Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Nchebe Ndị Uwe Ojii Na-enye—Olileanya na Egwu Dị na Ya

Nchebe Ndị Uwe Ojii Na-enye—Olileanya na Egwu Dị na Ya

Nchebe Ndị Uwe Ojii Na-enye—Olileanya na Egwu Dị na Ya

ỌTỤTỤ ndị nọ n’England ná mmalite narị afọ nke 19 megidere aro a tụrụ maka inwe ndị ọrụ uwe ojii bụ́ ọkpọka bụ́ ndị na-eyi yunifọm. Ha tụrụ egwu na ndị uwe ojii na-ebu égbè bụ́ ndị gọọmenti etiti nwe, pụrụ itinye nnwere onwe ha n’ihe ize ndụ. Ụfọdụ ndị tụrụ egwu na ha ga-emesị nwee usoro nledo nke ndị uwe ojii yiri nke France mgbe Joseph Fouché bụ onyeisi ha. Ka o sina dị, a manyere ha ịjụ onwe ha, sị, ‘Gịnị ka anyị ga-eme ma e wezụga ndị uwe ojii?’

London aghọwo obodo kasị ukwuu na nke kasị baa ọgaranya n’ụwa; mpụ nọ na-arị elu ma na-emetụta achụmnta ego. Ma ndị ọrụ afọ ofufo na-eche nche abalị ma ndị bụ́ ọkà n’ijide ndị ohi, bụ́ ndị Bow Street Runner bụ́ ndị ndị mmadụ na-akwụ ụgwọ, adịghị nke nwere ike ichebe ndị mmadụ na ihe onwunwe ha. N’akwụkwọ ya bụ́ The English Police: A Political and Social History, Clive Emsley na-ekwu, sị: “E lewanyere mpụ na ọgba aghara anya dị ka ihe ndị na-ekwesịghị ịdị n’etiti ọha mmadụ mepere anya.” N’ihi ya ndị London nwere olileanya na ha ga-enwe ihe ịga nke ọma ma kpebie inwe ndị uwe ojii bụ́ ọkpọka nke Sir Robert Peel ga na-eduzi. * Na September 1829, ndị uwe ojii na-eyi yunifọm bụ́ ndị si n’òtù Ndị Uwe Ojii Obodo Ukwu ahụ malitere ime ngagharị n’ógbè ndị ha na-elekọta.

Site ná mmalite nke akụkọ ihe mere eme ha nke oge a, okwu banyere ndị uwe ojii akpaliwo olileanya na egwu—olileanya na ha ga-eweta nchebe nakwa egwu na ha pụrụ iji ike ha mee ihe n’ụzọ na-ezighị ezi.

E Hiwe Ndị Uwe Ojii America

Na United States, New York City bụ ododo ukwu mbụ nwetara ndị uwe ojii bụ́ ọkpọka. Ka akụ̀ na ụba obodo ukwu ahụ na-ebuwanye ibu, otú ahụ ka mpụ a na-eme na ya na-ebuwanye ibu. Ka ọ na-erule n’afọ ndị 1830, ezinụlọ ọ bụla pụrụ ịgụ akụkọ ọjọọ banyere mpụ bụ́ ndị a na-ebipụta n’akwụkwọ akụkọ ndị dị ọnụ ala bụ́ ndị e bipụtara ọhụrụ—akwụkwọ akụkọ penny. Ndị mmadụ mewanyere mkpesa, New York nwetakwara ndị uwe ojii nke ya na 1845. Kemgbe ahụ, ndị New York na ndị London enwewo mmasị n’ebe ndị uwe ojii nke ibe ha nọ.

