Bible E Dere n’Asụsụ E Ji Eme Ihe Kwa Ụbọchị
Bible E Dere n’Asụsụ E Ji Eme Ihe Kwa Ụbọchị
Site n’ikike nke Onye Nduzi na Onye Nlekọta Ọ́bá Akwụkwọ, na Mahadum John Rylands nke Manchester
“Ọ BỤRỤ na i kweere na Bible bụ okwu Chineke nye ihe a kpọrọ mmadụ, ọ pụtara na Chineke na-agwa anyị okwu. . . . Ọ bụrụ na okpukpe gị na-emetụta ndụ gị nile, mgbe ahụ asụsụ e ji dee [Bible o ji eme ihe] aghaghị ịbụ nke e ji eme ihe kwa ụbọchị.” Ihe a ka ọkà mmụta bụ́ Alan Duthie dere n’akwụkwọ ya bụ́ Bible Translations: And How to Choose Between Them.
Ndị hụrụ Okwu Chineke n’anya ji obi ha nile kwenye na nke ahụ. Ha kwenyesiri ike na “Akwụkwọ Nsọ dum sitere n’ike mmụọ nsọ Chineke, baakwa uru maka izi ihe, maka ịdọ aka ná ntị, maka ime ka ihe guzozie, maka inye ọzụzụ n’ezi omume.” (2 Timoti 3:16) Bible abụtụghị akwụkwọ okpukpe na-agbụ agbụ, nke oge ya gafeworo. Ọ “dị ndụ ma na-akpa ike,” na-enye ezi ihe ngwọta maka nsogbu ndị a na-enwe ná ndụ a na-adị kwa ụbọchị. (Ndị Hibru 4:12) Otú ọ dị, ka ndị na-agụ akwụkwọ ahụ dị nsọ ghọta ma na-etinye ihe ha mụtara na ya n’omume, ọ ghaghị ịbụ nke e dere n’asụsụ e ji eme ihe kwa ụbọchị. E kwuwerị, e deghị ihe ahụ a na-akpọ Agba Ọhụrụ n’asụsụ nkà mmụta Grik, bụ́ nke ndị ọkà ihe ọmụma, dị ka Plato jiri mee ihe, kama e dere ya n’asụsụ Grik nke ndị nkịtị na-eji eme ihe kwa ụbọchị bụ́ nke a na-akpọ Koine. Ee, e dere Bible ka ndị nkịtị nwee ike ịgụ ya ma ghọta ya.
Iji mezuo nke a, n’afọ ndị na-adịbeghị anya, e bipụtawo ọtụtụ nsụgharị ọgbara ọhụrụ n’asụsụ dịgasị iche iche. Ihe ka ukwuu n’ihe ndị ọ rụpụtara abawo nnọọ uru. E mewo ka Akwụkwọ Nsọ nwekwuo ike iru ọha mmadụ n’ozuzu ha aka. N’agbanyeghị nke ahụ, ọtụtụ n’ime nsụgharị ọhụrụ ndị a kụrụ nnọọ afọ n’ala ma a bịa n’ihe banyere izi ezi na inwe nkwekọ na-adalagaghị n’otu akụkụ. Dị ka ihe atụ, ụfọdụ na-eme ka ozizi doro anya nke Bible banyere ọnọdụ ndị nwụrụ anwụ, ihe mkpụrụ obi mmadụ bụ, na aha ezi Chineke ahụ, ghara ido anya.
Ya mere, ndị hụrụ Okwu Chineke n’anya nabatara mwepụta e wepụtara Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ Grik nke Ndị Kraịst n’asụsụ Igbo. Ndịàmà Jehova mara ọkwa mwepụta e wepụtara nsụgharị nke oge a ná mgbakọ distrikti ha nwere na 2001/2002. N’abụghị nke ụkpụrụ nkwenkwe okpukpe metụtara, nsụgharị ya ziri ezi n’ụzọ na-enweghị atụ, na-eme ka e nwee ike inwe nghọta mmiri emi nke Bible bụ́ nke ndị na-amaghị asụsụ oge ochie ndị ahụ na-enwetabughị. Otú ọ dị, ị pụrụ iche sị, ọ̀ bụ ole ndị rụrụ ọrụ nsụgharị a dị ịrịba ama?
