Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ijikọ Ụwa Ọnụ—Olileanya na Egwu Ndị Ọ Na-eweta

Ijikọ Ụwa Ọnụ—Olileanya na Egwu Ndị Ọ Na-eweta

Ijikọ Ụwa Ọnụ—Olileanya na Egwu Ndị Ọ Na-eweta

“Ijikọ ụwa ọnụ bụ ihe omume akụ̀ na ụba kasị ịrịba ama n’ọgbọ anyị a. . . . Ọ na-emeghere ọtụtụ ijeri mmadụ gburugburu ụwa ohere ndị na-enweghị atụ ugbu a.”—MARTIN WOLF, ONYE NA-EDE IHE BANYERE EGO N’AKWỤKWỌ AKỤKỌ.

“Anyị, ndị bi n’Ụwa, bụ otu ezinụlọ buru ibu. Ihe ọhụrụ a na-emenụ na-eweta ihe ịma aka ndị ọhụrụ na nsogbu ndị ọhụrụ zuru ụwa ọnụ, dị ka ọdachi gburugburu ebe obibi, enwekwaghị ihe ndị sitere n’okike na-enye akụ̀, agha ndị na-akpata mwụfu ọbara nakwa ịda ogbenye.”—EDUARD SHEVARDNADZE, PRESIDENT NKE GEORGIA.

N A December 1999, ọgba aghara mere ka a kwụsị nzukọ Òtù Azụmahịa Ụwa nọ na-enwe na Seattle, U.S.A. Ndị uwe ojii jiri ikuku tear gas, mgbọ rọba, na mmiri ọgwụ na-afụ ka ose mee ihe iji weghachi udo. N’ikpeazụ, ha jidere ọtụtụ narị ndị na-eme ngagharị iwe.

Gịnị kpatara ọgba aghara a na Seattle? Ọ bụ ọtụtụ nchegbu a na-enwe maka ijigide ọrụ, gburugburu ebe obibi, nakwa ikpe na-ezighị ezi n’etiti ọha mmadụ. Otú ọ dị, n’ikwu ya n’ụzọ dị mfe, ndị ahụ na-eme ngagharị iwe na-atụ ụjọ banyere ijikọ ụwa ọnụ—mmetụta ọ ga-enwe n’ahụ́ ụmụ mmadụ nakwa na mbara ala.

Egwu ha akwụsịbeghị. Kemgbe 1999, ngagharị iwe megide ijikọ ụwa ọnụ ebukwuwo ibu ma ka njọ. N’ọnọdụ ụfọdụ, ndị ndú ụwa na-agbalịzi inwe nzukọ ha n’ebe ndị dịpụrụ adịpụ bụ́ ebe ọ ga-esiri ndị na-eme ngagharị iwe ike itisa nzukọ ha.

Otú ọ dị, ọ bụghị mmadụ nile na-ele njikọ zụrụ ụwa ọnụ anya dị ka ihe na-eyi egwu. Ka ụfọdụ ndị na-akatọ ya dị ka isi iyi nke nsogbu ụwa, ndị ọzọ na-eto ya dị ka ihe ngwọta dịịrị ihe ka ukwuu ná nsogbu ụwa. N’eziokwu, arụmụka a na-aga n’ihu pụrụ iyi ihe na-adịghị mkpa nye ihe ka ọtụtụ n’ihe a kpọrọ mmadụ, bụ́ ndị ọtụtụ n’ime ha na-amachaghị ihe ijikọ ụwa ọnụ gụnyere. Ma ihe ọ sọrọ echiche gị ya bụrụ, ijikọ ụwa ọnụ emetụtawala gị, ma eleghị anya, ọ ga-emetụtakwu gị ọbụna n’ọdịnihu.

Gịnị Kpọmkwem Bụ Ijikọ Ụwa Ọnụ?

“Ijikọ ụwa ọnụ” bụ okwu ụfọdụ ndị ji eme ihe n’ịkọwa ndabere na-arị elu nke ndị mmadụ na mba dị iche iche gburugburu ụwa na-adaberịta n’ebe ibe ha nọ. Usoro a arịwo elu n’ụzọ dị ukwuu n’ime ihe dị ka iri afọ gara aga, n’ụzọ bụ́ isi, ọ bụ n’ihi ọganihu dị ukwuu e nweworo na nkà na ụzụ. (Lee igbe dị na peeji nke 17.) N’oge a, ọ fọwo nke nta ka a gharazie inwe ìgwè mba ndị na-emegide onwe ha n’Agha Nzuzo, e belatawo ihe mgbochi azụmahịa ndị e nwere, ụlọ ahịa ego ụwa ndị bụ́ isi anọwo na-ejikọ aka, ime njem anọwokwa na-adị ọnụ ala ma na-adịkwu mfe.