Ndị America tụrụ ụdị egwu ahụ ndị England tụrụ maka ndị uwe ojii na-ebu égbè bụ́ ndị gọọmenti nwe. Ma mba abụọ ahụ chepụtara ihe ngwọta ndị dị iche. Ndị England kpebiri inwe ndị uwe ojii na-ekpu okpu dị elu bụ́ ndị a na-akwanyere ùgwù, ndị na-eyi yunifọm na-acha nnọọ anụnụ anụnụ. Ha na-eji nanị okpiri ha na-ezo ezo. Ruo taa ndị uwe ojii Britain adịghị ebu égbè ma e wezụga n’ọnọdụ mberede. Otú ọ dị, dị ka otu akụkọ na-ekwu, “a na-echewanye na ihe a na-apụghị izere ezere ga-eme . . . na ndị uwe ojii Britain ga-emesị ghọọ ndị uwe ojii na-ebu nnọọ ngwá agha.”

Otú ọ dị, na United States, egwu a na-atụ na gọọmenti pụrụ iji ike ya mee ihe n’ụzọ na-ezighị ezi kpatara nnabata a nabatara Ndezigharị nke Abụọ nke Ụkpụrụ Iwu United States, bụ́ nke na-akwado “ikike ndị mmadụ nwere inwe na ibu Ngwá Ọgụ.” N’ihi ya, ndị uwe ojii chọrọ ka e nye ha égbè. Ka oge na-aga, ojiji ha na-eji ya eme ihe kpatara ịgbarịta égbè n’okporo ámá, bụ́ nke ghọrọ ihe e ji mara ndị uwe ojii America na-achụ ndị ohi, ma ọ dịghị ihe ọzọ n’anya ọtụtụ ndị mmadụ. Ihe ọzọ mere ndị America ji ebu égbè otú ahụ bụ na e hiwere ndị uwe ojii mbụ nke United States n’ebe na-adịtụghị ka London. Aghara malitere ịdị na New York ka ọnụ ọgụg̣ụ ndị nọ na ya na-amụba n’ike n’ike. Nnubata nke ọtụtụ puku ndị mmadụ karịsịa site na Europe na nnubata nke Ndị Africa nke America mgbe Agha Obodo nke 1861-1865 malitesịrị kpatara ime ihe ike agbụrụ. Ndị uwe ojii chere na ọ dị mkpa ka ha jiri ụzọ siri ike karị na-eme ihe.

N’ihi ya, e lekarịrị ndị uwe ojii anya dị ka ndị ọjọọ dị mkpa. Ndị mmadụ dị njikere ịnagide àgwà ọjọọ ha na-akpa site n’oge ruo n’oge n’olileanya nke na ha ga-eme ka a na-eme ihe n’usoro nakwa ka e nwee nchebe ruo n’ókè ụfọdụ. Otú ọ dị, n’akụkụ ụfọdụ nke ụwa, ụdị ndị uwe ojii dị iche na-ebilite.

Ndị Uwe Ojii Na-emenye Ụjọ

Ná mmalite narị afọ nke 19, mgbe ndị uwe ojii nke oge a ka na-amalite amalite, ọnụ ọgụgụ ka ukwuu nke ihe a kpọrọ mmadụ bi n’okpuru ọchịchị alaeze ukwu Europe. A haziri ndị uwe ojii Europe n’ozuzu ha ichebe ndị ọchịchị kama ichebe ndị mmadụ. Ọbụna ndị Britain, bụ́ ndị na-enwetụdịghị mmasị n’echiche nke inwe ndị uwe ojii na-ebu égbè bụ́ ndị na-arụ ọrụ dị ka ndị soja ná mba ha, yiri ka hà ahụghị ihe ọjọọ ọ bụla dị n’iji ndị soja eme ka mba ndị ha na-achị nọrọ n’okpuru ha. Rob Mawby, kwuru n’akwụkwọ ya bụ́ Policing Across the World, sị: “Ndị uwe ojii ime ihe n’ụzọ obi ọjọọ, nrụrụ aka, ime ihe ike, igbu ọchụ na iji ike eme ihe n’ụzọ na-ezighị ezi, weere ọnọdụ n’ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ n’iri afọ nile e nwere ndị uwe ojii ná mba ndị a a na-achị achị.” Mgbe ọ kọwasịrị na iji ndị uwe ojii eme ihe n’okpuru alaeze ukwu ndị nke Europe wetakwara abamuru ụfọdụ, otu akwụkwọ ahụ kwukwara na o mere “nnọọ ka mba ndị dị gburugburu ụwa na-ele ndị uwe ojii anya dị ka ndị gọọmenti ji akpa ike, ọ bụghị ndị na-ejere ọha na eze ozi.”

