Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Mba Dị Iche Iche Amụtabeghị Ihe

Mba Dị Iche Iche Amụtabeghị Ihe

Mba Dị Iche Iche Amụtabeghị Ihe

“A sị nnọọ na ndị mmadụ ga-amụta ihe site n’ihe ndị mere n’oge gara aga—lee ihe bara uru ọ pụrụ ịkụziri anyị! Ma Oké Mkpali nakwa Ịnọ n’Òtù na-ekpuchi anyị anya, mmepeanya nke Ahụmahụ na-eweta bụ mpanaka a dọsara n’azụ obere ụgbọ mmiri anyị bụ́ nke na-achakwasị nanị ebili mmiri ndị dị n’azụ anyị!”—Samuel Taylor Coleridge.

Ì KWENYEERE onye England ahụ na-ede uri bụ́ Samuel Coleridge? Ọ̀ ga-ekwe omume anyị ịbụ ndị oké mkpali nke ihe anyị na-achụso kpuchiri anya nke na anyị na-emehieghachi otu ihe ndị ahụ ọgbọ ndị gara aga mehiere?

Agha Ntụte

Dị ka ihe atụ, tụlee ihe ụfọdụ mmadụ mere n’oge Agha Ntụte. Na 1095 O.A., Popu Urban nke Abụọ gbara “Ndị Kraịst” ume ịnara ndị Alakụba Ala Nsọ ahụ. Ndị eze, ndị oké ozu, ndị knight, na ndị nkịtị nọ ná mba nile Urban nke Abụọ na-achị zara òkù ya. Dị ka otu ọkọ akụkọ ihe mere eme mgbe ụwa na-emepechabeghị anya si kwuo, ‘o siri ike inwe ndị na-ebi ndụ n’ụzọ kwekọrọ n’iwu Kraịst’ bụ́ ndị na-ejighị ọsọ gaa ịkwado ihe omume ahụ.

Ọkọ akụkọ ihe mere eme bụ́ Zoé Oldenbourg kwuru na ọnụ ọgụgụ ka ukwuu nke ndị agha ntụte “kwenyesiri ike na site n’ịghọ ndị Agha Ntụte, [ha] na-ekere òkè n’ijere Chineke n’onwe Ya ozi.” Ha lere onwe ha anya, ka ọ na-ekwu, dị ka ndị na-arụ ọrụ dị ka “ndị mmụọ ozi na-ebibi ihe bụ́ ndị na-awakpo ụmụ ekwensu.” Ha kwenyekwara na “ndị nile nwụrụnụ ga-enweta okpueze eluigwe nke ndị nwụrụ n’ihi okwukwe ha,” ka onye edemede bụ́ Brian Moynahan kwuru.

Ikekwe, ndị agha ntụte ahụ amaghị na ndị iro ha kwekwaara ihe yiri nke ahụ. Onye edemede bụ́ J. M. Roberts kwuru n’akwụkwọ ya bụ́ Shorter History of the World, na ndị agha Alakụba gakwara agha na-ekwenyesi ike na ha na-alụrụ Chineke ọgụ, nakwa “na ọnwụ a nwụrụ n’ọgbọ agha megide ndị na-ekweghị ekwe ga-abụ nke mbanye na paradaịs” n’eluigwe ga-esochi.

A kụziiri akụkụ abụọ ahụ na agha ha bụ ihe ziri ezi—nke Chineke nabatara ma gọzie. Ndị ndú okpukpe na nke ndọrọ ndọrọ ọchịchị mere ka e nwee nnọọ nkwenye a ma na-akpali mmetụta uche nke ndị ha na-edu. Akụkụ abụọ ahụ kpakwara arụ ndị ọnụ na-apụghị ịkọ.

Ọ̀ Bụ Ụdị Ndị Dị Aṅaa?

