Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Olee Otú Eluigwe na Ala na Ndụ Si Malite?

Olee Otú Eluigwe na Ala na Ndụ Si Malite?

Olee Otú Eluigwe na Ala na Ndụ Si Malite?

“Sayensị okpukpe na-abataghị na ya dara ngwụrọ, okpukpe sayensị na-abataghị na ya kpuru ìsì.”—Albert Einstein.

ANYỊ na-ebi n’oge ihe ndị na-eju anya na-eme n’ọ̀tụ̀tụ̀ a na-ahụtụbeghị. Ihe ọhụrụ ndị a chọpụtara na mbara igwe na-amanye ndị na-enyocha mbara igwe ịgbanwe echiche ha banyere mmalite eluigwe na ala. Eluigwe na ụwa na-atụ ọtụtụ ndị mmadụ n’anya, ha na-ajụkwa ajụjụ oge ochie ndị ahụ ọnụnọ anyị nọ n’ime ya na-akpali: Olee otú eluigwe na ala na ndụ si malite, n’ihi gịnịkwa?

Ọ bụrụgodị na anyị eleba anya n’akụkụ nke ọzọ—n’ime onwe anyị—ihe ndị a chọpụtara ọhụrụ n’ụkpụrụ nke mkpụrụ ndụ ihe nketa mmadụ, na-akpali ajụjụ ndị bụ́: Olee otú e si kee imerime ụdị ihe dị iche iche dị ndụ? Ọ̀ bụkwa onye kere ha ma ọ bụrụ na ọ dị? Ịdị nnọọ mgbagwoju anya nke ụkpụrụ nke mkpụrụ ndụ ihe nketa anyị kpaliri otu president United States ikwu na “anyị na-amụ usoro ihe ọmụma dị ná mkpụrụ ndụ ihe nketa nke Chineke ji kee ihe ndị dị ndụ.” Otu n’ime ndị nduzi nke ndị ọkà mmụta sayensị ahụ so kọwaa ihe ọmụma dị ná mkpụrụ ndụ ihe nketa ahụ, ji obi umeala kwuo, sị: “Anyị ahụwo akụkụ mbụ dị nta nke akwụkwọ ntụziaka nke ahụ́ mmadụ, bụ́ nke nanị Chineke mabu.” Ma ajụjụ ahụ ka dị—olee otú eluigwe na ala si malite, n’ihi gịnịkwa?

“Windo Abụọ”

Ụfọdụ ndị ọkà mmụta sayensị na-azọrọ na a pụrụ ịkọwa usoro ịrụ ọrụ nile nke eluigwe na ala site n’ime nyocha ezi uche dị na ya, n’adabereghị n’amamihe Chineke. Ma ọtụtụ ndị, gụnyere ndị ọkà mmụta sayensị, anabataghị echiche ahụ. Ha na-agbalị ịghọta ihe otú ihe dị n’ezie site n’ilega anya ma na sayensị ma n’okpukpe. Ha na-eche na sayensị na-eme ka a mata otú ndụ anyị na eluigwe na ụwa anyị nọ n’ime ya si malite, ebe okpukpe, n’ụzọ bụ́ isi, na-eme ka a mata ihe mere ha ji malite.

N’ịkọwa akụkụ abụọ a, ọkà n’ihe ọmụmụ physics, bụ́ Freeman Dyson, kwuru, sị: “Sayensị na okpukpe bụ windo abụọ ndị mmadụ na-esi elepụ anya, na-agbalị ịghọta nnukwute eluigwe na ala nke dị n’èzí.”

