Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Zere Ọnyà nke Ịgba Chaa Chaa

Zere Ọnyà nke Ịgba Chaa Chaa

Zere Ọnyà nke Ịgba Chaa Chaa

“Ịgba chaa chaa emetụtaghị ahụ́ ike m, achịkwakwara m ego ole m na-etinye n’ịgba chaa chaa. Ma ekwetara m na mgbe ọ bụla m gbara lọtrị, m na-ahọrọkarị ihe m weere dị ka nọmba ndị kasị ewetara m ihu ọma.”—Linda.

ỌTỤTỤ ndị na-agba chaa chaa na-azụlite nkwenkwe na nọmba ndị na-eweta ihu ọma ma ọ bụ ọgwụ isi ọma. E nwere ike ha agaghị eche na ha na-eji nkwenkwe ha ndị na-enweghị isi akpọrọ oké ihe, ma ka o sina dị, ha pụrụ ịnọgide na-enwe ha.

Ọbụna ụfọdụ ndị na-agba chaa chaa na-ekpeku Chineke ekpere, na-arịọ ya ka o nyere ha aka irite ihe n’egwuregwu nke ha họọrọ. Ma, Bible nwere ihe ndekọ nke nkatọ Chineke katọrọ ndị na-azọrọ na ha na-efe ya ofufe ma bụrụ ndị “na-edoro [chi nke Isi Ọma, NW] tebụl n’usoro.” (Aịsaịa 65:11) Ee, Chineke kpọrọ omume ndị na-akwalite nkwenkwe na-enweghị isi nke isi ọma, asị. Ịgba chaa chaa, dị ka o si dị nnọọ, na-akpali inwe ntụkwasị obi na-enweghị isi n’ihe a sị na ọ bụ Nwanyị Isi Ọma.

Ịgba chaa chaa na-akwalitekwa ịhụnanya ego n’enweghị ihere. N’etiti ọha na eze nke taa nke na-ejighị okpukpe kpọrọ ihe, ego n’onwe ya aghọwo ihe e ji mere chi, ịgba chaa chaa bụkwa ụzọ na-ewu ewu e si efe ya ofufe. Akatamkpo ụlọ ọkụ na-eri ego dị iche iche anọchiziela anya katidral ná ndụ ndị mmadụ, echiche ọhụrụ e nwekwara bụ na anyaukwu dị mma. Ndị na-eme nchọpụta ahụwo na ọnụ ọgụgụ buru ibu nke ndị na-aga n’ụlọ ọkụ na-eri ego kwuru na ha na-eme otú ahụ, ọ bụghị maka ntụrụndụ ma ọ bụ maka otú gburugburu ebe ahụ dị, kama ọ bụ iji rite “ego buru nnọọ ibu.” Otú ọ dị, Bible na-adọ aka ná ntị, sị: “Ịhụ ego n’anya bụ mkpọrọgwụ nke ụdị ihe ọjọọ nile, sitekwa n’ịchụso ịhụnanya nke a e duhiewo ụfọdụ pụọ n’okwukwe, ha ejiriwokwa ọtụtụ ihe mgbu dụpuo onwe ha aghara aghara.”—1 Timoti 6:10.

1 Ndị Kọrint 6:9, 10, Bible na-ekwu hoo haa, sị: “Ka a ghara iduhie unu. . . . Ndị na-ekpere arụsị . . . ma ọ bụ ndị anyaukwu . . . agaghị eketa alaeze Chineke.” Ọ bụghị nanị na anyaukwu bụ ọrịa na-akpa ọha mmadụ aka ọjọọ; kamakwa ọ bụ ọrịa ime mmụọ na-egbu egbu—ma ọ bụ ọrịa nwere ihe ngwọta.

Ha Nwetara Ike nke Ịgbanwe

“Anwara m ọtụtụ ugboro ịkwụsị ịgba chaa chaa,” ka Kazushige, bụ́ onye a kpọtụrụ aha n’isiokwu mbụ na-echeta. “Aghọtara m na chaa chaa m so ndị enyi m na-agba n’ahịrị ebe a na-eji ịnyịnya asọ mpi na-ebibi ezinụlọ m. Ego ndị m na-erite na-efunahụkarị m. Ọbụna agbafuru m ego nwunye m chekwara maka ọmụmụ nwa nke abụọ anyị na chaa chaa, emesịkwara m malite iji ego ụlọ ọrụ anyị na-agba chaa chaa. N’ihi ya, atụfuru m ùgwù onwe onye m kpam kpam. Nwunye m na-ebe ákwá mgbe mgbe, na-arịọkwa m ka m kwụsị ịgba chaa chaa, ma o kweghị m nnọọ nkwụsị.”

Kazushige maliteziri iso Ndịàmà Jehova na-amụ Bible. Ọ na-ekwu, sị: “Ka m na-agụkwu Bible, otú ahụ ka m na-enwekwu obi ike na Chineke dị nakwa na m ga-erite uru site n’ige ya ntị. Ekpebisiri m ike na site n’ike Chineke na-enye, m ga-akwụsị ịgba chaa chaa. N’ịbụ ihe ijuanya nye m, ọ bụghị nanị na mụ akwụsịwo ịgba chaa chaa kamakwa akpọwo m ya asị. Ugbu a, m cheta ahụhụ ịgba chaa chaa m wetaara ezinụlọ m, obi na-agbawa m. Lee ekele m nwere n’ebe Jehova Chineke nọ na o nyeere m aka ịkwụsị ịgba chaa chaa nke riri m ahụ́ nakwa na ọ na-enyere m aka ibi ndụ bara uru!”—Ndị Hibru 4:12.

