Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

È Nwere Ihe Ngwọta Dịnụ?

È Nwere Ihe Ngwọta Dịnụ?

È Nwere Ihe Ngwọta Dịnụ?

GỊNỊ ka i kwesịrị ime ihe ị na-achọghị? “Tụfuo ya” yiri ka ọ bụ azịza dị mfe, nke doro anya. Otú ọ dị, ịtụfu ihe adịghị adịcha mfe otú ahụ. Tụfuo ya ebee? Otu òtù na-ahụ maka gburugburu ebe obibi n’Ịtali kwuru na ọ ga-ewe karama a tụbara n’ime oké osimiri ihe dị ka 1,000 afọ ịgbari. N’ụzọ dị iche, akwụkwọ ndị na-adị larịị bụ́ ndị a na-eji ehicha aka ga-ere n’ime ọnwa atọ nanị. Otu isi siga na-emetọ oké osimiri ruo ihe dị ka afọ 5; akpa plastik na-emetọ ya site

n’afọ 10 ruo afọ 20; ihe ndị e ji nylon mee na-emetọ ya site n’afọ 30 ruo afọ 40; kom kom na-emetọru ya afọ 500; ihe ndị e ji rọba mee na-emetọru ya 1,000 afọ.

Ihe mkpofu ndị dị otú ahụ ebukwuola nnọọ ibu. N’ụbọchị ndị a, e nwere ọtụtụ ihe a na-ere ere, ndị na-eme mkpọsa na-achọkwa ka anyị kwere na ha dịcha anyị mkpa. Akwụkwọ akụkọ Britain bụ́ The Guardian kwuru ya n’ụzọ dị nkenke, sị: “Ndị na-eme mkpọsa na-enyere anyị aka igbo mkpa ndị anyị na-amatụghị na anyị nwere.” N’ezie, a na-anwa anyị ịzụrụ ngwá ahịa ndị kasị ọhụrụ e nwere, ka anyị ghara ịtụfu ohere anyị nwere ịnwale ihe ọhụrụ. Otú ọ dị, n’okwu a na-ejikwa eme ihe n’ịkpọsa ngwá ahịa, “ihe ọhụrụ” pụtara “ihe ka mma,” ebe “ihe ochie” pụtara “ihe na-adịchaghị mma na nke oge ya gafeworo.”

N’ihi ya, a na-akpalikarị anyị ịzụ ihe ọhụrụ kama ịrụzi ihe ochie. A na-arụ ụka na idochi ihe ndị meworo ochie bara uru ma na-efu ego dị nta karịa ịrụzi ha arụzi. Mgbe ụfọdụ, nke ahụ bụ eziokwu. Otú ọ dị, ịtụfu ihe ndị meworo ochie na ijikarị ihe ndị ọhụrụ na-edochi ha na-efu oké ego ma bụrụ nke na-adịghị mkpa.

A na-eme ọtụtụ ihe ndị a na-emepụta taa maka ntụfu. Ha pụrụ isi ike nrụzi—ihe a ga-eburu n’uche mgbe a na-azụ ihe. Otu magazin Germany na-ekwu banyere ịzụ ihe, kwuru, sị: “Oge ihe nke ọ bụla a na-emepụta taa ga-adịru anọgidewo na-adị mkpirikpi. Ihe ‘pụta’ taa, ọ ‘laa’ echi, na-abụkarịkwa nke a na-atụba n’ihe mkpofu. N’ihi ya, kwa ụbọchị, ihe ndị bara uru e ji emepụta ihe na-emesị ghọọ ihe mkpofu na-abaghị uru!”

