Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Mgbe Ịgba Ohu Ga-akwụsị!

Mgbe Ịgba Ohu Ga-akwụsị!

Mgbe Ịgba Ohu Ga-akwụsị!

NNWERE onwe! E nwere okwu ole na ole na-enye ụmụ mmadụ obi ụtọ ka ya. Ndị mmadụ alụwo ọgụ ma taa ahụhụ, bie ndụ ma nwụọ, ka ha na-achọ nnwere onwe. Otú ọ dị, n’ụzọ dị mwute, ọtụtụ ndị emewo otú ahụ n’enweghị ezi ihe ịga nke ọma n’inweta ihe ha na-achụso. È nwere olileanya maka nnwere onwe pụọ n’ịgba ohu—olileanya nke na-agaghị ejedebe ná ndakpọ olileanya na mmechuihu? E nwere.

E nyere Pọl onyeozi ike mmụọ nsọ ide banyere nkwa Chineke, sị: “A ga-emekwa ka ihe e kere eke n’onwe ya nwere onwe ya pụọ n’ịbụ ohu nke ire ure ma nweta nnwere onwe dị ebube nke ụmụ Chineke.” (Ndị Rom 8:21) Ma olee otú anyị pụrụ isi jide n’aka na Chineke ga-eme n’ezie ka e nwee “nnwere onwe dị ebube” dị otú ahụ? Otu ụzọ bụ site n’inyocha ụzọ Chineke siworo mesoo ihe a kpọrọ mmadụ n’akụkọ ihe mere eme nile.

“Ebe ọ bụla mmụọ Jehova dịkwa, n’ebe ahụ ka nnwere onwe dị.” (2 Ndị Kọrint 3:17) Ee, mmụọ Chineke, ma ọ bụ ike ya nọ n’ọrụ, dị ike nke ukwuu. Ọ nọwo na-eji ya eme ihe n’iweta nnwere onwe n’ọtụtụ ụzọ ruo ogologo oge. N’ụzọ dị aṅaa? Anyị aghaghị iburu n’uche na e nwere ụdị ịgba ohu dị iche iche. Anyị atụlewo otu n’ime ụdị ndị kasị njọ, nke ndị dị ike na-eji ike na ime ihe ike eme ka ndị na-adịghị ike bụrụ ohu ha. Ma tụlee ụdị ndị ọzọ nke ịgba ohu.

Ndị mmadụ pụrụ ime onwe ha ohu nke ụdị ihe dị iche iche na-eri ahụ́ bụ́ ndị na-esi ike nke ukwuu ịhapụ. Ụgha na aghụghọ pụkwara ime ka ndị mmadụ nọrọ n’ohu, na-abụ ndị a ghọgburu gaa n’ịdị ndụ nke ịbụ ohu nke ozizi ụgha dị iche iche. Nke kasị zoo ezoo na ha nile, e nwere ụdị ịgba ohu na-eti onye ọ bụla n’ime anyị ihe otiti—ma ànyị maara ma ọ bụ na anyị amaghị—mmetụta ya na-egbukwa egbu. Otú ọ dị, a ghaghị imesi ya ike na ọ bụ ezie na anyị na-agụkọta ụdị dị iche iche nke ịnọ n’agbụ ná ntụle a, anyị adịghị ekwu ma ọlị na ha nile bụ otu. Ha dịgasị nnọọ iche. Ma, e nwere otu ihe dị mkpa ha nile nwekọrọ ọnụ. N’ikpeazụ, Chineke nke nnwere onwe ga-ahụ na e bupụụrụ ihe a kpọrọ mmadụ ibu arọ nke ụdị ịgba ohu ndị a nile na-eweta.

Mgbe Ihe Ndị Na-eri Ahụ́ Mere Ka Mmadụ Bụrụ Ohu

Rịba ama otú akwụkwọ bụ́ When Luck Runs Out si kọwaa ịgba chaa chaa nke riri mmadụ ahụ́: “Nsogbu nke na-eme ka mmadụ nwee oké mkpali na-enweghị nchịkwa maka ịgba chaa chaa. Mkpali ahụ na-adịgide, na-akawanye njọ ma na-enu enu n’ahụ́ . . . ruo mgbe o mesịrị n’ikpeazụ bamie abamie, ọtụtụ mgbe kwa, ọ na-eji nwayọọ nwayọọ bibie ihe nile nwere isi ná ndụ onye ahụ.” Ọ dịghị onye maara mmadụ ole ghọworo ohu nke ịgba chaa chaa. Atụmatụ e mere maka nanị otu mba, United States, bụ ihe dị ka nde mmadụ isii.