“Sayensị na-akọwa ihe a pụrụ ịtụ n’ihe ọ̀tụ̀tụ̀, okpukpe na-akọwa ihe a na-apụghị ịtụ n’ihe ọ̀tụ̀tụ̀,” ka onye na-ede akwụkwọ bụ́ William Rees-Mogg, kwuru. O kwuru, sị: “Sayensị apụghị ịnwapụta ma ọ bụ ịgbagha ịdị adị nke Chineke, dịkwa ka ọ na-apụghị ịnwapụta ma ọ bụ ịgbagha echiche ọ bụla e nwere banyere omume ma ọ bụ ịma mma. Ọ dịghị echiche sayensị na-egosi na mmadụ kwesịrị ịhụ onye agbata obi ya n’anya ma ọ bụ ịkwanyere ndụ mmadụ ùgwù . . . Ịrụ ụka na ọ dịghị ihe dị adị a na-apụghị ịnwapụta n’ụzọ nkà mmụta sayensị bụ ihie ụzọ kasị njọ, bụ́ nke ga-akachapụ ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ ihe nile anyị ji akpọrọ ihe ná ndụ, ọ bụghị nanị Chineke ma ọ bụ ọgụgụ isi, kamakwa ịhụnanya na abụ uri na egwú.”

“Okpukpe” nke Sayensị

Nchepụta nke ndị ọkà mmụta sayensị yiri ka ọ na-adaberekarị n’echiche ndị na-achọ ụdị okwukwe nke ha. Dị ka ihe atụ, a bịa n’ihe banyere mmalite nke ndụ, ihe ka ọtụtụ ná ndị kwere n’evolushọn na-arapagidesi ike n’echiche ndị na-achọ inwe okwukwe ‘n’ozizi’ ụfọdụ kpọmkwem. A na-agwakọta ihe ndị bụ́ eziokwu na ihe ndị e chepụtara echepụta. Mgbe ndị ọkà mmụta sayensị jikwa ikike ha nwere eme ihe iji manye ndị mmadụ iji ìsì kwere n’evolushọn, n’ezie ha na-enye echiche bụ́ na: ‘Ị pụghị ịchịkwa omume gị n’ihi na ị bụ nanị ihe sitere na nkà mmụta ihe ndị dị ndụ, mmụta ọdịdị na mgbanwe ọnọdụ ihe, na physics.’ Ọkà mmụta ihe ndị dị ndụ bụ́ Richard Dawkins kwuru na n’eluigwe na ala ‘ụkpụrụ adịghị, nzube adịghị, ihe ọma na ihe ọjọọ adịghị, ọ dịghị ihe ọ bụla dịnụ ma ọ bụghị omume ọ gbasaghị m na-enweghị isi.’

Iji jigide nkwenkwe ndị dị otú ahụ, ụfọdụ ndị ọkà mmụta sayensị na-ahọrọ ileghara nnyocha miri emi nke ndị ọkà mmụta sayensị ndị ọzọ anya, bụ́ ndị na-emegide ihe ndị bụ́ isi ha chepụtara iji kwadoo ozizi nke mmalite nke ndụ. Ọ bụrụgodị na ọtụtụ ijeri afọ agafeela, e gosiwo na mmepụta mberede nke ụmụ irighiri ihe ndị dị mgbagwoju anya bụ́ ndị dị mkpa maka mmepụta nke mkpụrụ ndụ nke na-arụ ọrụ nke ọma agatụghị ekwe omume. * N’ihi ya, a ghaghị iwere ozizi ndị e ji ikwesi olu ike na-ezi banyere mmalite nke ndụ bụ́ ndị dị n’ọtụtụ akwụkwọ ọgụgụ dị ka ndị na-ezighị ezi.

Ikwere na ndụ malitere site n’ihe ndapụta efu chọrọ mmadụ iji okwukwe mee ihe karịa ka ikwere n’okike chọrọ. Onye na-enyocha mbara igwe bụ́ David Block, kwuru, sị: “Onye na-ekweghị n’Onye Okike aghaghị inwe okwukwe karịa onye kwere na ya. Mmadụ ikwupụta na Chineke adịghị, bụ ikwu ihe a na-akapịghị ọnụ nke a na-apụghị ịnwapụta anwapụta—nzọrọ dabeere n’okwukwe.”