John, bụ́kwa onye a kpọtụrụ aha n’isiokwu mbụ, malitekwara ịmụ Bible. Ọ na-echeta, sị: “Ọmụmụ Bible m nyeere m aka ịtụleghachi ọnọdụ m. Na nke mbụ ya, ahụrụ m n’ezie mbibi ịgba chaa chaa nọ na-ewetara mụ na ezinụlọ m. Abịara m ghọta na ịgba chaa chaa na-eme ka ndị mmadụ nwee àgwà nke ịchọ ọdịmma onwe onye nanị na anyaukwu—àgwà ndị Jehova kpọrọ asị. Ka m nọgidere na-amụ ihe, ịhụnanya m nwere n’ebe Jehova nọ mere ka m nwee ike ịkwụsị ịgba chaa chaa. Amalitere m ịgba chaa chaa n’ihi na m chọsiri ike inweta ndụ ka mma. Ugbu a m kwụsịworo ịgba chaa chaa, ma na-ejere Jehova ozi n’obi ụtọ, ọchịchọ ahụ emezuwo.”

Nwunye John, bụ́ Linda, kpebikwara isepụ aka n’ịgba chaa chaa. “Ọ dịbughị mfe,” ka ọ na-ekwu. “Ma mgbe mụ na di m malitere iso Ndịàmà Jehova na-amụ Bible, amụtara m ilekwasị anya n’ihe ndị ka mkpa ná ndụ. Amụtara m ọ bụghị nanị ịhụ ihe ndị Chineke hụrụ n’anya n’anya, kamakwa ịkpọ ihe ndị ọ kpọrọ asị asị, gụnyere ụdị nile nke anyaukwu. Tụkwasị n’inwe ndụ nwere nzube karị, enwere m ego ka ukwuu n’akpa m.”—Abụ Ọma 97:10.

Site n’iso Jehova Chineke na-enwe mmekọrịta, gị onwe gị kwa pụrụ inweta ikike na amamihe dị mkpa iji zere ọnyà nke ịgba chaa chaa. Ime otú ahụ ga-eme ka ọnọdụ ego gị, mmetụta uche gị, na ahụ́ ike ime mmụọ gị ka mma. Ị ga-enwezi obi ụtọ nke ịhụ n’onwe gị ịbụ eziokwu nke okwu ndị e dekọrọ n’Ilu 10:22, bụ́: “Ngọzi Jehova, nke ahụ na-eme mmadụ ọgaranya, ọ dịghị atụkwasịkwa ya ihe mwute.”

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 21]

Ọ bụghị nanị na anyaukwu bụ ọrịa na-akpa ọha mmadụ aka ọjọọ; ọ bụkwa ọrịa ime mmụọ na-egbu egbu

[Igbe/Foto ndị dị na peeji nke 19]

Ịgba Chaa Chaa na Ike Karịrị Ike Mmadụ

N’otu akụkọ ha zigaara Òtù Na-amụ Banyere Mmetụta Ịgba Chaa Chaa Na-enwe ná Mba, ndị nnyocha nọ na Mahadum Duke zoro aka ná njikọ dị n’etiti ụzọ e si akpọsa ịgba chaa chaa na ikwere n’ike karịrị ike mmadụ. Akụkọ ahụ na-ekwu, sị: “Ọtụtụ mkpọsa [lọtrị] a na-eme bụ ndị na-elekwasị anya n’akụ̀ na ụba na ihe onwenwe n’ụzọ enweghị ihere . . . Ma nke a abụghị ịhụ ihe onwunwe n’anya nke na-akpata ịrụsi ọrụ ike na nnọgidesi ike kama a pụrụ iji ya tụnyere ịtụkwasị obi n’ike ndị karịrị ike mmadụ bụ́ ndị na-ejere ndị na-akpọku ha ozi nakwa n’oriọna majik, bụ́ ndị dabeere n’olileanya, nrọ na nkwenkwe na-enweghị isi. Onye manịja ebe ọ bụla a na-agba lọtrị maara na ọtụtụ n’ime ndị ahịa ya kasị mma na-eti ebe ha na-adabere na nkwenkwe onwe onye na-enweghị isi, chaatị ịgụ kpakpando, n’ịgbara onwe onye afa, nakwa ‘n’akwụkwọ nrọ’ ndị a na-asọpụrụ bụ́ ndị na-edepụta nọmba n’ikwekọ n’aha, akara ụbọchị, na nrọ dị iche iche. Kama imesi ya ike na nọmba nile nwere otu ohere ahụ nke ịbụ ndị a họọrọ nakwa na iji nọmba ndị na-ewu ewu agba chaa chaa ga-ebelata ego a tụrụ anya na a ga-akwụ mmadụ n’egwuregwu parimutuel, ebe ndị a na-agba lọtrị ahọrọwo ịgba ndị na-agba lọtrị ume ịhọrọ nọmba ndị dị ịrịba ama nye ha (ma nọgide na-eji ha eme ihe).”

[Foto ndị dị na peeji nke 20]

“Ịhụnanya m nwere n’ebe Jehova nọ mere ka m nwee ike inwere onwe m pụọ n’ịgba chaa chaa.”—John

“Tụkwasị n’ibi ndụ nwere nzube karị, enwere m ego ka ukwuu n’akpa m.”—Linda

[Foto ndị dị na peeji nke 20]

“N’ịbụ ihe ijuanya nye m, ọ bụghị nanị na mụ akwụsịwo ịgba chaa chaa kamakwa akpọwo m ya asị.”—Kazushige