Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ị̀ Maara?

Ị̀ Maara?

Ị̀ Maara?

(A pụrụ ịchọta azịza nye ajụjụ ndị a n’akụkụ Bible ndị e depụtara, e bipụtakwara ndepụta zuru ezu nke azịza ha na peeji nke 15. Iji nwetakwuo ihe ọmụma, lee akwụkwọ bụ́ “Insight on the Scriptures,” nke Ndịàmà Jehova bipụtara.)

1. Mgbe Jezibel nyere iwu ka e gbuo ndị amụma Jehova, ònye zoro 100 n’ime ha n’ọgbà dịgasị iche iche? (1 Ndị Eze 18:3, 4)

2. Olee utu aha Jizọs, nke ọbụna mmụọ ọjọọ na-adịghị ọcha Jizọs chụpụrụ n’ime otu nwoke, n’ụlọ nzukọ dị na Kapaniọm, matara? (Luk 4:34)

3. Gịnị bụ aha di Naomi? (Rut 1:3)

4. Olee ndị bụ ndị ọchịchị ise nke Rom ndị Luk kpọtụrụ aha n’igosipụta mgbe Jọn Onye Na-eme Baptizim malitere ozi ya? (Luk 3:1)

5. Olee akụkụ ebe ma ụlọikwuu ahụ ma ụlọ nsọ ahụ chere ihu? (Ọnụ Ọgụgụ 3:38)

6. Ụmụ nwoke ole ka Jesi mụrụ, Devid bụkwa nke ole n’ime ha? (1 Samuel 17:12, 14)

7. N’ihi gịnị ka ndị Farisii ji jụọ Jizọs ajụjụ? (Matiu 22:15)

8. N’obodo dị aṅaa nke ndị Filistia ka Samsin jere nweta uwe mgbanwe 30 o nyere ndị “zatara” ilu ya? (Ndị Ikpe 14:19)

9. N’ọhụụ Jọn banyere ocheeze Jehova, gịnị ka ihe nke abụọ e kere eke dị ndụ yiri? (Mkpughe 4:7)

10. Olee obodo Jehova na-ebibighị mgbe eze na ndị obodo ya chegharịrị site n’ụzọ ọjọọ ha? (Jona 3:1-10)

11. N’ihi gịnị ka e ji dụọ anyị ọdụ ka anyị ‘na-erubere ndị na-edu ndu’ n’ọgbakọ isi? (Ndị Hibru 13:17)

12. N’ikwu okwu banyere ọjụjụ Chineke jụrụ Izrel anụ ahụ́ ma were mba ime mmụọ ahụ, olee onye amụma nke buru amụma na “ndị na-abụghị ndị m ka m ga-akpọ ‘ndị m’”? (Ndị Rom 9:25)

13. N’ọhụụ Jọn, gịnị ka mmụọ ozi ahụ ji kee Setan agbụ? (Mkpughe 20:1)

14. N’ihi gịni ka Akwịla na Prisila ji si Rom kwaga Kọrint? (Ọrụ 18:2)

15. Gịnị mere na anyị apụghị ịhụ ikpe na-ezighị ezi n’iwe Chineke? (Joshua 7:1)

16. Olee ihe Aịzaịa ji ndị ajọ omume tụnyere bụ́ ndị e kewapụrụ n’ebe Chineke nọ? (Aịsaịa 57:20)

17. Ònye bụ eze ikpeazụ nke Juda nke chịrị na Jeruselem? (2 Ndị Eze 24:18)

18. Gịnị ka Jizọs gwara onye odeakwụkwọ ahụ nke sịrị na ya ga-aga ebe ọ bụla Jizọs gara, na-egosi na ndị na-eso ya ga-enwe ihe isi ike? (Luk 9:58)

19. Olee ajọ eze Moab nke nwere afọ abụba dị na ya nke na mma agha Ihud mara ya bamichara n’ime afọ ya? (Ndị Ikpe 3:17-22)

20. Gịnị ka Kliopas jụrụ Jizọs n’ihi ịbụ onye o juru anya na o yiri ka ọ maghị ihe mere na Jeruselem n’oge na-adịbeghị anya? (Luk 24:18)

Azịza Nye Ajụjụ

1. Obadaịa, bụ́ onye isi ụlọ

2. “Onye Nsọ nke Chineke”

3. Elimelek

4. Taịbiriọs Siza, Pọntiọs Paịlet, Herọd Antipas, nwanne ya nwoke bụ́ Filip, na Laịsenias

5. Ọwụwa Anyanwụ

6. Asatọ; ọdụdụ nwa

7. “Ka ha wee jide ya n’okwu ya”

8. Ashkelọn

9. “Nwa oké ehi”

10. Nineve

11. Ka ha wee nwee ike ịza ajụjụ ha ‘n’ọṅụ, ọ bụghị n’ịsụ ude,’ bụ́ nke “ga-ebibiri” anyị ihe

12. Hozia

13. “Nnukwu agbụ ígwè”

14. N’ihi iwu Klọdiọs nyere nke chụpụrụ ndị Juu na Rom

15. Ọ na-abụ nke ziri ezi mgbe nile, nke a chịkwara achịkwa, nke kwekọkwara n’àgwà ya ndị bụ́ ịhụnanya, amamihe, na ikpe ziri ezi

16. Oké osimiri nke na-amagharị amagharị

17. Zedekaịa

18. “Nwa nke mmadụ enweghị ebe ọ bụla ịtọgbọ isi ya”

19. Eglọn

20. “Ì bi dị ka onye ala ọzọ nanị gị na Jeruselem?”