Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Udo Ụwa Abụghị Nrọ Nkịtị!

Udo Ụwa Abụghị Nrọ Nkịtị!

Udo Ụwa Abụghị Nrọ Nkịtị!

Ọ BỤRỤ na Alfred Nobel pụrụ ileghachi anya azụ na narị afọ gara aga, ọ̀ ga-enwe nchekwube banyere atụmanya maka udo ụwa? Obi abụọ adịghị ya na ọ ga-enwe obi ụtọ ịmata na ọtụtụ ndị ejiwo obi eziokwu tinye mgbalị iji kwụsị agha. Ka o sina dị, ọ ga-eche eziokwu dị mwute ihu. Prọfesọ Hugh Thomas chịkọtara ya nke ọma, sị: “Narị afọ nke iri abụọ—ọ bụ ezie na ọ bụ nke e nwere ọganihu nke ọha mmadụ nakwa nke gọọmenti nwere nchegbu ka elu na ya banyere ndụ ndị ogbenye—abụrụwo nke jupụtara n’égbè na-awụpụ mgbọ, ụgbọ agha ọwụ mgbọ, ụgbọelu B-52, bọmbụ nuklia na, n’ikpeazụ, mgbọ ogbunìgwè. Ọ bụrụwo nke e ji ọtụtụ agha ndị a wụfuru ọbara na ha na ndị na-ebibi ihe karịa ndị nke ọgbọ ọ bụla ọzọ mara.” Thomas gbakwụnyere na “n’ihi ya, ọ dabeere n’otú mmadụ si lee ya anya bụ́ ikwu ma ọgbọ ahụ ọ̀ bụ nke nwere ọganihu ma ọ bụ na ọ bụghị.”

Atụmanya inweta udo ụwa ò yiri ka o siri ike ugbu a anyị banyeworo na narị afọ nke 21? Ọ dịghị ma ọlị! N’izo aka ná mwakpo ahụ ndị na-eyi ọha egwu wakporo New York City na Washington, D.C., na September 11, 2001, magazin Newsweek na-ekwu, sị: “N’ụwa ebe ụgbọelu ndị njem 767 pụziri ịghọ mgbọ ogbunìgwè na-achịkwa onwe ya, ọ dịghị ihe yiri ihe na-apụghị ime eme na ihe ọhụrụ—ma ọ bụ, nke kasị njọ, ọbụna ihe a pụrụ igbochi egbochi.”

Ụfọdụ ndị na-ekwu na ka e wee nwee udo ụwa, ihe abụọ aghaghị iwere ọnọdụ: Nke mbụ, ọ dị mkpa inwe oké mgbanwe n’otú ụmụ mmadụ si ele ihe anya na n’otú ha si akpa àgwà; nakwa nke abụọ, a ghaghị ime ka mba nile dị n’otu n’okpuru otu ọchịchị. Bible na-ebu amụma banyere mgbe a ga-enwe udo—ma ọ bụghị site ná mgbalị nke ihe a kpọrọ mmadụ. Abụ Ọma 46:9 na-ekwu banyere Onye Okike, bụ́ Jehova Chineke, sị: “[] na-eme ka agha nile kwụsị ruo nsọtụ ụwa.” Olee otú Chineke ga-esi mezuo nke a? Ọ bụ site n’Alaeze ya, bụ́ nke ọtụtụ ndị nwere obi eziokwu kpeworo ekpere ugboro ugboro maka ya. Alaeze ahụ abụghị ọnọdụ obi bụ́ nke siri ike nkọwa, kama ọ bụ ọchịchị dị adị n’ezie nke Chineke ga-eji weta udo site n’otu nsọtụ ụwa ruo nsọtụ ọzọ. Aịzaịa onye amụma bụ́ onye e nyere ike mmụọ nsọ buru amụma na ndị ọchịchị ahụ ga-achị agaghị “amụtakwa agha ọzọ.” (Aịsaịa 2:4) Site n’usoro izi ihe zuru ụwa ọnụ, ụmụ mmadụ ga-amụta ibi n’udo ma si otú a ‘kpụgharịa mma agha ha nile ka ha bụrụ mma ogè, na ube ha nile ka ha bụrụ mma ịkwa osisi.’

Ọbụna ugbu a, Ndịàmà Jehova na-eme nke a. Ha na-ajụ ibuli ngwá ọgụ megide mmadụ ibe ha n’agbanyeghị na ha si n’ọtụtụ agbụrụ dị iche iche ma biri n’ihe karịrị ala 200 dị iche iche. Nnọpụiche ha n’ime ụwa nke agha tisasịworo na-egosi na udo abụghị olileanya na-agaghị emezu emezu kama ọ bụ ihe a pụrụ inweta enweta.

Ọ̀ ga-amasị gị ịmatakwu banyere olileanya a dabeere na Bible maka ezi udo? Biko detara ndị bipụtara magazin a akwụkwọ, na-eji adres e depụtara na peeji nke 5 bụ́ nke kasị dịrị gị nso, ma ọ bụ kpọtụrụ Ndịàmà Jehova nọ n’ógbè gị.