tupu mgbe ahụ nyere m nkasi obi na agbamume pụrụ iche. Nkwado ịhụnanya ha n’oge ọ dị m mkpa chetaara m okwu Bible bụ́: “Na mgbe nile ka enyi na-ahụ n’anya, a na-amụkwa nwanne banyere ahụhụ.”—Ilu 17:17.
Nkasi Obi Site n’Okwu Chineke
E mere Ememe Ncheta ọnwụ Kraịst n’izu na-esochi izu ime m pụrụ. Otu mgbede mgbe anyị na-agụ akụkọ Bible banyere ụbọchị ndị ikpeazụ nke Jizọs, na mberede ihe a gbatara m n’uche: ‘Jehova maara otú ihe mgbu nke mfu na-adị. Nwa nke ya nwụnahụrụ ya!’ N’ihi na Jehova bụ Nna anyị nke eluigwe, mgbe ụfọdụ ana m echezọ na ọ na-aghọta nnọọ mmetụta anyị na-enwe nakwa na ọ na-enwe nnọọ mmetụta ọmịiko n’ahụ́ ndị ohu ya—ndị ikom na ndị inyom. Ozugbo ahụ, enwere m mmetụta dị ukwuu nke obi iru ala. Enwere m mmetụta nke ịnọ Jehova nso karịa mgbe ọ bụla ọzọ.
Enwetakwara m agbamume dị ukwuu site n’akwụkwọ ndị dabeere na Bible, karịsịa mbipụta ndị gara aga nke magazin Ụlọ Nche na Teta! bụ́ ndị na-ekwu banyere ọnwụ nke onye a hụrụ n’anya. Dị ka ihe atụ, isiokwu ndị dabeere n’isiokwu bụ́ “Ịnagide Ọnwụ nke Nwatakịrị” bụ́ ndị dị ná mbipụta Teta! nke January 8, 1989, nyeere m aka nke ukwuu, dịkwa ka broshuọ bụ́ Mgbe Onye Ị Hụrụ n’Anya Nwụrụ nyeere m. *
Njedebe nke Iru Újú
Ka oge na-aga, amatara m na agbakewela m mgbe m pụrụ ịchị ọchị n’enweghị obi amamikpe nakwa mgbe m pụrụ inwe mkparịta ụka n’ekwuteghị okwu banyere nwa ọhụrụ ahụ nwụnahụrụ m. N’agbanyeghị nke ahụ, site n’oge ruo n’oge, ana m enwe mkpasasị uche, dị ka mgbe m hụrụ ndị enyi m bụ́ ndị na-anụbeghị banyere ime ọpụpụ ahụ ma ọ bụ mgbe otu ezinụlọ mụrụ nwa ọhụrụ bịara n’Ụlọ Nzukọ Alaeze anyị.
Etetaziri m n’otu ụtụtụ na-enwe mmetụta na ọnọdụ ọjọọ ahụ apụọla n’anya. Ọbụna tupu mụ emeghee anya m, enwere m mmetụta na agbakeela m—udo na ahụ́ iru ala m na-enwebeghị kemgbe ọtụtụ ọnwa. Ma, mgbe m tụụrụ ime n’ihe dị ka otu afọ mgbe nwa m nwụnahụsịrị m, amalitekwara m iche na ọ pụrụ ịpụ ọzọ. N’ụzọ na-enye obi ụtọ, a mụrụ m nwa nwoke ji ahụ́ n’October 2001.
M ka na-eru újú maka nwa ahụ nwụnahụrụ m. Ma, ihe ahụ nile merenụ emewo ka m nwekwuo ekele maka ndụ, ezinụlọ m, Ndị Kraịst ibe m, nakwa n’ebe Chineke—onye na-akasi anyị obi nọ. Ahụmahụ ahụ emesiwokwa eziokwu ahụ ike, nke bụ́ na Chineke adịghị ewere ụmụ anyị kama na “mgbe na ihe ndapụta na-adabara [anyị] nile.”—Eklisiastis 9:11.
Lee ka m si atụ anya oge mgbe Chineke ga-ewepụ iru újú, ịkwa ákwá, na ihe mgbu nile, gụnyere ihe mgbu anụ ahụ́ na nke uche a na-enwe ma ime pụọ! (Aịsaịa 65:17-23) Mgbe ahụ ụmụ mmadụ nile na-erube isi ga-enwe ike ikwu, sị: “Ọnwụ, olee mmeri gị? Ọnwụ, olee ihe ọgbụgba gị?”—1 Ndị Kọrint 15:55; Aịsaịa 25:8.— Ọ bụ onye ọzọ dere ya.