Ndị Nsụgharị Ndị Buliri Chineke Elu
Ọ bụ ezie na Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ Grik nke Ndị Kraịst pụrụ ịbụ ihe ọhụrụ nye ndị na-asụ Igbo, n’ezie ọ dịlarị adị kemgbe 1950. N’oge ahụ, Watch Tower Bible and Tract Society—òtù Bible nke mba nile bụ́ nke nọworo na-ebipụta Bible eri ogologo oge—wepụtara ya n’asụsụ Bekee. Aha nsụgharị ọhụrụ a—nke hapụrụ nnọọ ụzọ ochie nke ikewa Bible gaa n’agba “ochie” na n’agba “ọhụrụ”—bụ nnọọ otu n’ime ọtụtụ ụzọ o si pụọ iche. Ụlọ Nche (Bekee) nke September 15, 1950, kwuru, sị: “Ndị ikom mejupụtara kọmitii nsụgharị ahụ egosipụtawo ọchịchọ ha . . . ịnọ n’ekwughị aha ha, ha achọtụghịkwa ka e bipụta aha ha n’oge ha nọ ndụ ma ọ bụ mgbe ha nwụsịrị. Nzube nke nsụgharị ahụ bụ ibuli aha ezi Chineke ahụ dị ndụ elu.”
E wepụtara New World Translation of the Holy Scriptures, bụ́ mbipụta nke Bible dum dị n’otu mpịakọta na 1961. Ọ bụ ezie na
e kpughebeghịkwa aha ndị sụgharịrị ya ruo taa, e nweghị obi abụọ ọ bụla banyere ebumnobi ha ma ọ bụ otú nraranye ha miruru emi. Okwu mmalite nke mbipụta nke 1984 kwuru, sị: “Ịsụgharị Akwụkwọ Nsọ pụtara itinye n’asụsụ ọzọ echiche na okwu Jehova Chineke . . . Ndị sụgharịrị akwụkwọ a, bụ́ ndị na-atụ Chineke Onye Dere Akwụkwọ Nsọ egwu ma hụ ya n’anya, gụrụ ya na ha nwere ibu ọrụ pụrụ iche n’ebe Ọ nọ ịsụgharị echiche na okwu ya n’ụzọ ziri ezi ruo n’ókè o kwere mee.”N’agbanyeghị na ha nwere ezi nzube, ndị nọ na kọmitii ahụ hà ruru eru ịrụ ọrụ a? Ụfọdụ ndị ọkà mmụta obi jọrọ njọ rụrụ ụka na ọ bụrụ na e kpugheghị aha ndị sụgharịrị ya na iru eru ha n’agụmakwụkwọ, e kwesịrị iwere nsụgharị ahụ ozugbo dị ka nsụgharị nke ndị na-amaghị nke a na-akọ. Ma ọ bụghị ndị ọkà mmụta nile nweworo echiche dị otú ahụ ezi uche na-adịghị na ya. Alan S. Duthie dere, sị: “Ọ bụrụ na anyị amara ndị sụgharịrị ma ọ bụ bipụta otu nsụgharị Bible kpọmkwem, ọ̀ na-enyere anyị aka ikpebi ma nsụgharị ahụ ọ̀ dị mma ma ọ bụ dị njọ? Ọ dịchaghị enye aka. Ọ dịghị ihe a ga-eji dochie anya inyocha ọdịdị nke nsụgharị nke ọ bụla n’onwe ya.” *
Ọtụtụ puku ndị na-agụ ya emewo nke ahụ. Ruo taa e bipụtawo ihe karịrị Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ 114,590,000 n’ozuzu ya ma ọ bụ n’akụkụ ya ụfọdụ n’asụsụ 42 n’ụwa nile. Gịnị ka ọtụtụ ndị na-agụ ya chọpụtaworo?
Nsụgharị nke Na-edo Aha Chineke Nsọ
Na Matiu 6:9, Jizọs kụziiri ndị na-eso ụzọ ya ikpe ekpere, sị: “Nna anyị nke nọ n’eluigwe, ka e doo aha gị nsọ.” Ma n’ihe ka ọtụtụ ná nsụgharị ndị e nwere, Chineke bụ onye na-enweghị aha, nke e ji nanị utu aha ndị bụ́ “Chineke” ma ọ bụ “Onyenwe Anyị,” mara. Otú ọ dị, ọ dịghị otú a na mbụ. A kpọrọ Chineke aha aka ahụ bụ́ “Jehova” n’ụzọ doro anya ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ ugboro 7,000 n’Akwụkwọ Nsọ Hibru mbụ. (Ọpụpụ 3:15; Abụ Ọma 83:18) Ka ọtụtụ afọ gasịrị, egwu nkwenkwe ụgha mere ka ndị Juu kwụsị iji aha Chineke na-eme ihe. Mgbe ndịozi Jizọs nwụsịrị, echiche nkwenkwe ụgha a batara n’ọgbakọ Ndị Kraịst. (Tụlee Ọrụ 20:29, 30; 1 Timoti 4:1.) Ndị depụtaghachiri akụkụ dị iche iche nke Akwụkwọ Nsọ e dere n’asụsụ Grik malitere iji okwu Grik bụ́ Kyʹri·os na The·osʹ, bụ́ ndị pụtara “Onyenwe Anyị” na “Chineke” n’otu n’otu, na-edochi anya aha aka Chineke, bụ́ Jehova.
