Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Olee Otú Mụ na Onye Mụ na Ya Bi Pụrụ Isi Na-ebi n’Udo?

Olee Otú Mụ na Onye Mụ na Ya Bi Pụrụ Isi Na-ebi n’Udo?

Ndị Na-eto Eto Na-ajụ Sị . . .

Olee Otú Mụ na Onye Mụ na Ya Bi Pụrụ Isi Na-ebi n’Udo?

“Achọrọ m kichin na-adị ọcha. Ma ndị mụ na ha bi achọghị ịma ma efere ọ kwasara ebe nile ma ọ bụ na a hapụrụ ite na arịa ndị ọzọ n’elu stovu. Nke ahụ adịghị ha ka ihe ọ bụla.”—Lynn. *

NDỊ bi n’otu ọnụ ụlọ. “Ha nwere ike ịbụ ndị enyi kasị dịrị ná mma ma ọ bụ ndị iro kasị njọ,” ka onye edemede bụ́ Kevin Scoleri na-ekwu. O nwere ike ị gaghị enwecha ụdị mmetụta siri ike otú ahụ, ma ọ bụ ihe a na-apụghị ịgbagha agbagha na gị na mmadụ ibi pụrụ ịbụ nnọọ ezigbo ihe ịma aka. * Esemokwu nke ndị bi n’otu ọnụ ụlọ bụ ihe a na-ahụkarị n’etiti ụmụ akwụkwọ mahadum nke na dị ka akwụkwọ bụ́ U.S.News & World Report si kwuo, ọtụtụ ụlọ akwụkwọ na-eme “mgbalị buru ibu” inyere ndị bi n’otu ọnụ ụlọ aka ibi n’udo, nke gụnyere “usoro ihe omume maka idozi esemokwu” nakwa nzukọ ọmụmụ ihe.

Ibikọ ọnụ n’otu ọnụ ụlọ pụrụ isiri ọbụna ndị na-eto eto bụ́ Ndị Kraịst ike, bụ́ ndị hapụrụ ụlọ ha iji rụọ ọrụ izisa ozi ọma oge nile. Ọ dị nnọọ mma ịmara na site n’itinye ụkpụrụ Bible n’ọrụ na site n’igosipụta “ezi amamihe,” ọtụtụ mgbe a pụrụ idozi esemokwu.—Ilu 2:7, NW.

Matanụ Onwe Unu

Ozugbo obi ụtọ nke ime nkwapụ gasịrị, ị pụrụ ịhụ ka ị na-enwe agụụ maka otú ihe dị n’ụlọ. (Ọnụ Ọgụgụ 11:4, 5) Otú ọ dị, ịdị na-eche banyere oge ndị gaworo aga, pụrụ nanị ime ka o sikwuoro gị ike ime mgbanwe. Eklisiastis 7:10 na-enye ndụmọdụ a: “Asịla, Gịnị kpatara ụbọchị ndị mbụ ji dị mma karịa ụbọchị ndị a? n’ihi na i siteghị n’amamihe jụọ ajụjụ banyere nke a.” Ee, ọ kasị mma ịgbalị ime ihe ọ bụla i nwere ike ime iji nweta obi ụtọ n’ọnọdụ ị nọ na ya.

Malite site n’ịgbalị ịmatakwu onye gị na ya bi nke ọma. N’eziokwu, ọ dịghị mkpa na ndị bi n’otu ụlọ ga-abụ ndị enyi kasị dịrị ná mma. N’ezie, o nwere ike onye ahụ agaghị abụ onye i nwere mmasị dị ukwuu n’ebe ọ nọ. Ka o sina dị, ọ́ bụghị ihe ezi uche dị na ya, ma ọ bụrụ na gị na onye ahụ ga-ebi, inwe mmekọrịta dị mma ruo n’ókè o kwere mee?

Ndị Filipaị 2:4 na-agwa anyị ka anyị “na-elekwasị anya, ọ bụghị n’igosi mmasị onwe onye nanị n’ihe ndị metụtara [anyị], kamakwa n’igosi mmasị onwe onye n’ihe ndị metụtara ndị ọzọ.” N’abanyeghị ná mkparịta ụka nke yiri ịgba ajụjụ ọnụ, ị̀ pụrụ ịjụ onye gị na ya bi banyere ezinụlọ ha, ihe ndị ọ na-enwe mmasị ime, ihe mgbaru ọsọ ya, nakwa ihe ndị na-amasị ya karị? Kọkwaara ya banyere onwe gị. Ka unu na-amatakwu onwe unu, otú a ka unu ga-amalite ịghọtakwu onwe unu.

