Gịnị Dị Njọ n’Ịgba Chaa Chaa?
Gịnị Dị Njọ n’Ịgba Chaa Chaa?
“Ihe dị ka ndị Australia 290,000 nwere nsogbu ịgba chaa chaa, ọ bụkwa ha na-akpata mfu nke ihe karịrị ijeri $3 a na-enwe kwa afọ. Nke a na-abụ ọdachi nye ọ bụghị nanị ndị a nwere nsogbu ịgba chaa chaa, kamakwa nye ihe e mere atụmatụ ya ịbụ nde mmadụ 1.5, bụ́ ndị ha na-emetụta kpọmkwem n’ihi ịnọ n’enweghịzi ego, ịgba alụkwaghịm, igbu onwe onye na ịtụfu oge n’ọrụ.”—J. Howard, praịm minista Australia, 1999.
JOHN, bụ́ onye a kpọtụrụ aha n’isiokwu bu ụzọ, ghọrọ onye nwere nsogbu ịgba chaa chaa. * Ọ kwagara Australia, bụ́ ebe ọ lụrụ Linda, bụ́ onye na-agbakwa chaa chaa. Ma ịgba chaa chaa nke riri John ahụ́ kara njọ. Ọ na-ekwu, sị: “Esi m n’ịgba tiketi lọtrị banye n’iti ebe maka ịnyịnya ndị e ji asọ mpi ọsọ nakwa n’ịgba chaa chaa n’ụlọ ọkụ na-eri ego. N’ikpeazụ, amalitere m ịgba chaa chaa n’ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ ụbọchị nile. Mgbe ụfọdụ, ana m emefucha ego ọnwa m dum n’ịgba chaa chaa ma gharazie inwe ihe ọ bụla fọdụrụnụ m ga-eji kwụọ ụgwọ m ji ma ọ bụ iji nye ezinụlọ m nri. Ọbụna mgbe m ritere nnukwu ego, anọgidere m na-agba chaa chaa. Ọ bụ mkpali mmadụ na-enweta mgbe o ritere ego mere ka m nọgide na ya.”
E nwere ọtụtụ ndị dị ka John. O yiri ka ara ịgba chaa chaa ọ̀ na-agba ọha mmadụ nile. Magazin bụ́ USA Today kwuru na n’agbata afọ 1976 na 1997, e nwere oké ịrị elu dị pasent 3,200 n’ego a na-emefu n’ịgba chaa chaa iwu kwadoro na United States.
“A nọbu na-ele ịgba chaa chaa anya dị ka omume ọjọọ na ihe na-adịghị mma n’etiti ọha na eze. Taa, ọ bụ ihe e ji egbu oge nke ọha na eze nabatara,” ka akwụkwọ akụkọ Canada bụ́ The Globe and Mail kwuru. N’ikwu otu ihe mere e ji nwee mgbanwe a n’àgwà ọha na eze, akwụkwọ akụkọ ahụ kwuru, sị: “Mgbanwe e nwere n’àgwà ụmụ mmadụ n’ebe ịgba chaa chaa dị bụ kpọmkwem n’ihi ihe pụrụ ịbụ usoro mkpọsa ihe kasị oké ọnụ na nke kasị dịtee aka bụ́ nke gọọmenti tinyetụworo ego na ya n’akụkọ ihe mere eme nke Canada.” Mmetụta dị aṅaa ka mgbalị ndị e meworo iji kwalite ịgba chaa chaa nweworo n’obodo ụfọdụ?
Njupụta nke Nsogbu Ịgba Chaa Chaa
Dị ka atụmatụ Ngalaba Ihe Iri Ahụ́ nke Ụlọ Akwụkwọ Nkà Ọgwụ nke Harvard mere na-egosi, na 1996, e nwere “nde ndị America 7.5 toworo eto bụ́ ndị nwere nsogbu ịgba chaa chaa na ndị na-agba chaa chaa n’ụzọ na-enweghị nchịkwa,” gụnyekwara “nde ndị America 7.9 nọ n’oge uto ha bụ́ ndị nwere nsogbu ịgba chaa chaa na ndị na-agba chaa chaa n’ụzọ na-enweghị nchịkwa.” E denyekọtara ọnụ ọgụgụ ndị a n’akụkọ Òtù Ọrụ Na-amụ Banyere Mmetụta Ịgba Chaa Chaa Na-enwe ná Mba wepụtara, bụ́ nke e nyefere òtù Nzukọ Ndị Omeiwu United States. Akụkọ ahụ kwuru na ọnụ ọgụgụ ndị nwere nsogbu ịgba chaa chaa n’America nwere ike ịkarị nnọọ ihe e dekọrọ.
