Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Narị Afọ nke Ime Ihe Ike

Narị Afọ nke Ime Ihe Ike

Narị Afọ nke Ime Ihe Ike

ALFRED NOBEL kwenyere na a pụrụ ịnọgide na-enwe udo ma ọ bụrụ na mba dị iche iche enwee ajọ ngwá agha. E kwuwerị, mba dị iche iche pụrụ ijikọta aka ngwa ngwa wee sụọ onye mwakpo ọ bụla akwụ. “Nke a bụ ihe ga-eme ka agha bụrụ ihe na-agaghị ekwe ọlụlụ,” ka o dere. Dị ka echiche Nobel si dị, ọ dịghị mba ọ bụla isi zuru okè ga-akpalite agha ma ọ bụrụ na ọ ga-akpatara ya oké mbibi. Ma gịnị ka narị afọ gara aga kpughere?

Ihe na-erughị afọ 20 mgbe Nobel nwụsịrị, Agha Ụwa Mbụ dara. N’agha a, e jiri ajọ ngwá agha ndị ọhụrụ, gụnyere égbè ndị na-awụpụ mgbọ, ikuku gas na-egbu egbu, ngwá agha ndị na-awụpụ ọkụ, ụgbọ agha, ụgbọelu, na ụgbọ agha okpuru mmiri mee ihe. E gburu ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ nde ndị soja iri, e merụkwara ọnụ ọgụgụ ndị soja ji okpukpu abụọ karịa nke ahụ ahụ́. Arụrụala a rụrụ n’Agha Ụwa Mbụ mere ka e nweghachi mmasị n’udo. Nke a kpatara nguzobe nke Njikọ Mba Nile. President Woodrow Wilson nke United States, bụ́ onye kwadoro nguzobe nke njikọ a n’ụzọ pụtara ìhè, nwetara Ihe Nrite Nobel Maka Udo na 1919.

Ma, olileanya ọ bụla e nwere na agha ga-akwụsị kpam kpam dakpọrọ mgbe Agha Ụwa nke Abụọ tiwapụrụ na 1939. N’ọtụtụ akụkụ, ọ dị egwu karịa Agha Ụwa Mbụ. Mgbe a na-alụ agha a, Adolf Hitler wusawanyere ụlọ mmepụta ihe nke Nobel dị na Krümmel ịghọ otu n’ime ebe ndị kasị ibu a na-emepụta ngwá agha na Germany, na-enwe ihe karịrị ndị ọrụ 9,000. Ma, mgbe agha ahụ biri, ụgbọelu nke Ndị Agha Njikọ Aka, bụ́ ndị tụrụ ihe karịrị otu puku bọmbụ, bibiri ụlọ mmepụta ihe nke Nobel kpam kpam. N’ụzọ na-emegide onwe ya, e mepụtara bọmbụ ndị ahụ site n’enyemaka nke ihe ndị Nobel n’onwe ya chepụtara.

N’otu narị afọ gafeworonụ eri Nobel nwụsịrị, e nwewo ọ bụghị nanị agha ụwa abụọ kamakwa ụmụ obere agha a na-apụghị ịgụta ọnụ. Ngwá agha mụbakwara n’oge ahụ, ụfọdụ n’ime ha bịakwara dị egwu karị. Tụlee ngwá agha ole na ole wuworo ewu n’ọtụtụ iri afọ sochirinụ kemgbe Nobel nwụsịrị.

Ngwá agha ndị dị obere na ndị nke na-agbapụ obere mgbọ. Ha na-agụnye égbè mkpụmkpụ, égbè ogologo, bọmbụ grenade, égbè ndị na-awụpụ mgbọ, ogbunigwe, na obere ngwá agha ndị ọzọ. Ngwá agha ndị dị obere na ndị nke na-agbapụ obere mgbọ adịghị oké ọnụ, ha na-adị mfe ilekọta, ọbụnakwa na-adị mfe iji mee ihe.

Mmepụta e mepụtara ngwá agha ndị a—na ihe ize ndụ ha bụụrụ ndị nkịtị—hà egbochiwo agha? Ọ dịghị ma ọlị! Na magazin bụ́ Bulletin of the Atomic Scientists, Michael Klare dere na ngwá agha ndị na-agbapụ obere mgbọ ghọrọ “ihe bụ́ isi e ji lụọ agha n’ihe ka nnọọ ọtụtụ n’agha ndị a lụrụ mgbe Agha Nzuzo ahụ gasịrị.” N’eziokwu, ihe ruru pasent 90 nke ndị nwụrụ n’agha ndị a lụrụ n’oge na-adịbeghị anya bụ n’ihi ojiji e ji ngwá agha ndị dị obere na ndị nke na-agbapụ obere mgbọ mee ihe. E jiri ngwá agha ndị a gbuo ihe karịrị nde mmadụ anọ n’afọ ndị 1990 nanị. N’ọtụtụ ọnọdụ, ọ bụ ndị ntorobịa na-anataghị ọzụzụ agha nakwa ndị na-ahụghị ihe ọjọọ dị n’imebi ụkpụrụ ndị mbụ na-achịkwa agha, na-eji ngwá agha ndị na-agbapụ obere mgbọ eme ihe.