Ọ fọrọ nke nta ka ọ bụrụ na gọọmenti ndị na-achị ọchịchị aka ike bụ́ ndị na-atụ egwu mgbanwe ọchịchị ejiriwo ndị uwe ojii nzuzo mee ihe mgbe nile iji ledoo ụmụ amaala ha. Ndị uwe ojii dị otú ahụ na-enweta ihe ọmụma site n’ịta ndị mmadụ ahụhụ na ikpochapụ ndị e chere na ha chọrọ ịkwatu ọchịchị site n’igbu ha egbu ma ọ bụ ijide ha n’ekpeghị ha ikpe. Ndị Nazi nwere ndị Gestapo nke ha, Soviet Union nwere ndị KGB nke ha, Ebe Ọwụwa Anyanwụ Germany kwa nwere ndị Stasi. N’ụzọ na-eju anya, ndị Stasi were 100,000 ndị uwe ojii n’ọrụ nakwa ma eleghị anya ọkara nde ndị mgbaàmà iji chịkwaa ndị bi ná mba ahụ bụ́ ndị dị ihe dị ka nde 16. Ndị uwe ojii na-ege nkwurịta okwu ndị a na-enwe na telifon ehihie na abalị, ha nwekwara ihe ndekọ banyere otu ụzọ n’ụzọ atọ nke ndị nile bi ná mba ahụ. “Ndị uwe ojii Stasi adịghị emeru ihe n’ókè, ihere adịghịkwa eme ha,” ka John Koehler kwuru n’akwụkwọ ya bụ́ Stasi. “E debanyere aha ọtụtụ ndị ụkọchukwu, gụnyere ndị isi nke ma okpukpe Protestant ma okpukpe Katọlik, dị ka ndị mgbaàmà nzuzo. Ọfịs ha na ebe ndị a na-anọ ekwupụtara ha mmehie jupụtara ná ngwá ndị e ji ege nkwurịta okwu na nzuzo.”

Otú ọ dị, ọ bụghị nanị gọọmenti ndị na-achị ọchịchị aka ike nwere ndị uwe ojii na-emenye egwu. E bowo ndị uwe ojii obodo ukwu ndị nọ n’ebe ndị ọzọ ebubo imenye ndị mmadụ egwu mgbe ha jiri oké obi ọjọọ mee ihe iji hụ na e debere iwu, karịsịa ma ọ bụrụ na ha lekwasịrị ndị ka nta n’ọnụ ọgụgụ anya. N’ikwu okwu banyere otu akụkọ ọjọọ a kpọsara na Los Angeles, otu magazin akụkọ kwuru na o “mewo ka àgwà ọjọọ nke ndị uwe ojii ruo ọ̀tụ̀tụ̀ ọhụrụ nke mmebi iwu ma wetara ha aha ọhụrụ: òtù ndị uwe ojii na-eme mpụ.”

N’ihi ya, ndị isi ọchịchị anọwo na-ajụ ajụjụ bụ́, Gịnị ka òtù ndị uwe ojii pụrụ ime iji mee ka ha nwee aha ọma? Ná mgbalị ime ka ozi ha na-ejere ọha pụta ìhè, ọtụtụ ndị uwe ojii agbalịwo ime ka akụkụ ọrụ ha dị ka ndị uwe ojii bụ́ nke na-abara obodo uru, pụta ìhè.

