Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Nkasi Obi Maka Ndị Na-eru Újú

Nkasi Obi Maka Ndị Na-eru Újú

Nkasi Obi Maka Ndị Na-eru Újú

MWAKPO ahụ ndị na-eyi ọha egwu wakporo New York City nakwa Washington, D.C., na September 11, 2001 menyere ndị mmadụ egwu n’ụwa nile. N’ime otu ụbọchị, ọtụtụ puku mmadụ nwụrụ, gụnyere ọtụtụ narị ndị ọrụ mmenyụ ọkụ, ndị uwe ojii, na ndị enyemaka n’ọrụ ahụ́ ike.

Kemgbe ihe ahụ mere, Ndịàmà Jehova ejikọwo aka mee mgbalị iji nyere ndị ndị ha hụrụ n’anya nwụnahụrụ n’ọdachi ahụ aka. Ha emewo nke a iji ‘kechie ọnyá ndị obi ha tiwara etiwa,’ nakwa iji ‘kasie ndị nile na-eru újú obi.’—Aịsaịa 61:1, 2.

Eri ọtụtụ afọ, Ndịàmà Jehova achọpụtawo na ndị ndị ha hụrụ n’anya nwụnahụrụ na-atụgharịkarị uche n’ajụjụ ndị dị n’okpuru. Bible nwere azịza ha. Gịnị ma i jiri Bible nke gị nyochaa akụkụ Akwụkwọ Nsọ ndị e zoro aka na ha n’okpuru?

A na-aka oge ọnwụ mmadụ aka?

N’Eklisiastis 9:11, Bible na-ekwu na “mgbe na ihe ndapụta” na-adakwasị ihe nile a kpọrọ mmadụ. Ọ bụrụ na a na-aka oge ọnwụ aka, gịnị mere Bible ji agba anyị ume ilezi anya maka mmerụ ahụ́?—Dị ka ihe atụ, lee Deuterọnọmi 22:8.

Gịnị mere anyị ji anwụ anwụ?

E debere di na nwunye mbụ, bụ́ Adam na Iv, na paradaịs elu ala. Ọ bụrụ na ha nọgidere na-erube isi, ha agaraghị anwụ. Ụmụ mmadụ gaara anwụ nanị ma ọ bụrụ na ha nupụụrụ Chineke isi. (Jenesis 1:28; 2:15-17) N’ụzọ dị mwute, Adam na Iv nupụụrụ Onye Okike ha isi. N’ihi ya, ha nwetara ntaramahụhụ si na ya pụta—ọnwụ. Ebe ọ bụ na ụmụ mmadụ nile bụ ụmụ Adam na Iv, ha nile ketara mmehie na ọnwụ. Bible na-akọwa, sị: “Mmehie sitere n’otu mmadụ [Adam] bata n’ụwa, ọnwụ esitekwa ná mmehie, ọnwụ ewee si otú ahụ gbasaa ruo mmadụ nile.”—Ndị Rom 5:12.

Gịnị bụ ọnọdụ ndị nwụrụ anwụ?

Mgbe Adam mehiesịrị, Chineke kwuru, sị: “Ị ga-alọta n’ala; n’ihi na e siri na ya wepụta gị; n’ihi na ájá ka ị bụ, ọ bụkwa ájá ka ị ga-alọta.” (Jenesis 3:19) N’ihi ya, ọnwụ bụ ọnọdụ nke amaghị ihe ọ bụla—n’ezie, adịghị adị. Bible na-ekwu, sị: “Ndị dị ndụ maara na ha ga-anwụ: ma ndị nwụrụ anwụ adịghị ama ihe ọ bụla.” (Eklisiastis 9:5, ọ bụ anyị dere okwu ụfọdụ n’aka akwụkwọ dị iche.) Bible na-ekwukwa na mgbe mmadụ nwụrụ, ‘ọ na-alaghachi n’ala o si pụta; n’ụbọchị ahụ echiche ya nile alawo n’iyi.’Abụ Ọma 146:3, 4.

Ọ̀ bụ na anyị enweghị mkpụrụ obi nke na-alanarị ọnwụ?

Bible na-akụzi n’ụzọ doro anya na mkpụrụ obi gị bụ nnọọ gị onwe gị, ọ bụghị ihe a na-amaghị ama nke ga-alanarị mgbe ị nwụrụ. (Jenesis 2:7; Ilu 2:10; Jeremaịa 2:34) Ebe ọ dị otú a, anyị pụrụ ikwu na mgbe mmadụ nwụrụ, mkpụrụ obi anwụwo. Bible na-ekwu n’ụzọ doro anya, sị: “Mkpụrụ obi [ya bụ, mmadụ] ahụ nke na-emehie . . . ga-anwụ.”—Ezikiel 18:4.

Olileanya dị aṅaa dịịrị ndị nwụworonụ?

Bible na-ekpughe na ọ bụ nzube Chineke iweghachi ndị nwụrụ anwụ ná ndụ site ná mbilite n’ọnwụ gaa n’ụwa paradaịs, bụ́ ebe ọrịa na ọnwụ na-agaghịzi adị. Jizọs kwuru, sị: “Oge awa na-abịa mgbe ndị nile nọ n’ili ncheta ga-anụ olu ya wee pụta.”—Jọn 5:28, 29; Mkpughe 21:1-4.

Mgbe Jizọs na-ekwu banyere enyi ya nwụrụ n’oge na-adịghị anya, bụ́ Lazarọs, o ji ụra tụnyere ọnwụ. (Jọn 11:11-13) Ọzọkwa, mgbe Jizọs kpọlitesịrị ya n’ọnwụ, Lazarọs ekwughị ihe ọ bụla banyere ịnọ n’ebe mmekpa ahụ́ ma ọ bụ n’ebe e nwere ọṅụ zuru okè ná mkpirikpi oge nke ọnwụ ya. (Jọn 11:37-44) Nke a kwere nghọta n’ihi na ndị nwụrụ anwụ amaghị ihe na-emenụ. Ha adịghị ahụju anya kama ha na-echere “oge awa” a ga-akpọlite ha n’ọnwụ. Nke kasị mkpa, eziokwu ahụ bụ́ na Jizọs kpọlitere Lazarọs n’ọnwụ na-egosi na ndị nwụrụ anwụ pụrụ ịdị ndụ ọzọ. N’ezie, site n’ọrụ ebube a, Jizọs gosiri n’ụzọ dị nta ihe ga-ewere ọnọdụ n’ụwa n’okpuru ịchịisi Alaeze Chineke. (Ọrụ 24:15) Lee ihe nkasi obi nke ahụ bụ nye ndị ndị ha hụrụ n’anya nwụnahụrụ n’oge nsogbu a!