Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

“Ụdị Nlekọta nke Nne Anụ ‘Kangaroo’”—Ọ̀ Bụ Ihe Ngwọta nke Nsogbu Na-eyi Ndụ Egwu?

“Ụdị Nlekọta nke Nne Anụ ‘Kangaroo’”—Ọ̀ Bụ Ihe Ngwọta nke Nsogbu Na-eyi Ndụ Egwu?

“Ụdị Nlekọta nke Nne Anụ ‘Kangaroo’”—Ọ̀ Bụ Ihe Ngwọta nke Nsogbu Na-eyi Ndụ Egwu?

Ọ bụ n’otu ụlọ ọgwụ dị na Bogotá, Colombia, na 1979. Ebe ọ bụ na ọnụ ọgụgụ nke ụmụ a mụkworo amụkwo na-emesị dị ndụ dị nnọọ nta n’ụzọ dị egwu, otu onye dọkịta Colombia chepụtara ihe ngwọta dị nnọọ iche n’ụzọ dị ịtụnanya—“ụdị nlekọta nke nne anụ ‘kangaroo.’”

Ime ka ụmụ a mụkworo amụkwo dị ndụ bụ ihe ịma aka nye ndị dọkịta. A na-edebekarị ụmụ ọhụrụ ịdị arọ ha na-erughị otú kwesịrị mgbe a mụrụ ha n’ebe na-ekpo ọkụ nke ígwè a na-etinye nwa a mụkworo amụkwo, bụ́ ebe ha na-anọ ruo mgbe ha bukwuru ibu. Otú ọ dị, n’ala ndị na-emepe emepe, ụlọ ọgwụ ndị na-akpa akpa, edebeghị ihe ọcha, na ụkọ nke ndị ọrụ ahụ́ ike na ngwá ọrụ, na-akpatakarị mbufe ọrịa ndị dị ize ndụ.

Otu dọkịta nọ na Colombia chepụtara otu ụzọ yiri ka ọ̀ ga-ebelata nsogbu a. Olee otú o si arụ ọrụ? Mgbe a mukworo nwa, a na-elekọta ya n’ụzọ kwesịrị ekwesị ruo mgbe ọnọdụ ya bịara dị mma. Ka ọ dịgodị, nne ya na-anata ọzụzụ n’ilekọta nwa. Mgbe nwata ahụ bịara nwee ahụ́ ike otú o kwesịrị, nne ya na-aghọ ígwè a na-etinye nwa a mụkworo amụkwo nke dị n’ụdị mmadụ. N’ụzọ dị aṅaa? Site n’ime ka nwa ya nọrọ ya nso, na-eku ya n’etiti ara ya abụọ. N’ịbụ onye nọ ná nchebe n’ebe ọ gwọkọrọ onwe ya dị ka anụ kangaroo, nwa ọhụrụ ahụ na-enweta ahụ́ ikpo ọkụ, ọ ga-adịkwa mfe inye ya mmiri ara nne ya. N’ihi ya, a na-akpọkarị usoro a ụdị nlekọta nke nne anụ kangaroo.

Ọ dịghị mkpa inwe ngwá ọrụ dara oké ọnụ. Nne ahụ na-eyi uwe elu kwesịrị ekwesị ma ọ bụ uwe mwụda nwere eriri n’úkwù. Mgbe nwa ọhụrụ ahụ buru ibu otú dị mma, nne na nwa ahụ pụrụ ịla, na-abịaghachi ụlọ ọgwụ mgbe mgbe maka ile ahụ́.

Nnyocha ndị e bu ụzọ mee na-egosi na ụdị nlekọta nke nne anụ kangaroo dị irè ma dị nchebe. Ọzọkwa, o yiri ka ọ̀ na-akwalite nkekọ ka chie anya n’etiti nwa ọhụrụ na nne ya. Ọ bụghị ihe ijuanya na a nabatawo iji usoro a eme ihe n’ọtụtụ mba. Na Mexico, a na-enye ndị ikwu ọzụzụ ịghọ “ndị nna anụ kangaroo,” “ndị nne ochie anụ kangaroo,” nakwa ọbụna “ụmụnne ndị nwanyị anụ kangaroo” iji nye aka mgbe ọ dị mkpa ka nne zurutụ ike. Dr. Guadalupe Santos, bụ́ onye nwere ụlọ ọrụ na-enye ụdị nlekọta nke nne anụ kangaroo na Mexico, gwara Teta!, sị: “Anyị anọwo na-eji usoro a eme ihe kemgbe 1992 ma hụ otú ọ dịruru irè. Ọ chọrọ ígwè a na-etinye nwa a mụkworo amụkwo ole na ole na ịnọ oge ka nnọọ nta n’ụlọ ọgwụ.”