Olileanya nke Iji Ndị Uwe Ojii Eme Ihe n’Obodo

Ụzọ Japan si eji ndị uwe ojii eme ihe n’ógbè kemgbe ụwa adọtawo mmasị nke mba ndị ọzọ. Dị ka ọ na-adịkarị, ndị uwe ojii Japan na-arụ ọrụ n’obere ụlọ ọrụ ndị na-enwe ikekwe ndị uwe ojii iri na abụọ bụ́ ndị a na-agbanwegharị oge ọrụ ha. Onye Britain bụ́ onye nkụzi ná mmụta banyere mpụ na onye biworo na Japan ruo ogologo oge, bụ́ Frank Leishman na-ekwu, sị: “Ọ̀tụ̀tụ̀ ije ozi enyi nke ndị uwe ojii koban na-eje bụ nke a maara nke ọma: inye ihe ọmụma banyere adres n’okporo ámá Japan bụ́ ndị ihe ka ọtụtụ n’ime ha na-enweghị aha; ịgbazinye ndị si n’ụgbọala rịtuo mgbe mmiri na-ezo nche anwụ ndị ndị nwe ha hapụrụ ahapụ; ịhụ na ndị ọrụ ṅụbigara mmanya ókè gbara ụgbọ okporo ígwè ikpeazụ laa; na inye ndụmọdụ banyere ‘nsogbu nke ụmụ amaala ha.’” Ndị uwe ojii na-arụ ọrụ n’ógbè abụwo otu ihe mere e ji mara Japan n’ụzọ na-adọrọ mmasị dị ka nke nwere okporo ámá ndị a pụrụ ịgagharị na ha n’udo.

Iji ndị uwe ojii eme ihe otú a ọ̀ pụrụ ịdị irè n’ebe ndị ọzọ? Ụfọdụ ndị na-amụ banyere mpụ malitere ịhụ ihe mmụta dị na ya. Ọganihu e nweworo n’oge a n’usoro mgbasa ozi yiri ka o mewo ka ndị uwe ojii ghara ịnọ ndị ha na-ejere ozi nso. Taa, n’ọtụtụ obodo ukwu, ọ na-eyikarị ka ọrụ bụ́ isi nke ndị uwe ojii ọ̀ bụ ịhụ banyere ọnọdụ mberede. Mgbe ụfọdụ, ọ na-eyi ka e chezọwo ojiji a na-ejibu igbochi mpụ kpọrọ ihe. Ná mmeghachi omume nye àgwà a, ọtụtụ ndị amaliteghachiwo iche nche n’ógbè ha.

Iche Nche n’Ógbè

“Nke a dị irè n’ezie; ọ na-ebelata mpụ,” ka Dewi, bụ́ onye uwe ojii, kwuru banyere ọrụ ya na Wales. “Iche nche n’ógbè pụtara ime ka ndị mmadụ nọrọ na nche iji hụ na ibe ha nọ ná nchebe. Anyị na-ahazi nzukọ ka ndị agbata obi nwee ike ịmata onwe ha, na-agwarịta ibe ha aha ha na nọmba fon ha, ma nụ otú ha ga-esi na-egbochi mpụ. Ọrụ ahụ na-amasị m n’ihi na ọ na-ewebataghachi mmetụta obodo n’ime ógbè. Ọtụtụ mgbe, ndị mmadụ adịghị amata ọbụna ndị ndị agbata obi ha bụ. Atụmatụ ahụ na-adị irè n’ihi na ọ na-eme ka ndị mmadụ matakwuo ihe na-emenụ.” Ọ na-emekwa ka mmekọrịta dị n’etiti ndị uwe ojii na ọha na eze ka mma.