N’ihi enwekwaghị ọrụ, enwechaghịzi ahụ́ ike, ịkwụ ndị na-enweghị ọrụ ego mmachi akpa, na ihe usoro ọgwụgwọ na-efu, a na-eme atụmatụ na nsogbu ịgba chaa chaa na-efu ndị United States ọtụtụ ijeri dollar kwa afọ. Otú ọ dị, ọnụ ọgụgụ a adịtụghị egosi mfu na nhụjuanya nsogbu ịgba chaa chaa na-ewetara ndị mmadụ—ihe ọ na-efu ndị ezinụlọ, ndị enyi, na ndị ọrụ ibe mmadụ, bụ́ nke izu ohi, iri ego, igbu onwe onye, ime ihe ike n’ebe obibi, na
imetọ ụmụaka na-akpata. Otu nnyocha e mere n’Australia gosiri na otu onye ọ bụla nwere nsogbu ịgba chaa chaa pụrụ inwe mmetụta dị njọ kpọmkwem n’ahụ́ ihe ruru mmadụ iri. Otu akụkọ sitere n’aka Kansụl Na-eme Nnyocha ná Mba bụ́ nke dị na United States na-ekwu na ihe ruru “pasent 50 nke ndị di ma ọ bụ nwunye na pasent 10 nke ụmụaka bụ ndị onye na-agba chaa chaa n’ụzọ na-enweghị nchịkwa na-eti ihe.”Ihe Iri Ahụ́ nke Na-efe Efe
Dị ka ọrịa ụfọdụ, nsogbu ịgba chaa chaa pụrụ iyi ihe na-esi na nne ma ọ bụ nna efere nwa. “O yikarịrị ka ụmụ nke ndị ịgba chaa chaa riri ahụ́ hà ga-etinye aka n’akparamàgwà dị njọ, ndị dị ka ise siga, aṅụrụma, iji ọgwụ ọjọọ eme ihe, ma nwee ihe ize ndụ ka ukwuu nke inwe nsogbu ịgba chaa chaa n’onwe ha ma ọ bụ bụrụ ndị na-agba chaa chaa n’ụzọ na-enweghị nchịkwa,” ka akụkọ Òtù Ọrụ Na-amụ Banyere Mmetụta Ịgba Chaa Chaa Na-enwe ná Mba kwuru. Akụkọ ahụ dọkwara aka ná ntị na “ndị nọ n’oge uto bụ́ ndị na-agba chaa chaa yikarịrị ka hà ga-enwe nsogbu ịgba chaa chaa ma ọ bụ bụrụ ndị na-agba chaa chaa n’ụzọ na-enweghị nchịkwa karịa ndị toruworo ogo mmadụ.”
Dr. Howard J. Shaffer, bụ́ onye ntụzi ọrụ nke Ngalaba Ihe Iri Ahụ́ nke Ụlọ Akwụkwọ Nkà Ọgwụ nke Harvard, kwuru, sị: “E nwere ìgwè ihe àmà na-apụta
ugbu a nke na-egosi na ịgba chaa chaa iwu na-akwadoghị n’etiti ndị na-eto eto na-arị elu n’ọ̀tụ̀tụ̀ nke ya na, ma ọ dịghị ihe ọzọ, ohere e nwere ịgba chaa chaa iwu kwadoro hà nhata.” A bịa n’ohere ndị na-agba chaa chaa n’ụzọ na-enweghị nchịkwa nwere iji nkà na ụzụ Intanet mee ihe n’ụzọ na-ezighị ezi, o kwuru, sị: “Dị ka ise cocaine a zara aza gbanwere ụzọ e si eji cocaine eme ihe, echere m na ngwá electronic gaje ịgbanwe ụzọ e si agba chaa chaa.”A na-egosipụtakarị achụmnta ego nke ịgba chaa chaa dị ka ihe mkpori ndụ na-adịghị ihe o mere. Ma nye ndị nọ n’oge uto, ịgba chaa chaa pụrụ ịbụ ihe na-eri ahụ́ dị nnọọ ka ọgwụ ọjọọ ọ bụla, ọ pụkwara iduga n’ime mpụ. Otu nnyocha e mere na United Kingdom gosiri na n’etiti ndị nọ n’oge uto bụ́ ndị gbara chaa chaa, “pasent 46 n’ime ha zuuru ihe n’ezinụlọ ha” iji kwado àgwà ha.