Ogbunigwe. Ka ọ na-erule ná ngwụsị narị afọ nke 20, ogbunigwe nọ na-akwarụ ma ọ bụ na-egbu ihe dị ka nkezi nke mmadụ 70 kwa ụbọchị! Ihe ka ọtụtụ n’ime ha bụ ndị nkịtị, ọ bụghị ndị soja. Ọtụtụ mgbe, a na-eji ogbunigwe eme ihe, ọ bụghị iji gbuo ndị mmadụ, kama iji kwarụọ ndị mmadụ ma gbasaa egwu na oké ụjọ n’etiti ndị ọ na-akpa aka ọjọọ.

N’eziokwu, e mewo mgbalị dị ukwuu n’afọ ndị na-adịbeghị anya iji wepụtasịa ogbunigwe n’ala. Ma ụfọdụ ndị na-ekwu na mgbe ọ bụla e wepụtara otu ogbunigwe n’ala, a na-eli ogbunigwe 20 ọzọ nakwa na a pụrụ inwe nde ogbunigwe 60 e liri n’ala n’ụwa nile. Eziokwu ahụ bụ́ na ogbunigwe apụghị ịmata ihe dị iche n’etiti nzọụkwụ onye soja na nke nwatakịrị na-egwurị egwu n’ime ọhịa egbochibeghị mmepụta na ojiji a na-eji ngwá agha ndị a dị egwu eme ihe.

Ngwá agha nuklia. N’ihi mmepụta nke ngwá agha nuklia, na nke mbụ ya, a pụrụ ikpochapụ obodo ukwu dum na sekọnd ole na ole, n’adịtụghị agha ọ bụla ndị soja ga-alụ. Dị ka ihe atụ, tụlee mbibi dị egwu weere ọnọdụ mgbe a tụrụ bọmbụ atọm na Hiroshima na Nagasaki na 1945. Ìhè nke chasiri nnọọ ike mere ka ụfọdụ ndị kpuo ìsì. Ụzarị ọkụ mere ndị ọzọ nsí. Ọkụ na okpomọkụ gburu ọtụtụ ndị mmadụ. E mere atụmatụ na ngụkọta ọnụ ọgụgụ ndị nwụrụ n’obodo ukwu abụọ a fọrọ nke nta ka o ruo 300,000!

N’ezie, ụfọdụ ndị ga-ekwu na bọmbụ a tụrụ obodo ukwu ndị ahụ gbochiri ọnwụ nke ọtụtụ ndị gaara anwụnụ ma ọ bụrụ na e jiri ngwá agha ndị na-abụghị nke nuklia gaa n’ihu n’agha ahụ. Otú ọ dị, n’ịbụ ndị ogbugbu e gburu ọtụtụ ndị mmadụ wụrụ akpata oyi n’ahụ́, ụfọdụ ndị malitere ịgbalị inweta obi ndị nwere ikike gaa n’ịkwado ka e nwee nchịkwa nke ajọ ngwá agha a n’ụwa nile. N’ezie, ọtụtụ ndị malitere ịtụ egwu na ụmụ mmadụ emepụtawo ihe ha ga-eji bibie onwe ha.

Mmepụta nke ngwá agha nuklia ò mewo ka udo yie ihe ga-ekwe nnweta karị? Ụfọdụ na-asị na o mewo. Ha na-arụtụ aka n’eziokwu ahụ bụ́ na e jibeghị ngwá agha ndị a na-akpa ike lụọ agha n’ihe karịrị afọ 50. Otú o sina dị, nkwenye Nobel kwenyere na ngwá agha na-egbu ndị mmadụ n’ìgwè ga-eme ka agha nyụọ ka ọkụ abụbeghị eziokwu, n’ihi na agha ndị e ji ngwá agha ndị na-abụghị nke nuklia na-alụ ka na-aga n’ihu. E wezụga nke ahụ, e nwere ọtụtụ puku ngwá nuklia a pụrụ ịgbapụ n’oge ọ bụla, ka Kọmitii Na-ahụ Maka Iwu Metụtara Ngwá Agha Nuklia kwuru. N’oge a kwa bụ́ mgbe iyi ọha egwu na-akpata oké nchegbu, ọtụtụ ndị na-atụ egwu ihe ga-emenụ ma ọ burụ na ihe ndị e ji emepụta bọmbụ nuklia abanye n’aka “ndị ọjọọ.” Ọbụna ‘n’aka ndị ezigbo mmadụ,’ a na-enwe nchegbu na otu ihe mberede pụrụ ịkpatara ụwa ọdachi ngwá agha nuklia. N’ụzọ doro anya, a bịa n’ihe banyere ngwá agha ndị na-ebibi ihe, nke a abụghị udo nke Nobel chere n’echiche.