Njikọ aka a na-arị elu gburugburu ụwa akpatawo nnọọ ọtụtụ ihe—n’ụzọ akụ̀ na ụba, n’ụzọ ndọrọ ndọrọ ọchịchị, n’ụzọ ọdịbendị, nakwa na gburugburu ebe obibi. N’ụzọ dị mwute, ụfọdụ n’ime ihe ndị a ọ na-akpata pụrụ ịbụ ndị na-adịghị mma. Akwụkwọ òtù Mba Ndị Dị n’Otu bụ́ Human Development Report 1999 kọwara, sị: “E jikọwo ndụ ndị mmadụ gburugburu ụwa n’ụzọ chiri anya karị, n’ụzọ dị irè karị, n’ụzọ gara n’ihe kpọmkwem karịa mgbe ọ bụla ọzọ. Nke a na-emeghe ọtụtụ ohere, na-arụpụta ihe ọhụrụ ndị bara uru na ndị dị njọ.” Dịkwa ka ọ dị n’ọtụtụ ihe ụmụ mmadụ rụzuworo, ijikọ ụwa ọnụ nwere ma akụkụ ndị dị mma ma ndị dị njọ.

Olileanya Maka Ụwa Na-enwe Ọganihu Karị

Ijikọ ụwa ọnụ “emewo ka ụwa nwee ọganihu n’ụzọ nkà mmụta sayensị nakwa n’ụzọ ọdịbendị, ọ bawokwara ọtụtụ ndị uru n’ụzọ akụ̀ na ụba,” ka onye nwetara Ihe Nrite Nobel na nkà mmụta akụ̀ na ụba, bụ́ Amartya Sen, na-azọrọ. Akwụkwọ Human Development Report 1999 ahụ na-ekwukwa na ijikọ ụwa ọnụ “na-emeghe ohere dị ukwuu maka iwepụ ịda ogbenye na narị afọ nke 21.” Ihe kpatara nchekwube a bụ ịrị elu dị ukwuu e nwere n’ọganihu ijikọ ụwa ọnụ wetaworo. Ezinụlọ dị otú o kwesịrị n’ụwa taa na-akpata ego ji okpukpu atọ karịa ihe ọ na-akpatabu afọ 50 gara aga. *

Ụfọdụ ndị nnyocha na-ahụ abamuru ọzọ nke njikọ akụ̀ na ụba: Ha na-eche na ọ pụrụ ime ka mba dị iche iche ghara inwe ọchịchọ ịga agha. Thomas L. Friedman kwuru, n’akwụkwọ ya bụ́ The Lexus and the Olive Tree na ijikọ ụwa ọnụ “na-eme ka e nwekwuo ihe ndị na-eme ka a chọọ izere agha, na-amụbakwa ihe ịga agha na-efu n’ụzọ dị ukwuu karịa n’ọgbọ ọ bụla bu ụzọ n’akụkọ ihe mere eme.”

Isoro ndị mmadụ na-emekọrịtakwu ihe nwekwara ike ime ka e nwekwuo ịdị n’otu zuru ụwa ọnụ. Ụfọdụ òtù ndị na-ahụ maka ihe ndị ruuru mmadụ enwewo ike iji Intanet mee ihe iji kwalite ọrụ ha n’ụzọ dị irè karị. Dị ka ihe atụ, nkwekọrịta mba nile e mere na 1997, bụ́ nke machibidoro ogbunigwe, kwere omume n’ụzọ ụfọdụ site n’iji E-mail zigara ìgwè dịgasị iche iche na-enye nkwado ozi gburugburu ụwa. E toro usoro a e ji mee ka ndị nkịtị kere òkè na ya dị ka “ụzọ ọhụrụ nke isi soro mba dị iche iche na-emekọrịta ihe, bụ́ nke gọọmenti na ndị nkịtị na-arụkọ nnọọ ọrụ na ya iji dozie nsogbu zuru ụwa ọnụ nke ụmụ mmadụ.”

N’agbanyeghị ihe ọma ndị a ọ rụpụtara, ọtụtụ ndị ka na-atụ ụjọ na mmetụta na-adịghị mma nke ijikọ ụwa ọnụ karịrị abamuru ya.