Ihe ọzọ dị mkpa e meworo bụ ịgba ndị uwe ojii ume inwekwu ọmịiko n’ahụ́ ndị mpụ metụtara. Onye Netherlands a ma ama bụ́ ọkàchamara ná mmụta banyere ndị mpụ metụtara, bụ́ Jan van Dijk, dere, sị: “A ghaghị ịkụziri ndị uwe ojii na otú ha si emeso ndị mpụ metụtara n’ọfịs ha dị mkpa dị ka otú ndị dọkịta si emeso ndị ọrịa n’akụkụ ihe ndina ha.” N’ọtụtụ ebe, ndị uwe ojii amalitebeghị ile ime ihe ike na ndina n’ike n’ime ezinụlọ anya dị ka mpụ n’ezie. Ma Rob Mawby, kwuru, sị: “Ụzọ ndị uwe ojii si eme ihe banyere ime ihe ike na ndina n’ike n’ime ezinụlọ akawo nnọọ mma n’afọ ndị na-adịbeghị anya. Ka o sina dị, a ka pụrụ imeziwanye nnọọ ihe.” Ojiji ndị uwe ojii na-eji ike eme ihe n’ụzọ na-ezighị ezi bụ akụkụ ọzọ nke ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ ndị uwe ojii nile ka ọ pụrụ ịdị mkpa imeziwanye ihe na ya.

Egwu Maka Nrụrụ Aka nke Ndị Uwe Ojii

Mgbe ụfọdụ, inwe mmetụta nke ịbụ ndị ndị uwe ojii chebere na-eyi amaghị ihe, karịsịa mgbe akụkọ banyere nrụrụ aka nke ndị uwe ojii na-agbasa ebe nile. A nọwo na-enweta akụkọ ndị dị otú ahụ kemgbe ndị uwe ojii malitere. N’izo aka n’afọ 1855, akwụkwọ bụ́ NYPD—A City and Its Police kọwara “echiche nke ọtụtụ ndị New York bụ́ na ọ na-esi ike ịmata ihe dị iche n’etiti ndị agboro na ndị uwe ojii.” Akwụkwọ bụ́ Faces of Latin America, bụ́ nke Duncan Green dere, na-akọ na “ọtụtụ ndị na-eche na [ndị uwe ojii nọ n’ebe ahụ] bụ ndị na-arụrụ aka, ndị na-erughị eru, na ndị na-emebi ihe ndị ruuru ndị mmadụ.” Onyeisi nke ìgwè ndị uwe ojii 14,000 nke Latin America, kwuru, sị: “Olee ihe ị ga-atụ anya ya mgbe onye uwe ojii na-akpata ihe na-erughị [$100] n’ọnwa? Ọ bụrụ na e nye ya aka azụ, gịnị ka ọ ga-eme?”

Ókè ha aṅaa ka nsogbu nrụrụ aka bururu n’ibu? Azịza ya dabeere n’onye ị jụrụ. Otu onye uwe ojii bụ́ onye Ebe Ugwu America, bụ́ onye ruo ọtụtụ afọ nọ na-akpagharị n’obodo ukwu nwere ọnụ ọgụgụ mmadụ dị 100,000, zara, sị: “N’ezie e nwere ụfọdụ ndị uwe ojii na-adịghị akwụwa aka ọtọ, ma ọnụ ọgụgụ ka ukwuu nke ndị uwe ojii na-akwụwa aka ọtọ. Nke ahụ bụ ihe m hụworo.” N’aka nke ọzọ, onye na-enyocha mpụ bụ́ onye rụworo ọrụ ruo afọ 26 ná mba ọzọ, zaghachiri, sị: “Ana m ele nrụrụ aka anya dị ka ihe dị n’ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ n’ebe nile. Ndị uwe ojii adịghị akwụwakebe aka ọtọ. Ọ bụrụ na onye uwe ojii achọọ ihe n’ụlọ e tikara etika ma chọta ego, ma eleghị anya ọ ga-ewere ya. Ọ bụrụ na ọ chọta ihe e zuru ezu, ọ ga-edebere onwe ya ụfọdụ n’ime ha.” N’ihi gịnị ka ụfọdụ ndị uwe ojii ji arụrụ aka?

