Olee Otú Chineke Si Ele Ime Ihe Ike Anya?
Echiche nke Bible
Olee Otú Chineke Si Ele Ime Ihe Ike Anya?
IME ihe ike zuru ebe nile, bụrụkwa nke a na-egosipụta n’ụzọ dịgasị iche iche. E wezụga ịlụ agha, e nwere ime ihe ike n’egwuregwu, n’ụlọ akwụkwọ, n’ụlọ ọrụ, n’etiti òtù ndị omempụ, ime ihe ike n’ihi ịṅụ ọgwụ ọjọọ nakwa ime ihe ike ndị a na-egosi ná ntụrụndụ. Ọbụna ime ihe ike n’ime ezinụlọ yiri ka ọ bụ ihe a na-ahụkarị n’ọtụtụ ezinụlọ. Dị ka ihe atụ, otu nnyocha e mere na nso nso a kwuru na na Canada, ndị ikom na ndị inyom dị nde 1.2 bụ ndị ndị òtù ọlụlụ ha mesoworo ihe ike ma ọ dịkarịa ala otu ugboro n’ime afọ ise gara aga. Nnyocha ọzọ kwubiri na ihe dị ka pasent 50 nke ndị na-eti nwunye ha ihe na-etikwa ụmụ ha ihe.
N’ezie, ụdị omume nke ime ihe ike ndị dị otú ahụ na-awụ gị akpata oyi n’ahụ́ otú ọ na-awụkwa ihe ka n’ọnụ ọgụgụ mmadụ ndị ọzọ. Otú ọ dị, ime ihe ike aghọwo ihe dị mkpa n’ihe dị ukwuu ná ntụrụndụ nke oge a. A na-adọrọ mmasị nke ndị na-ekiri ha ọ bụghị nanị site n’ihe yiri ka ọ bụ ime ihe ike na-ewere ọnọdụ n’ezie ndị a na-egosi n’ihe nkiri dị iche iche kamakwa site n’omume ime ihe ike ndị na-eme eme n’ezie ndị a na-egosi na telivishọn. Ịkụ ọkpọ na egwuregwu ndị ọzọ a na-eme ihe ike na ha bụ ihe na-amasị ọtụtụ ndị n’ọtụtụ mba. Ma olee otú Chineke si ele ime ihe ike anya?
Akụkọ Dịteworo Aka Banyere Ime Ihe Ike
Ime ihe ike adịwo anya ọ malitere. Akụkọ mbụ e dekọrọ na Bible banyere mmadụ ime ihe ike bụ nke a kọwara na Jenesis 4:2-15. Ken, bụ́ nwa mbụ nke Adam na Iv, malitere inwe anyaụfụ n’ebe nwanne ya nwoke bụ́ Ebel nọ, ma kpachara anya gbuo ya. Gịnị ka Chineke mere? Bible na-akọwa na Jehova Chineke nyere Ken ntaramahụhụ siri ike n’ihi igbu nwanne ya nwoke.
Na Jenesis 6:11, anyị na-agụ na ihe karịrị afọ 1,500 mgbe ihe ahụ mechara, ụwa “jupụtakwara n’ihe ike.” Ọzọkwa, gịnị ka Chineke mere? O nyere Noa bụ́ onye ezi omume iwu ka ọ rụọ ụgbọ nke ga-echebe ya na ezinụlọ ya ndụ mgbe Jehova ga-eme ka iju mmiri bịakwasị ụwa, si otú a ‘bibie’ ụwa ahụ nke na-eme ihe ike. (Jenesis 6:12-14, 17) Ma gịnị kpatara ndị ahụ ji nwee ọchịchọ siri ike ime ihe ike?
Mmetụta nke Ndị Mmụọ Ọjọọ
Ihe ndekọ Jenesis na-ekpughe na ụmụ Chineke, bụ́ ndị mmụọ ozi nupụrụ isi, nwoghara dị ka mmadụ, lụọ ndị inyom, ma mụọ ụmụ. (Jenesis 6:1-4) Ụmụ ahụ, bụ́ ndị a maara dị ka ndị Nefilim, bụ ndị gbara dimkpa nke ukwuu nakwa ndị a maara aha ha. N’ihi mmetụta nke ndị mmụọ ọjọọ bụ́ nna ha, ha ghọrọ ndị na-eme ihe ike bụ́ ndị na-emenye ndị ọzọ ụjọ. Mgbe mmiri nke iju mmiri ahụ toro ma kpuchie ụwa, ndị a na-emenye ndị ọzọ ụjọ nwụrụ. Ma o yiri ka ndị mmụọ ọjọọ ahụ hà nwoghara ma laghachi n’ógbè ndị bụ́ mmụọ.