Ụjọ Maka Ụwa Kewara Ekewa Karị

Ma eleghị anya, ụjọ kasịnụ a na-atụ banyere ijikọ ụwa ọnụ bụ ụzọ o siworo mee ka oghere dị ukwuu e nwere n’etiti ndị nwere akụ̀ na ụba na ndị na-enweghị sakwuo mbara. Ọ bụ ezie na ihe ịrụ ụka adịghị ya na akụ̀ na ụba ụwa amụbawo, ọ dị n’aka mmadụ ole na ole nakwa ná mba ole na ole. Ngụkọta nke akụ̀ na ụba mmadụ 200 kasị baa ọgaranya n’ụwa karịziri ngụkọta nke ego pasent 40 nke ndị bi na mbara ala a—ihe dị ka ijeri mmadụ 2.4—na-akpata. Ka ụgwọ ọnwa nọgidekwara na-arị elu ná mba ndị bara ọgaranya, mba 80 dara ogbenye na-enwe n’ezie ndalata ná nkezi nke ego a na-akpata n’ime afọ iri gara aga.

Nchegbu ọzọ bụ́ isi bụ banyere gburugburu ebe obibi. Ijikọ ụwa ọnụ n’ụzọ akụ̀ na ụba abụwo nke ndị ahịa bụ́ ndị nwere mmasị dị ukwuu banyere irite uru karịa n’ichebe mbara ala kpaliri. Agus Purnomo, onyeisi nke Òtù Na-ahụ Maka Ego Ụwa Maka Ihe Ndị E Kere Eke n’Indonesia, kọwara ọnọdụ amaghị nke a ga-eme ahụ, sị: “Anyị na mmepe nọ nnọọ n’ọsọ. . . . Ọ na-echegbu m na n’ime afọ iri, anyị nile ga-amawo banyere gburugburu ebe obibi anyị, ma a gaghịzi enwe ihe fọdụrụ a ga-echebe.”

Ndị mmadụ na-enwekwa nchegbu banyere ọrụ ha. Ma ọrụ ma ego a na-akpata abụwo nke a na-ejighị nnọọ n’aka karị, ka njikọ aka zuru ụwa ọnụ na oké asọmpi na-amanye ụlọ ọrụ dị iche iche ime ka ọrụ ha ka mfe ma dịkwuo irè. Iwe na ịchụ ndị ọrụ dị ka mkpa e nwere n’ahịa n’oge ọ bụla si dị na-eyi ihe ezi uche dị na ya nye ụlọ ọrụ nchegbu ha bụ iritekwu uru, ma ọ na-ewetara ndị mmadụ nsogbu na nhụsianya dị ukwuu.

Ijikọ ụlọ ahịa ego ụwa ọnụ akpatawo ihe ọzọ na-ebibi ihe. Ndị nwere ụlọ ọrụ achụmnta ego ná mba ọzọ pụrụ ịgbazinye mba ndị ka na-emepe emepe nnukwu ego ma mesịa dọrọghachi ego ha na mberede mgbe ọnọdụ akụ̀ na ụba bịara ka njọ. Ndọrọghachi dị ukwuu otú ahụ pụrụ itinye ọtụtụ mba ná nsogbu akụ̀ na ụba. Nsogbu ego e nwere n’Ebe Ọwụwa Anyanwụ Eshia na 1998 mere ka nde mmadụ 13 gharazie inwe ọrụ. N’Indonesia, ọbụna ndị ọrụ bụ́ ndị nọgidere n’ọrụ ha hụrụ ka ihe ụgwọ ọnwa ha ga-azụtali ji ọkara dalata.

Mgbe ahụ, n’ụzọ kwere nghọta, ijikọ ụwa ọnụ na-akpata egwu nakwa olileanya. È nwere ihe mere ị ga-eji na-atụ ijikọ ụwa ọnụ egwu? Ka ị̀ pụrụ ịtụ anya ka o mee ka i nwekwuo ọganihu ná ndụ? Ijikọ ụwa ọnụ ò mewo ka anyị nwee ihe mere anyị ga-eji nwee nchekwube banyere ọdịnihu? Isiokwu anyị na-esonụ ga-atụle ajụjụ ndị a.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 12 Otú ọ dị, nkezi ndị e mere, karịsịa nkezi nke ụwa nile, pụrụ ịbụ ihe na-eduhie eduhie. N’ọtụtụ ebe, ezinụlọ dị iche iche enwebeghị ịrị elu ọ bụla ma ọlị n’ego ha na-akpata n’ime afọ 50 gara aga, ebe ụgwọ ọrụ ndị ọzọ mụbaworo ọtụtụ ugboro.

