Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ibi n’Etiti Ọha Mmadụ Na-atụfukarị Ihe

Ibi n’Etiti Ọha Mmadụ Na-atụfukarị Ihe

Ibi n’Etiti Ọha Mmadụ Na-atụfukarị Ihe

NDỊ bi n’ala ndị mepere emepe na-ekpofu nnukwu ihe. Dị ka ihe atụ, tụlee ihe mkpofu United States na-ewepụta kwa afọ. E kwuwo na “mmiri nke ya na ya hà nhata n’ịdị arọ pụrụ iju ọdọ mmiri Olympic 68,000, ndị otu n’ime ha dị mita 50 n’ogologo.” Afọ ụfọdụ gara aga, e mere atụmatụ na kwa afọ ndị bi na New York City nanị na-ekpofu ihe zuru irikpu nnukwute ogige ntụrụndụ obodo ahụ bụ́ Central Park ruo mita anọ! *

Ka a sịkwa ihe mere e ji kpọọ United States “ebe akụkụ ndị ọzọ nke ụwa ga-eji mụrụ akọ” ma a bịa n’ihe banyere ịbụ “ọha mmadụ na-azụkarị ma na-atụfukarị ihe.” Ma ọ bụghị nanị mba ahụ ka ọ dị otú ahụ. A na-eme atụmatụ na ihe ndị Germany na-ekpofu kwa afọ pụrụ iju ụgbọ okporo ígwè obu ngwongwo ga-esi n’isi obodo ya, bụ́ Berlin, ruo n’ụsọ oké osimiri Africa, bụ́ nke dị ihe dị ka kilomita 1,800 site n’isi obodo ahụ. N’otu oge na Britain kwa, e mere atụmatụ na n’ime otu afọ, ezinụlọ na-ebi ndụ otú kwesịrịnu nke mmadụ anọ mejupụtara na-atụfu akwụkwọ a ga-eji úkwù osisi isii mepụta.

Ala ndị ka na-emepe emepe nwekwara njupụta nke ihe mkpofu. Otu magazin akụkọ a ma ama kọrọ, sị: “Nke bụ́ akụkọ ọjọọ n’ezie bụ na ihe ka ukwuu n’ijeri mmadụ 6 ndị nọ na mbara ụwa a ka na-amalite nnọọ amalite n’ikpofu ihe dị ukwuu dị ka United States na mba ndị ọzọ mepere emepe na-eme.” Ee, ma ọ̀ masịrị anyị ma ọ bụ na ọ masịghị anyị, ihe ka ukwuu n’ime anyị so n’etiti ọha mmadụ na-atụfukarị ihe.

N’eziokwu, ndị mmadụ anọwo na-enwe ihe ndị ha ga-atụfu atụfu. Ma, a pụrụ inweta ihe oriri na ngwá ahịa ndị a gbara ná mkpọ na ndị e kere ná ngwugwu n’ebe nile ugbu a karịa ka ọ dị n’ọtụtụ afọ gara aga, n’ihi ya, ngwugwu ndị a pụrụ ịtụfu atụfu juru ebe nile. Ọnụ ọgụgụ akwụkwọ akụkọ, magazin, mpempe akwụkwọ ndị e ji eme mkpọsa, na akwụkwọ ndị ọzọ e biri ebi arịwokwa nnọọ elu.

