Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Olee Ụzọ M Pụrụ Isi Chọta Ezi Mmadụ Mụ na Ya Ga-ebi?

Olee Ụzọ M Pụrụ Isi Chọta Ezi Mmadụ Mụ na Ya Ga-ebi?

Ndị Na-eto Eto Na-ajụ Sị . . .

Olee Ụzọ M Pụrụ Isi Chọta Ezi Mmadụ Mụ na Ya Ga-ebi?

“E wezụga inwe ndị mụ na ha bi, ọ dịghị otú m gaara esi jee ozi dị ka onye na-ezisa ozi ọma oge nile ma kwụọ ụgwọ ụlọ na mmefu ndị ọzọ.”—Lynn. *

MGBE ndị na-eto eto hapụrụ ụlọ, ọ na-ejukarị ha anya ịhụ nnọọ ihe ọ na-ewe iji bie ndụ n’ime ‘ụwa n’ezie.’ Nye ọtụtụ ndị, ụzọ ha si enwe ike emeri ịda oké ọnụ nke ihe ndị e ji ebi ndụ bụ iso otu onye ma ọ bụ abụọ nke ha na ha bi na-ekerịta ịkwụ ụgwọ mmefu ahụ.

Ma dị ka isiokwu bu ụzọ n’usoro isiokwu a kwuru, gị na mmadụ ibikọ—karịsịa onye ị na-amabughị ma ọlị—pụrụ ịbụ ezigbo ihe ịma aka. * Nke a bụ eziokwu ọbụna n’etiti ndị na-eto eto bụ́ Ndị Kraịst, bụ́ ndị na-ebikọ ọnụ iji nwee ike ije ozi dị ka ndị na-ezisa ozi ọma oge nile. N’agbanyeghị ihe bụ́ ọnọdụ gị kpọmkwem, ọ bụrụ na ị na-eche echiche inwe onye gị na ya ga-ebikọ, ọ bụ ihe ezi uche dị na ya iji “ezi amamihe” mee ihe n’ịhọrọ onye ọ ga-abụ. *Ilu 3:21, NW.

Ihe Ize Ndụ nke Mkpakọrịta Ọjọọ

Ọtụtụ ndị ntorobịa na-aga na bọọdụ mkpọsa ozi, mkpọsa ozi ndị a na-ahụ n’akwụkwọ akụkọ nakwa n’Intanet iji chọta onye ha na ha nwere ike ibi. Ma nye Ndị Kraịst na-eto eto, e nwere nnukwute ihe ize ndụ na-adị n’ebe ndị dị otú ahụ. O yiri ka ha ga-eduga gị n’izute ndị gị na ha na-enweghị otu okwukwe, omume, ma ọ bụ otu ụkpụrụ. Ọ̀ bụ anabataghị ndị ọzọ ma ọ bụ adịghị eso ndị ọzọ emekọ ihe gị ịchọ ka gị na nanị onye gị na ya nwere otu okwukwe biri? Ee e, ọ bụ ihe amamihe dị na ya. Bible n’onwe ya na-adụ ọdụ, si: “Mkpakọrịta ọjọọ na-emebi àgwà bara uru.”—1 Ndị Kọrint 15:33.

Tụlee ihe banyere otu nwa agbọghọ aha ya bụ Lee. Ọ ghọbeghị Onye Kraịst e mere baptizim mgbe ọ malitere ibi n’ụlọ obibi nke otu mahadum. “Ọ bụ ebe dị ize ndụ,” ka ọ na-echeta. “Ụfọdụ n’ime ụmụ agbọghọ ahụ na-alọta n’ụlọ ma hụ ka onye ha na ha bi na-enwe mmekọahụ.” N’oge na-adịghị anya, ibi ebe ahụ nwere mmetụta na-adịghị mma n’ọnọdụ ime mmụọ Lee. “Anaghị m agakwa ihe ka ukwuu ná nzukọ Ndị Kraịst,” ka o kwetara. N’abụghị ihe ijuanya, omume ya nọgidere na-ajọwanye njọ. “Otu ụbọchị, eji m okwu rụrụ arụ mee ihe, ma otu n’ime ụmụ agbọghọ ndị ahụ jụrụ m, sị: ‘Jehova ọ̀ nabatara nke ahụ?’” Leenụ ihe mweda n’ala ọ bụ! N’ụzọ na-enye obi ụtọ, Lee si n’ebe ahụ na-adịghị mma pụta ma malite inwe ọganihu n’ụzọ ime mmụọ. Ma ahụmahụ ya na-egosi ihe ize ndụ dị n’iso ndị na-adịghị akwanyere ụkpụrụ omume gị ùgwù biri.