Ụfọdụ na-enwe ụkpụrụ omume dị elu mgbe ha malitere ma bụrụ ndị omume nke ndị ibe ha na-adịghị akwụwa aka ọtọ na ụkpụrụ ọjọọ nke ndị omempụ ha na ha na-emekọ ihe metụtara. Akwụkwọ bụ́ What Cops Know hotara otu onye uwe ojii na-akpagharị akpagharị na Chicago dị ka onye na-ekwu, sị: “N’ihe banyere ndị uwe ojii, ha maara banyere ihe ọjọọ site n’ahụmahụ ndị ha nweworo. Ọ gbara ha gburugburu. Ha na-emetụ ya aka . . . na-edetụ ya ire . . . na-anụ ísì ya . . . na-anụ banyere ya . . . ha aghaghị ijide ya aka.” Ịnọ omume rụrụ arụ otú ahụ nso pụrụ inwe mmetụta ọjọọ n’ahụ́ mmadụ.

Ọ bụ ezie na ndị uwe ojii na-eje ozi bara oké uru, ije ozi ha abụghị ịgba. Ànyị pụrụ ịtụ anya ihe ka mma?

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 3 A bịara mara ndị uwe ojii nke Britain dị ka ndị uwe ojii Bobby dabere n’aha onye malitere ya, bụ́ Sir Robert (Bobby) Peel.

[Igbe/Foto ndị dị na peeji nke 8, 9]

“Ndị Uwe Ojii Bobby nke Britain Hà Abụghị Ọkpọka?”

Ndị Britain so ná ndị mbụ nwetaliri ndị uwe ojii a zụrụ azụ. Ha chọrọ ka mba ha bụrụ nke a haziri nke ọma—dị ka usoro ụgbọala ha ịnyịnya na-adọkpụ bụ́ nke na-agba nnọọ n’ezi oge. Na 1829 Onyeisi Ngalaba Na-ahụ Maka Ihe Na-eme n’Obodo, bụ́ Sir Robert (Bobby) Peel, mere ka Nzukọ Ndị Isi kweta ịkwado nguzobe nke Ndị Uwe Ojii Obodo Ukwu nke London, bụ́ nke isi ụlọ ọrụ ya dị na Scotland Yard. N’ịbụ ndị a kpọrọ asị na mbụ maka iguzogide ịṅụbiga mmanya ókè na ịgba chaa chaa n’okporo ámá, ka oge na-aga, ndị bobby ghọrọ ndị ndị mmadụ kasị enwe mmasị n’ebe ha nọ.

Na 1851, London nwere nnọọ obi ụtọ ịkpọ ụwa nile òkù ịbịa Nnukwute Ngosi Ngwá Ahịa ma hụ ihe ndị ụlọ ọrụ Britain rụzuworo. Okporo ámá ndị dị n’usoro na ọnụnọ nke ndị aṅụrụma, ndị akwụna, na ndị na-enweghị ebe obibi na-anọghị n’okporo ámá juru ndị bịaranụ anya. Ndị uwe ojii na-arụ ọrụ nke ọma na-achịkwa ìgwè mmadụ, na-enyere ndị si esi bịa aka ibu ibu ha, na-enyere ndị mmadụ aka ịgafe okporo ụzọ, ọbụnakwa na-ekuru ụmụ nwanyị meworo agadi gaa na tagzi. Ka a sịkwa ihe mere e ji nụ ka ndị Britain nakwa ndị si mba ọzọ bịa na-ekwu, sị: “Ndị uwe ojii bobby nke Britain hà abụghị ọkpọka?”

O yiri nnọọ ka hà dị nnọọ irè n’ịkwụsị mpụ nke na onyeisi ndị uwe ojii nke Chester na 1873 chere echiche banyere mgbe ọ ga-afọdụ nke nta ka e kpochapụ mpụ ndị kasị njọ! Ndị uwe ojii malitekwara ime ndokwa maka ụgbọala e ji ebu ndị ahụ́ na-adịghị na ịrụ ọrụ mgbanyụ ọkụ. Ha mere ndokwa maka ndị ọrụ ebere na-enye ndị ogbenye akpụkpọ ụkwụ na uwe. Ụfọdụ ndị uwe ojii hazịrị òtù dị iche iche maka ụmụ okorobịa, ime mkpapụ, na ebe ezumike dị iche iche.