Iri ahụ́ nke mmanya na-aba n’anya pụkwara iweta mbibi otú ahụ, ma ọ bụrụ na ọ bụghị karị, ọ bụkwa ihe a na-ahụkarị n’ọtụtụ ebe. N’otu mba buru ibu, ihe hà ka ọkara nke ụmụ nwoke nile toruworo ogo mmadụ bụ ndị aṅụrụma n’ụzọ ụfọdụ. Ricardo, bụ́ onye ghọrọ onye aṅụrụma afọ 20 gara aga, na-akọwa ihe ụdị ihe iri ahụ́ a pụtara: “Malite n’oge i tetara n’ụra, ahụ́ gị na-amalite ịchọ mmanya na-aba n’anya—iji mee ka ahụ́ dajụọ gị, ka i chezọọ nsogbu gị, ma ọ bụ nanị iji nye gị obi ike zuru ezu iji na-anagide ihe ndị na-eme ná ndụ. Uche gị nile na-adị n’ịṅụ mmanya, ma ị ga na-agbalị ịgwa onwe gị na ndị nọ gị gburugburu na omume gị adịghị njọ.”

Ọ bụghị nanị mmanya na-aba n’anya bụ ihe na-eri ahụ́ nke na-eme ndị mmadụ ohu ya. N’ụwa nile, e nwere ọtụtụ nde mmadụ ndị na-eji ọgwụ ọjọọ eme ihe. Ọzọkwa, ihe dị ka ijeri mmadụ 1.1 na-eji ụtaba eme ihe—bụ́ nke nwere otu n’ime ọgwụ kasị eri ahụ́. Ọtụtụ ndị ga-enwe mmasị ịkwụsị iji ya eme ihe, ma ọ na-adị ha ka ha nọ n’ohu. Jehova ọ̀ bụrụwo Onye Ntọhapụ dị ike nke na-atọhapụ ndị mmadụ pụọ n’ụdị ịnọ n’agbụ ndị ahụ dị ike? *

Tụlee ihe atụ Ricardo. “Ihe dị ka afọ iri gara aga, achọpụtara m na mmanya na-aba n’anya na-achịkwa ndụ m,” ka Ricardo na-akọwa. “Ọ na-ebibi alụmdi na nwunye m, ọrụ m, na ezinụlọ m, amakwaara m na mụ agaghị enwe ike idozi nsogbu m ọ gwụla ma m nweere onwe m pụọ na ya. Site n’ịmụ Bible, amụtara m na ndị na-aṅụ oké mmanya na-ada ogbenye—ma n’ụzọ nkịtị ma n’ụzọ ime mmụọ. (Ilu 23:20, 21) Achọrọ m ka mụ na Chineke nwee ezi mmekọrịta, ekpere m jikwa obi eziokwu na-ekpe maka enyemaka Chineke mere ka m nwee ike ịgwa onwe m eziokwu. Otu nwoke duziiri m ọmụmụ Bible ma ghọọ ezigbo enyi m. Mgbe m dabaghachiri n’omume ahụ, ike agwụghị ya n’ebe m nọ, kama o ji ndidi na nnọgidesi ike gosi m ụzọ Chineke tụziri maka ezi Ndị Kraịst.”

Taa, Ricardo na-enwe mmetụta nke ịbụ onye nweere onwe ya pụọ n’ohu ọ nọbu na ya—ma ọ dịghị ihe ọzọ ma e jiri ya tụnyere oge mbụ. Ọ na-ekweta ngwa ngwa na ná mmalite, ọ dị oge ndị ya laghachiri n’omume ya. “Ma n’agbanyeghị ndaghachi azụ ndị ahụ,” ka ọ na-ekwu, “ọchịchọ m nwere ijere Jehova ozi n’ikwesị ntụkwasị obi, tinyere nkwado nwunye m na Ndị Kraịst ibe m nyere m, enyeworo m aka imeri ọnọdụ ahụ. Ana m atụ anya oge ahụ Chineke kwere ná nkwa mgbe ‘ọ dịghị onye ga-asị, Ana m arịa ọrịa,’ aṅụrụma agaghị adịkwa. Ka ọ dịgodị, m ga-anọgide n’ọgụ m na-alụ kwa ụbọchị inyefe ahụ́ m dị ka ‘àjà dị ndụ, dị nsọ, nke Chineke na-anara nke ọma.’”—Aịsaịa 33:24; Ndị Rom 12:1.