Bible na-eme ka o doo anya na kemgbe ahụ, ndị mmụọ ozi a bụ́ ndị nnupụisi enwewo mmetụta dị ike n’ahụ́ ụmụ mmadụ. (Ndị Efesọs 6:12) Ọ bụ onye ndú ha, bụ́ Setan, ka a na-akpọ onye mbụ bụ́ “ogbu mmadụ.” (Jọn 8:44) N’ihi ya, a pụrụ ikwu n’ụzọ kwesịrị ekwesị na ihe ike a na-eme n’ụwa sitere n’aka ndị mmụọ ọjọọ, ma ọ bụ n’aka Setan.
Bible na-adọ aka ná ntị banyere ikike ịra ụrà nke ime ihe ike. N’Ilu 16:29, ọ na-ekwu, sị: “Onye na-eme ihe ike na-ara mmadụ ibe ya ụrà, na-emekwa ka o jee ije n’ụzọ na-adịghị mma.” A rabawo ọtụtụ ndị taa n’ịkwado, ịkwalite, ma ọ bụ ime ihe ike. Ọzọkwa, a rabawo ọtụtụ nde mmadụ n’inwe ntụrụndụ ndị na-ebuli ime ihe ike elu. A pụrụ iji ihe e kwuru n’Abụ Ọma 73:6 kọwaa ọgbọ nke taa n’ụzọ ziri ezi. Onye ọbụ abụ ahụ na-ekwu, sị: “Mpako dị ha gburugburu dị ka ịyagba olu; a na-ewere ime ihe ike kpuchie ha dị ka uwe.”
Chineke Kpọrọ Ime Ihe Ike Asị
Olee otú Ndị Kraịst kwesịrị isi na-eme omume n’ime ụwa nke ime ihe ike jupụtara? Ihe ndekọ Bible banyere ụmụ Jekọb bụ́ Simiọn na Livaị na-enye anyị nduzi dị mma. Nwanne ha nwanyị bụ́ Daịna sooro ndị Shekem nwere omume rụrụ arụ na-akpakọrịta. Nke a rụpụtara ya ịbụ onye otu onye Shekem metọrọ n’ụzọ mmekọahụ. Iji megwara, Simiọn na Livaị gburu ndị ikom nile nke Shekem n’emeghị ebere. Mgbe e mesịrị, site n’ike mmụọ nsọ Chineke, Jekọb jiri okwu ndị a bụọ iwe a na-achịkwaghị achịkwa nke ụmụ ya ọnụ, sị: “[Simiọn] na Livaị bụ nwanne; ihe nke ihe ike bụ mma agha ha. Abala n’izu ha, mkpụrụ obi m; Gị na mkpọkọta ha abụla otu.”—Jenesis 49:5, 6.
N’ikwekọ n’okwu ndị a, Ndị Kraịst na-ezere iso ndị na-akwado ma ọ bụ na-eme ihe ike na-akpakọrịta. N’ụzọ doro anya, Chineke kpọrọ ndị na-akwalite ime ihe ike asị. Bible na-ekwu, sị: “Jehova na-anwa onye ezi omume: ma onye na-emebi iwu na onye na-ahụ ihe ike n’anya ka mkpụrụ obi Ya na-akpọ asị.” (Abụ Ọma 11:5) A na-adụ Ndị Kraịst ọdụ ka ha zere ụdị ọ bụla nke iwe a na-achịkwaghị achịkwa, ọbụna ikwu okwu iwe.—Ndị Galeshia 5:19-21; Ndị Efesọs 4:31.
Ọ̀ Dị Mgbe Ime Ihe Ike Ga-akwụsị?
Onye amụma oge ochie bụ́ Habakuk jụrụ Jehova Chineke, sị: “Ruo ole mgbe ka m ga na-etiku Gị?” (Habakuk 1:2) Ikekwe, ị jụwo ajụjụ yiri nke ahụ. Chineke zara Habakuk ajụjụ ya, na-ekwe nkwa iwepụ “ndị na-emebi iwu.” (Habakuk 3:13) Akwụkwọ amụma Aịzaịa na-enyekwa olileanya. Chineke kwere nkwa n’ebe ahụ, sị: “A gaghị anụkwa ihe ike ọzọ n’ala gị, a gaghị anụ mbibi na ntipịa n’ókèala gị nile.”—Aịsaịa 60:18.
Ndịàmà Jehova nwere obi ike na n’oge na-adịghị anya Chineke ga-ewepụ ụdị nile nke ime ihe ike na ndị na-akwado ha site n’ụwa. N’oge ahụ, kama ịbụ nke jupụtara n’ime ihe ike, “ụwa ga-ejupụta n’ọmụma ebube Jehova, dị ka mmiri si ekpuchi oké osimiri.”—Habakuk 2:14.
[Foto dị na peeji nke 22]
Ime ihe ike malitere mgbe Ken gburu Ebel