Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Mkpa Anyị Nile Nwere

Mkpa Anyị Nile Nwere

Mkpa Anyị Nile Nwere

NRI DỊ GỊ MKPA. Mmiri dị gị mkpa. Ikuku dị gị mkpa. Ebe obibi na nchebe ụfọdụ pụọ n’ihu igwe dị njọ, dị gị mkpa. Ihe ndị a dị ọ bụghị nanị mmadụ nile mkpa kamakwa ijeri kwuru ijeri ihe ndị ọzọ dị ndụ e kere eke nọ na mbara ala a. Otú ọ dị, e nwere otu mkpa ọ bụ nanị ụmụ mmadụ nwere. Gịnị ka ọ bụ?

Onye Canada bụ́ ọkà mmụta mmekọrịta ọha na eze bụ́ Reginald W. Bibby dere, sị: “Ndị mmadụ nwere mkpa ndị nanị okpukpe ga-egbo.” Ná mbipụta ya nke February 2000, akwụkwọ bụ́ American Sociological Review bipụtara otu isiokwu nke kwuru, sị: “O yiri ka inwe mmasị n’ihe ime mmụọ ọ̀ ga-anọgide na-abụ akụkụ nke echiche ụmụ mmadụ.”

Ee, n’akụkọ ihe mere eme nile, ụmụ mmadụ enwewo mkpa ife ofufe. Eri ọtụtụ narị afọ, ihe ka n’ọnụ ọgụgụ echigharịkwuruwo njikọ okpukpe iji gboo mkpa ahụ. Ma ihe na-agbanwe. N’ọtụtụ mba ndị mepere emepe—dị ka Ebe Ugwu America na Ebe Ugwu Europe—ọnụ ọgụgụ ka ukwuu nke ndị mmadụ na-agbahapụ chọọchị ha. Ihe ahụ na-emenụ ọ̀ pụtara njedebe nke okpukpe? Ọ dịghị ma ọlị.

“A na-etinye nnọọ nnu na ose n’akụkọ banyere njedebe nke okpukpe,” ka akwụkwọ akụkọ Sweden bụ́ Svenska Dagbladet na-ekwu. Gịnị na-anọchi anya chọọchị ndị mbụ? Akwụkwọ akụkọ ahụ gara n’ihu ikwu, sị: “Ihe na-ewuzi bụ na anyị anọghị na chọọchị ọ bụla. Kama nke ahụ, anyị pụrụ isi n’ọtụtụ okpukpe dị iche iche dị n’ụwa taa họrọ ihe anyị chọrọ ịnakwere ma chepụta usoro nkwenkwe nke anyị. . . . Ọ pụrụ ịgụnye ihe ọ bụla site na crystal ndị e ji agwọ ọrịa ruo n’uwe elu nke ndị mọnk Buddha. Mgbe ihe ị họọrọ na-amasịghịzi gị, ị pụrụ nnọọ ime mgbanwe otú ọ masịrị gị.”

Ndị nnyocha nke nkà mmụta okpukpe ụmụ mmadụ na-ezo aka n’omume a dị ka “okpukpe onwe onye” ma ọ bụ “okpukpe a na-adịghị ahụ anya.” Ọkà mmụta mmekọrịta ọha na eze bụ́ Bibby, bụ́ onye e hotara ihe o kwuru na mbụ, chepụtara nkebi ahịrịokwu bụ́ “religion à la carte” (Ịhọrọ Nkwenkwe Okpukpe Masịrị Onye). Ndị ọzọ na-ezo aka n’okpukpe ndị dị otú ahụ dị ka “nke e mere ka o kwekọọ ná nzube onwe onye” ma ọ bụ “nke e mere dị ka o si masị onye.” Ná mba ụfọdụ a maara dị ka nke Ndị Kraịst, òtù okpukpe kasị ukwuu, dị ka a pụrụ isi kwuo ya, bụ nke mmadụ ndị nwere okpukpe nke onwe ha mejupụtara.

