Olee Otú M Pụrụ Isi Kwusaara Ụmụ Akwụkwọ Ibe M Ozi Ọma?
Ndị Na-eto Eto Na-ajụ Sị . . .
Olee Otú M Pụrụ Isi Kwusaara Ụmụ Akwụkwọ Ibe M Ozi Ọma?
“Anọ m na-ezisa ozi ọma mgbe m zutere onye m maara na mberede. Egwu jidere m! Onye e kenyere mụ na ya tinyeziri ọnụ ma kwuchitere m.”—Alberto.
“Amaara m na otu n’ime ụmụ klas m bi n’okporo ámá a, n’ihi ya, ahapụrụ m ka nwanne m nwoke kwuo okwu n’ọnụ ụzọ nile. Mgbe oge ụfọdụ gasịrị, ike gwụtụrụ ya, ọ gwakwara m ka m kwuo okwu n’ọnụ ụzọ nke ọzọ. Akụrụ m aka, ma—ewoo—ọ bụ nwa akwụkwọ ibe m ahụ! Atụrụ m nnọọ egwu!”—James.
NDỊ na-eto eto na-echekarị na “ọ dịghị adaba adaba” ikwurịta banyere okpukpe. Otú ọ dị, n’etiti ezi Ndị Kraịst, ndị na-eto eto na-eji ihe ùgwù Chineke nyere ha bụ́ ịgwa ndị ọzọ banyere ihe ha kwere na ya akpọrọ ihe. N’ihi ya, ọtụtụ puku ndị na-eto eto bụ́ Ndịàmà Jehova na-ekere òkè n’ọrụ ime nkwusa site n’ọnụ ụzọ ruo n’ọnụ ụzọ. Ma ụfọdụ na-eme otú ahụ ma na-atụ egwu na ha pụrụ izute onye ha maara n’ụlọ akwụkwọ. “Ahụ́ ka na-ama m jijiji ma m zute ndị mụ na ha gakọrọ akwụkwọ,” ka Jennifer na-ekwu, n’agbanyeghị na ọ gụsịrị akwụkwọ sekọndrị n’afọ ụfọdụ gara aga.
Ọ bụrụ na ị bụ Onye Kraịst na-eto eto, ị pụrụ inwe mmetụta dị otú ahụ mgbe ụfọdụ. N’ezie, anyị nile na-atụ egwu ịbụ ndị a jụrụ ajụ, n’ihi ya ọ bụ ihe dị nnọọ otú o kwesịrị inwetụ nchegbu n’ihe banyere isoro nwa akwụkwọ ibe gị kwurịta banyere okpukpe. * Ma ọ dịghị ihe mere ị ga-eji kwe ka egwu jikpaa gị. Ì chetara nwoke ahụ Bible kpọrọ “Josef onye Arimatịa”? O kweere ihe ndị ọ nụrụ n’ọnụ Jizọs. Ma, Bible kọwara Josef dị ka “onye na-eso ụzọ Jizọs, kama ọ bụ nke nzuzo ya n’ihi egwu ọ na-atụ ndị Juu.” (Jọn 19:38) Ugbu a, olee otú ọ ga-adị gị inwe enyi nke chọrọ izo ọbụbụenyi unu ezo? (Luk 12:8, 9) Mgbe ahụ, ọ bụghị ihe ijuanya na Chineke na-atụ anya ka Ndị Kraịst nile na-eme “nkwupụta ihu ọha” nke okwukwe ha. (Ndị Rom 10:10) Nke ahụ ga-agụnye ịgwa ndị na-eto eto nọ n’ụlọ akwụkwọ unu okwu.
Josef onye Arimatịa kwụsịrị ịtụ egwu, ma ọ dịghị ihe ọzọ ruo n’ókè nke ịchọ inweta ikike iji lie ozu Jizọs. Olee otú ị pụrụ isi kwụsị ịtụ egwu?