N’ụwa nile, ọtụtụ puku mmadụ enwetawo enyemaka Chineke ka ha na-eme mgbalị iji nwere onwe ha pụọ n’ụdị ihe dị iche iche na-eri ahụ́. N’eziokwu, ha onwe ha keere òkè dị ukwuu n’itinye onwe ha n’ịgba ohu, ma eleghị anya na-ekwe ka nrụgide na ọnwụnwa dị iche iche merie ha. Ka o sina dị, ha achọpụtawo na Jehova bụ Onye Ntọhapụ na-enwe ndidi. Ọ dị njikere inyere ndị nile chọrọ ijere ya ozi n’ezie aka na iwusikwu ha ike.

“Eziokwu ahụ Ga-emekwa Ka Unu Nwere Onwe Unu”

Olee banyere ịbụ ohu nke ụgha na aghụghọ? Jizọs Kraịst na-emesi anyị obi ike na mmadụ inwere onwe ya pụọ n’ihe ndị dị otú ahụ ga-ekwe omume. “Ọ bụrụ na unu anọgide n’okwu m,” ka o kwuru, “unu bụ n’ezie ndị na-eso ụzọ m, unu ga-amarakwa eziokwu ahụ, eziokwu ahụ ga-emekwa ka unu nwere onwe unu.” (Jọn 8:31, 32) N’oge o kwuru okwu ahụ, ọtụtụ n’ime ndị na-ege ya ntị nọ n’ohu nye ụkpụrụ iwu na-adịghị agbanwe agbanwe nke ọdịnala ndị Farisii. N’ezie, Jizọs kwuru banyere ndị ndú okpukpe nke oge ya, sị: “Ha na-ekekọta ibu dị arọ ma dọkwasị ha n’ubu ndị mmadụ, ma ha onwe ha adịghị achọ iji mkpịsị aka ha enutụ ha.” (Matiu 23:4) Ozizi Jizọs mere ka ndị mmadụ nwere onwe ha pụọ n’agbụ dị otú ahu. Ọ gbara ụgha dị iche iche nke okpukpe n’anwụ, ọbụna mee ka a mata ebe ha sitere. (Jọn 8:44) O jikwa eziokwu dochie ụgha ndị ahụ, na-ekpughe n’ụzọ doro anya ihe ezi uche dị na ha Chineke chọrọ n’aka ihe a kpọrọ mmadụ.—Matiu 11:28-30.

Dị ka ndị na-eso ụzọ Jizọs, ọtụtụ puku mmadụ taa na-ahụ na site n’enyemaka Chineke ha nwere ike inwere onwe ha pụọ n’ụgha dị iche iche nke okpukpe na ọdịnala ndị na-ezighị ezi bụ́ ndị meworo ka ha nọrọ n’ohu. Mgbe ha mụtasịrị eziokwu ndị na-enye obi ụtọ nke Bible, ha na-enwere onwe ha pụọ n’ajọ egwu a na-atụ ndị nwụrụ anwụ, nwere onwe ha pụọ n’ịtụ oké ụjọ banyere mmekpa ahụ́ ebighị ebi n’ime hel na-ere ọkụ, nwerekwa onwe ha pụọ ná nrụgide nke iji ego ha tara ahụhụ kpata na-akwụ ụgwọ ọrụ okpukpe ndị ụkọchukwu na-arụ, bụ́ ndị na-azọrọ na ha na-anọchite anya Kraịst—onye kwuru, sị: “Unu natara n’efu, na-enyenụ n’efu.” (Matiu 10:8) Ọzọkwa, a ga-enwe ọbụna nnwere onwe ka ukwuu n’isi nso.

Ịgba Ohu Kasị Zoo Ezo

Rịba ama otú Jizọs si kọwaa ụdị ịgba ohu zoro ezo, nke a kpọtụrụ aha na mbụ, bụ́ nke na-emetụta nwoke, nwanyị na nwatakịrị ọ bụla nọ n’ụwa: “N’ezie, n’ezie, asị m unu, Onye ọ bụla na-eme mmehie bụ ohu nke mmehie.” (Jọn 8:34) Ònye ga-asị na ya adịghị eme mmehie? Ọbụna Pọl onyeozi kwetara, sị: “Ezi ihe nke m na-achọ ka m na-adịghị eme, kama ihe ọjọọ nke m na-achọghị ka m na-eme.” (Ndị Rom 7:19) Ọ bụ ezie na ọ dịghị onye pụrụ inwere onwe ya pụọ n’agbụ nke mmehie, ọnọdụ anyị abụghị nke olileanya na-adịghị na ya.