N’ụzọ na-enye obi ụtọ, Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ emewo ihe obi ike bụ́ iweghachi aha Jehova n’Akwụkwọ Nsọ Grik nke Ndị Kraịst (“Agba Ọhụrụ”), aha ahụ pụtara ugboro 237 na ya. E weghachighị nke a na-adabere n’ọchịchọ ndị ahụ sụgharịrị ya, kama ọ dabeere n’ihe e ji nlezianya mụta. Dị ka ihe atụ, Luk 4:18 hotara ihe e kwuru n’Aịsaịa 61:1. N’ihe odide Hibru mbụ, aha ahụ́ bụ́ Jehova dị n’amaokwu ahụ n’Aịsaịa. * Mgbe ahụ, n’ụzọ kwesịrị ekwesị, ná Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ, a sụgharịrị Luk 4:18 otú a: “Mmụọ Jehova dịkwasịrị m, n’ihi na o tere m mmanụ ịkpọsara ndị ogbenye ozi ọma.”
Nsụgharị ndị dị otú ahụ na-enyere ndị na-agụ ha aka ịmata ọdịiche dị n’etiti Jehova Chineke na Ọkpara ọ mụrụ nanị ya, bụ́ Jizọs Kraịst. Dị ka ihe atụ, ihe ka ọtụtụ ná nsụgharị ndị e nwere sụgharịrị Matiu 22:44 dị ka nke na-ekwu, sị: “Onyenwe anyị sịrị Onyenwe m.” Ma ọ̀ bụ onye na-agwa ònye okwu? N’eziokwu, amaokwu a bụ nhota sitere n’Abụ Ọma 110:1, bụ́ nke, n’ihe odide Hibru mbụ, nwere aha Chineke. N’ihi ya, Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ sụgharịrị amaokwu a, otú a: “Jehova gwara Onyenwe m, sị: ‘Nọdụ ala n’aka nri m ruo mgbe m ga-edebe ndị iro gị n’okpuru ụkwụ gị.’” Ịghọta ngosipụta Akwụkwọ Nsọ gosipụtara ọdịiche dị n’etiti Jehova Chineke na Ọkpara ya abụghị ịkọ nkọ. (Mak 13:32; Jọn 8:17, 18; 14:28) Ọ dị mkpa maka nzọpụta nke mmadụ. Ọrụ 2:21 na-ekwu, sị: “Onye ọ bụla nke na-akpọkukwa aha Jehova ka a ga-azọpụta.”
Izi Ezi na Ido Anya
E nwere ihe ndị ọzọ dị ịrịba ama ná Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ. A họọrọ ihe odide Grik bụ́ isi, nke na-enweghị nnọọ ntụpọ, bụ́ nke Westcott na Hort dere dị ka ihe bụ́ isi nsụgharị a dabeere na ya. Mgbe ahụ, e jiri nnọọ nlezianya hụ na a sụgharịrị Grik mbụ ahụ n’ụzọ ziri ezi nakwa n’ụzọ nkịtị ruo ókè o kwere mee, gaa n’asụsụ dị mfe e ji eme ihe ugbu a. Ọ bụghị nanị na ime otú ahụ chekwara ụtọ na ido anya nke ihe odide Bible mbụ ahụ n’ụzọ dị ukwuu kama o mekwara ka e nwee ike ịghọta ya nke ọma.
Were, dị ka ihe atụ, akụkụ Akwụkwọ Nsọ bụ́ Ndị Rom 13:1, bụ́ ebe Pọl onyeozi gbara Ndị Kraịst ume ‘ido onwe ha n’okpuru ikike ndị ka elu,’ ma ọ bụ gọọmenti. Ọtụtụ nsụgharị gara n’ihu ikwu na “Chineke guzobere” ma ọ bụ “Chineke họpụtara” gọọmenti ndị dị otú ahụ. (King James Version; Jerusalem Bible) Ụfọdụ ndị ọchịchị ejiwo nsụgharị ndị dị otú ahụ kwadoo ọchịchị aka ike ha. Ma dị ka e si mara ya, Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ sụgharịrị amaokwu a n’ụzọ ziri ezi nakwa n’ụzọ nkịtị, sị, “Chineke debere ikike ndị dị adị n’ọkwá ha ndị ka ala.” * Ugbu a, a pụrụ ịghọta na ọ bụ ezie na Chineke adịghị ahọpụta ndị ọchịchị ụwa n’onwe ya, ọ na-ekwe ka ndị dị otú ahụ nwee ikike n’ebe ibe ha nọ ruo n’ókè ụfọdụ—ma na-abụ nke dị ala mgbe nile n’ebe ya onwe ya nọ.
Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ na-agbalịkwa igosipụta obere ọdịiche ndị dị n’etiti ngwaa Grik dị iche iche. N’ọtụtụ asụsụ ndị e ji eme ihe n’oge a, a na-ejikọta ngwaa dị iche iche iji gosipụta oge ihe e kwuru n’otu ngwaa weere ọnọdụ—ya bụ́, ihe gara aga, ihe na-eme ugbu a, ma ọ bụ ihe ga-eme n’ọdịnihu. Na Grik, ngwaa na-egosipụtakwa ụdị ihe e mere—ma è mere ya ruo nwa oge, ma è mechara ya, ma ọ bụ ma à ka na-eme ya. Tụlee ihe Jizọs kwuru na Matiu 6:33. Ngwaa Grik pụtara “ịchọ” na-enye echiche nke ihe omume na-aga n’ihu. E si otú a wepụta mmetụta zuru ezu nke okwu Jizọs ná nsụgharị bụ́: “Ya mere, nọgidenụ buru ụzọ na-achọ alaeze ahụ na ezi omume ya, a ga-atụkwasịkwara unu ihe ọzọ ndị a nile.” N’otu aka ahụ, a sụgharịrị Matiu 7:7 otú a: “Nọgidenụ na-arịọ, a ga-enyekwa unu; nọgidenụ na-achọ, unu ga-achọtakwa; nọgidenụ na-akụ, a ga-emeghekwara unu.”—Leekwa Ndị Rom 1:32; 6:2; Ndị Galeshia 5:15.
Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ gbalịrị nke ukwuu inwe nkwekọ na iji otu ụdị okwu mee ihe n’otú o si sụgharịa okwu ndị bụ́ isi. Dị ka ihe atụ, a sụgharịrị okwu Grik bụ́ psy·kheʹ, ịbụ “mkpụrụ obi” n’ebe nke ọ bụla ọ pụtara. N’ihi ya, ndị na-agụ ya pụrụ ịghọta ngwa ngwa na, n’adịghị ka ozizi okpukpe, mkpụrụ obi abụghị ihe na-adịghị anwụ anwụ. Ọ pụrụ ịnwụ anwụ.—Matiu 2:20; Mak 3:4, Luk 6:9; 17:33.
Ime Ka Okwu Chineke Ruo Ndị Mmadụ Aka n’Ụwa Nile
Mwepụta e wepụtara Akwụkwọ Nsọ Grik nke Ndị Kraịst n’asụsụ Igbo ka bụ mmalite. E mewo ndokwa ịsụgharị Bible dum mgbe oge ya ruru. Otú ọ dị, ndị na-agụ nsụgharị Igbo hà pụrụ ijide n’aka na ọ ga-ezi ezi ma nwee nkwekọ dị ka nke Bekee ya?
Eenụ. Nke a bụ n’ihi na Watch Tower Society lekọtara nnọọ ọrụ nsụgharị ya. E jiri amamihe kpebie na ọ ga-akasị mma ka a gbakọọ aka n’ihe banyere ịsụgharị Bible gaa n’asụsụ ọzọ. N’ihi ya e guzobere ìgwè ndị nsụgharị Bible n’ọtụtụ ala n’ụwa nile. E guzobere otu ngalaba a na-akpọ Ije Ozi Maka Nsụgharị n’isi ụlọ ọrụ Watch Tower Society, dị na Brooklyn, New York, iji gboo mkpa ìgwè ndị ahụ, iji zaa ajụjụ dị iche iche, na iji hụ na mbipụta nke asụsụ dị iche iche nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ kwekọrọ. Watch Tower Society emepụtawokwa otu ngwá ọrụ bara nnọọ uru, ya bụ́, usoro e ji kọmputa achịkwa iji nyere ndị na-asụgharị Bible aka. Aghọtahiela ihe a na-ekwu: Ọrụ nsụgharị ka chọrọ mgbalị dị ukwuu nke mmadụ. Ma kọmputa emewo ka ihe mgbaru ọsọ dị elu e setịpụụrụ ìgwè ndị nsụgharị Bible, bụ́ ndị ga-asụgharị Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ ka o zie ezie ma nwee nkwekọ dị ka mbipụta nke Bekee, dịrị nnọọ mfe. Tinyere ihe ndị ọzọ, usoro na-eji kọmpụta arụ ọrụ na-egosi otú e si sụgharịa okwu Hibru na Grik nke ọ bụla ná mbipụta Bekee—ihe enyemaka dị ukwuu nye ndị nsụgharị n’ịhọrọ mkpụrụ okwu ndị ha na ha kwekọrọ n’asụsụ ha.