Ịzụlite Ọchịchọ Siri Ike nke Ime Nkwusa
N’ezie Pọl onyeozi alaghị azụ n’ịgwa ndị ọzọ banyere ihe ndị o kweere. Ná Ndị Rom 1:15, ọ kọwara onwe ya dị ka onye nwere ọchịchọ siri ike nke ikwusa ozi Bible. Gịnị kpatara ọchịchọ siri ike dị otú ahụ? Dị ka e dekọrọ ya n’amaokwu nke 16, ọ na-ekwu, sị: “Ihere ozi ọma ahụ adịghị eme m; n’eziokwu, ọ bụ ike Chineke maka ịzọpụta onye ọ bụla nke nwere okwukwe.” Gịnị banyere gị? Ị̀ nwapụtaworo onwe gị eziokwu ahụ n’ezie? (Ndị Rom 12:2) Ì kwenyesiri ike n’onwe gị na ozi dị na Bible bụ ‘ike Chineke maka nzọpụta’?
Nanị isoro ndị mụrụ gị na-aga nzukọ Ndị Kraịst ezughị. “Ọ dị mfe ịga nanị nzukọ,” ka otu onye ntorobịa aha ya bụ Deborah na-ekwu, “n’ihi na ndị mụrụ gị na-agwa gị ka i mee otú ahụ. Ma mgbe ndị mmadụ jụrụ m ajụjụ banyere Bible, adịghị m ama ihe m ga-aza.” Otu onye ntorobịa aha ya bụ Mi Young kwetara n’otu aka ahụ, sị: “Anyị aghaghị ikweta n’onwe anyị na nke a bụ eziokwu ahụ.”
Gịnị pụrụ ịkpali gị ịgwa ndị ọzọ ihe ọmụma i nwere banyere Bible? Ọ bụ ịmụ ya n’onwe gị. Otu onye ntorobịa aha ya bụ Sean na-ekwu, sị: “Mgbe ị malitere inwe ọmụmụ Bible onwe onye nke gị, ị ga-amalite ime eziokwu ahụ nke gị. Ị na-amụ ihe maka abamuru nke gị.” N’eziokwu, ọ bụghị mmadụ nile na-enwekarị mmasị ịmụ ihe. “Adịghị m enwe mmasị ịgụ ihe,” ka Shevon na-ekweta. “N’ihi ya, na mbụ o siiri m ike ịgụ Ụlọ Nche na Teta! ma ọ bụ ịgụ Bible kwa ụbọchị. Ma ka oge na-aga, amalitere m ime otú ahụ.”
Gịnị na-esi n’ịmụsị ihe ike otú ahụ apụta? Pọl onyeozi na-ekwu, sị: “Okwukwe na-esochi ihe a na-anụ.” (Ndị Rom 10:17) Ka okwukwe na nkweta gị na-esikwu ike, àgwà gị ga-agbanwerịrị. Otu onye ntorobịa bụ́ onye Brazil nke aha ya bụ Elisângela kwubiri, sị: “Ịbụ Onye Kraịst bụ ihe ùgwù, ọ bụghị ihe a ga-emere ihere.” N’ezie, ka okwukwe gị na-esikwu ike, ị ga-abụ onye a kwaliri ịgwa ndị ọzọ okwu—gụnyere ndị klas gị. Pọl kwuru, sị: “Anyị . . . na-egosipụta okwukwe, ya mere anyị na-ekwukwa okwu.” (2 Ndị Kọrint 4:13) E wezụga nke ahụ, olee otú ị pụrụ isi dị “ọcha n’ebe ọbara” nke ndị ọzọ dị ma ọ bụrụ na ị jụ ime ka ndị na-eto eto ị na-ahụ kwa ụbọchị nweta ihe ọmụma na-enye ndụ?—Ọrụ 20:26, 27.
Otú ọ dị, ụfọdụ ndị na-eto eto bụ́ Ndị Kraịst na-eche na ha akwadebeghị nke ọma ịgwa ndị ọzọ banyere Bible. “Ọ bụrụ na ị maghị ihe ị ga-ekwu,” ka otu onye ntorobịa aha ya bụ Joshua na-ekwu, “ịgbalị ime nkwusa adịchaghị atọ ụtọ.” Ọzọkwa, inwetakwu nghọta miri emi nke Bible ga-enyere gị aka ime ya n’ụzọ ziri ezi. (2 Timoti 2:15) N’ọgbakọ Ndịàmà Jehova, ndị ntorobịa pụrụ ịgakwuru ndị okenye ọgbakọ ma rịọ maka enyemaka onwe onye n’ịzụlite nkà izi ihe. Otu onye ntorobịa bụ́ onye Germany nke aha ya bụ Matthias, na-ekwu, sị: “Mgbe m malitere isoro ndị mmadụ na-enwe nkwurịta okwu n’ezie—ọ bụghị nanị inyefe akwụkwọ ndị e ji amụ Bible—amalitere m inweta ọṅụ n’ime nkwusa.”