Site n’oge ruo n’oge, na-emenụ atụmatụ a kapịrị ọnụ imekọ ihe ọnụ. Lee na-ekwu, sị: “Mgbe ụfọdụ, mụ na ndị mụ na ha bi na-apụ gaa rie nri n’ụlọ nri, ma ọ bụ anyị pụrụ ịga ebe a na-egosi ọrụ nkà.” Nye Ndị Kraịst na-ebikọ ọnụ, imekọ ihe ime mmụọ ọnụ, dị ka ịkwadebe maka nzukọ ọgbakọ ma ọ bụ ịrụ ọrụ izisa ozi ọma, bụ nnọọ ụzọ dị irè ọbụna karị nke isi zụlite ọbụbụenyi.

David na-ekwu, sị: “Mgbe onye mụ na ya bi kwuru okwu ihu ọha dabeere na Bible, agara m n’ọgbakọ ya ịga gbaa ya ume.” Ọ bụ ezie na ihe na-amasị ya dị iche na nke na-amasị onye ya na ya bi ma a bịa n’ihe ndị dị ka egwuregwu na egwú, ịhụnanya ha nwere maka ihe ime mmụọ ejikọtawo ha. “Anyị na-enwe ọtụtụ nkwurịta okwu banyere ihe ime mmụọ,” ka David na-ekwu. “N’ezie, anyị pụrụ ịdị na-ekwu okwu banyere ihe ime mmụọ ruo ọtụtụ awa.”

Okwu ịdọ aka ná ntị: Gị na onye gị na ya bi akpachila anya nke na ị gaghị eso ndị ọzọ nwee ọbụbụenyi na-ewuli elu. Ọ bụrụ na ọ na-adị onye gị na ya bi ka ọ bụ na ọ ghaghị ịkpọ gị mgbe ọ bụla ọ na-aga ebe ọ bụla, ọ pụrụ ịmalite ịdị ya ka ị dịghị ekwe ya megharịa ahụ́. Ndụmọdụ Bible bụ ka ị ‘na-agbasapụ’ agbasapụ n’ọbụbụenyi gị.—2 Ndị Kọrint 6:13.

Ịdị Ndụ Kwekọrọ n’Ụkpụrụ Ọma Ahụ

N’ezie ka unu na-amatakwu onwe unu, unu ga-aghọtakwa ndịrịta iche unu n’ihe banyere àgwà, ihe ndị na-amasị unu, na echiche unu. Dị ka Mark na-eto eto na-adọ aka ná ntị, “i kwesịrị ịtụ anya ezughị okè.” Ịbụ onye na-adịghị eme mgbanwe ma ọ bụ onye na-eche nanị banyere onwe ya na-akpata ahụ́ erughị ala. Otú ahụ ka ọ dịkwa ịtụ anya ka onye gị na ya bi mee nnukwute mgbanwe ka gị na ya wee nwee ike ibi.

Fernando amụtawo nke a banyere ịbụ onye ya na mmadụ bi: “Ị ghaghị ịbụ onye na-adịghị achọ ọdịmma onwe ya nanị nakwa onye na-adịghị eche nanị banyere onwe ya.” Okwu ya kwekọrọ n’Ụkpụrụ Ọma ahụ a ma ama, bụ́ nke na-asị: “Ya mere, ihe nile unu chọrọ ka ndị mmadụ na-emere unu, unu onwe unu aghaghị imere ha otú ahụ.” (Matiu 7:12) Dị ka ihe atụ, n’oge na-adịghị anya Fernando chọpụtara na ya na onye ya na ya bi nwere nghọtahie n’ihi ọ̀tụ̀tụ̀ okpomọkụ nke ime ụlọ; ọ na–achọ ka ọ na-ekpo ọkụ ma onye ya na ya bi na-enwe mmasị ka ụlọ jụọ oyi ma ọ na-ehi ụra. Gịnị ka ha ga-eme? Fernando na-ekwu, sị: “Azụtara m blanket.” Ee, dị ka Mark si tinye ya, “na-eme mgbanwe. Ọ bụghị na ị ga-ahapụcha ụzọ nile i si eme ihe, kama ị pụrụ ịhapụ ụfọdụ n’ime ha.”