N’agbanyeghị eziokwu ndị a e kwuru n’elu, otu òtù ịgba chaa chaa a ma ama nwara igosi na nkwado ha na-akwado ịgba chaa chaa ziri ezi site n’ikwu, sị: “Ọnụ ọgụgụ ka ukwuu nke ndị America bụ́ ndị na-enwe mmasị n’ịgba chaa chaa adịghị enwe nsogbu ọ bụla.” Ọ bụrụgodị na i chere na ịgba chaa chaa adịghị emetụta ọnọdụ ego gị ma ọ bụ ahụ́ ike gị n’ụzọ dị njọ, mmetụta dị aṅaa ka ịgba chaa chaa na-enwe n’ahụ́ ike gị n’ụzọ ime mmụọ? È nwere ezi ihe ndị mere i kwesịrị iji zere ịgba chaa chaa? Isiokwu na-esonụ ga-atụle ajụjụ ndị a.
[Ihe e dere n’ala ala peeji]
^ par. 3 Lee igbe bụ́ “Ènwere M Nsogbu Ịgba Chaa Chaa?” nke dị na peeji nke 14 na nke 15.
[Igbe/Foto ndị dị na peeji nke 14, 15]
Ènwere M Nsogbu Ịgba Chaa Chaa?
Dị ka Òtù Na-ahụ Maka Ọrịa Uche n’America si kwuo, a pụrụ iji ihe ndị na-esonụ bụ́ ndị dị na peeji a na nke na-eso ya chọpụta onye nwere nsogbu ịgba chaa na-enweghị nchịkwa (nke a na-akpọ mgbe ụfọdụ iri ahụ́ nke ịgba chaa chaa). Ihe ka ukwuu ná ndị ma nke a na-akọ kwetara na ọ bụrụ na i nwee ụfọdụ n’ime àgwà ndị na-esonụ, i nwere nsogbu ịgba chaa chaa, nakwa na ọ bụrụ na i nwee nke ọ bụla n’ime àgwà ndị a, ị nọ n’ihe ize ndụ nke ịghọ onye nwere nsogbu ịgba chaa chaa.
Itinye Uche na Ya Ị na-etinye uche gị nile n’ịgba chaa chaa—na-achọ ka ihe ndị mere n’oge gara
aga ị gbara chaa chaa mee ọzọ, na-eme atụmatụ maka chaa chaa ọzọ ị ga-agba, ma ọ bụ na-eche ụzọ ndị ị ga-esi enweta ego ị ga-eji agba chaa chaa.Ịnagide ihe Ọ na-adị gị mkpa ịdị na-etinyekwu ego na chaa chaa ị na-agba iji nweta mkpali ndị ị chọrọ.
Nsepụ aka Ahụ́ adịghị eru gị ala, ị na-enwekwa ahụ́ mgbakasị mgbe ị na-anwa ibelata ma ọ bụ ịkwụsị ịgba chaa chaa.
Mgbanahụ Ị na-agba chaa chaa dị ka ụzọ isi gbanahụ nsogbu ma ọ bụ ụzọ isi nwere onwe gị pụọ ná mmetụta nke enweghị enyemaka, obi amamikpe, nchekasị, ma ọ bụ ịda mbà n’obi.
Nchụso Mgbe ị gbafusịrị ego na chaa chaa, ị na-alaghachikarị ụbọchị ọzọ iji riteghachi ihe i mefuru. A maara àgwà a dị ka mmadụ ịchụso ihe ndị funahụrụ ya.
Ịgha ụgha Ị na-aghara ndị ezinụlọ gị, ndị na-enye ọgwụgwọ, ma ọ bụ ndị ọzọ ụgha iji zochie ọ̀tụ̀tụ̀ ị na-ekereru òkè n’ịgba chaa chaa.
Enweghịzi nchịkwa Ọtụtụ ugboro, i mewo mgbalị ndị kụrụ afọ n’ala iji kwụsị, chịkwaa, ma ọ bụ belata ịgba chaa chaa.
Omume ndị megidere iwu I mewo omume ndị megidere iwu, dị ka wayo, ohi, ma ọ bụ iri ego, iji hụ ego ị ga-eji na-agba chaa chaa.
Ezigbo mmekọrịta e tinyere n’ihe ize ndụ I tinyewo ezigbo mmekọrịta i nwere, ohere agụmakwụkwọ ma ọ bụ ịmụ ọrụ, ma ọ bụ ọrụ, n’ihe ize ndụ ma ọ bụ mebie ha n’ihi ịgba chaa chaa.