N’ikpeazụ, ị pụrụ ikpe ekpere ka Chineke nyere gị aka iji obi ike kwuo okwu. (Ọrụ 4:29) Pọl onyeozi n’onwe ya nwetara enyemaka Chineke na nke a. Ná 1 Ndị Tesalonaịka 2:2, ọ na-ekwu, sị: ‘Anyị nwetara nkwuwa okwu site na Chineke anyị iji oké ịgba mgba gwa unu ozi ọma Chineke.’ Dị ka otu akwụkwọ si kwuo, a pụrụ ịsụgharị okwu a ịbụ, “Chineke wepụrụ egwu n’obi anyị.” N’ihi ya, gịnị ma i kpee ekpere ma rịọ Chineke ka o wepụ egwu n’obi gị?
Mee Ka A Mata Onye Ị Bụ
N’ụzọ kwekọrọ n’ekpere ahụ, ị pụrụ iwere nzọụkwụ pụtara ìhè. Otu onye ntorobịa bụ́ onye Britain nke aha ya bụ Chic, na-adụ ọdụ, sị: “Gwa ụmụ akwụkwọ ibe gị na ị bụ Onye Kraịst.” Ị chọghị ịbụ ‘onye na-eso ụzọ na nzuzo.’ Otu onye ntorobịa aha ya bụ Rebecca kwetara na ya na-atụbu egwu izute onye ya maara n’ọrụ nkwusa. Ma o kwuru na ya chọpụtara na “ọ bụrụ na ị gwa ha na ị bụ Onye Kraịst nakwa na ị na-aga site n’ọnụ ụzọ ruo n’ọnụ ụzọ, mgbe ụfọdụ ha ga-ajụ, sị: ‘Ị̀ ga-erutekwa n’ọnụ ụzọ m?’”
Ma n’ihi gịnị ka ị ga-eji chere ruo mgbe unu zutere na mberede? Chọọ ohere ndị ị ga-eji gwa ndị ọzọ n’ụlọ akwụkwọ banyere ihe i kweere na ya. Cheta ajụjụ ndị Pọl onyeozi jụrụ, sị: “Olee otú ha ga-esi tinye okwukwe n’onye ha na-anụbeghị banyere ya? N’aka nke ọzọ, olee otú ha ga-esi anụ ma ọ́ dịghị onye ga-eme nkwusa?” (Ndị Rom 10:14) Ị nọ nnọọ n’ọnọdụ kasị mma inyere ụmụ klas gị aka ịnụ banyere ya. Otu onye ntorobịa aha ya bụ Iraida kwuru, sị: “Ụlọ akwụkwọ bụ ókèala a na-eme nkwusa bụ́ ebe nanị anyị pụrụ iru.” N’ihi ya, ọtụtụ ndị ntorobịa na-eji ọnọdụ ha eme ihe bara uru site n’ime nkwusa mberede.