Ọ̀ bụ ụdị ndị dị aṅaa kpara arụ ndị a? Ọnụ ọgụgụ ka ukwuu n’ime ha bụ ndị nkịtị—ndị ọ na-enweghị oké ọdịiche dị n’etiti ha na ndị mmadụ taa. Ihe ịrụ ụka adịghị ya na ọtụtụ n’ime ha bụ ndị nchụso nke nchepụta ha ndị ha chere na ha kasị mma nakwa ndị ọchịchọ nke idozi mmehie ihe ndị ha hụtara n’ụwa nke oge ha, kwaliri. Ebe ọ bụ na a kpaliwo ha nke ukwuu n’ụzọ mmetụta uche, o yiri ka ha amaghị na, n’ọgụ ha na-alụ maka “ikpe ziri ezi,” ọ dịghị ihe ọzọ ha wetaara ọtụtụ narị puku ndị ikom, ndị inyom, na ụmụaka aka ha dị ọcha, bụ́ ndị tọrọ n’ọgbọ agha ndị ahụ ma ọ́ bụghị ikpe na-ezighị ezi, ihe mgbu, na nhụjuanya.

Ọ́ bụghị otú ahụ ka ọ nọgideworo na-adị n’akụkọ ihe mere eme nile? Ndị ndú nwere ikike ndọrọ ọ̀ bụ na ha akpalibeghị nde kwuru nde mmadụ—ndị na-agaraghị echetụdị echiche n’onwe ha ime omume dị otú ahụ—iji obi ọjọọ na obi ịta mmiri lụsoo ndị iro ha bụ́ ndị okpukpe na ndị ndọrọ ndọrọ ọchịchị agha? Ọkpụkpọ òkù nke akụkụ abụọ ahụ na-ese okwu kpọrọ maka ịga agha na nzọrọ ha zọọrọ na Chineke nọnyeere akụkụ nke ọ bụla mere ka ojiji e ji ime ihe ike abịajụ mmegide ndọrọ ndọrọ ọchịchị na nke okpukpe yie nke iwu kwadoro. Ọ bụ ụkpụrụ gbanyesiri mkpọrọgwụ ike bụ́ nke ndị ọchịchị aka ike jiworo mee ihe ruo ọtụtụ narị afọ. Nke a, ka Moynahan na-ekwu, bụ ụkpụrụ nke “ndị malitere Oké Mgbukpọ ahụ na ndị na-ekpocha agbụrụ nke oge a na-agbaso dị nnọọ ka ọ kpaliri agha ntụte mbụ ahụ.”

‘Ma ndị na-eche echiche nke ọma taa agaghịzi ekwe ka a chịkwaa ha n’ụzọ ahụ,’ ka ị pụrụ ikwu. ‘Ọ̀ bụ na anyị emepebeghị anya ugbu a karị?’ Ọ bụ otú ahụ ka o kwesịrị ịdị. Ma à mụtawo ihe n’ezie site n’ihe ndị mere n’oge gara aga? Ònye pụrụ ikwu n’eziokwu na ọ bụ otú ahụ ka ọ dị mgbe ọ na-eche banyere akụkọ ihe mere eme nke narị afọ gara aga?

Agha Ụwa Mbụ

Dị ka ihe atụ, n’oge Agha Ụwa Mbụ, a gbasoghachiri ụkpụrụ ahụ e setịpụrụ n’Agha Ntụte ahụ. Ọ bụ “otu n’ime eziokwu yiri ụgha nke 1914,” ka Roberts na-ekwu, nke “na ná mba ọ bụla ọnụ ọgụgụ dị ukwuu nke ndị mmadụ, n’òtù nile, ụkpụrụ okwukwe na usoro ọmụmụ, n’ụzọ na-eju anya, yiri ka ha ejiriwo obi ha nile gaa agha n’obi ụtọ.”

Gịnị mere ọnụ ọgụgụ dị ukwuu nke ndị nkịtị ji ‘jiri obi ha nile gaa agha n’obi ụtọ’? Ọ bụ n’ihi na ha kwere ka ụkpụrụ na nkwenkwe ha bụrụ nke nkà ihe ọmụma na-ewu ewu n’oge ahụ kpụziri, dịkwa ka ndị bu ha ụzọ jiri nnọọ obi ha nile gaa agha. Ọ bụ ezie na ụfọdụ pụrụ ịbụwo ndị ụkpụrụ ndị metụtara nnwere onwe na ikpe ziri ezi kpaliri, obi abụọ adịchaghị ya na ụfọdụ bụ ndị a kpaliri site ná nkwenye mpako nke bụ́ na mba ha ka ndị ọzọ mma ma si otú ahụ bụrụ nke kwesịrị ịdị na-achị ndị ọzọ.

