Ndị Kraịst Hà Kwesịrị Ikwusara Ndị Ọzọ Ozi Ọma?
Echiche nke Bible
Ndị Kraịst Hà Kwesịrị Ikwusara Ndị Ọzọ Ozi Ọma?
MA ELEGHỊ anya ebe a zụlitere gị ma ọ bụ ọdịbendị unu kwuru na e kwesịghị ikwurịta banyere okpukpe ma ọ́ bụghi n’ezinụlọ ma ọ bụ na chọọchị. N’ihi ya, ọ pụrụ ịkpasu gị iwe ma mmadụ kpara Bible n’aka bịa n’ebe obibi gị na mberede. Ụfọdụ ndị malitere inwe echiche a n’ihi ime ihe ike ndị e nweworo n’akụkọ ihe mere eme nke okpukpe, bụ́ ndị e mere n’aha nke ịchọ iwetara ndị mmadụ nzọpụta.
Akụkọ ihe mere eme nke ọtụtụ mba na-akọ banyere ntọghata ndị mmadụ n’ìgwè, nke ọ na-abụghị ịhụnanya ha nwere n’ebe Kraịst nọ kpaliri, kama, ọ bụ egwu nke ịbụ ndị e gburu. Ọtụtụ ndị gara zoo, si n’ebe obibi na mba ha gbapụ, ma ọ bụ ọbụna tụfuo ndụ ha—ụfọdụ bụ ndị a kpọrọ ọkụ n’elu osisi—kama ịbụ ndị a tọghatara gaa n’okpukpe ndị na-akpagbu ha.
Ihe odide Bible e ji ike mmụọ nsọ dee adịghị akwado omume ntọghata ná mmanye dị otú ahụ. Ya mere, nke ahụ ọ̀ na-akagbu mmadụ isoro ndị ọzọ kwurịta nkwenkwe okpukpe ya? Bible n’onwe ya zara ajụjụ ahụ.
Izi Ihe Dị Ka Onye Nwere Ikike
Nke mbụ, tụlee ihe nlereanya Jizọs Kraịst setịpụrụ. Ọ bụ onye ọkà ozizi nke metụtara ndụ ndị na-ege ya ntị. (Jọn 13:13, 15) N’Ozizi Elu Ugwu ahụ, ozizi ya dị mfe ma dị irè. Mmetụta nke ahụ nwere bụ na “ụzọ o si ezi ihe juru [ndị na-ege ya ntị] anya; n’ihi na ọ nọ na-ezi ha ihe dị ka onye nwere ikike.” (Matiu 7:28, 29) Ihe dị ka afọ 2,000 mgbe e mesịrị, ozizi ya ka na-emetụta ndụ ndị na-enyocha ha. N’ịkwado echiche a, Prọfesọ Hans Dieter Betz kwuru na “mmetụta Ozizi Elu Ugwu ahụ nwere karịrị nnọọ nke okpukpe ndị Juu na Iso Ụzọ Kraịst, ma ọ bụ ọbụna ọdịbendị Ebe Ọdịda Anyanwụ Ụwa, na-enwe.”
Kpọmkwem tupu Jizọs arịgoro eluigwe, o nyere iwu nke mere ka ọrụ nkwusa ahụ ọ malitere nọgide na-aga n’ihu, ọbụnakwa nwee ọganihu, mgbe ọ nwụsịrị. (Jọn 14:12) O nyere ndị na-eso ụzọ ya ntụziaka ịgakwuru ndị nke mba nile, “na-ezi ha ka ha debe ihe nile” o nyere n’iwu. E mere ka nzube bụ́ isi nke ọrụ a doo anya mgbe Jizọs kwuru, n’otu okwu ahụ, sị: ‘Ya mere gaanụ mee ndị na-eso ụzọ.’—Matiu 28:19, 20; Ọrụ 1:8.
Tụleekwa ihe nlereanya Pọl onyeozi. Mgbe a tọghatasịrị ya gaa n’Iso Ụzọ Kraịst, o meghị ihere iso ndị ọzọ kwurịta banyere okwukwe ọhụrụ ya. (Ọrụ 9:17-19, 22) Ọ bụ omume e ji mara Pọl bụ́ ikwu okwu n’ụlọ nzukọ dị iche iche na ịnwapụta “site n’izo aka n’ebe dị iche iche na ọ dị mkpa ka Kraịst taa ahụhụ na ka o si ná ndị nwụrụ anwụ bilie.” O ji nkà ‘soro ha tụgharịa uche site n’Akwụkwọ Nsọ’ iji ‘mee ka ndị Juu na ndị Grik kweta.’ Dị ka otu akwụkwọ si kwuo, okwu Grik e ji mee ihe maka “mee ka e kweta” pụtara “ime ka a gbanwee uche site ná ntụgharị uche ma ọ bụ nnyocha nke ihe ndị ziri ezi.” Ihe si ná ntụgharị uche n’ụzọ na-eme ka e kweta bụ́ nke Pọl ji mee ihe pụta bụ na o ‘mere ka ìgwè mmadụ batụrụ ụba kweta, tụgharịakwa ha gaa n’echiche dị iche.’—Ọrụ 15:3; 17:1-4, 17; 18:4; 19:26.