Ịchọta Ndị Ezi Mmadụ Gị na Ha Ga-ebi

Mgbe ahụ, olee ebe ị pụrụ ịchọ? Malite n’ọgbakọ Ndịàmà Jehova nke ị nọ na ya. N’ụzọ na-enye obi ụtọ, ndị na-ezisa ozi ọma oge nile na-ahụkarị ndị na-eto eto ndị ọzọ ji ihe ime mmụọ kpọrọ ihe n’ụlọ akwụkwọ na ná nzukọ dịgasị iche iche a na-enwe maka ndị nkwusa oge nile. * Ndị nne na nna, ndị okenye ọgbakọ, ndị nlekọta na-ejegharị ejegharị, na ndị ọzọ pụkwara inye aka; ha pụrụ ịma ụfọdụ ndị na-eto eto bụ́ ndị pụrụ ịbụ ndị kwesịrị ekwesị iso biri.

Ịgwa ndị ọzọ banyere ya pụkwara ịbụ ngwá ọrụ dị ike. Ka ị na-akọrọ ọtụtụ ndị mkpa gị, otú ahụ ka o yikarịrị ka ị ga-achọta ihe ị na-achọ. (Eklisiastis 11:6) Karịsịa, rịọ Jehova maka enyemaka iji chọta onye gị na ya ga-ebi, daberekwa n’ebe ọ nọ maka ịgọzi mgbalị gị.—1 Jọn 5:14, 15.

Ime Nchọpụta

Ebe ị chọtaworo onye gị na ya nwere ike ibi, ị pụrụ inwe agụụ ka gị na ya biri ozugbo. Ma ọ bụ ihe amamihe dị na ya ibu ụzọ mee nchọpụta ụfọdụ. Ụmụnna nọ n’ọgbakọ hà “na-akọ akụkọ ọma banyere” onye ahụ? (Ọrụ 16:1, 2) Ikekwe, gị na ndị mụrụ gị pụrụ isoro ụfọdụ ndị maara ya, bụ́ ndị ruru eru n’ụzọ ime mmụọ, kwurịta banyere ya. Ị pụrụ ịjụ, sị: ‘Ụdị aha dị aṅaa ka o nwere? Ọ̀ bụ onye kwụsiri ike n’ụzọ ime mmụọ na n’ụzọ mmetụta uche? Ọ̀ na-ekere okè n’ikwusara ndị ọzọ ozi ọma na n’ịza ajụjụ ná nzukọ? Ọ̀ bụ onye e ji ezi àgwà mara?’

Cheta na onye ‘na-ejeso ndị maara ihe, ga-amakwa ihe.’ (Ilu 13:20) “Onye mụ na ya bi ji nnọọ ihe ime mmụọ kpọrọ ihe,” ka David na-ekwu. “Nke ahụ na-enyere m aka ịnọgidesi ike ijiri ihe ime mmụọ na-akpọrọ ihe.” Renee, bụ́ onye ya na ọtụtụ ndị biworo na-ekwu n’otu aka ahụ, sị: “Ụfọdụ n’ime ndị mụ na ha biri na-atụ aro ka anyị na-agụkọta otu isiakwụkwọ Bible ọnụ kwa abalị. Ebe ọ bụ na ndị mụrụ m abụghị Ndịàmà, anyị enwetụbeghị ọmụmụ Bible ezinụlọ. N’ihi ya, iso ndị mụ na ha bi na-enwe ‘ọmụmụ ihe ezinụlọ’ bụụrụ m nnọọ ihe magburu onwe ya!” Ee, inwe onye gị na ya bi nke nwere otu ụdị ịhụnanya ahụ i nwere maka ihe ime mmụọ bụ nnọọ ihe ngọzi.

Inwe Ezi Nkwurịta Okwu

Ọzọkwa, nọkọtanụ ma kwurịta okwu. Mkparịta ụka ndị dị otú ahụ pụrụ inyere unu aka ịchọpụta ma àgwà unu ò kwekọrọ. N’ụzọ na-adọrọ mmasị, otu nchọpụta a kọrọ maka ya n’akwụkwọ bụ́ Communication Research Reports kpughere na ndị na-ebikọ ọnụ bụ́ ndị nwere otu ụdị àgwà nke nkwurịta okwu “kasị nwee mmasị nakwa afọ ojuju n’ebe ndị ha na ha bi nọ.” Ya mere, ọ bụrụ na ị bụ ụdị onye na-ekwupụta ihe dị ya n’obi, nke na-eso ndị ọzọ akpakọrịta, ma na-ekwupụta mmetụta ya, ị pụrụ inwe nsogbu gị na onye na-adịghị ekwupụta obi ya, nke na-adịghị ekwukebe okwu, ma na-achọ ịnọ nanị ya, ibi.

