Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Njikọ Ụwa nke Ga-abara Gị Uru

Njikọ Ụwa nke Ga-abara Gị Uru

Njikọ Ụwa nke Ga-abara Gị Uru

“Ọ bụrụ na a gaje inwe ihe ịga nke ọma n’ijikọ ụwa ọnụ, ọ ghaghị ịrụpụtara ma ndị ogbenye ma ndị ọgaranya ihe dị mma. Ọ ghaghị ime ka ikike na ihe ùgwù ndị ruuru mmadụ n’ụzọ ziri ezi na akụ̀ na ụba ya hara nhata. Ọ ghaghị iweta ikpe ziri ezi n’etiti ọha mmadụ na ịha nhata nke na-adịghị ala karịa inwe ọganihu n’ụzọ akụ̀ na ụba na usoro mgbasa ozi ka mma.”—KOFI ANNAN, ODEAKWỤKWỌ UKWU NKE ÒTÙ MBA NDỊ DỊ N’OTU.

DỊ KA Kofi Annan si kwuo, njikọ ụwa nke nwere ihe ịga nke ọma n’ezie ga-eme ka ndụ nke onye ọ bụla bi n’agbata obi ụwa nile ka mma. Ma ihe anyị hụworo n’afọ ndị na-adịbeghị anya adịtụdịghị otú ahụ. E nwewo ọganihu dị nnọọ nta n’ihe ndị ruuru mmadụ nakwa n’ịha nhata nke ọha mmadụ karịa ka e nwere na nkà na ụzụ nakwa n’ihe onwunwe.

Nsogbu bụ́ isi bụ na ọ bụ ọchịchọ inweta ego na-akpali ijikọ ụwa ọnụ n’ụzọ akụ̀ na ụba. Ọ na-esi ike ka ọchịchọ irite uru kwe ka e chebara ndị ogbenye na ndị ụwa na atụ n’ọnụ ma ọ bụ mkpa na-adịgide adịgide nke mbara ala anyị echiche. “Usoro akụ̀ na ụba ụwa a na-adịghị achịkwa achịkwa, nke ụlọ ọrụ azụmahịa ndị na-ahụ ego dị ka nanị uru ha nwere bụ akụkụ ya bụ́ isi, bụ nnọọ nke a na-ejighị n’aka . . . ọ na-anapụkwa ihe a kpọrọ mmadụ ihe karịrị ego,” ka Dr. David C. Korten kwuru.

Gọọmenti dị iche iche nke ụwa hà ga-enwe ike ịchịkwa akụ̀ na ụba nke ụwa n’ụzọ ga-eweta ịha nhata n’etiti ọha mmadụ? Nke ahụ yiri ihe na-agaghị eme eme. Ka ọ dị ugbu a, o siworo gọọmenti dị iche iche ike idozi nsogbu zuru ụwa ọnụ—ma ọ bụ mpụ zuru ụwa ọnụ, ịrị elu nke okpomọkụ n’ụwa nile, ma ọ bụ ịda ogbenye zuru ụwa ọnụ. “Ọ dị mkpa imekọ ihe ọnụ iji chebe ọdịmma ụwa nile,” ka Annan na-akọwa, “ma n’ụwa e jikọrọ ọnụ nke taa, usoro ndị e nwere maka imekọ ihe ọnụ nke ụwa ka na-amalite amalite.”

Usoro zuru ụwa ọnụ nke iji hụ banyere nsogbu zuru ụwa ọnụ abụghị nanị ihe a chọrọ. Òtù Na-ahụ Maka Usoro Ọchịchị Zuru Ụwa Ọnụ * na-arụ ụka na ụkpụrụ omume dịkwa ụwa mkpa. “Ọ bụrụ na e nweghị ụkpụrụ omume zuru ụwa ọnụ,” ka akụkọ ha na-ekwu, “esemokwu na nrụgide nke ibi n’agbata obi ụwa nile ga-amụba; ọ bụrụ na e nweghị nduzi, ọbụna ụlọ ọrụ na usoro ndị kasị mma e guzobere ga-akụ afọ n’ala.”

Olee ụdị ụkpụrụ omume zuru ụwa ọnụ ha tụrụ aro ya? “Ndị mmadụ kwesịrị ịdị na-emeso ndị ọzọ dị ka ha onwe ha ga-achọ ka e si na-emeso ha,” ka akụkọ ahụ kwuru. Jizọs Kraịst, bụ́ onye ndú kasịnụ ụwa matụworo, kụziri ụkpụrụ omume a ihe dị ka puku afọ abụọ gara aga. (Matiu 7:12) Ma ụkpụrụ ahụ ka dị irè dị ka ọ dịworo. Obi abụọ adịghị ya na njikọ zuru ụwa ọnụ nke hiwere isi n’ụkpụrụ ahụ ga-abara onye ọ bụla uru. Nke ahụ ọ̀ pụrụ ime eme?