Ngwá agha ndị nwere nje ndị na-akpata ọrịa na ndị e ji mmiri ọgwụ mee. Iji nje alụ agha na-agụnye ojiji a na-eji nje bacteria na-egbu egbu, dị ka anthrax, ma ọ bụ nje virus, dị ka kịtịkpa eme ihe. Kịtịkpa dị nnọọ ize ndụ n’ihi na ọ na-efe nnọọ efe. E nwekwara ihe ize ndụ nke ngwá agha ndị e ji mmiri ọgwụ mee, dị ka ikuku gas na-egbu egbu. Mmiri ọgwụ ndị a na-adị n’ụdị dị iche iche, n’agbanyeghịkwa na a machibidowo ha iwu eri ọtụtụ iri afọ, nke a emebeghị ka a kwụsị iji ha na-eme ihe.

Ajọ ngwá agha ndị a na ihe ize ndụ ha na-eweta hà emewo ka ndị mmadụ meghachi omume dị ka Nobel kwuru na ha ga-eme—‘ịkwụsị n’ihi oké egwu ma kposaa ndị agha ha’? N’ụzọ megidere nke ahụ, nanị ihe ha meworo bụ ime ka a tụkwuo egwu na otu ụbọchi ndị mmadụ—ọbụna ndị na-enwechaghị ahụmahụ—pụrụ iji ngwá agha ndị a mee ihe. Ihe karịrị iri afọ gara aga, onye ntụzi ọrụ nke Ụlọ Ọrụ Na-ahụ Maka Nchịkwa na Nchịsa Ngwá Agha na United States kwuru, sị: “A pụrụ iji mmiri ọgwụ mepụta ngwá agha n’ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ n’ebe ndọba ụgbọala onye ọ bụla, ọ bụrụhaala na onye ahụ mụtụrụ nanị ihe mmụta ọdịdị na mgbanwe ọnọdụ ihe n’ụlọ akwụkwọ sekọndrị.”

Obi abụọ adịghị ya na e nwere agha ndị bibiri ihe na narị afọ nke 20 karịa agha ndị e nwere n’oge ọ bụla ọzọ. Ugbu a ná mmalite nke narị afọ nke 21, atụmanya nke inweta udo yiri ihe na-eduhie eduhie karị—karịsịa mgbe ndị na-eyi ọha egwu wakposịrị New York City na Washington, D.C., na September 11, 2001. “Ọ fọrọ nke nta ka ọ bụrụ na ọ dịghị onye ga-ajụwa ma à pụrụ iji nkà na ụzụ mezuo nzube ọjọọ kama iji ya mee ihe ndị bara uru,” ka Steven Levy dere na magazin bụ́ Newsweek. Ọ gbakwụnyere, sị: “Ònye maara ihe a ga-eme banyere ọnọdụ ahụ? A ma ndị mmadụ ama dị ka ndị na-achụso ihe ha chere na ọ bụ mmepeanya ma jụwazie ajụjụ mgbe e mesịrị. Ka anyị na-ajụ iche na [ọdachi a na-apụghị ichetụ n’echiche pụrụ iwere ọnọdụ n’ezie], anyị na-eme ka e nwee ọnọdụ ndị ga-eme ka o mee.”

Ka ọ dị ugbu a, akụkọ ihe mere eme akụziworo anyị na mmepụta e mepụtara bọmbụ na ajọ ngwá agha dị iche iche emetụbeghị ka udo dị n’ụwa a. Mgbe ahụ, udo ụwa ọ̀ bụ nrọ nkịtị?

[Igbe/Foto ndị dị na peeji nke 8]

Ịchịkwa Ikike Nitroglycerin

Na 1846, onye Ịtali na-emepụta mmiri ọgwụ, bụ́ Ascanio Sobrero chọpụtara nitroglycerin, bụ́ ihe dị mmanụ mmanụ nke rọrọ arọ, bụ́ nke na-agbawa agbawa. Ihe ahụ bịara dị ize ndụ. Ibé enyo gbuwara Sobrero ihu nke ukwuu mgbe ihe gbawara, n’ikpeazụkwa ọ kwụsịrị iji ihe ahụ na-arụ ọrụ. Ọzọkwa, ọ dị nsogbu mmanụ ahụ nwere bụ́ nke Sobrero na-apụghị idozi: Ọ bụrụ na a wụsa ya n’ala ma jiri hama kụọ ya, ọ bụ nanị akụkụ mmanụ ahụ hama kụtara na-agbawa, n’emetụtaghị akụkụ ndị ọzọ nke mmanụ ahụ.