Ọzụzụ nile a a na-azụ ihe n’ụzọ na-enweghị nchịkwa ọ̀ na-abara ndị na-azụ ihe uru n’ezie? N’eziokwu, ndị ọ na-abara uru bụ ụlọ ọrụ achụmnta ego nzube ha bụ inweta ego. Akwụkwọ akụkọ Switzerland a na-ebipụta kwa izu bụ́ Die Weltwoche rụrụ ụka, sị: “A ga-enwerịrị ndakpọ akụ̀ na ụba ma a sị na onye ọ bụla na-eji ngwá ụlọ ya ma ọ bụ ụgbọala ya eme ihe oge ndụ ya nile ma ọ bụ ọbụna jiri ya mee ihe ruo oge ji okpukpu abụọ karịa oge ọ na-ejiru ya eme ihe ugbu a.” Ndakpọ akụ̀ na ụba abụghị azịza ya ma ọlị, ebe ọ ga-emekwa ka ndị na-azụ ihe gharazie inwe ọrụ. Gịnịzi bụ ihe ngwọta ụfọdụ e nwere maka njupụta nke ihe mkpofu?

Ọ̀ Bụ Ịtụfu, Imegharị, Ka Ọ Bụ Ibelata Ihe?

Ụfọdụ mba ndị mepere emepe na-agbaso ụzọ dịịrị ha mfe site nnọọ n’ikpofu unyi ha ná mba ndị ka na-emepe emepe. Dị ka ihe atụ, otu akụkọ kọrọ na “n’otu ebe a ma ama na Nigeria, a hụrụ ka tọn 3,500 nke mmiri ọgwụ nwere nsí na-agbapụta site n’ihe karịrị drọm 8,000 taworo nchara, na-eme ka nsí banye ma n’ala ma na mmiri dị n’ime ala.” Isi otú ahụ ekpofu ihe eyighị ka ọ̀ bụ ihe ngwọta dị irè ma ọ bụ ụzọ dị mma isi mesoo ndị ọzọ.

Gịnị banyere imegharị ihe ndị a na-achọghị maka iji ha mee ihe ọzọ kama ịtụfu ha nnọọ atụfu? Otú ọ dị, ihe omume dị otú ahụ na-achọ ka ndị na-azụ ihe kewaa ihe mkpofu ha gaa n’ụdị dịgasị iche iche, bụ́ ihe iwu chọrọ n’ógbè ụfọdụ. Ndị ọchịchị pụrụ ikwu ka a na-ekewa ihe mkpofu gaa n’ụdị dịgasị iche iche dị ka akwụkwọ nkịtị, akwụkwọ kadbọd, ígwè, ugegbe, na ihe ndị si n’ahụ́ ihe ndị dị ndụ pụta. N’aka nke ya, o nwere ike bụrụ na a ghaghị ikewa ugegbe gaa n’àgwà dịgasị iche iche.

O doro anya na imegharị ihe maka iji ya mee ihe ọzọ nwere abamuru ndị nke ya. Akwụkwọ bụ́ 5000 Days to Save the Planet kwuru na imegharị aluminum “na-echekwa ike eletrik dị ukwuu,” ọ pụkwara “ibelata mbibi nke gburugburu ebe obibi bụ́ nke ebe a na-egwupụta ihe e ji eme aluminum na-akpata.” Akwụkwọ ahụ kọwara n’ụzọ sara mbara, sị: “A na-eji nanị ọkara nke ike eletrik e ji emepụta akwụkwọ nakwa otu ụzọ n’ụzọ iri nke mmiri a na-eji emepụta ya eme ihe n’imegharị ya emegharị. . . . A pụrụ iwetaghachi ọtụtụ ihe mkpofu, megharịa ha ma jiri ha mee ihe ọzọ. . . . Ọbụna n’ebe ụlọ ọrụ mmepụta ihe na-apụghị iji ihe mkpofu nke ha mee ihe ọzọ, ha pụrụ mgbe ụfọdụ imegharị ha ka ndị ọzọ jiri ha mee ihe . . . Na Holland, usoro ịgbanwerịta ihe mkpofu anọworị na-arụ ọrụ n’ụzọ na-aga nke ọma kemgbe mmalite afọ ndị 1970.”