Ụwa anyị nke jupụtara n’ụlọ ọrụ mmepụta ihe na nkà mmụta sayensị emewo ka e nwee ụdị ihe mkpofu ọhụrụ. Akwụkwọ akụkọ Germany bụ́ Die Welt kwuru na “Njikọ nke Mba Ndị Dị na Europe na-atụfu ihe dị ka nde ụgbọala itoolu kwa afọ.” Ikpofu ha abụghị obere ọrụ. Nke kadịrị enye nsogbu bụ ajụjụ bụ́, Olee otú a ga-esi kpofuo ihe ndị sitere na nuklia ma ọ bụ ná mmiri ọgwụ dị iche iche? Laa azụ na 1991, a kọrọ na United States nwere “ọtụtụ ùkwù ihe mkpofu na-anụ ọkụ, ha enweghịkwa ebe a na-adọba ha nke na-adịgide adịgide.” E kwuru na e debere otu nde drọm ihe ndị na-egbu egbu dị n’ime ha n’ebe ndebe ihe nwa oge, na-enwe “ihe ize ndụ na-adịgide adịgide nke ifu efu, ịbụ nke e zuuru na ibibi gburugburu ebe obibi site ná nlekọta na-adịghị mma.” Na 1999 nanị, ihe dị ka ụlọ ọrụ 20,000 dị na United States mepụtara ihe karịrị nde tọn 40 nke ihe mkpofu dị ize ndụ.

Ihe ọzọ na-akpata ya bụ ọnụ ọgụgụ ndị bi n’ụwa, bụ́ nke rịworo nnọọ elu na narị afọ gaworo aga. Ka ọnụ ọgụgụ ndị mmadụ na-arị elu, otú ahụ ka a na-enwekwu ihe mkpofu! Ihe ka ukwuu ná ndị bi n’ụwa nwere oké mmasị n’ịzụ ihe. Ụlọ ọrụ Worldwatch Institute kwubiri n’oge na-adịbeghị anya, sị: “Anyị ejiriwo ngwá ahịa na ozi dị iche iche na-eme ihe kemgbe 1950 karịa mgbe ọ bụla ọzọ n’akụkọ ihe mere eme nke mmadụ.”

N’eziokwu, ọ bụ mmadụ ole na ole n’ime ndị bi n’ala ndị mepere emepe chọrọ ịkwụsị iji “ngwá ahịa na ozi,” ndị ahụ na-eme ihe. Dị ka ihe atụ, cheedị banyere otú o si dị nnọọ mfe ịga n’ụlọ ahịa ma zụrụ ihe ndị e ji esi nri bụ́ ndị a dịlarị mbụ kechie ná ngwugwu ma bulaa ha n’akpa akwụkwọ ma ọ bụ n’akpa plastik e nyere n’ụlọ ahịa ahụ. Ọ bụrụ na a kwụsị na mberede iji ụzọ ọgbara ọhụrụ a e si ekechi ihe ná ngwugwu eme ihe, n’oge na-adịghị anya ụmụ mmadụ ga-achọpụta ókè ha daberuuru nnọọ na ya. Ebe ọ bụ na ọ na-adị ọcha karị, ikechi ihe ná ngwugwu otú ahụ, ma ọ dịghị ihe ọzọ, na-eso eme, n’ụzọ ụfọdụ, ka e nwee ahụ́ ike ka mma.

Otú ọ dị, n’agbanyeghị abamuru ndị dị otú ahụ, ọ̀ dị ihe mere a ga-eji nwee nchegbu na o nwere ike bụrụ na ọha mmadụ nke taa bụ́ nke na-atụfukarị ihe emebigawo ihe ókè? Ihe àmà na-egosi na ọ dị, n’ihi na ihe ngwọta dịgasị iche iche e chepụtarala iji lụsoo njupụta nke ihe mkpofu ọgụ emewo ihe dị nnọọ nta n’ibelata nnukwu ikpo ihe mkpofu ndị mmadụ na-ewepụta. Nke ka njọ bụ na àgwà ndị na-akpali ọha mmadụ nke taa ịtụfu ihe pụrụ ịkpata ihe ndị ọzọ na-enye nsogbu n’obi karị.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 2 Obosara ala nke ogige ntụrụndụ ahụ dị hekta 341, ma ọ bụ o mejupụtara pasent 6 nke mbara ala nke ógbè Manhattan.

[Foto dị na peeji nke 4]

Ikpofu ihe ndị dị ize ndụ n’ụzọ na-agaghị akpata mmerụahụ bụ oké ihe ịma aka