A pụrụ ịhụ ihe ịga nke ọma nke ndokwa a ngwa ngwa nanị site n’ile anya n’ihe ndị si na ya pụta. Anyị na-agba gị ume inyocha Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ Grik nke Ndị Kraịst. Ị pụrụ inweta ya site n’aka ndị bipụtara magazin a. Ị ga-anụkwa ụtọ ọtụtụ ihe pụrụ iche dị na ya: mkpụrụ akwụkwọ a na-ahụ nke ọma, ndị na-ekwe ọgụgụ; isiokwu ndị dị n’elu peeji, bụ́ ndị ga-enyere gị aka ịchọta amaokwu ndị ị maara ngwa ngwa karị; map ndị nwere nkọwa zuru ezu; na ihe odide ntụkwasị na-adọrọ mmasị. Nke kasị mkpa, ị pụrụ ịgụ Bible a, na-enwe obi ike na ọ na-ekwu kpọmkwem ihe Chineke kwuru, n’asụsụ e ji eme ihe kwa ụbọchị.
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
^ par. 10 N’ụzọ na-akpali mmasị, mkpo nke New American Standard Bible nke (1971) nke Nwere Ntụaka kwuru n’otu aka ahụ, sị: “Anyị ejighị aha ọkà mmụta ọ bụla mee ihe dị ka ihe izo aka ma ọ bụ ihe ịtụ aro n’ihi na anyị kweere na Okwu Chineke kwesịrị ịkwụrụ n’onwe ya.”
^ par. 14 Ọ bụ eziokwu na nhota Akwụkwọ Nsọ Hibru ndị e mere n’ihe a na-akpọ Agba Ọhụrụ dabeere ná nsụgharị Septuagint Grik. Ebe ọ bụ na aha Chineke adịghị na Septuagint ndị nke e wepụtara mgbe e mesịrị, ọtụtụ ndị ọkà mmụta na-ekwu na e kwesịkwara iwepụ aha ahụ n’Akwụkwọ Nsọ Grik nke Ndị Kraịst. Otú ọ dị, Septuagint ndị nke kasị ochie a ka nwere ugbu a bu aha ahụ bụ́ Jehova—n’ụdị mbụ ya e dere n’asụsụ Hibru. Nke a na-akwadosi ike mweghachi e weghachiri aha ahụ bụ́ Jehova n’Akwụkwọ Nsọ Grik.
^ par. 18 Lee akwụkwọ bụ́ A Manual Greek Lexicon of the New Testament, nke G. Abbott-Smith dere, na A Greek-English Lexicon bụ́ nke Liddell na Scott dere. Dị ka akwụkwọ ndị a na ndị ọzọ a pụrụ ịdabere na ha si kwuo, okwu Grik ahụ pụtara n’ụzọ nkịtị “idokwa ihe n’usoro, idebe ihe n’ọnọdụ ya.”
[Foto dị na peeji nke 27]
Ndị so dee Bible, dị ka Pọl onyeozi dere ya n’asụsụ a na-eji eme ihe kwa ụbọchị
[Foto dị na peeji nke 28]
Ihe ndị dị ná Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ:
[Foto dị na peeji nke 28]
E jiri nnọọ nlezianya hụ na a sụgharịrị Grik mbụ ahụ n’ụzọ ziri ezi nakwa n’ụzọ nkịtị ruo ókè o kwere mee, gaa n’asụsụ dị mfe e ji eme ihe ugbu a
[Foto dị na peeji nke 28]
Mkpụrụ akwụkwọ ndị dị mfe ọgụgụ na-eme ka ịgụ ya bụrụ ihe na-atọ ụtọ
[Foto dị na peeji nke 29]
Isiokwu ndị dị n’elu peeji na-eme ka ọ dị mfe ịchọta amaokwu Bible ndị ị maara ngwa ngwa karị
[Foto dị na peeji nke 29]
Map ndị nwere nkọwa zuru ezu na-enyere ndị na-agụ ya aka ịghọtakwu ọdịdị mbara ala ndị a kpọrọ aha na Bible
[Foto dị na peeji nke 30]
Ido anya nke “Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ” bara nnọọ uru n’ozi Ndị Kraịst