E mere ka ndị a kwenye na agha so n’ihe ndị a na-apụghị izere ezere sitere n’okike—ụdị nke “ihe dị mkpa maka ịdị ndụ.” Dị ka ihe atụ, “Ozizi Darwin nke Otu Ìgwè Ịka Ndị Ọzọ Mma,” ka onye edemede bụ́ Phil Williams na-ekwu, na-akwalite echiche bụ́ na agha bụ ụzọ ziri ezi isi “kpochapụ agbụrụ ndị na-ekwesịghị ịdị ndụ.”

N’ezie, onye nke ọ bụla n’ime ha chere na ihe ọ na-achụso ziri ezi. Gịnị si na ya pụta? N’oge Agha Ụwa Mbụ, “ndị ọchịchị,” ka onye edemede na ọkọ akụkọ ihe mere eme bụ́ Martin Gilbert na-ekwu, “kpaliri ma kwadoo ịkpa ókè agbụrụ, ịhụ mba n’anya na ike agha”—ndị mmadụ gbasokwara ha n’ajụghị ase. Ọkà ná nhazi akụ̀ na ụba bụ́ John Kenneth Galbraith tolitere n’ebe na-emepeghị emepe na Canada n’oge agha ahụ. Ọ sịrị na n’ebe nile gburugburu ya, ndị mmadụ nọ na-ekwu banyere “nzuzu pụtara ìhè nke dị n’agha ahụ a na-alụ na Europe.” “Ndị nwere ọgụgụ isi . . . ekereghị òkè n’ara ọgbụgba dị otú ahụ,” ka ha sịrị. Ma ọzọkwa, ha keere. Gịnị si na ya pụta? Ihe dị ka ndị soja 60,000 nke Canada so n’ime ihe karịrị nde ndị agha itoolu nwụrụnụ n’akụkụ abụọ ahụ n’ihe ahụ na-asọ oyi a bịara kpọọ Agha Ụwa Mbụ.

Ọ Dịghị Ihe A Mụtara

N’ime iri afọ abụọ sochirinụ, otu àgwà ahụ malitere ịpụta ìhè ọzọ mgbe e nwere ọchịchị aka ike Fascist na ọchịchị ndị Nazi. Ndị Fascist malitere iji “ngwá ọrụ ndị e ji na-eme ihe kemgbe ụwa n’ịgbasa echiche na-eduhie eduhie, bụ́ ihe oyiyi na akụkọ ọdịbendị na-emeghị eme, mee ihe iji kpalie mmetụta uche ndị mmadụ,” ka Hugh Purcell dere. Otu ụzọ dị ike ha si mee ihe karịsịa bụ site ná ngwakọta dị ike nke okpukpe na ndọrọ ndọrọ ọchịchị, na-ekpe ekpere maka ngọzi Chineke n’usuu ndị agha ha.

Onye bụ́ “ọkà n’iji akọ na ire ụtọ emetụta ìgwè mmadụ, nke bụkwa ọkà n’ikwu okwu,” bụ Adolf Hitler. Dịkwa ka ọtụtụ ndị ndú n’oge gara aga bụ́ ndi na-ekwu okwu nduhie iji nweta nkwado, ka Dick Geary na-ekwu n’akwụkwọ bụ́ Hitler and Nazism, Hitler kweere na ‘ọ bụ mmetụta uche ọha mmadụ na-achịkwa ha, ọ bụghị akọ na uche ha.’ O jiri adịghị ike a ụmụ mmadụ nwere mee ihe site n’iji akọ jiri ụzọ ochie ahụ e si eme ka ndị mmadụ zụlite ịkpọasị n’ebe onye iro ọha nọ, mee ihe—dị ka mgbe o “mere ka ndị Germany malite ịtụ ndị Juu egwu na iwesa ha iwe,” ka Purcell na-ekwu. Hitler kwutọrọ ndị Juu, na-asị, ‘Ọ bụ ndị Juu mebiri mba Germany.’