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 15]

Ngụkọta nke akụ̀ na ụba mmadụ 200 kasị baa ọgaranya n’ụwa karịrị ngụkọta nke ego pasent 40 nke ndị bi n’ụwa na-akpata

[Igbe/Foto ndị dị na peeji nke 17]

NKÀ NA ỤZỤ NDỊ NA-EME KA IJIKỌ ỤWA ỌNỤ KWE OMUME

Nkà na ụzụ agbanwewo usoro mgbasa ozi kpam kpam na narị afọ gara aga. Iru ndị mmadụ na inweta ihe ọmụma—n’ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ ebe nile n’ụwa—adịwo ngwa karị, dị ọnụ ala karị ma ka mfe.

TELIVISHỌN Ihe ka n’ọnụ ọgụgụ ndị mmadụ n’ụwa na-ekiri telivishọn, ọ bụrụgodị na ọ dịghị nke ha nwere. Ka ọ na-erule 1995, n’ime 1000 mmadụ ọ bụla gburugburu ụwa, e nwere TV 235, ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ okpukpu abụọ nke ọnụ ọgụgụ e nwere na 1980. Nanị otu obere ígwè satellite pụrụ ime ka ndị bi n’ime ime obodo nweta ihe omume telivishọn a na-eme gburugburu ụwa. “Taa, ọ dịghị mba ọ bụla pụrụ n’ezie iwepụ onwe ya n’usoro mgbasa ozi zuru ụwa ọnụ,” ka Francis Fukuyama, bụ́ onye prọfesọ maka akụ̀ na ụba ọchịchị kwuru.

INTANET A na-ejikọ ihe dị ka ndị ọhụrụ 300,000 na-eji Intanet eme ihe kwa izu. Na 1999, e mere atụmatụ na a ga-ejikọ nde mmadụ 700 n’Intanet ka ọ na-erule afọ 2001. “Ihe si na ya pụta,” ka onye na-ede akwụkwọ bụ́ Thomas L. Friedman na-akọwa, “bụ na ọ dịtụbeghị mgbe ọ bụla ọzọ n’akụkọ ihe mere eme nke ụwa bụ́ mgbe e nwere nnọọ ọtụtụ ndị mmadụ nwere ike ịmụta nnọọ ọtụtụ ihe banyere ndụ nke ọtụtụ ndị ọzọ, ọtụtụ ngwá ahịa nakwa ọtụtụ echiche dị ka e nwere ugbu a.”

TELIFON Fiber-optic cable na usoro njikọ satellite emewo ka ọnụ ahịa telifon dalata nke ukwuu. Ego ole ọ na-ewe iji nọrọ na New York kpọọ London na fon ruo minit atọ si $245 na 1930 dalataruo cent 35 na 1999. Usoro njikọ ozi telifon ndị na-adịghị eji waya eme ihe emewo ka fon ndị a na-eji agagharị agagharị bụrụ ihe zuru ebe nile dị ka kọmputa. Ka ọ na-erule ngwụsị afọ 2002, a ga-enwe ihe dị ka otu ijeri mmadụ ga na-eji fon a na-eji agagharị agagharị na-eme ihe, ọtụtụ n’ime ndị a ga na-eji ya eme ihe ga-enwekwa ike iji fon ha chọọ ihe n’Intanet.

AKỤKỤ AHỤ́ ELECTRONIC BỤ́ MICROCHIP Ngwá nile ahụ a kpọrọ aha n’elu, bụ́ ndị a nọgidere na-eme ka ha kakwuo mma, na-adabere n’akụkụ ahụ́ electronic bụ́ microchip. N’ime afọ 30 gara aga, ikike ndekọ ihe nke akụkụ ahụ́ electronic bụ́ microchip anọwo na-amụba kwa ọnwa 18. Ọ dịtụbeghị mgbe ọ bụla ọzọ e tinyeworo ihe ọmụma dị nnọọ ukwuu otú ahụ n’ime ntakịrị ihe dị otú ahụ.

[Ebe E Si Nweta Foto Dị na peeji 15]

Ụwa ndị e sere na peeji nke 17, 19-22, na 25: NASA photo