Ọ bụ ezie na ị chọghị ime ka nkwurịta okwu unu ghọọ ịgba ajụjụ ọnụ nke ndị uwe ojii, ọ na-enye aka gị na onye gị na ya chọrọ ibi ịtụle ihe mgbaru ọsọ na atụmatụ ndị a na-achọ imezu mgbe ahụ. Onye ahụ ọ̀ na-achọ inwe ọganihu ime mmụọ ka ọ̀ chọrọ nanị ịgbanahụ ọnọdụ ndị na-adịghị mma dị n’ụlọ? Lynn hotara nsogbu ọzọ nke pụrụ ibilite: “E nwere onye mụ na ya biri nke na-eyi oge mkpapụ, enyi ya nwoke na-abịakwa mgbe nile, na-anọgide ruo n’ime abalị.” Lynn lere ngosipụta ịhụnanya ha anya dị ka nke na-ekwesịghị ekwesị na nke na-akpasu iwe. Otú ọ dị, a pụrụ izere ụdị nsogbu ndị ahụ ma ọ bụrụ na e nwere iwu ndị e buru ụzọ mee. Dị ka ihe atụ, Renee na-ekwu, sị: “Anyị tiri iwu na ụmụ nwoke agaghị anọfe otu oge a kapịrị ọnụ.” Ọ ga-adịkwa mma ka ndị ahụ na-ebikọ ọnụ kwekọrịta na ha na onye na-abụghị nwoke ma ọ nwanyị ibe ha agaghị anọ nanị ha n’otu ọnụ ụlọ ma ọ bụ ebe obibi.

Ọ bakwara uru ikwurịta ihe ndị dị ka ihe omume ntụrụndụ, ihe ndị na-amasị mmadụ, na ụdị egwú na-amasị mmadụ. “M ga-enwe mmasị iso onye mụ na ya nwere mmasị n’otu ụdị ihe, onye mụ na ya nwere otu ụdị àgwà, onye nwere mmasị n’ime otu ụdị ihe m na-eme na-ebikọ,” ka Mark na-ekwu. N’ezie inwe ụdị ihe ndị dị iche na-amasị unu apụtaghị na unu apụghị ibikọ ọnụ. Ihe bụ nsogbu bụ, Ruo ókè hà aṅaa ka unu pụrụ ime mgbanwe? Ùnu dị njikere ịnakwere ndịrịta iche ma mee mgbanwe iji nabata ibe unu?

Lee na-atụ aro, sị: “I kwesịkwara ịjụ ihe onye nke ọzọ na-atụ anya ya ná ndokwa ahụ. Ndị ụfọdụ na-atụ anya ka ị bụrụ enyi ha kachasị nọrọ ha nso. Ma nke ahụ abụghị ihe m chọrọ.” N’otu aka ahụ David na-ekwu, sị: “Enwere m mmasị n’onye mụ na ya ga-ebi, onye mụ na ya ga na-emekọ ihe ma ọ gaghị na-eche na ya aghaghị ịdị na-esonyere m mgbe nile m chọrọ ka mụ na ndị ọzọ mekọọ ihe.” N’otu aka ahụ, chọpụta ma onye ahụ ò nwere mmasị iso gị rụkọọ ọrụ nke izisa ozi ọma ahụ, ka ò nwere ihe ọzọ o bu n’obi, dị ka ije ozi n’ọgbakọ na-asụ asụsụ ala ọzọ.

N’ikpeazụ, jide n’aka na unu elegharaghị ihe ndị dị ka isi nri (unu abụọ ùnu maara esi nri?) anya, ikerịta ọrụ ụlọ, iji ngwá ụlọ eme ihe, iji ohere dị n’ụlọ ebe a na-ekowe ákwà, oche, ohere dị n’ebe ịkwasa ihe, na ụmụ anụ ndị e ji mere enyi, eme ihe. Ikwurịta ihe ndị dị otú ahụ pụrụ igbochi nghọtahie na mkpasu iwe. Ilu 20:18 na-ekwu, sị: “Echiche nile na-eji ndụmọdụ guzosie ike.”

