Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

N’agbanyeghị Oké Mmụta—E Nwere Obere Mgbanwe

N’agbanyeghị Oké Mmụta—E Nwere Obere Mgbanwe

N’agbanyeghị Oké Mmụta—E Nwere Obere Mgbanwe

“N’agbanyeghị ọganihu ndị sayensị nweworo n’oge na-adịbeghị anya, ụmụ mmadụ agbanwebeghị nke ukwuu n’ime puku afọ abụọ gara aga; n’ihi ya kwa, anyị aghaghị ịnọgide na-agbalị ịmụta ihe site n’ihe ndị mere n’oge gara aga.”Kenneth Clark, n’akwụkwọ bụ́ Civilisation—A Personal View.

N’EZIE, e nwewo ọganihu ụfọdụ dị ịrịba ama na nkà mmụta sayensị n’ime ọtụtụ narị afọ gara aga. Magazin bụ́ Time na-ekwu na ọganihu ndị a emewo ka “ọtụtụ nde mmadụ n’ime anyị nwee ọnọdụ ibi ndụ kasị mma n’akụkọ ihe mere eme.” Ụfọdụ n’ime ọganihu kasịnụ e nweworo bụ n’ihe banyere nkà ọgwụ. N’oge ụwa na-emepechabeghị anya, “mmụta ọgwụ bụ nke a na-enweghị nkà na ya na nke dị ize ndụ,” ka ọkọ akụkọ ihe mere eme bụ́ Zoé Oldenbourg na-ekwu. “Onye dọkịta pụrụ igbu mmadụ n’ụzọ dị mfe dị nnọọ ka ọ pụrụ ịgwọ mmadụ.”

Ha Adịghị Adị Njikere Mgbe Nile Ịmụta Ihe

Ndị mmadụ adịbeghị njikere mgbe nile ịmụta ihe. Dị ka ihe atụ, ná ngwụsị narị afọ nke 19, ọtụtụ ndị dọkịta leghaara ihe àmà gbara ọkpụrụkpụ e nwere na ọ dị ụfọdụ ụzọ ha onwe ha si ebunye ndị ọrịa ha ọrịa. N’ihi ya ha nọgidere na-eme ihe ndị dị ize ndụ ma na-ajụ ịkwọ aka tupu ha esi n’otu onye ọrịa gafee n’onye ọzọ.

Otú o sina dị, sayensị na nkà na ụzụ nọgidere na-enwe ọganihu. Ya mere, n’ụzọ ezi uche dị na ya, ụmụ mmadụ kwesịrị isiwo n’ahụmahụ ndị gara aga mụta ụzọ isi mee ka ụwa bụrụ nke obi ụtọ, ebe dị nchebe karị. Ma ọ bụghị otú ahụ ka ọ dị.

Tụlee ihe banyere Europe na narị afọ nke 17. A kọwara oge ahụ dị ka ọgbọ nke mmepeanya na nke echiche. Ma, nke bụ́ eziokwu bụ na “n’agbanyeghị ọtụtụ ihe ndị e ji ọgụgụ isi na nkà mee,” ka Kenneth Clark na-ekwu, “a ka nwere mkpagbu na ajọ agha ndị a na-eji obi ọjọọ na-enweghị atụ ebu.”

N’oge anyị a, a dịbeghị njikere ‘ịmụta ihe site n’ihe ndị mere n’oge gara aga iji zere imehie otu ihe ndị ahụ e mehiere n’oge ahụ. N’ihi ya, ịdị adị anyị na mbara ala a yiri ka ọ nọ n’ihe ize ndụ. Onye edemede bụ́ Joseph Needham kwubiri na ọnọdụ ahụ aghọwo nke dị nnọọ ize ndụ nke na ‘nanị ihe anyị pụrụ ime ugbu a bụ inwe olileanya na ikpe ekpere ka ndị isi na-acha ọkụ ghara iji ike ndị pụrụ ịpịnyụ ndụ nile n’ụwa mee ihe n’ebe ihe a kpọrọ mmadụ nọ.’

Gịnị mere na n’agbanyeghị ike ọgụgụ isi na mmụta nile nke mmadụ, anyị ka tọrọ n’ụwa nke ime ihe ike na obi ọjọọ jupụtara na ya? Ọ̀ dị mgbe nke a ga-agbanwe? Isiokwu abụọ na-esonụ ga-atụle ajụjụ ndị a.

[Ebe E Si Nweta Foto Ndi Dị na peeji 3]

IHU AKWỤKWỌ: Foto ogbunigwe nke WWI: foto U.S. National Archives; foto ndị Oké Mgbukpọ ahụ metụtara na WWII: Robert A. Schmuhl, site n’ikike nke USHMM Photo Archives

Peeji nke 2 na nke 3: Ụgbọelu B-17 e ji atụ bọmbụ: foto USAF; nwanyị: Instituto Municipal de Historia, Barcelona; ndị gbara ọsọ ndụ: UN PHOTO 186797/J. Isaac; mgbawa nke nwere ikike dị kilotọn 23: foto Ngalaba Na-ahụ Maka Ikike Elektrik na United States sere