Kama ịchọ ụzọ dị iche iche nke isi na-ekpofu ihe, ndị ọchịchị ndị ọzọ na-elekwasị anya karị n’ime ka a gharadị inwe ihe mkpofu enwe. Akwụkwọ ahụ e hotara na mbụ na-adọ aka ná ntị na “a chọrọ ime ihe n’ụzọ dị ngwa” ma ọ bụrụ na ihe a kpọrọ mmadụ “ga-esi n’ọnọdụ akụ̀ na ụba na-akwalite ịtụfukarị ihe . . . gaa na nke na-echekwa ihe, nke na-ebelata ihe mkpofu ma na-ebelata akụ̀ na ụba ndị na-abanye na ya.”

Otú ọ dị, ndị chọrọ ‘isi n’ọnọdụ akụ̀ na ụba na-akwalite ịtụfukarị ihe pụta’ aghaghị ịdị njikere iji ngwá ahịa ndị ha na-azụta eme ihe ruo ogologo oge o kwere mee, na-atụfu ha nanị mgbe a na-apụghị imezi ha emezi. Ihe ndị a na-achọghị bụ́ ndị a ka pụrụ iji mee ihe aghaghị ịbụ ndị e nyere ndị ọzọ bụ́ ndị ga-eji ha mee ihe. Ọfịs Öko-Institut (Ụlọ Ọrụ Na-akụzi Itinye Ụkpụrụ nke Njikọ nke Ihe Ndị Dị Ndụ na Gburugburu Ha n’Ọrụ) nke dị na Darmstadt, Germany, na-eme atụmatụ na ezinụlọ nke na-agbasosi ụkpụrụ bụ́ “Jiri ihe mee ihe kama ịtụfu ya atụfu” ike, ga-emepụta ihe mkpofu ji ihe ruru pasent 75 dị ala karịa nke ezinụlọ na-adịghị eme otú ahụ, na-emepụta.

Ma ọtụtụ ezinụlọ hà ga-agbasosi ụkpụrụ ndị dị otú ahụ ike? O yighị ka ha ga-eme otú ahụ. Nsogbu ihe mkpofu nke ihe a kpọrọ mmadụ na-enwe bụ nanị mgbaàmà nke nsogbu ndị ka ukwuu. N’etiti ọha mmadụ nke taa na-atụfukarị ihe, ọtụtụ ndị mmadụ amalitewo inwe ihe anyị pụrụ ịkpọ àgwà nke ịtụfu ihe. Ka anyị tụlee àgwà ahụ—na ole na ole n’ime ihe ọjọọ ndị ọ pụrụ ịkpata.

Ihe Ize Ndụ Ndị Dị n’Àgwà nke Ịtụfu Ihe

Àgwà nke ịtụfu ihe pụrụ n’ụzọ dị mfe ịkarị mmefusị nke ụmụ obere ihe. Ọ pụrụ ime ka ndị mmadụ ghara inwe ekele na iche echiche, nke na ha na-atụfu nnọọ ihe oriri buru ibu a na-emetụghị aka na ihe ndị ọzọ. Ndị na-eche nanị banyere onwe ha ma bụrụ ndị na-agbaso ihe na-ewu ewu nakwa ndị na-ahọ ihe n’ụzọ na-enweghị isi pụrụ mgbe nile ịbụ ndị a kpaliri iji ákwà ọhụrụ, ngwá ụlọ ọhụrụ, na ihe ọhụrụ ndị ọzọ dochie anya ndị ka dị mma.

Otú ọ dị, àgwà nke ịtụfu ihe pụrụ irukwa n’ebe ihe ndị na-abụghị ihe onwunwe dị. Otu nnyocha e mere na Germany bụ́ nke hiwere isi n’iji ngwá ụlọ ndị a tụfuru atụfu eme ihe, gosiri n’oge na-adịbeghị anya na: “Anyị amalitewala imeso ndị mmadụ n’ụzọ anyị si emeso ngwá ụlọ ndị dị na palọ, bụ́ ndị na-amasịghịzi anyị ma bụrụ ndị a na-atụfu mgbe afọ ise gasịrị iji were nke ọhụrụ dochie ha. Ajụjụ bụ, olee mgbe ọha na eze ga-anagideru nke a.” Akụkọ ahụ na-akọwa, sị: “Ozugbo mmadụ na-enweghị ike ịrụ ọrụ n’ụzọ kasị dị irè, a na-eji onye ọzọ edochi ya. E kwuwerị, ndị ọrụ juru eju!”