Otú ọ dị, mgbe ụfọdụ, a na-enwe ihe omume klas ndị ga-enye gị ohere ịgwa ndị ọzọ eziokwu Bible. Otu nwata nwanyị bụ́ onye Britain nke aha ya bụ Jaimie na-akọ, sị: “Anyị nọ na-atụle evolushọn mgbe anyị na-amụ sayensị, ekwupụtakwara m nkwenkwe m. Otu n’ime ụmụ okoro nọ na klas m kwara m emo ma kwuo na Ndịàmà Jehova amaghị akwụkwọ nakwa na ha ekwesịghị ịnọ n’ụlọ akwụkwọ. Otú ọ dị, ozugbo ahụ ụmụaka ndị ọzọ nọ na klas malitere ịgbachitere m.” O doro anya na aha ọma ya dị ka Onye Kraịst na-esetịpụ ezi ihe nlereanya rụpụtara ezi ihe. Jaimie kwukwara, sị: “N’ihi ya, enwere m ohere inyefe otu nwa klas m otu mkpụrụ nke akwụkwọ bụ́ Is There a Creator Who Cares About You?” *
Otu nwata nwanyị dị afọ 14 nọ na Romania nke aha ya bụ Roxana kọrọ ahụmahụ yiri ya, sị: “Onye nkụzi anyị mara ọkwa na a ga-enwe nkwurịta okwu na klas banyere mmanya na-aba n’anya, ụtaba, na ọgwụ ọjọọ. N’ihi ya, ewetara m mbipụta Teta! (Bekee) nke March 22, 2000, nke na-ekwu banyere ‘Otú Ị Pụrụ Isi Kwụsị Ise Siga.’ Otu nwa klas m hụrụ magazin ahụ, were ya, ma jụ inyeghachi m ya. Mgbe ọ gụsịrị ya, o kwuru na ya ekpebisiwo ike ịkwụsị ise siga.”
O nwere ike ị gaghị adị na-enweta mmeghachi omume dị mma otú ahụ mgbe nile. Ma Eklisiastis 11:6 na-agba anyị ume, sị: “Ghaa mkpụrụ gị n’ụtụtụ, ewepụkwala aka gị n’anyasị: n’ihi na ị dịghị ama nke ga-agazi agazi.” Ma ọ dịghị ihe ọzọ, ịgwa ndị ọzọ banyere nkwenkwe gị n’ụlọ akwụkwọ ga-aghọ ihe ndabere maka nkwurịta okwu dị mma karị ma i zute nwa akwụkwọ ibe gị n’ozi ụlọ n’ụlọ. Otu onye ntorobịa bụ́ onye Britain nke aha ya bụ Jessica na-ekwu, sị: “Ịgbara ndị ị maara n’ụlọ akwụkwọ àmà ka mfe n’ezie n’ihi na ị mataworị ndị ha bụ.” Ị pụrụ inwe ihe ijuanya otú ụfọdụ n’ime ụmụ akwụkwọ ibe gị si enwe ọchịchọ ịmata banyere nkwenkwe gị.
N’eziokwu, ọ bụghị mmadụ nile ga-eji obi ọma nabata gị. Ma Jizọs nyere ndụmọdụ a dị irè, sị: “N’ebe ọ bụla ọ na-adịghị onye nabatara unu ma ọ bụ gee ntị n’okwu unu, mgbe unu na-apụ n’ụlọ ahụ . . . , tichapụnụ uzuzu n’ụkwụ unu.” (Matiu 10:14) N’ikwu ya n’ụzọ ọzọ, i kwesịghị ile enweghị mmasị ahụ anya dị ka mkparị. Pụọ nnọọ n’udo ma chọọ onye ọzọ dị njikere karị ige ntị. Ị ga-emesị chọta ndị nwere obi eziokwu bụ́ ndị agụụ eziokwu ahụ na-agụ, ndị dịkwa njikere ige ntị. Ọ́ gaghị abụ ihe obi ụtọ ma ọ bụrụ na otu n’ime ha bụ nwa akwụkwọ ibe gị? Ọ bụrụ otú ahụ, ị ga-enwe obi ụtọ na ị kwụsịrị ịtụ egwu ịgwa ụmụ klas gị ihe ndị i kweere.
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
^ par. 6 Lee isiokwu bụ́ “Ndị Na-eto Eto Na-ajụ Sị . . . Gịnịkwanụ Ma M Zute Onye M Maara n’Ụlọ Akwụkwọ?,” nke pụtara ná mbipụta anyị nke March 8, 2002.
^ par. 18 Nke Ndịàmà Jehova bipụtara.
[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 30]
“Mgbe ị malitere inwe ọmụmụ Bible onwe onye nke gị, ị ga-amalite ime eziokwu ahụ nke gị.”—Sean.
[Foto dị na peeji nke 28]
Atụla egwu ime ka a mata gị dị ka Onye Kraịst
[Foto dị na peeji nke 28]
Ọtụtụ mgbe ihe omume klas na-enye ohere ịgwa ndị ọzọ eziokwu Bible