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
^ par. 13 Nnyocha na-egosi na a na-enwe mmeghachi omume dịgasị iche n’ebe ime ọpụpụ dị. Ụfọdụ ndị na-enwe mgbagwoju anya, ndị ọzọ na-enwe ndakpọ olileanya, ebe ndị ọzọ na-enwe oké mwute. Mwute bụ mmeghachi omume dị otú o kwesịrị a na-enwe mgbe e nwere nnukwu mfu dị ka ime ọpụpụ, ka ndị nnyocha na-ekwu, ọ bụkwa akụkụ nke usoro mgbake.
^ par. 20 Nke Ndịàmà Jehova bipụtara.
[Igbe dị na peeji nke 23]
Ugboro Ole A Na-enwe Ime Ọpụpụ na Ihe Ndị Na-akpata Ya
“Nnyocha na-egosi na pasent 15 ruo 20 nke ndị nile a chọpụtara na ha dị ime na-emesị nwee ime ọpụpụ,” ka akwụkwọ bụ́ The World Book Encyclopedia, na-ekwu. “Ma ihe ize ndụ nke ime ọpụpụ na-akasị adị ukwuu n’ime izu abụọ mbụ mgbe a tụsịịrị ime, bụ́ oge ọnụ ọgụgụ ka ukwuu nke ndị inyom na-adịghị amadịrị na ha dị ime.” Akwụkwọ ọzọ na-ekwu na ihe karịrị “pasent 80 nke ime ọpụpụ na-ewere ọnọdụ n’ime izu 12 mbụ nke afọ ime,” bụ́ ndị a na-eche na ihe na-akpata ọkara n’ime ha ma ọ dịkarịa ala bụ nkwarụ ndị dị na chromosome nke nwa e bu n’afọ. Ọ bụghị ụdị nkwarụ ndị dị na chromosome nke nne ma ọ bụ nna na-akpata nkwarụ ndị a.
Ihe ndị ọzọ na-akpata ime ọpụpụ pụrụ isite n’ahụ́ ike nke nne. Ndị ọrụ ahụ́ ike na-arụtụ aka na ọ bụ nsogbu e nwere ná mmiri ọgwụ ahụ́ bụ́ hormone na n’usoro ahụ́ ji alụso ọrịa ọgụ, ọrịa, nakwa adịzighị adịzi nke ọnụ akpa nwa ma ọ bụ akpa nwa nke nne, na-akpata ya. Ọrịa ndị na-adịghị ala ala, ndị dị ka ọrịa shuga (ma ọ bụrụ na a chịkwaghị ya nke ọma) na ọbara mgbali elu pụkwara ịkpata ya.
Dị ka ndị ọkachamara si kwuo, mmega ahụ́, ibuli ihe ndị dị arọ, ma ọ bụ inwe mmekọahụ adịchaghị akpata ime ọpụpụ. O yighị ka ịda ada, ịbụ onye e titụrụ ihe, ma ọ bụ onye egwu tụrụ na mberede hà ga-akpata ime ọpụpụ. Otu akwụkwọ na-ekwu, sị: “O yighị ka mmerụ ahụ́ ọ̀ ga-emetụta nwa e bu n’afọ n’ụzọ dị njọ ọ gwụla ma mmerụ ahụ́ ahụ ọ̀ dị ukwuu ruo n’ókè nke itinye ndụ nke gị onwe gị n’ihe ize ndụ.” Lee ka ọdịdị nke akpa nwa si egosipụta nke ọma na e nwere Onye Okike maara ihe ma na-ahụ n’anya!—Abụ Ọma 139:13, 14.
[Igbe/Foto dị na peeji nke 25]
Ụzọ Ezinụlọ na Ndị Enyi Pụrụ Isi Nye Aka
Mgbe ụfọdụ ọ na-esi ike ịmata kpọmkwem ihe a ga-ekwu ma ọ bụ mee mgbe ime pụrụ onye òtù ezinụlọ ma ọ bụ enyi mmadụ. Ndị mmadụ na-emeghachi omume n’ụzọ dị iche iche ná mfu dị otú ahụ, n’ihi ya e nweghị otu ụkpụrụ e guzobere maka inye nkasi obi na enyemaka. Otú ọ dị, tụlee aro ndị na-esonụ. *
Ihe ndị dị irè ị pụrụ ime iji nye aka:
◆ Kwuo ka i lekọta ụmụaka ndị nke topụtaworonụ.
◆ Sie nri ma butere ya ezinụlọ ahụ.
◆ Nyekwa nna ha nkwado. Dị ka otu nna kwuru, “ha adịghị emepụta ọtụtụ kaadị ekele pụrụ iche maka ndị nna nọ n’ọnọdụ a.”