N’akwụkwọ ya bụ́ Earth in the Balance, onye bụ́bu Osote President United States bụ́ Al Gore jụrụ ajụjụ dabara adaba, sị: “Ọ bụrụ na anyị elewala ihe ndị anyị na-eji eme ihe anya dị ka ihe ndị anyị pụrụ ịtụfu atụfu, ànyị agbanwekwuola ụzọ anyị si eche echiche banyere ụmụ mmadụ ibe anyị? . . . Ànyi esitela n’ime otú ahụ kwụsị iji ịpụ iche nke onye nke ọ bụla akpọrọ ihe?”

Ma eleghị anya, ọ ga-adịrị ndị na-adịghịzi eji ndị ọzọ akpọrọ ihe, na-adịghịkwa akwanyere ha ùgwù mfe karị—n’atachaghịkwa onwe ha ụta—ịgbahapụ ndị enyi ma ọ bụ di ma ọ bụ nwunye ha. N’ikwu banyere ụzọ iche echiche a, akwụkwọ akụkọ Germany bụ́ Süddeutsche Zeitung kwuru, sị: “Anyị na-azụ uwe ndị ọhụrụ ugboro abụọ n’afọ, na-azụ ụgbọala ọhụrụ kwa afọ anọ, na-azụ ngwá ndị ọhụrụ maka palọ kwa afọ iri; kwa afọ anyị na-achọ ebe ọhụrụ anyị ga-aga ezumike; anyị na-agbanwe ebe obibi, ọrụ, achụmnta ego—ya mere, n’ihi gịnị ka anyị na-agaghị eji gbanwee di ma ọ bụ nwunye anyị?”

O yiri ka ụfọdụ ndị taa hà na-adị njikere ịtụfu ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ ihe ọ bụla ozugbo ọ ghọrọ ibu arọ. Dị ka ihe atụ, n’otu mba dị na Europe, e kwuru na ndị nwe ihe ruru 100,000 nwamba na ihe ruru nkịta 96,000 gbahapụrụ ha na 1999. Otu onye na-akwado ọdịmma ụmụ anụmanụ n’ebe ahụ kwuru na ụmụ amaala ibe ya “adịghị ele inwe anụ e ji mere enyi anya dị ka ihe ga-adịru ogologo oge. Ha zụọ nwa nkịta na September, ha agbahapụ ya [mgbe otu afọ gasịrị ma ha gaa ezumike] n’August.” Nke ka njọ, e nwewakwala àgwà nke ịtụfu ihe n’ihe banyere ndụ mmadụ n’onwe ya.

Enweghị Nkwanye Ùgwù Maka Ndụ

O yiri ka ọtụtụ ndị taa hà na-eche na ndụ nke onwe ha abachaghị uru. N’ụzọ dị aṅaa? Dị ka ihe atụ, otu magazin a na-ebipụta na Europe kwuru n’oge na-adịbeghị anya na njikere ndị na-eto eto dị ime ihe ndị dị ize ndụ amụbawo n’afọ ndị na-adịbeghị anya. A pụrụ ịhụ nke a ná njikere ha na-adịwanye ikere òkè n’egwuregwu ndị dị ize ndụ. Iji nụ ụtọ ihe mkpali na-adịru nwa oge, ha na-adị njikere ime ihe ndị pụrụ ime ka ha tụfuo ndụ n’onwe ya! Ndị ọchụ nta ego bụ́ ndị na-achọsi uru ego ike na-eji nnọọ àgwà a eri uru. Otu onye ndọrọ ndọrọ ọchịchị na Germany kwuru na ndị na-akwalite egwuregwu ndị dị ize ndụ “na-elekarị ịkpata ego anya dị ka ihe dị mkpa karịa ahụ́ ike na ndụ mmadụ.”