Ihe ndị sayensị chọpụtara pụrụ ime ka ụfọdụ ndị ọkà mmụta sayensị nwee àgwà nsọpụrụ dị omimi. Albert Einstein kwetara, sị: “N’etiti ndị ọkà mmụta sayensị nwere oké amamihe, o sikata ike ka ị hụ onye nke na-enweghị echiche okpukpe nke ya. . . . Echiche okpukpe na-abịa n’ụdị nke inwe nnukwute ihe ijuanya n’ihi nkwekọ e nwere n’iwu na-achịkwa ihe ndị dị adị, bụ́ nke na-egosipụta ụdị ọgụgụ isi dị nnọọ elu, nke na e jiri ya tụnyere nke mmadụ, ụkpụrụ nile a haziri ahazi nke iche echiche ụmụ mmadụ na ụzọ ha si eme ihe achịtaghịdị ájá ma ọlị.” Ma, nke a adịchaghị eme ka ndị ọkà mmụta sayensị kwere n’Onye Okike, Chineke bụ́ onye.

Ihe Ndị Sayensị Na-apụghị Ime

O ziri ezi inwe nkwanye ùgwù kwesịrị ekwesị maka ihe ọmụma nkà mmụta sayensị na ihe ndị ọ rụzuru. Otú ọ dị, ọtụtụ ndị ga-ekweta na ọ bụ ezie na sayensị na-egosi ụzọ isi mata ihe, ọ bụghị nanị ya na-enye ihe ọmụma. Nzube nke sayensị bụ ịkọwa ihe ịtụnanya ndị na-eme n’ihe ndị e kere eke na inye aka kọwaa otú ihe ịtụnanya ndị a si mee.

Sayensị na-eme ka anyị ghọtakwuo eluigwe na ala a na-ahụ anya, nke pụtara ihe ọ bụla a pụrụ ịhụ anya. Ma n’agbanyeghị otú sayensị nweruworo ọganihu n’ịchọpụta ihe, ọ pụghị ịza ajụjụ banyere nzube—ihe mere eluigwe na ala ji dịrịdị adịrị.

“E nwere ụfọdụ ajụjụ ndị ọkà mmụta sayensị na-apụghị ịza,” ka onye na-ede akwụkwọ bụ́ Tom Utley, kwuru. “Ọ pụrụ ịbụ na Oké Ntiwapụ ahụ weere ọnọdụ ijeri afọ 12 gara aga. Ma gịnị mere o ji mee? . . . Olee otú ụmụ ihe ndị mejupụtara ya si bịa dịrị? Gịnị dịbu ebe ahụ?” Utley kwubiri, sị: “O yiri ka . . . o dowo anya karịa mgbe ọ bụla ọzọ na sayensị agaghị emeju ọchịchọ ụmụ mmadụ na-achọ azịza ma ọlị.”

Ihe ọmụma sayensị e nwetara site n’ime nnyocha dị otú ahụ, n’abụtụghị nke na-egosi na Chineke adịghị mkpa, anwapụtawo nnọọ na e nwere nnukwute ụwa dị mgbagwoju anya, nke siri ike nghọta, na nke dị egwu bụ́ nke anyị bi n’ime ya. Ọtụtụ ndị nwere ọgụgụ isi na-ahụ ya dị ka ihe ezi uche dị na ya ikwubi na iwu ndị na-achị ihe e kere eke na mgbanwe mmiri ọgwụ nakwa DNA na ndịrịta iche dị ịtụnanya nke ndụ, na-egosicha na e nwere Onye Okike. E nweghị ihe àmà na-emegide nke ahụ.

‘Okwukwe Bụ Ihe Dị Adị’

Ọ bụrụ na e nwere Onye Okike mere eluigwe na ala, anyị apụghị ịtụ anya ịghọta onye ọ bụ ma ọ bụ ịghọta nzube ya site n’iji enyo e ji ahụ ihe dị anya, ígwè microscope, ma ọ bụ ngwá ọrụ ndị ọzọ nke sayensị eme ihe. Chee banyere ọkpụite na ite ọ kpụrụ. Ọ dịghị ókè a pụrụ inyocharu ite ahụ n’onwe ya pụrụ ịkọwa ihe mere e ji mee ya. Iji mata ya, anyị aghaghị ịjụ ọkpụite ahụ n’onwe ya.