Ihe ndị na-enye aka ị ga-ekwu:
◆ “O wutere m nnọọ ịnụ banyere ime ọpụpụ gị.”
Okwu a dị mfe pụtara nnọọ ihe dị ukwuu, ha pụkwara imeghe ụzọ maka ikwu okwu nkasi obi ndị ọzọ.
◆ “Ọ dịghị njọ ịkwa ákwá.”
A na-enwekarị mkpali ịkwa ákwá n’ime izu ma ọ bụ ọbụna ọnwa ndị mbụ mgbe e nwesịrị ime ọpụpụ. Mesie onye ahụ obi ike na ị dịghị eleda ya anya n’ihi igosi mmetụta uche ya.
◆ “M̀ nwere ike ịkpọ gị ọzọ na fon n’izu ọzọ iji mata otú ị dị?”
Na mbụ, a pụrụ igosi ndị o metụtara ọmịiko n’ụzọ dị ukwuu, ma ka oge na-aga, ọ bụrụkwa na ha ka na-enwe mwute, ha pụrụ iche na ndị ọzọ echezọọla ha. Ọ dị mma ha ịmara na nkwado gị ka na-aga n’ihu. Mmetụta ndị ha nwere pụrụ ịdị na-abịaghachi ruo ọtụtụ izu ma ọ bụ ọnwa. Ha pụrụ ọbụna ịbịaghachi mgbe a mụsịrị nwa ọzọ a tụụrụ ime ya.
◆ “Amaghị m n’ezie ihe m ga-ekwu.”
Ọtụtụ mgbe ikwu nke ahụ na-aka mma karịa ịghara ikwu ihe ọ bụla. Ma eziokwu i kwuru ma ọnụnọ ị nọ n’ebe ahụ na-egosi nchebara echiche gị.
Ihe ndị ị na-agaghị ekwu:
◆ “Nwa adịghị agwụ agwụ.”
Ọ bụ ezie na nke a pụrụ ịbụ eziokwu, a pụrụ ịghọta ya dị ka egosighị ọmịiko. Nne na nna ahụ achọghị nnọọ nwa ọhụrụ ọ bụla, ha chọrọ nwa ọhụrụ nke ahụ. Tupu ha enwee ike iche banyere ịmụ ọzọ, o yiri ka ọ̀ ga-adị mkpa ka ha ruo újú maka nwa nwụnahụrụ ha.
◆ “Ọ pụrụ ịbụ na ọ dị ihe mere ya.”
Ọ bụ ezie na nke a pụrụ ịbụ eziokwu, ọ dịghị enye nnọọ nkasi obi. N’obi nne ahụ, o bu nwa ọhụrụ ji ahụ́.
◆ “Ma ọ dịghị ihe ọzọ ị maghị nwa ọhụrụ ahụ n’ezie. Ọ gaara aka nnọọ njọ ma ọ bụrụ na o mere mgbe a mụsịworo ya.”
Ihe ka n’ọnụ ọgụgụ ndị inyom na nwa ha bu n’afọ na-enwe nkekọ mgbe ha ka na-amalite nnọọ amalite. N’ihi ya, mgbe nwa ọhụrụ dị otú ahụ nwụrụ, iru újú na-esochikarị ya. Eziokwu ahụ bụ́ na ọ dịghị onye ọ bụla ọzọ “maara” nwa ọhụrụ ahụ dị ka nne ya maara ya na-eme ka iru újú ahụ dịkwuo njọ.
◆ “Ma ọ dịghị ihe ọzọ, i nwere ụmụ ọzọ.”
Nye nne na nna na-eru újú, nke a pụrụ ịdị ka ịgwa onye na-enwekwaghị otu aka, sị: “Ma ọ dịghị ihe ọzọ, ị ka nwere otu nke ọzọ.”
N’ezie, a ghaghị ikweta na ọbụna ndị kasị echebara ndị ọzọ echiche ma nwee ezi obi na-ekwu ihe na-ezighị ezi site n’oge ruo n’oge. (Jems 3:2) N’ihi ya, ndị inyom nwere ezi uche bụ́ ndị ime ha pụworo kwesịrị igosi ịhụnanya Ndị Kraịst ma ghara iburu ndị ji ezi nzube obi kwuo okwu na-ekwesịghị ekwesị, iwe n’obi.—Ndị Kọlọsi 3:13.
[Ihe e dere n’ala ala peeji]
^ par. 36 E nwetara ha site n’akwụkwọ bụ́ A Guide to Coping With Miscarriage, nke Òtù Na-enyere Ndị Ime Ha Pụrụ Aka bụ́ nke dị na Wellington, New Zealand, dere.