Leekwa ebe ọzọ ị pụrụ itinye Ụkpụrụ Ọma ahụ n’ọrụ: Mụta ịnabata ihe ndị na-amasị onye gị na ya bi. Gịnịkwanụ ma ọ bụrụ na i nweghị mmasị n’ụdị egwú na-amasị ya? O yikarịrị ka o nwekwara ụdị mmetụta ahụ banyere ndị nke na-amasị gị. Ya mere, ọ bụrụ na ụdị egwú na-amasị onye gị na ya bi abụghị ndị rụrụ arụ, ị pụrụ ịgbalị ịmụta ịnabata ya. Fernando na-ekwu, sị: “Ọ gaara adị m mma ma a sị na onye mụ na ya bi adịghị akpọ ụdị egwú ndị ọ na-akpọ. Ma ọ marawo m ahụ́.” N’aka nke ọzọ, mmadụ pụrụ iji ntakịrị ígwè okwu a na-akwụnye ná ntị na-egere egwú ya ka ọ ghara inye onye ya na ya bi nsogbu, bụ́ onye nwere ike ịdị na-amụ ihe.

Itinye Ụkpụrụ Ọma ahụ n’ọrụ pụkwara igbochi esemokwu ndị na-enweghị isi banyere ihe onwunwe. Dị ka ihe atụ, ọ bụrụ na i nwere àgwà nke iwere ihe ọ bụla ị hụrụ n’ime friji rie—ma ị dịghị etinyekebe ọzọ—ọ pụrụ ịkpata mkpasu iwe. N’otu oge ahụkwa, iwe iwe ma ọ bụ ile onye gị na ya bi anya ọjọọ mgbe ọ na-eri ihe ị zụtara agaghịkwa eme ka unu nwee mmekọrịta dị mma. Bible na-agba anyị ume ịdị “na-emesapụ aka, na-adị njikere ikerịta ihe.” (1 Timoti 6:18) Ọ bụrụ na ị na-eche na a na-erigbu gị, ekewapụla onwe gị iche n’ekwughị okwu. Jiri obiọma kwupụta iwe gị n’ụzọ dị jụụ.

Na-akwanyerịtaranụ ihe onwunwe ibe unu ùgwù. Mmadụ ịdị nganga pụrụ ime ka o were ihe onye ọzọ n’anataghị ikike. (Ilu 11:2) Burukwa n’uche mkpa ọ dị onye gị na ya bi inwe mgbe ọ ga-anọrọ onwe ya. Na-akpa àgwà ọma ndị dị ka ịkụ aka tupu ị baa n’ọnụ ụlọ nke ya. Mgbe ị na-akwanyere ya ùgwù, o yiri ka onye gị na ya bi ọ̀ ga-akwanyekwara gị ùgwù. “O nweghị nsogbu na-adị n’onye ọ bụla n’ime anyị abụọ ịnọ n’ụlọ na-amụ ihe,” ka David na-ekwu. “Anyị na-akwanyere nnọọ nke ahụ ùgwù, anyị ga-anọkwa n’emeghịrị ibe anyị ụzụ. Ma mgbe ụfọdụ, m na-aga n’ọ́bá akwụkwọ gaa mụọ ihe ma ọ bụrụ na onye mụ na ya bi chọrọ ime ihe ọzọ.”

Itinye Ụkpụrụ Ọma ahụ n’ọrụ ga-agụnyekwa ịbụ onye a pụrụ ịtụkwasị obi mgbe a bịara n’ihe dị ka ịkwụ ụgwọ ụlọ nke gị n’oge ma ọ bụ ịrụ ọrụ ụlọ nke gị.