“N’ụzọ Kwesịrị Ekwesị Nakwa Dị Ka Ndokwa Si Dị”

A na-achọta ụkpụrụ ọzọ na-enye aka na Luk 14:28, ebe o kwuru, sị: “Gbakọọ ihe ọ ga-efu.” Ee, gbalịa ịgbakọ ihe ị ga na-emefu iji bie ndụ. Ego ole ka ị ga-emefu n’ụgwọ ụlọ? N’ihe oriri? N’ụgwọ ọkụ na mmiri? Ùnu ga-eji otu telifon na-eme ihe? Ọ bụrụ otú ahụ, olee otú unu ga-esi kewaa ego ya? “Ọ ga-edo m nnọọ anya na nwa agbọghọ ahụ ga-enwe ike ịkwụ ụgwọ nke ya tupu mụ anabata ya dị ka onye mụ na ya ga-ebi,” ka Lynn na-ekwu. Magazin a na-enweta ihe odide ya na kọmputa, bụ́ The Next Step na-ekwu n’ụzọ ziri ezi, sị: “Ndị ha na mmadụ bi bụ́ ndị na-adịghị enye aka n’ịkwụ ụgwọ ụlọ ma ọ bụ ụgwọ ihe oriri . . . ma ọ bụ ndị na-akpata ụgwọ ọkụ na mmiri ibu ibu na-akpata nnọọ nchekasị ọ na-adịghị onye chọrọ ya.”

“Mgbe ụfọdụ nsogbu abụghị ego ole a ga-akwụ,” ka Renee na-ekwu, “kama mgbe a ga-akwụ ya!” Ọ na-akọwa, sị: “Anyị na-akwụ ụgwọ ụlọ anyị n’ụbọchị nke atọ nke ọnwa ọ bụla. Ma mgbe ụfọdụ, onye mụ na ya bi nwere ike mee njem ná ngwụsị izu tupu o weta nke ya, m ga-agakwa rịọ onye nwe ụlọ arịrịọ.” N’ụzọ doro anya, ọ bụ ihe amamihe dị na ya ime ihe nile “n’ụzọ kwesịrị ekwesị nakwa dị ka ndokwa si dị,” ọ bụghị ịhapụ ihe ndị dị mkpa ka ọ bụrụ mgbe ọ dabara. (1 Ndị Kọrint 14:40) Ọtụtụ mgbe, ọ na-abụ ihe amamihe dị na ya ide ihe ndị e kwekọrịtara na ha ede.

Iji nlezianya na nghọta eme ihe na-eme ka ohere i nwere ịchọta onye gị na ya ga-ebi, nke ga-abụrụ gị ihe ngọzi kama iwetara gị nchekasị, bukwuo ibu. Otú ọ dị, gịnị ma ọ bụrụ na nsogbu na ndịrịta iche nke àgwà ebilite? Isiokwu ga-apụta n’ihu ga-atụle ọnọdụ ndị a.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

^ par. 3 A gbanwewo aha ụfọdụ.

^ par. 5 Lee isiokwu bụ́ “Gịnị Mere O Ji Sie Oké Ike Mụ na Onye Mụ na Ya Bi n’Otu Ọnụ Ụlọ Ibikọ?,” bụ́ nke pụtara ná mbipụta anyị nke May 8, 2002.

^ par. 5 N’ihi eziokwu ahụ bụ́ na ọtụtụ ndị na-ebikọ ọnụ taa n’ihi nzube nke ime omume ndị rụrụ arụ, anyị na-emesi ya ike na isiokwu a na-ekwu banyere nwoke na nwoke ma ọ bụ nwanyị na nwanyị na-ebikọ ọnụ bụ́ ndị na-ebikọ ọnụ n’ihi ihe metụtara ego na iji mee ka ihe dị mfe.

^ par. 10 Ndị na-ezisa ozi ọma oge nile nwere ihe ùgwù nke ịga Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọsụ Ụzọ. A na-esokwa ndị na-ezisa ozi ọma oge nile enwe nzukọ n’oge mgbakọ sekit ndị a na-enwe kwa afọ.

[Foto dị na peeji nke 29]

E nwere ihe ize ndụ ndị dị n’isoro ndị na-adịghị agbaso ụkpụrụ omume nke Bible biri

[Foto dị na peeji nke 29]

Tupu i kweta iso mmadụ biri, nọkọtanụ ma kwurịta ihe ndị dị mkpa