Nobel doziri nsogbu ahụ mgbe o mepụtara ihe na-agbawa ihe, na-eji obere ihe na-agbawa agbawa pụrụ ịkpake nnukwu ihe ọzọ na-agbawa agbawa. Na 1865, Nobel mepụtaziri obere mkpọ nwere ọgwụ na-eme ka ihe gbawaa nke e ji mercury mee bụ́ nke e tinyere n’ime arịa a gbanyere nitroglycerin ma kpakezie ya.

Otú ọ dị, iji nitroglycerin na-arụ ọrụ ka dị ize ndụ. Dị ka ihe atụ, na 1864, otu ihe gbawara n’ụlọ ọrụ Nobel dị ná mpụga Stockholm gburu mmadụ ise—gụnyere nwanne nwoke Nobel nke kasị nta, bụ́ Emil. A gbariri ụlọ ọrụ Nobel dị na Krümmel, Germany, ugboro abụọ. N’oge ahụkwa, ụfọdụ ndị na-eji mmanụ ahụ emere mmanụ ọkụ oriọna, ihe a na-ete n’akpụkpọ ụkwụ, ma ọ bụ ihe a na-atụ n’ụkwụ ụgbọ ịnyịnya—ọ kpatakwara mmerụ ahụ ndị siri ike. Ọbụna mgbe a na-agbawa ugwu, mmanụ pụrụ iruba n’ebe ala gbawara agbawa ma mesịa kpata ihe ọghọm.

Na 1867, Nobel mere ka mmanụ ahụ kpụkọọ akpụkọọ site n’iji kieselguhr, bụ́ ihe na-adịghị eme ka ihe gbawaa nke na-amịrị ihe ọzọ, gwakọta na nitroglycerin. Nobel si n’okwu Grik bụ́ dynamis, nke pụtara “ike,” chepụta aha ahụ bụ́ dynamite. Ọ bụ ezie na Nobel mesịrị mepụta ihe na-agbawa agbawa ndị ka bụrụ ọkpọka, a na-ele dynamite anya dị ka otu n’ime ihe ndị kasị mkpa o mepụtara.

N’ezie, e jiwo ihe ndị na-agbawa agbawa ndị Nobel mepụtara mee ihe ndị na-emetụtaghị agha. Dị ka ihe atụ, e ji ha mee ihe n’ụzọ dị ịrịba ama n’owuwu nke ọwara St. Gotthard (1872-1882), n’ịgbawa mkputamkpu ala dị n’ime Osimiri Ọwụwa Anyanwụ nke New York (1876, 1885), na n’ogwugwu nke Ọwara Kọrint dị na Gris (1881-1893). Ka o sina dị, site n’oge e mepụtara ya, a matara ihe na-agbawa agbawa bụ́ dynamite ngwa ngwa dị ka ngwá ọrụ mbibi na ọnwụ.

[Foto]

Ụlọ ọrụ ndị uwe ojii Colombia nke ihe na-agbawa agbawa bụ́ “dynamite” bibiri

[Ebe E Si Nweta Foto]

© Reuters NewMedia Inc./CORBIS

[Foto dị na peeji nke 4]

N’ihe na-erughị afọ 20 Nobel nwụsịrị, e jiri ajọ ngwá agha ndị ọhụrụ mee ihe n’Agha Ụwa Mbụ

[Ebe E Si Nweta Foto]

Foto U.S. National Archives

[Foto ndị dị na peeji nke 6]

Ndị ogbunigwe merụrụ ahụ́ na Cambodia, Iraq, na Azerbaijan

[Ebe E Sigasị Nweta Foto]

Foto UN/DPI 186410C nke P.S. Sudhakaran sere

Foto UN/DPI 158314C nke J. Isaac sere

Foto UN/DPI nke Armineh Johannes sere

[Foto dị na peeji nke 6]

N’oge ọ bụla, dị ka Kọmitii Na-ahụ Maka Iwu Metụtara Ngwá Agha Nuklia si kwuo, e nwere ọtụtụ puku ngwá nuklia a pụrụ ịgbapụ ma a chọọ

[Ebe E Si Nweta Foto]

MBA NDỊ DỊ N’OTU/FOTO NKE SYGMA SERE

[Foto ndị dị na peeji nke 7]

A matara otú ngwá agha ndị e ji mmiri ọgwụ mee na-akparu ike mgbe e jiri gas bụ́ “sarin” mee ihe n’ụzọ ụgbọ okporo ígwè okpuru ala nke Tokyo na 1995

[Ebe E Si Nweta Foto]

Asahi Shimbun/Sipa Press

[Ebe E Si Nweta Foto Dị na peeji 5]

Foto UN/DPI 158198C nke J. Isaac sere