Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

A Kwụghachiri Obubu O Bu Ụzọ Mee Ihe Ụgwọ

A Kwụghachiri Obubu O Bu Ụzọ Mee Ihe Ụgwọ

A Kwụghachiri Obubu O Bu Ụzọ Mee Ihe Ụgwọ

ỌTỤTỤ NDỊ NA-ETO ETO BỤ́ NDIÀMÀ JEHOVA na-esetịpụ ezi ihe nlereanya n’iji obi ike ekwupụta ihe ndị ha kwere. Tụlee ihe banyere Stella, bụ́ onye nọ n’afọ iri na ụma ya, onye si Salonika, Gris. “N’otu n’ime nzukọ Ndị Kraịst anyị,” ka ọ na-ekwu, “a tụlere ụzọ ndị a pụrụ isi jiri vidio anyị dị iche iche nyere ndị ọzọ aka ịmata Jehova. Echere m echiche ụzọ m pụrụ isi jiri vidio bụ́ Jehovah’s Witnesses—The Organization Behind the Name mee ihe. N’echi ya, esoro m onyeisi ụlọ akwụkwọ anyị nwee nkwurịta okwu, atụkwara m aro ka e gosi vidio ahụ n’ụlọ akwụkwọ. N’ụzọ m na-atụghị anya ya, o kwenyere—ma ọ bụrụhaala na ndị nkụzi ekwere.

“Mgbe e mesịrị n’otu ụbọchị ahụ, onyeisi ụlọ akwụkwọ anyị gwara m na a pụrụ igosi vidio ahụ n’izu na-esonụ—ma ọ bụ nanị mgbe a gbasasịrị akwụkwọ. Enwere m nkụda mmụọ n’ihi na m chere na ụmụ klas anyị agaghị ewere oge ha ga-eji zuru ike bịa kirie vidio ahụ. Ka o sina dị, n’ụbọchị na-esonụ m kpọrọ mmadụ nile òkù ịbịa. Ọ bụghị nanị na ha kwetara ịbịa kama ha kpọkwara ụmụ akwụkwọ si na klas ndị ọzọ. Ndị nkụzi isii—tinyere otu onye ọkà mmụta okpukpe—bịakwara ikiri vidio ahụ.

“Onye ọ bụla ṅara ntị nke ọma. Mgbe e mesịrị, onyeisi ụlọ akwụkwọ anyị gwara m ka m duzie mkparịta ụka ajụjụ na azịza. Ọtụtụ ụmụ akwụkwọ nwere mmasị n’ọrụ afọ ofufo nke a na-arụ n’isi ụlọ ọrụ Ndịàmà Jehova, bụ́ nke e gosiri na vidio ahụ. ‘N’agbanyeghị na a dịghị akwụ ha ụgwọ, ha ji ọṅụ na-arụ ọrụ ha!’ ka otu nwa akwụkwọ tipụrụ.

“Agwara m ndị nile bịaranụ banyere mbipụta anyị ndị dabeere na Bible. Ọzọ, ekesara m Akụkọ Alaeze nke 36, ‘Narị Afọ Iri Ọhụrụ—Gịnị Na-echere Gị n’Ọdịnihu?’ Onyeisi ụlọ akwụkwọ anyị rịọrọ ka e nyekwuo ya ka o wee nwee ike inye ya ndị nkụzi na-abịaghị.

“Mgbe e mesịrị, ọtụtụ ụmụ akwụkwọ kọọrọ ndị enyi ha banyere vidio ahụ. Enwere m obi ụtọ na m jiri ohere a gbaa àmà. Ụmụ klas m na-akwanyere m ùgwù karị; ma nke kasịnụ, ha na-akwanyere Chineke m na-efe ofufe ùgwù!”