Gịnịkwanụ banyere ịtụfu ndụ mmadụ e bu n’afọ? Òtù Ahụ Ike Ụwa na-eme atụmatụ na “n’ụwa nile, ihe dị ka nde ụmụaka 75, bụ́ ndị a na-atụrụ ime ha kwa afọ, na-abụ ndị ọ na-adịghị onye chọrọ ha n’ezie. Nye ọtụtụ ndị inyom, nsikwopụ afọ ime bụ nanị ihe ngwọta dịnụ.” Ọbụna mgbe a mụsịrị ụmụ ọhụrụ, ha na-anọ n’ihe ize ndụ. Dị ka akwụkwọ akụkọ Brazil bụ́ O Estado de S. Paulo si kwuo, “ọnụ ọgụgụ ụmụ ọhụrụ a na-agbahapụ n’okporo ámá na-arị elu.” Ọ̀ dị otú a n’ógbè gị?

Gburugburu anyị n’ụwa nke taa, anyị na-ahụ ihe àmà na-egosi na a na-elekarị ndụ mmadụ anya dị ka ihe na-adịghị mkpa, ihe na-abaghị uru, ihe a ga-atụfu nnọọ n’enweghị nsogbu. Anyị na-ahụ àgwà a n’ime ihe ike ndị a na-egosi n’ihe ntụrụndụ ndị na-ewu ewu, ebe “ndị dike” na-egbu ọtụtụ “ndị ọjọọ” n’otu ihe nkiri ma ọ bụ ihe omume TV. Anyị na-ahụ ya n’imerime mpụ ime ihe ike a na-eme gburugburu ụwa, ebe ndị ohi na-egbu ndị mmadụ n’ihi obere ego—ma ọ bụ n’ụzọ na-enweghị nnọọ isi. Anyị na-ahụkwa ya n’akụkọ ụwa ndị na-enye nsogbu n’obi banyere ihe omume nke ndị na-eyi ọha egwu, mkpocha agbụrụ, mgbukpọ agbụrụ, bụ́ ndị na-agụnyecha ogbugbu a na-eji obi ịkpọ nkụ egbu ụmụ mmadụ n’ìgwè—na-atụfu ndụ ndị dị oké ọnụ ahịa dị ka ihe mkpofu.

O nwere ike anyị apụghị izere ibi n’etiti ọha mmadụ na-atụfukarị ihe, ma anyị pụrụ izere inwe àgwà nke ịtụfu ihe. Isiokwu na-esonụ ga-atụle ihe pụrụ inyere anyị aka ịnagide ihe n’etiti ọha mmadụ nke taa na-atụfukarị ihe nakwa àgwà ọjọọ ndị e jikọtara ha na ya.

[Foto dị na peeji nke 6]

N’ọtụtụ ebe, ọ bụ ihe iwu chọrọ bụ́ imegharị ihe maka iji ya mee ihe ọzọ

[Foto ndị dị na peeji nke 7]

Ihe ndị na-ewu ewu bụ́ ndị na-agbanwe agbanwe hà na-amanye gị ịtụfu uwe ndị dị mma ma zụrụ ndị ọhụrụ?

[Foto dị na peeji nke 8]

E kwesịrị iji nwa e bu n’afọ kpọrọ ihe, ọ bụghị ịtụfu ya atụfu

[Ebe E Si Nweta Foto]

Index Stock Photography Inc./BSIP Agency

[Foto dị na peeji nke 8]

Ndụ dị nnọọ oké ọnụ ahịa nke na e kwesịghị iji n’ihi ihe mkpali mee ihe pụrụ ime ka a tụfuo ya