Idozi Esemokwu

Laa azụ n’oge Bible, ndị ikom abụọ bụ́ Ndị Kraịst a na-akwanyere ùgwù bụ́ Pọl na Banabas “nwere oké ntiwapụ nke iwe.” (Ọrụ 15:39) Gịnị ma ọ bụrụ na ihe yiri nke ahụ emee n’etiti unu abụọ? Ikekwe, e nwere nsogbu n’ihi ndịrịta iche n’ụdị mmadụ unu bụ ma ọ bụ ụfọdụ àgwà ndị na-akpasu iwe bụ́ ndị na-ele ndidi gị ule. Inwe otu nghọtahie ma ọ bụ barịta mba ọ̀ pụtara nnọọ na unu kwesịrị ịkwụsị ibikọ ọnụ? Ọ bụchaghị otú ahụ. N’ụzọ doro anya, Pọl na Banabas doziri nsogbu ha. Ikekwe gị onwe gị pụkwara ime otu ihe ahụ tupu i mee mkpebi gbara ọkpụrụkpụ dị ka ịkwapụ. Lee ụkpụrụ Bible ụfọdụ ndị pụrụ inye aka.

● ‘Unu Emela ihe ọ bụla n’ihi esemokwu ma ọ bụ n’ihi ịbụ ndị onwe ha na-ebu isi, kama site n’ịdị nwayọọ n’obi na-ewere na ndị ọzọ ka unu.’—Ndị Filipaị 2:3.

● “Ka e wepụ obi ilu na iwe na ọnụma na iti mkpu na okwu mkparị n’ebe unu nọ tinyere ihe ọjọọ nile. Ma bụrụnụ ndị na-emere ibe unu ebere, na-enwe obi ọmịiko, na-agbaghara ibe unu kpam kpam dị nnọọ ka Chineke gbaghakwaara unu kpam kpam site na Kraịst.”—Ndị Efesọs 4:31, 32.

● “Ya mere, ọ bụrụ na ị na-ewega onyinye gị n’ebe ịchụàjà, i wee cheta n’ebe ahụ na o nwere ihe nwanne gị nwere megide gị, hapụ onyinye gị n’ebe ahụ n’ihu ebe ịchụàjà, pụọkwa; buru ụzọ mee ka gị na nwanne gị dị n’udo, mgbe ahụkwa, mgbe ị bịaghachiworo, nye onyinye gị.”—Matiu 5:23, 24; Ndị Efesọs 4:26.

Uru Ọ Bara

Ọtụtụ Ndị Kraịst na-eto eto (na ndị metụworo okenye karị) bụ́ ndị nwere ndị ha na ha bi amụtawo n’onwe ha eziokwu dị n’ihe Eze Solomọn maara ihe kwuru: “Abụọ dị mma karịa otu.” (Eklisiastis 4:9) N’ezie, ọtụtụ ndị achọpụtawo na iso mmadụ bie bara uru. “Amụtawo m ụzọ isi soro ndị mmadụ na-emekọ ihe n’ụzọ ka mma nakwa ime mgbanwe,” ka Mark na-ekwu. Renee na-agbakwụnye, sị: “Ị na-amụta ọtụtụ ihe banyere onwe gị. N’otu mgbe ahụkwa, ndị ha na mmadụ bi pụrụ ịbụ nrụgide ndị ọgbọ nke dị mma.” Lynn na-ekweta, sị: “A zụtọrọ m nnọọ azụtọ tupu mụ na onye mụ na ya bi amalite ibi. Ma amụtawo m ịbụ onye na-eme mgbanwe. Achọpụtawo m ugbu a na nanị na mmadụ na-eme ihe n’ụzọ dị nnọọ iche n’otú m si eme apụtaghị na ihe ọ na-eme dị njọ.”

N’eziokwu, gị na onye gị na ya bi ịdị ná mma na-achọ mgbalị na ịchụ ihe ụfọdụ n’àjà. Ma ọ bụrụ na ị rụsie ọrụ ike n’itinye ụkpụrụ Bible n’ọrụ, unu pụrụ inweta ihe karịrị nnọọ ibikọ ọnụ n’udo; ị pụrụ ọbụna ịdị na-enwe obi ụtọ na i nwere onye gị na ya bi.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

^ par. 3 A gbanwewo aha ụfọdụ.

^ par. 4 Lee isiokwu bụ́ “Gịnị Mere O Ji Sie Oké Ike Mụ na Onye Mụ na Ya Bi n’Otu Ọnụ Ụlọ Ibikọ?,” nke pụtara ná mbipụta anyị nke May 8, 2002.

[Foto dị na peeji nke 30]

Iwere ihe ndị na-abụghị nke gị pụrụ ịkpata esemokwu

[Foto dị na peeji nke 31]

Na-egosirịtanụ ibe unu nchebara echiche