Otú ọ dị, ndị uwe ojii ọhụrụ ahụ nwekwara nsogbu nke ha bụ́ nke metụtara inye ndị uwe ojii tinyere aka ná nrụrụ aka na omume obi ọjọọ ahụhụ. Ma ihe ka ọtụtụ kpara nganga n’ihi inwe ike mee ka e nwee udo n’ejighị ike gabigara ókè mee ihe. Na 1853, ndị uwe ojii nọ na Wigan, Lancashire, aghaghị iguzogide ọgba aghara nke ndị na-egwupụta akụ̀ ndị dị n’ime ala bụ́ ndị gbara abụbọ ọrụ. Onyeisi ndị uwe ojii nke nwere obi ike, bụ́ onye du nanị ndị uwe ojii iri, jụwara isi iji égbè nke onye nwe ebe ahụ a na-egwupụta akụ̀ n’ala mee ihe. Akwụkwọ ozi nke Hector Mac­leod natara na 1886, bụ́ mgbe ọ gbasoro nzọụkwụ papa ya site n’ịghọ onye uwe ojii, gosiri àgwà nke ahụ kpaliri. Dị ka e hotara n’akwụkwọ bụ́ The English Police, o kwuru, sị: “Ọ bụrụ na ị dị aka ike, ọha na eze agakwaghị adị na-ele gị anya ọma . . . Ana m ebute ọdịmma nke ọha na eze ụzọ n’ihi na onye uwe ojii bụ onye na-ejere obodo ozi, bụ́ ndị e kenyere gị ijere ozi ka ọ dịgodị, ọ bụkwa ọrụ gị ime ihe na-atọ ha nakwa onyeisi unu ụtọ.”

Hayden, bụ́ onye inspektọ nke Ndị Uwe Ojii nke Obodo Ukwu bụ́ onye laworo ezumike nká, na-ekwu, sị: “A na-akụziri anyị mgbe nile ka anyị na-enwe njide onwe onye n’ihi na ọrụ ndị uwe ojii na-aga nke ọma chọrọ nkwado nke obodo. Anyị na-eji okpiri anyị eme ihe nanị mgbe ọ na-adịghịzi ihe ọzọ anyị pụrụ ime, bụ́ nke ihe ka ọtụtụ ná ndị uwe ojii na-agaghị eji mee ihe n’oge ọrụ ha nile.” Ihe ọzọ so wetara ndị uwe ojii bobby nke Britain aha ọma bụ usoro ihe omume TV wuru ewu nke e mere ruo afọ 21 banyere otu onye uwe ojii na-akwụwa aka ọtọ bụ́ onye maara mmadụ nile nọ n’ógbè ọ na-elekọta, bụ́ Dix­on of Dock Green. Ma eleghị anya o mere ka ndị uwe ojii na-eme omume n’ụzọ kwekọrọ n’ihe ahụ a na-egosi, ma n’ezie, ọ kwalitere mmasị ndị Britain nwere n’ebe ndị uwe ojii nọ.

Omume ndị mmadụ na Britain gbanwere n’afọ ndị 1960, àgwà nke iguzogide ịbụisi nọchiri anya àgwà nke iji mba akpa nganga. Akụkọ banyere nrụrụ aka na ịkpa ókè agbụrụ nke ndị uwe ojii mebiri aha ọma ha n’afọ ndị 1970, n’agbanyeghị mgbalị ndị ha tinyere inweta nkwado nke ọha na eze site n’atụmatụ iche ógbè nche. N’oge na-adịbeghị nnọọ anya, mgbe e bosịworo ndị uwe ojii ọtụtụ ebubo banyere ịkpa ókè agbụrụ na ichepụta ihe akaebe ụgha iji maa mmadụ ikpe, ha etinyekwuwo ezi mgbalị iji kpaziwanye àgwà.

[Ebe E Si Nweta Foto]

Foto dị n’elu: http://www.constabulary.com

[Igbe/Foto dị na peeji nke 10]

Ọ̀ Bụ Ọrụ Ebube Mere na New York?