Ọkachamara n’ihe banyere ụmụ irighiri ihe ndị dị ndụ bụ́ Francis Collins kọwara otú okwukwe na iji ihe ime mmụọ kpọrọ ihe pụrụ isi nye aka mechie oghere ahụ sayensị kpatara: “Agaghị m atụ anya ka okpukpe bụrụ ụzọ kwesịrị ekwesị isi ghọta ihe banyere chromosome dị n’ahụ́ mmadụ, n’otu aka ahụkwa agaghị m atụ anya ka sayensị bụrụ ụzọ isi nweta ihe ọmụma banyere ike karịrị ike mmadụ. Ma n’ihe banyere ajụjụ ndị kasị dịrị ịrịba ama n’ezie, ndị dị ka ‘N’ihi gịnị ka anyị ji nọrọ n’ebe a? ma ọ bụ ‘N’ihi gịnị ka agụụ ihe ime mmụọ ji agụ ụmụ mmadụ?,’ sayensị adịghị enye azịza na-eju m afọ. Ọtụtụ nkwenkwe ụgha apụtawo ma jirizie nwayọọ nwayọọ laa. Okwukwe emebeghị otú ahụ, bụ́ nke na-egosi na ọ bụ ihe dị adị.”

Ịkọwa Ihe Mere Eluigwe na Ala na Ndụ Ji Malite

N’ịza ajụjụ banyere ihe mere eluigwe na ala na ndụ ji malite nakwa n’ịkọwa nzube nke ndụ, ezi okpukpe na-enyekwa ụkpụrụ a ga-agbaso n’ihe banyere ụkpụrụ omume ọma, omume, nakwa nduzi ná ndụ. Ọkà mmụta sayensị bụ́ Allan Sandage kwupụtara ya otú a, sị: “Adịghị m eme nnyocha n’akwụkwọ nkà mmụta ihe ndị dị ndụ iji mụta ụzọ m ga-esi ebi ndụ.”

Ọtụtụ nde ndị mmadụ gburugburu ụwa na-eche na ha achọtawo ebe ha ga-aga iji mụta ụzọ ha ga-esi ebi ndụ. Ha na-echekwa na ha achọtawo azịza ndị na-eju afọ n’ezie nye ajụjụ ndị bụ́: N’ihi gịnị ka anyị ji nọrọ n’ebe a? Oleekwa ebe anyị na-aga? Azịza ha dị. Ma olee ebe ha dị? Ọ bụ n’akwụkwọ dị nsọ kasị ochie nakwa nke a kasị ekesa n’ebe nile, bú Bible.

Bible na-agwa anyị na Chineke bu ụmụ mmadụ n’obi karịsịa wee kwadebe ụwa. Aịsaịa 45:18 na-ekwu banyere ụwa, sị: ‘Chineke ekeghị ya ka ọ burụ ihe tọgbọrọ n’efu, ọ bụ ka e wee biri n’ime ya ka Ọ kpụrụ ya.’ Ọ kwadebekwara ụwa tinye ya ihe nile ga-adị ụmụ mmadụ mkpa, ọ bụghị nanị iji dịrị ndụ kamakwa iji nụ ụtọ ndụ n’ụzọ zuru ezu.

E nyere ụmụ mmadụ ọrụ ilekọta ụwa, “ịrụ ọrụ ya na idebe ya.” (Jenesis 2:15) Bible na-akọwakwa na ihe ọmụma na amamihe bụ onyinye sitere n’aka Chineke nakwa na anyị kwesịrị igosi ịhụnanya na ikpe ziri ezi n’ebe ibe anyị nọ. (Job 28:20, 25, 27; Daniel 2:20-23) N’ihi ya, ụmụ mmadụ pụrụ ịchọta nzube ná ndụ nanị mgbe ha chọtara ma nabata ihe Chineke zubere maka ha. *

Olee otú onye nwere ọgụgụ isi n’oge a pụrụ isi mechie ihe ahụ yiri oghere dị n’etiti echiche sayensị na nkwenkwe okpukpe? Olee ụkpụrụ nduzi ndị pụrụ inyere mmadụ aka imezu nke ahụ?