Enyemaka ego Ị daberewo n’ebe ndị ọzọ nọ inye gị ego iji gbapụta gị n’ọnọdụ enweghịzi ego nke ịgba chaa chaa tinyere gị na ya.
[Ebe E Si Nweta Foto]
Ebe e si nweta ya: Ụlọ Ọrụ Na-ajụta Echiche nke Mba nke dị na Mahadum Chicago, Gemini Research, na The Lewin Group.
[Igbe/Foto dị na peeji nke 17]
Ozi A Na-ezipụ n’Ezie ná Mkpọsa Lọtrị
“A pụrụ ile ịkwalite lọtrị . . . anya dị ka ọzụzụ banyere ụkpụrụ omume, na-akụzi na ịgba chaa chaa bụ ihe na-adịghị njọ ma ọ bụ ọbụna ọrụ ọma,” ka ndị na-eme nnyocha na Mahadum Duke, nke dị na United States kwuru, n’akụkọ ha nyere Òtù Na-amụ Banyere Mmetụta Ịgba Chaa Chaa Na-enwe ná Mba. Mmetụta dị aṅaa ka ịkpọsa lọtrị na-enwe n’ebe ndị obodo nọ n’ezie? Akụkọ ahụ na-ekwu, sị: “Ma eleghị anya, ọ bụghị ikwubiga okwu ókè ịsị na ozi a na-ezipụ ná mkpọsa lọtrị bụ nke aghụghọ—na ihe ịga nke ọma dabeere n’ịhọrọ nọmba nke ziri ezi. Usoro ‘ọzụzụ’ a hiere ụzọ bụ́ nke ụlọ ọrụ ndị na-agba lọtrị na-akpọsa pụrụ imesị nwee mmetụta na-adịghị mma nke ibelata ego gọọmenti na-akpata, site n’ibelata uto akụ̀ na ụba. Kpọmkwem, ọ bụrụ na nkwalite nke lọtrị ebelata ọchịchọ ebumpụta ụwa nke ịrụ ọrụ, ichekwa ego, na idebe ego maka agụmakwụkwọ na ọzụzụ onwe onye, ihe ga-esi na ya pụta ga-emesị bụrụ mbelata nke ihe a na-arụpụta. Otú o sina dị, ịtụ anya ọrụ ebube abụghị usoro na-eweta ihe ịga nke ọma bụ́ nke anyị na-akụzikarịrị ụmụ anyị.”
[Igbe/Foto dị na peeji nke 18]
Ebe Obibi Nile Aghọọ Ụlọ Ọkụ Na-eri Ego
Ụlọ ọrụ ndị na-agba chaa chaa na-ejizi akụkụ ụfọdụ nke ihe iwu ụlọ ịgba chaa chaa ọhụrụ na-efu emepe ebe a na-edebe ihe ọmụma n’Intanet bụ́ nke pụrụ ime ka ebe obibi nile e nwere kọmputa e jikọrọ n’Intanet ghọọ ụlọ ọkụ na-eri ego. N’etiti afọ ndị 1990, e nwere ihe dị ka ebe ịgba chaa chaa 25 n’Intanet. Na 2001, e nwere ihe karịrị ebe ịgba chaa chaa 1,200, ego a na-enweta site n’ịgba chaa chaa n’Intanet anọwokwa na-arị elu okpukpu abụọ kwa afọ. Na 1997, ebe ndị a na-agba chaa chaa nwetara nde $300 n’Intanet. Na 1998, ha nwetakwuru nde $650. Na 2000, e nwetara ijeri $2.2 n’ịgba chaa chaa n’Intanet, ka ọ na-erulekwa 2003, ‘a na-atụ anya na ọnụ ego ahụ ga-arị elu ruo ijeri $6.4,’ ka akụkọ sitere n’usoro mgbasa akụkọ Reuters kwuru.
[Foto dị na peeji nke 16]
Mmetụta nke nsogbu ịgba chaa chaa na-enwe n’ahụ́ ndị mmadụ gụnyere ezinụlọ ndị na-enweghị ego nri
[Foto dị na peeji nke 17]
N’etiti ndị na-eto eto, ịgba chaa chaa na-arị elu n’ọ̀tụ̀tụ̀ dị egwu
[Foto dị na peeji nke 18]
Ụmụ nke ndị ịgba chaa chaa riri ahụ́ nwere ihe ize ndụ dị elu nke ịghọ ndị nwere nsogbu ịgba chaa chaa n’onwe ha