Ihe Ngwọta Zuru Ụwa Ọnụ nke Dị Iche

Bible na-ebu amụma na n’ọdịnihu dị nso, otu ọchịchị zuru ụwa ọnụ ga-ejikọta ihe a kpọrọ mmadụ na-adabere n’achọghị ọdịmma onwe onye nanị kama ịdabere n’ego ma ọ bụ na nkà na ụzụ. Ọ ga-enwe ihe ịga nke ọma n’ihi na o nwere ike na usoro ọ ga-eji eme ihe n’ụwa nile maka ọdịmma nke ihe nile a kpọrọ mmadụ. Jizọs Kraịst n’onwe ya lekwasịrị anya n’ọchịchị a zuru ụwa ọnụ mgbe ọ kụziiri ụmụazụ ya ikpe ekpere ka ‘Alaeze Chineke bịa nakwa ka uche Chineke mee n’ụwa.’—Matiu 6:10.

Alaeze Chineke, bụ́ ọchịchị eluigwe dị n’aka Jizọs Kraịst, ga-egosi ihe nlereanya nke ụkpụrụ omume ọhụrụ zuru ụwa ọnụ, nke ahụ Jizọs n’onwe ya kụziri mgbe ọ nọ n’ụwa. Ịhụ Chineke n’anya na ịhụ onye agbata obi n’anya ga-abụ ụkpụrụ nduzi. (Matiu 22:37-39) Ọtụtụ amụma ndị dị na Bible na-ekwu ihe ọchịchị ọhụrụ a ga-eme. Banyere Onye Ọchịchị ya, bụ́ Jizọs Kraịst, Bible na-ekwe nkwa, sị: “Ọ ga-eji ezi omume kpee ndị na-enweghị ike ikpe, ọ ga-ejikwa izi ezi baa mba banyere ndị dị umeala n’obi n’ụwa.“ (Aịsaịa 11:4) Ndị bara ọgaranya na ndị dị ike agaghị erigbu ndị ihe na-adabachaghịrị. Jizọs “ga-emere onye na-enweghị ike na ogbenye ebere . . . Ọ ga-esi n’aka nzọgbu na n’aka ime ihe ike gbapụta mkpụrụ obi ha.”—Abụ Ọma 72:13, 14.

A ga-edozi nsogbu gburugburu ebe obibi n’egbughị oge. Kama inwe mgbasa nke ọzara, “obi ga-atọ ọzara na ala kpọrọ nkụ ụtọ; ala ihe na-adịghị ga-etegharịkwa egwú ọṅụ, gbawaa okooko ọhịa, dị ka rose.” (Aịsaịa 35:1) Kama inwe ụkọ nri, ‘ọtụtụ ọka ga-adị n’ala.’—Abụ Ọma 72:16.

Alaeze Chineke na-eme ka ndị si ná nzụlite nile dị n’otu. “N’otu ka M ga-edokọ ha dị ka ìgwè ewu na atụrụ nke Bọzra,” ka Chineke na-ekwe ná nkwa. ‘M ga-agbanwere ha egbugbere ọnụ dị ọcha, ka ha nile wee fee m n’otu ubu.’ (Maịka 2:12; Zefanaịa 3:9) “Egbugbere ọnụ dị ọcha” a, nke na-agụnye ụkpụrụ dị iche iche nke omume na nke okpukpe, na-eme ka ndị mmadụ dị n’otu ọbụna ugbu a.

N’ihi ịdị adị nke ihe ndị e ji eme njem gburuguburu ụwa, mgbe mgbe, Ndịàmà Jehova na-enwe mgbakọ mba nile ndị buru ibu, bụ́ nke na-eme ka njikọ e nwere n’etiti agbụrụ, mba, na ọdịbendị dị iche iche sikwuo ike. Mgbakọ ndị a bụ ihe akaebe pụtara ìhè banyere ịdị n’otu n’obi nakwa n’uche, kama ịbụ na nkà na ụzụ na azụmahịa. (Lee igbe so isiokwu a.) Otu ọkà mmụta okpukpe bụ́ onye Spen nke gaworo mgbakọ dị otú ahụ dere, sị: ‘Esi m ebe ahụ laa na-enwe mmetụta nke ịbụ onye e wuliri elu, ọ bụghị nanị site n’okwu ndị dabeere n’Akwụkwọ Nsọ bụ́ ndị na-enye ihe ọmụma kamakwa site n’ịdị n’otu nke dị n’etiti ndị a, ụkpụrụ omume ha ndị dị elu, na ezi akparamàgwà ha.’