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

^ par. 11 Lee isiokwu Ụlọ Nche nke June 15, 1999, “Onye Okike Pụrụ Ime Ka Ndụ Gị Nwee Nzube,” bụ́ nke Ndịàmà Jehova bipụtara.

^ par. 26 Iji nwetakwuo ntụle zuru ezu, lee broshuọ bụ́ Gịnị Bụ Nzube nke Ndụ? Olee Otú Ị Pụrụ Isi Chọta Ya?, bụ́ nke Ndịàmà Jehova bipụtara.

[Igbe/Foto ndị dị na peeji nke 7]

Ihe Ụfọdụ Ndị Ọkà Mmụta Sayensị Na-ekwu

Ụfọdụ ndị na-eche na ihe ka ọtụtụ ná ndị ọkà mmụta sayensị na-agbara okwu banyere ihe ime mmụọ na nkà mmụta okpukpe ọsọ n’ihi na ha adịghị eji okpukpe akpọrọ ihe ma ọ bụ na ha adịghị achọ ikere òkè n’arụmụka ahụ dị n’etiti sayensị na okpukpe. Ọ bụ otú ahụ ka ọ dị n’ebe ụfọdụ ndị ọkà mmụta sayensị nọ ma ọ bụghị ha nile. Rịba ama ihe ndị ọkà mmụta sayensị na-esonụ nwere ikwu.

“Eluigwe na ala nwere mmalite ma ihe ndị ọkà mmụta sayensị na-apụghị ịkọwa bụ ihe mere o ji dịrị. Azịza ya bụ Chineke.” “Ana m ele Bible anya dị ka akwụkwọ eziokwu na nke sitere n’ike mmụọ nsọ Chineke. A ghaghị inwe onye nwere ọgụgụ isi kere ihe ndị dị mgbagwoju anya ná ndụ.”—Ken Tanaka, bụ́ ọkà mmụta banyere mbara ala n’Ụlọ Ọrụ United States Na-enyocha Ọdịdị Ime Ala.

“Oghere dị n’etiti ihe ọmụma dịgasị iche iche (nke nkà mmụta sayensị na nke okpukpe) bụ ihe aka mere. . . . Ihe ọmụma banyere Onye Okike na ihe ọmụma banyere ihe ndị e kere eke nwere njikọ chiri anya.”—Enrique Hernández, bụ́ onye nchọpụta na prọfesọ ná Ngalaba Ihe Ọmụmụ “Physics” na Mmụta Ọdịdị na Mgbanwe Ọnọdụ Ihe, na Mahadum National Autonomous nke Mexico.

“Ka anyị na-echepụta ihe ọmụma a nile [banyere chromosome mmadụ], ọ ga-eme ka a mata ịdị mgbagwoju anya, ndabererịta nke ihe ndị a nile. Ọ ga-atụ aka ná mmalite dị ka ihe sitere n’aka onye okike nwere ọgụgụ isi, onye nwere ọgụgụ isi nke na-eme ka ihe mee.”—Duane T. Gish, ọkà mmụta mmiri ọgwụ ndị mejupụtara ihe ndị dị ndụ.

“Sayensị na okpukpe abụghị ihe ndị na-enweghị nkwekọrịta. Ha abụọ na-achọ otu eziokwu ahụ. Sayensị na-egosi na Chineke dị adị.”—D.H.R. Barton, prọfesọ ná mmụta ọdịdị na mgbanwe ọnọdụ ihe, na Texas.

[Ebe E Sigasị Nweta Foto]

NASA/Ụlọ Ọrụ United States Na-enyocha Ọdịdị Ime Ala

Foto: www.comstock.com

NASA na Hubble Heritage Team (STScI/AURA)

[Foto ndị dị na peeji nke 5]

Nchọputa sayensị ọ̀ pụrụ ikwu ihe mere anyị ji nọrọ n’ebe a?

[Ebe E Sigasị Nweta Foto]

Site n’ikike nke Arecibo Observatory/David Parker/Science Photo Library

[Ebe E Si Nweta Foto Dị na peeji 6]

Kpakpando ndị dị na peeji nke 2, 3, 5, nakwa n’elu peeji nke 7: National Optical Astronomy Observatories