Ihe na-emenye egwu banyere ọgbọ a dum bụ na a kpaliri ọtụtụ nde ndị yiri ezi ndị mmadụ n’ụzọ dị mfe igbu ndị mmadụ n’ìgwè. “Olee otú ndị bi ná mba e weere dị ka nke mepere anya si, ọ bụghị nanị nabata omume obi ọjọọ dị egwu nke ọchịchị Nazi kamakwa tinye aka na ya?” ka Geary jụrụ. Ọ bụghịkwa nanị na ọ bụ mba “mepere anya,” kamakwa ọ bụ mba e weere dị ka nke Ndị Kraịst! A rabanyere ha na ya n’ihi na ha họọrọ nkà ihe ọmụma na atụmatụ dị iche iche nke ụmụ mmadụ karịa ozizi nke Jizọs Kraịst. E dubawokwa ọtụtụ ndị ikom na ndị inyom nwere ezi obi, ndị nwere ụkpụrụ, ịkpa arụ ndị dị egwu kemgbe ahụ!

“Ihe ahụmahụ na akụkọ ihe mere eme na-akụzi bụ nke a,” ka ọkà ihe ọmụma bụ́ Georg Hegel na-ekwu, “na mba na gọọmenti dị iche iche amụtabeghị ihe ọ bụla site n’ihe ndị mere n’oge gara aga ma ọ bụ mee ihe banyere ihe ọ bụla ha pụrụ ịmụtawo site na ya.” Ọtụtụ ndị nwere ike ha agaghị anabata echiche Hegel banyere ndụ, ma ọ bụ mmadụ ole na ole ga-agbagha okwu ahụ. N’ụzọ dị mwute, o yiri ka ndị mmadụ hà na-enwe oké ihe isi ike n’ịmụta ihe site n’ihe ndị mere n’oge gara aga. Ma nke ahụ ọ̀ ga-adịrịrị otú ahụ n’ebe ị nọ?

N’ezie, otu ihe doro anya a ga-amụta bụ nke a: Ihe a pụrụ nnọọ ịdabere na ya karịa nkà ihe ọmụma ụmụ mmadụ bụ́ nke nwere ike ihie ụzọ, dị anyị mkpa ma ọ bụrụ na anyị ga-ezere ọdachi ndị e nwere n’ọgbọ ndị gara aga. Ma ọ bụrụ na ọ bụghị nkà ihe ọmụma mmadụ, gịnị kwesịrị ịchịkwa echiche anyị? N’ihe karịrị otu puku afọ tupu oge a lụrụ Agha Ntụte ndị ahụ, ndị na-eso ụzọ Jizọs Kraịst gosipụtara ihe ụzọ ndụ ezi Ndị Kraịst—nke bụ́kwa nanị ụzọ ndụ ezi uche dị na ya—kwesịrị ịbụ. Ka anyị nyochaa ihe ha mere iji zere ịbụ ndị e mere ka ha tinye aka n’agha ndị a wụfuru ọbara na ha n’oge ha. Ma ò yiri ka mba dị iche iche taa hà pụrụ ịmụta ụzọ ha ga-esi eme otú ahụ ma si otú ahụ zere agha? N’agbanyeghịkwa ihe mba dị iche iche na-eme, gịnị ka Chineke ga-eji gwọta ọnọdụ a wee weta nhụjuanya nile a nke ụmụ mmadụ ná njedebe?

[Foto ndị dị na peeji nke 6]

Ọ bụ omume obi ọjọọ na nhụjuanya ka e ji mara agha ụmụ mmadụ na-alụ

[Foto ndị dị na peeji nke 7]

N’elu: Ndị gbara ọsọ ndụ site n’ebe agha tisasịrị

Olee otú ndị e weere dị ka ndị mepere anya ga-esiwo tinye aka n’ime ihe ike dị otú ahụ nke ọnụ na-apụghị ịkọ?

[Ebe E Sigasị Nweta Foto]

Ndị Rwanda gbara ọsọ ndụ: UN PHOTO 186788/J. Isaac; ndakpọ nke Ebe Azụmahịa Ụwa: AP Photo/Amy Sancetta