Sayensị na Okpukpe—Ọgụ Dị n’Etiti Ha
Sayensị na Okpukpe—Ọgụ Dị n’Etiti Ha
“Ọ̀ kasị mma ịghọta okpukpe dị ka ọrịa na-efe efe nke uche?”—Ọkà mmụta ihe ndị dị ndụ bụ́ Richard Dawkins.
MGBE ụfọdụ a na-ele okpukpe na sayensị anya dị ka ajọ ndị iro. Nye ụfọdụ ndị, o yiri ka hà nọ n’ọgụ na mgba siri ike nke na ọ pụrụ iyi ka otu ọ̀ ga-emeri nanị mgbe ibe ya nwụrụ.
N’otu akụkụ, e nwere ụfọdụ ndị ọkà mmụta sayensị, ndị dị ka ọkà mmụta mmiri ọgwụ bụ́ Peter Atkins, bụ́ onye chere na ime ka okpukpe na sayensị kwekọọ bụ ihe “na-apụghị ikwe omume.” Atkins kwuru na ikwere “na e nwere Chineke, bụ́ onye (ihe ọ bụla, ma ya fọdụkwa ihe nile) sitere n’aka ya bụ ihe ezi uche na-adịghị na ya.”
N’akụkụ nke ọzọ, e nwere ndị ji okpukpe kpọrọ ihe bụ́ ndị na-ata sayensị ụta maka ibibi okwukwe. Ndị dị otú ahụ na-eche na ụdị sayensị e nwere taa bụ nke aghụghọ; ihe ndị a chọpụtara na ya pụrụ izi ezi, ma nkọwahie a na-akọwahie ihe ndị ahụ a chọpụtara na-ebibi nkwenkwe nke ndị okpukpe. Dị ka ihe atụ, ọkà mmụta ihe ndị dị ndụ bụ́ William Provine kwuru na Ozizi Darwin pụtara “enweghị ntọala bụ́ isi maka ụkpụrụ omume; enweghị nzube bụ́ isi nke ndụ.”
Otú ọ dị, ụfọdụ n’ime ọgụ ndị ahụ malitere n’ihi ihe ndị na-abụghị eziokwu ma ọ bụ ihe ndị a na-apụghị ịnwapụta anwapụta akụkụ abụọ ahụ na-azọrọ. Ruo ọtụtụ narị afọ, ndị ndú okpukpe akụziwo akụkọ mgbe ochie na nkwenkwe ụgha ndị na-emegide nchọpụta ndị sayensị nke oge a mere, bụrụkwa ndị na-adabereghị n’Akwụkwọ Nsọ e dere n’ike mmụọ nsọ. Dị ka ihe atụ, Chọọchị Roman Katọlik katọrọ Galileo n’ihi na o kwubiri, n’ụzọ ziri ezi, na ụwa na-agba anyanwụ gburugburu. Echiche Galileo emegideghị Bible ma ọlị, ma ọ dị iche n’ihe chọọchị na-akụzi n’oge ahụ. N’aka nke ọzọ, ndị ọkà mmụta sayensị hiere ụzọ mgbe ha kụziri, dị ka eziokwu, echiche a na-apụghị ịnwapụta anwapụta bụ́ na ihe ndị dị ndụ esiteghị n’aka Chineke kama na ha si n’ihe na-adịghị ndụ pụta. Ha na-akwa okwukwe okpukpe emo dị ka nke na-ekwekọghị na nkà mmụta sayensị.
Ya mere, ọ̀ pụrụ ikwe mee sayensị na okpukpe ikwekọ? Ee, ọ pụrụ ikwe mee. N’eziokwu, sayensị a nwapụtara ịbụ eziokwu ya na ezi okpukpe na-emejurịta ibe ha kama imegiderịta onwe ha.
[Foto dị na peeji nke 2, 3]
Galileo kụziri eziokwu kwekọrọ na sayensị, bụ́ nke mere ka chọọchị katọọ ya