Tụlee ihe si n’otu nnyocha e mere na Sweden, bụ́ otu n’ime mba kasị bụrụ nke na-enweghị mmasị n’okpukpe, pụta. Nnyocha ahụ gosiri na mmadụ 2 n’ime mmadụ 3 na-ele onwe ha anya dị ka Ndị Kraịst “n’ụzọ nke onwe ha.” Ụfọdụ ndị kwuru, sị: “Enwere m echiche nke m banyere Iso Ụzọ Kraịst,” “Ahụ́ adịghị eru m ala n’ime ụlọ chọọchị,” “Ọ dịghị amasị m ịga chọọchị na-ege ndị ụkọchukwu ntị,” ma ọ bụ “Apụrụ m ịbanye n’ime ụlọ m ma kpee ekpere n’onwe m.” Ọtụtụ ndị bịara kwere n’ịlọ ụwa ma ọ bụ n’akara aka. Ọnụ ọgụgụ ka ukwuu kweere na ụdị ụfọdụ nke ikike yiri chi pụrụ ịdị kama na ha apụghị ịkọwa ya.

Nnyocha ọzọ gosiri na ọtụtụ ndị ọzọ na-etinye uche ná mmetụta ha banyere okpukpe nanị mgbe ha pụtara èzí, na-anụrụ ụtọ ihe ndị e kere eke gbara ha gburugburu. Otu nwa agbọghọ na-arụ ọrụ ugbo kwuru, sị: “Mgbe ị bara n’ime ọhịa ma ọ bụ n’ime ime obodo, ọ bụ mgbe ahụ ka ị na-akasị anọ Chineke nso, otú ahụ ka m chere.” Onye ọzọ a gbara ajụjụ ọnụ, bụ́ onye na-adịghị ele onwe ya anya dị ka onye ji okpukpe kpọrọ ihe, kọwara, sị: “Ọ bụrụ na m baa n’ime ọhịa, ọ na-adị m ka ọ bụ akatamkpo ụlọ nsọ. . . . Amaghịkwa m onye na-achịkwa ya, ma ọ bụ otú ahụ ka ọ na-adị m.” Ụfọdụ ndị kọwara ime ọhịa dị ka ebe dị nsọ, nke sitere n’aka Chineke, na nke dị egwu ma kwuo na ịnọ na ya na-enye ha ume ọhụrụ, udo, na ahụ́ iru ala. Ná nchịkọta, otu onye na-agba ajụjụ ọnụ mechiri akụkọ ya site n’ikwu, sị: “A pụrụ ịhụ Chineke n’ime ọhịa.”

A pụrụ ịhụ ihe a na-emenụ n’ọtụtụ akụkụ nke ụwa taa. Thomas Luckmann, onye America bụ́ ọkachamara na nkà mmụta okpukpe ụmụ mmadụ, kwuru banyere okpukpe hiwere isi na chọọchị dị ka nke a na-ewezụga n’akụkụ ná mba ndị mepere emepe ma bụrụ nke e ji “ụdị okpukpe ọha mmadụ na-anakwere” edochi. Onye ahụ, dị ka a pụrụ isi kwuo ya, na-echepụta nkà ihe ọmụma banyere ndụ site n’ịhọtagasị echiche dị iche iche banyere ihe ime mmụọ ma gwakọtazie echiche ndị a ịghọ okpukpe nke ya.

Ị pụrụ iche, sị, ‘Okpukpe na chọọchị ndị bụ́ isi hà bụ́ n’ezie ndị ọha na eze na-ewega n’ọnọdụ na-adịchaghị mkpa? Ya bụrụ otú ahụ, ọ̀ bụ n’ihi gịnị?’ A tụlere ajụjụ ndị a n’isiokwu na-esonụ.

[Foto dị na peeji nke 13]

N’ikwu okwu n’ihe malitere ime na nso nso a banyere ịchọ ọnọdụ ime mmụọ n’ihe ndị e kere eke, otu onye nnyocha kwubiri, sị: “A pụrụ ịhụ Chineke n’ime ọhịa”