Mgbe ndị uwe ojii tinyere mgbalị pụrụ iche, ihe ndị na-esi na ya apụta na-adị ịrịba ama. Ruo ogologo oge, e lere New York anya dị ka otu n’ime obodo ukwu ndị kasị dịrị ize ndụ n’ụwa, mgbe ọ na-erulakwa ngwụsị afọ ndị 1980, o yiri ka ndị uwe ojii ahụ nwere nkụda mmụọ hà enweghịzi ike igbochi mpụ. Ụkọ ego manyere ndị isi obodo ukwu ahụ ime ka ụgwọ ọnwa ghara ịgbanwe agbanwe ma belata ọnụ ọgụgụ ndị uwe ojii. Ọnụ ọgụgụ ndị na-azụ ahịa ọgwụ ọjọọ mụbara, o mekwara ka ime ihe ike mụbaa. Ndị bi n’etiti obodo ukwu ahụ na-anụkarị ụda égbè mgbe ha na-alakpu ụra. E nwere ọgba aghara ndị kasị njọ nke agbụrụ na 1991, ndị uwe ojii n’onwe ha hazikwara mkpesa kpụ ọkụ n’ọnụ iji kwupụta iwe ha.

Otú ọ dị, otu onyeisi ọhụrụ nke ndị uwe ojii nwere mmasị n’ịkpali ndị uwe ojii ya, soro ha na-enwe nzukọ mgbe mgbe iji kpebie ụzọ ha ga-esi mee ihe, site n’ógbè ruo n’ógbè. James Lardner na Thomas Reppetto kọwara n’akwụkwọ ha bụ́ NYPD, sị: “Onyeisi ndị uwe ojii na-eme nchọpụta ma ọ bụ onyeisi Ngalaba Na-ahụ Maka Ọgwụ Ọjọọ bụ ndị ndị isi ndị uwe ojii na-elekọta ógbè na-agụ banyere ha n’akwụkwọ akụkọ ma bụrụ ndị ọ na-esi ike ka ha zute ezute. Ugbu a ha nile na-anọdụkọ ala ruo ọtụtụ awa n’otu oge.” Ọnụ ọgụgụ mpụ malitere ịdalata nke ukwuu. A kọrọ na igbu ọchụ jiri nwayọọ nwayọọ dalata site n’ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ 2,000 na 1993 ruo 633 na 1998—nke kasị ala n’ime afọ 35. Ọ fọrọ nke nta ka ndị New York lee ya anya dị ka ọrụ ebube. Mpụ ndị a kọrọ akụkọ ha n’ime afọ asatọ gara aga ji pasent 64 dalata.

Olee otú e si mee ka e nwee ọganihu a? Akwụkwọ akụkọ bụ́ The New York Times nke January 1, 2002, tụrụ aro na otu isi ihe kpatara ọganihu ahụ bụ “usoro e ji achọpụta mpụ bụ́ nke gụnyere inyocha site n’ógbè ruo n’ógbè ndekọ ọnụ ọgụgụ ndị a na-enweta kwa izu iji chọpụta na ime ihe banyere nsogbu dị iche iche ozugbo ha selitere isi.” Onye bụbu kọmishọna ndị uwe ojii bụ́ Bernard Kerik, kwuru, sị: “Anyị na-arịba ama ebe mpụ ahụ na-ewere ọnọdụ, ihe mere o ji na-ewere ọnọdụ ma zipụzie ndị uwe ojii na ihe ndị dị mkpa iji hụ na e lebaara ebe ndị ahụ anya. Ọ bụ otú ahụ ka e si ebelata mpụ.”

[Foto dị na peeji nke 7]

Ụlọ ọrụ ndị uwe ojii Japan nke dị otú o kwesịrị

[Foto dị na peeji nke 7]

Onye uwe ojii na-achịkwa ụgbọala na Hong Kong

[Foto dị na peeji nke 8, 9]

Ịchịkwa ìgwè mmadụ n’asọmpi bọl n’England

[Foto dị na peeji nke 9]

Ọrụ ndị uwe ojii gụnyere inyere ndị nwere ihe ọghọm aka