Jizọs mesiri ndị na-eso ụzọ ya obi ike, sị: “Ọ bụrụ na Ọkpara ahụ emee ka unu nwere onwe unu, unu ga-enwere onwe unu n’ezie.” (Jọn 8:36) Imezu nkwa a enweghị ihe ọzọ ọ ga-apụta ma ọ bụghị nnwere onwe pụọ n’ụdị ịgba ohu kachasị njọ. Iji ghọta otú anyị pụrụ isi nwere onwe anyị pụọ na ya, anyị aghaghị ibu ụzọ hụ otú anyị si nọrọ n’ohu.

Bible na-ekpughe na Chineke kere ụmụ mmadụ ịbụ ndị nweere onwe ha ime nhọrọ, n’enweghị ọchịchọ ime mmehie. Ma, nwa Chineke nke bụ́ mmụọ, bụ́ onye nwere ọchịchọ onwe onye nanị chọrọ ịchị ihe a kpọrọ mmadụ, n’agbanyeghị ịta ahụhụ ọ ga-arụpụtara ụmụ mmadụ. Iji mezuo nke ahụ, mmụọ ozi a bụ́ onye nnupụisi, bụ́ onye e mesịrị kpọọ Setan bụ́ Ekwensu, mere ka nne na nna anyị mbụ bụ́ mmadụ, bụ́ Adam na Iv, si n’ebe Chineke nọ wezụga onwe ha. Mgbe Adam jisịrị nlezianya nupụ isi ná ntụziaka a kapịrị ọnụ ndị Chineke nyere, ọ bụghị nanị na ya onwe ya ghọrọ onye mmehie kama o bufeere ụmụ ya nile ezughị okè na ọnwụ. (Ndị Rom 5:12) N’ikpeazụ, Setan ghọrọ “onye na-achị ụwa,” ‘mmehie achịwokwa ihe a kpọrọ mmadụ dị ka eze ya na ọnwụ.’—Jọn 12:31; Ndị Rom 5:21; Mkpughe 12:9.

Olee otú anyị pụrụ isi nwere onwe anyị? Site n’ịghọ ndị na-eso ụzọ Jizọs, anyị pụrụ irite uru site n’ọnwụ ịchụ àjà nke Kraịst, bụ́ nke nwere ikike nke ‘ime ka ọ ghara ịdị bụ́ onye ahụ nke nwere ihe e ji akpata ọnwụ, ya bụ, Ekwensu’ na ‘ịtọhapụ ndị nile ji maka egwu ọnwụ bụrụ ndị e doro ịnọ n’ohu ná ndụ ha nile.’ (Ndị Hibru 2:14, 15) Cheedị ya—nnwere onwe pụọ n’ịbụ ohu nye mmehie na ọnwụ! Ọ̀ bụ na icheta nnwere onwe dị otú ahụ n’echiche adịghị enye obi ụtọ?

Otú ọ dị, olee banyere ụdị ịgba ohu ahụ anyị tụlere ná mmalite? Ọ̀ dị mgbe iji ike gbara ndị mmadụ n’ohu n’ụzọ megidere ọchịchọ ha ga-akwụsị?

Ihe Ndabere E Ji n’Aka Maka Olileanya

N’ezie, anyị pụrụ inwe obi ike na a ga-ekpochapụ ụdị ịgba ohu ahụ na-asọ oyi. N’ihi gịnị? Cheedị nke a: Ọ bụ Jehova Chineke mere ka e mee njem kasị ukwuu e metụrụla n’akụkọ ihe mere eme nile nke mmadụ gaa ná nnwere onwe. Ọ pụrụ ịbụ na ị maara akụkọ ahụ.

Ijipt jiri mba Izrel mere ohu, manye ha ịrụ ọrụ ike ma na-emeso ha mmeso ọjọọ. Ha tikuru Chineke maka enyemaka, n’ebere ya dị ukwuu, ọ nụrụ mkpu ha ma mee ihe. N’iji Mozis na Erọn mere ọnụ na-ekwuru ya, Jehova kwuru ka Fero Ijipt tọhapụ ndị Izrel. Onye ọchịchị ahụ dị mpako jụrụ ugboro ugboro, ọbụna mgbe Jehova mesịworo ka ọtụtụ ihe otiti bịakwasị ala ahụ. N’ikpeazụ, Chineke manyere Fero ikwere. N’ikpeazụ, a tọhapụrụ ndị Izrel!—Ọpụpụ 12:29-32.