Ndịàmà Jehova na-ejikwa akụkụ ndị ọzọ nke imekọ ihe ọnụ nke mba ụwa eme ihe n’ịkwalite nkwusa ha nke ozi ọma banyere Alaeze Chineke. Dị ka ihe atụ, ọtụtụ ndị nsụgharị gburugburu ụwa na-eji kọmputa na E-mail eme ihe n’ịsụgharị Teta! gaa n’ihe karịrị asụsụ 80. Ngwá ọrụ ndị dị otú ahụ na-enyere Ndịàmà Jehova aka ime ka usoro ịkụzi Bible ha bụrụ nke zuru ụwa ọnụ n’ezie. N’ụzọ doro anya, a pụrụ iji ngwá ọrụ nke ijikọ ụwa ọnụ mee ihe n’ụzọ bara uru nakwa n’ụzọ na-ebibi ihe.

N’otu aka ahụ, ọchịchị zuru ụwa ọnụ nke Chineke guzobere ga-eweta ihe ngwọta kama iweta nsogbu, dị ka ijikọ ụwa ọnụ nke ụmụ mmadụ meworo. Anyị nwere ezi ihe mere anyị ga-eji nwee obi ike n’ọchịchị eluigwe a. ‘M gaje ike ụwa ọhụrụ,’ ka Chineke na-ekwe nkwa ya. “A gaghị echetakwa ihe mbụ nile, ha agaghị abatakwa n’obi. Ma otú ọ dị, ka obi tọọ unu ụtọ, tegharịakwanụ egwú ọṅụ ruo mgbe ebighị ebi n’ihi ihe nke Mụ onwe m na-eke.” (Aịsaịa 65:17, 18) N’ezie, “ụwa ọhụrụ” Chineke ga-abara ndị mmadụ nọ n’ụwa nile uru n’ezie.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 6 Òtù a, bụ́ nke ndị ndú ụwa 28 a ma ama mejupụtara, dere akụkọ toro ogologo na 1995, bụ́ nke isiokwu ya bụ́ “Agbata Obi Ụwa Nile Anyị,” bụ́ ebe ha depụtara aro ha maka ime ka ọchịchị ụwa ka mma.

[Igbe dị na peeji nke 24]

NDỊ E JIKỌTARA MA KA BỤRỤ NDỊ E KEWARA EKEWA

Ọ bụ ezie na nkà na ụzụ pụrụ imewo ka ụwa dị obere karị, nkewa ka gbanyesiri mkpọrọgwụ ike. Telivishọn, fon ndị a na-eji agagharị agagharị, na Intanet abụwo ihe ndị bara uru n’ijikọta ndị mmadụ ma ọ bụghị n’ime ka ndị mmadụ dị n’otu. Njikọ akụ̀ na ụba na njedebe nke esemokwu mba ndị bụ́ dike ebelatawo ọnụ ọgụgụ agha ndị a na-alụ n’etiti mba na mba, ma agha obodo ndị dị oké njọ ka nọgidere na-egbu ma na-akwarụ ọtụtụ narị puku ndị mmadụ kwa afọ.

N’ihi gịnị? N’ihi na ịkpọasị nke dị n’etiti agbụrụ na òtù okpukpe ndị na-asọrịta mpi—isi ihe na-akpata agha obodo—eyighị ka ọ̀ ga-ebelata. Azụmahịa zuru ụwa ọnụ na òtù ndị omekome dị iche iche na-ejidekwa n’aka na e nwere ụba ngwá agha ndị na-adịghị oké ọnụ iji mee ka akụkụ abụọ na-eburịta agha nwee nnọọ ngwá agha. Ngwá ọrụ electronic apụghị iweta ezi ịdị n’otu. Ọganihu nke ụlọ ahịa ego adịghịkwa akwalite ịha nhata n’etiti ọha mmadụ.

N’ụzọ ụfọdụ, ijikọ ụwa n’ụzọ akụ́ na ụba pụrụ n’ezie iso kpata adịghị n’otu. Mgbe ndalata akụ̀ na ụba sochiri mmụba azụmahịa, ndị ogbenye pụrụ ịghọ anụ oriri nye ndị ndọrọ ndọrọ ọchịchị na-emebiga ihe ókè bụ́ ndị na-eji mkpesa ndị metụtara akụ̀ na ụba eme ihe maka nzube nke ha. Gịnị bụ ngwọta ya? “A ghaghị inwe ụdị ọchịchị ọhụrụ nke mba na nke ụwa nile—na-abụ nke ọganihu na ịha nhata nke ụmụ mmadụ bụ ihe kasị mkpa na ya,” ka akwụkwọ bụ́ Human Development Report 1999 na-ekweta. Nke ahụ bụ kpọmkwem ihe Alaeze Chineke ga-eme.

[Foto ndị dị na peeji nke 25]

Usoro nkụzi Bible zuru ụwa ọnụ nke Ndịàmà Jehova na-eduzi enyewo aka n’ime ka ndị si ná nzụlite nile dị n’otu