Mmanye Ma Ọ Bụ Ime Ka E Kweta—Ole Nke?
N’oge ndị a, e jiwo okwu bụ́ “ime ntọghata” mee ihe ịpụta iji otu ụzọ ma ọ bụ ọzọ amanye mmadụ ịgbanwe okpukpe ya. Bible adịghị akwado omume dị otú ahụ. Kama nke ahụ, ọ na-akụzi na e kere ndị mmadụ dị ka ndị nweere onwe ha ime nhọrọ, na-enwe ohere na ibu ọrụ nke ịhọrọ otú ha ga-esi ebi ndụ ha. Nke a gụnyere mkpebi nke otú ha ga-esi fee Chineke.—Deuterọnọmi 30:19, 20; Joshua 24:15.
Jizọs kwanyeere nnwere onwe a Chineke nyere ùgwù site n’ejighị ike ya dị egwu mee ihe ma ọlị n’ịmanye mmadụ ịnakwere ihe ndị o kwuru. (Jọn 6:66-69) Ọ kpaliri mmasị ndị na-ege ya ntị site n’iji echiche rijuru afọ, ihe atụ, na ajụjụ mmata echiche mee ihe, ná nzube nke iru n’obi ha. (Matiu 13:34; 22:41-46; Luk 10:36) Jizọs kụziiri ndị na-eso ụzọ ya ịkwanyere ndị ọzọ ùgwù otú a.—Matiu 10:14.
O doro anya na Pọl gbasoro ihe nlereanya Jizọs n’ozi ya. Ọ bụ ezie na Pọl ji echiche rijuru afọ bụ́ nke sitere n’Akwụkwọ Nsọ mee ka ndị na-ege ya ntị kweta, o gosipụtara nkwanye ùgwù n’ebe mmetụta na echiche ndị ọzọ dị. (Ọrụ 17:22, 23, 32) Ọ ghọtara na ọ ghaghị ịbụ ịhụnanya anyị nwere n’ebe Chineke na Kraịst nọ ga-akwali anyị ijere Onye Okike anyị ozi n’ụzọ zuru ezu. (Jọn 3:16; 21:15-17) Ya mere, ọ dịịrị anyị ikpebi.
Mkpebi Onwe Onye
Mgbe ha na-eme mkpebi ndị bụ́ isi ná ndụ, dị ka ụdị ụlọ a ga-azụ, ebe a ga na-arụ ọrụ, na otú a ga-esi azụlite ụmụ, ndị nwere ezi uche adịghị eji ọsọ eme nke ahụ. Ha pụrụ ime nchọpụta iji hụ nhọrọ ndị dịnụ, chebara ihe ndị ha chọpụtara echiche, ma eleghịkwa anya, rịọ maka ndụmọdụ. Ọ bụ nanị mgbe ha chebasịịrị ihe ndị a echiche ka ha ga-eme mkpebi.
Mkpebi banyere otú anyị kwesịrị isi fee Chineke chọrọ ka anyị tinye oge na mgbalị ka ukwuu karịa mkpebi ọzọ ná ndụ. Ọ ga-emetụta otú anyị si ebi ndụ anyị ugbu a, nke kasịkwa mkpa, ọ ga-emetụta atụmanya anyị maka ndụ ebighị ebi n’ọdịnihu. Ndị Kraịst narị afọ mbụ nọ na Biria ghọtara nke a nke ọma. N’agbanyeghị na ọ bụ Pọl n’onwe ya kọwaara ha ozi ọma ahụ, ha jikwa nlezianya nyochaa Akwụkwọ Nsọ kwa ụbọchị iji jide n’aka na ihe a na-akụziri ha bụ eziokwu. N’ihi ya, “ọtụtụ n’ime ha ghọrọ ndị kwere ekwe.”—Ọrụ 17:11, 12.
Taa, Ndịàmà Jehova na-anọgide na-arụ ọrụ nkwusa na ime ndị na-eso ụzọ bụ́ nke Jizọs mere ndokwa ya. (Matiu 24:14) Ha na-akwanyere oruru o ruuru ndị ọzọ inwe okpukpe nke ha ùgwù. Ma a bịa n’ihe banyere ịgwa ndị ọzọ nkwenkwe okpukpe ha, ha na-agbaso ụkpụrụ ahụ e setịpụrụ na Bible. Ee, ha na-eji ntụgharị uche ziri ezi nke sitere n’Akwụkwọ Nsọ eme ihe n’ọrụ ha lere anya dị ka nke na-azọpụta ndụ.—Jọn 17:3; 1 Timoti 4:16.