Ọ bụ akụkọ na-akpali akpali, ọ́ bụghị ya? Otú ọ dị, ị pụrụ ịdị na-eche ihe mere Chineke na-ejibeghị mee ihe yiri ya n’oge a. Gịnị mere na o tinyebeghị aka n’ihe omume ụmụ mmadụ ma kwụsị ịgba ohu? Cheta, ọ bụghị Jehova bụ “onye na-achị ụwa”—ọ bụ Setan. N’ihi ihe ịma aka ndị e welitere laa azụ n’Iden, Jehova ekwewo ka ajọ Onye Iro a chịa ruo oge a kpaara ókè. Ịgba ohu, mmegbu, na obi ọjọọ bụ nnọọ ihe ndị e ji mara ịchịisi Setan. N’okpuru ikike dị otú ahụ, akụkọ ihe mere eme banyere ịchịisi ụmụ mmadụ egosiwo na ọ kụwo afọ n’ala. Bible chịkọtara akụkọ ihe mere eme ahụ n’ụzọ dị nkenke, na-asị: “Mmadụ nwere ike n’ahụ mmadụ ibe ya imejọ ya.”—Eklisiastis 8:9.

Ma ọ̀ bụ ruo ole mgbe? Bible na-akọwa na anyị na-ebi “n’ụbọchị ikpeazụ,” bụ́ oge mgbe ọchịchọ onwe onye nanị na anyaukwu ga-ejupụta ebe nile. (2 Timoti 3:1, 2) Nke a pụtara na n’oge na-adịghị anya, Alaeze Chineke, bụ́ nke Jizọs kụziiri anyị ka anyị na-ekpe ekpere maka ya, ga-eguzobe ọha mmadụ bụ́ ndị ezi omume bụ́ ebe a ga-amachibido ịgba ohu iwu. (Matiu 6:9, 10) Jizọs Kraịst, bụ́ Eze Chineke họpụtara, ga-eme ihe iji bibie ihe nile metụtara ịgba ohu ruo mgbe a ga-eme ka onye iro ikpeazụ, bụ́ ọnwụ, ghara ịdị irè.—1 Ndị Kọrint 15:25, 26.

N’ikpeazụ mgbe oge ahụ ruru, ihe a kpọrọ mmadụ na-ekwesị ntụkwasị obi ga-ahụ na ịtọhapụ ndị Chineke n’ohu n’Ijipt bụ nanị ihe atụ dị ntakịrị nke ntọhapụ ka ukwuu. Ee, ka oge na-aga, “a ga-emekwa ka ihe e kere eke n’onwe ya nwere onwe ya pụọ n’ịbụ ohu nke ire ure.” N’ikpeazụ, mmadụ nile ga-enwe ike ịnụ ụtọ “nnwere onwe dị ebube nke ụmụ Chineke” n’ụzọ zuru ezu.—Ndị Rom 8:21.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 9 Na narị afọ mbụ, ọtụtụ ndị nọ na-eribiga ihe ókè n’oké oriri ndị Rom. N’ihi ya, a dọrọ Ndị Kraịst aka ná ntị banyere ikwe ka ihe oriri ma ọ bụ ihe ọ bụla ọzọ yiri ya mee ka ha bụrụ ohu ya.—Ndị Rom 6:16; 1 Ndị Kọrint 6:12, 13; Taịtọs 2:3.

[Foto dị na peeji nke 21]

Ndị e mere atụmatụ na ha dị nde mmadụ isii bụ ohu nye ịgba chaa chaa na United States nanị

[Foto ndị dị na peeji nke 21]

Ọtụtụ narị nde mmadụ bụ ohu nye ọgwụ ọjọọ, mmanya na-aba n’anya, na ụtaba

[Foto ndị dị na peeji nke 22, 23]

Dị ka Ricardo, ọtụtụ puku enwetawo enyemaka Chineke iji nwere onwe ha pụọ n’ihe ndị na-eri ahụ́

[Foto ndị dị na peeji nke 24]

Dị ka e mere ka ndị Izrel oge ochie nwere onwe ha pụọ n’ịgba ohu, n’isi nso, ndị na-efe Chineke ezi ofufe ga-enweta ntọhapụ ka nnọọ ukwuu