Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Onye Na-akwado Agha Ka Ọ Bụ Onye Na-akwado Udo?

Onye Na-akwado Agha Ka Ọ Bụ Onye Na-akwado Udo?

Onye Na-akwado Agha Ka Ọ Bụ Onye Na-akwado Udo?

SITE N’AKA ONYE EDEMEDE TETA! NA SWEDEN

Kwa afọ, a na-enye ndị mmadụ ma ọ bụ òtù ndị kerewooro òkè dị ukwuu n’ịkwalite ọdịmma nke ihe a kpọrọ mmadụ n’ọtụtụ ụzọ, Ihe Nrite Nobel. Olee mgbe omenala a malitere, oleekwa otú o si metụta ọchịchọ a na-achọ udo ụwa?

ANA-EJIKỌTA aha ya na ịkwalite ọdịmma nke ihe a kpọrọ mmadụ, ma ọ kpakọbara nnukwu akụ̀ site n’ire ngwá agha. Ònye ka ọ bụ? Ọ bụ Alfred Bernhard Nobel, onye Sweden nwere ụlọ ọrụ mmepụta ihe nke na-emepụta mmiri ọgwụ. E towo Nobel maka mgbalị ndị o mere iji kwalite ọdịmma ndị mmadụ, ma a na-akpọkwa ya “onye ahịa ọnwụ.” N’ihi gịnị? Ọ bụ n’ihi na Nobel mepụtara ihe na-agbawa agbawa bụ́ dynamite, n’oge ndụ ya kwa, ọ bara nnọọ ọgaranya site n’imepụta na ire bọmbụ ndị na-akpa ajọ ike.

Otú ọ dị, mgbe Nobel nwụsịrị na 1896, a chọpụtara ihe dị ịtụnanya. Ékpé o kere kwuru ka e debe nde $9 iche ma jiri ọmụrụ nwa e nwetara na ya na-enye ndị rụzuru ihe ndị dị ịrịba àmà na physics, mmụta ọdịdị na mgbanwe ọnọdụ ihe, nkà mmụta ọgwụ, nkà edemede, na udo.

Na mbụ, o juru ọtụtụ ndị anya. N’ihi gịnị ka onye a ma ama n’ịkpụ bọmbụ ji nwee ọchịchọ siri ike inye ihe nrite maka ihe ọma ndị a rụzuru nakwa ọbụna udo e nwetara? Ụfọdụ ndị chere na akọ na uche Nobel mara ya ikpe n’ihi na ihe ndị na-agbawa agbawa ndị o ji oge ndụ ya nile rụọ kpatara ajọ mbibi. Otú ọ dị, ndị ọzọ bịara na-eche na Nobel anọwo na-arụ ọrụ maka udo eri oge ahụ nile. N’ezie, o yiri ka o kwere na ka ngwá agha na-adịwanye ize ndụ, agha ga-eyiwanye ihe na-agaghị adị. “Ikekwe ụlọ ọrụ mmepụta ihe m ga-akwụsị agha ọbụna ngwa ngwa karịa ndị ome iwu unu,” ka a sịrị na ọ gwara otu onye edemede, na-ekwukwa, sị: “N’ụbọchị ìgwè ndị agha abụọ pụrụ ikpochapụrịta onwe ha n’otu ntabi anya, ma eleghị anya oké egwu ga-ejide mba nile mepere emepe, ha ga-ekposasị ndị agha ha.”

Amụma Nobel buru ò mezuru? Olee ihe ndị a mụtara n’ime narị afọ ahụ gafeworonụ kemgbe Nobel nwụsịrị?

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 3]

“Ọ ga-amasị m imepụta ihe ma ọ bụ ígwè nwere nnọọ ike nke igbu ndị mmadụ n’ìgwè nke na agha agaghịzi ekwe ọlụlụ ruo mgbe ebighị ebi”ALFRED BERNHARD NOBEL

[Ebe E Si Nweta Foto Ndi Dị na peeji 3]

Peeji nke 2: Mgbọ ogbunìgwè: Foto Ndị Agha Ụgbọ Mmiri U.S.; ụlọ dakasịrị adakasị: UN PHOTO 158178/J. Isaac; peeji nke 3: Nobel: © Nobelstiftelsen