Ndị Nọ N’afọ Iri Na Ụma Na-ero Ụra—Ọ̀ Bụ Ihe Na-akpata Nchegbu?
Ndị Nọ N’afọ Iri Na Ụma Na-ero Ụra—Ọ̀ Bụ Ihe Na-akpata Nchegbu?
SITE N’AKA ONYE EDEMEDE TETA! NA CANADA
ICHU onwe onye ụra na-ebelata ike iche echiche na ike icheta ihe, ụmụ akwụkwọ ndị nọ n’oge uto so ná ndị o yikarịrị ka ọ̀ ga-emerụ ahụ́, ka akwụkwọ akụkọ Canada bụ́ Globe and Mail na-ekwu. “E jikọwokwa ehighị ụra nke ụmụaka, ya na nke ndị nọ n’oge uto na nsogbu ndị metụtara akparamàgwà, ahụ́ mgbakasị na oké aghara.” Ndị ọkà mmụta sayensị mụrụ banyere otú ihe dị ka ụmụ akwụkwọ kọleji 2,200 si ehi ụra ma chọpụta na ihe dị ka pasent 47 na-ehi ụra ihe na-erughị awa asatọ ahụ a tụrụ aro ya maka abalị ọ bụla.
Ọ bụ ezie na ụzọ ndụ nke ndị na-eto eto na-echukarị ha ụra ahụ́ ha chọrọ, “ụfọdụ n’ime ha pụkwara inwe nsogbu ahụ́ ike a na-achọpụtabeghị,” ka Globe na-ekwu. “Nsogbu nke mkpachi okpo iku ume n’oge a na-ehi ụra na-emetụta pasent 4 nke ụmụaka dị afọ 4 ruo 18.” N’oge ha na-ehi ụra, okpo iku ume nke dị n’azụ akpịrị ha na-akpachilata ma ọ bụ kpachichaa, na-ebelata ma ọ bụ na-akwụsị ngafe nke ikuku oxygen. N’ihi ya, ụbụrụ ha adịghị akụjụ kpam kpam, ụmụaka na-abụkwa ndị na-eteta ma na-enwe ike ọgwụgwụ na ahụ́ mgbakasị.
Mgbaàmà ndị pụrụ igosipụta nsogbu ahụ na-agụnye ikwo ụra ma ọ bụ ekutechaghị ume n’oge a na-ehi ụra, inwe isi ọwụwa mgbe mgbe n’ụtụtụ, na nsogbu icheta ihe na nke itinye uche n’ihe, nakwa irokarị ụra mgbe mgbe n’ụbọchị. A na-agba ndị nne na nna ume ịdị na-ege ntị mgbe ụfọdụ ka ụmụ ha nọ n’oké ụra. Dr. Robert Brouillette, bụ́ ọkachamara n’ihe banyere ihi ụra ụmụaka n’Ụlọ Ọgwụ Ụmụaka dị na Montreal, kwuru na nwatakịrị nwere nsogbu pụrụ ịkwụsị iku ume mgbe ọ na-ehi ụra, ọ bụ ezie na obi ya pụrụ ịdị na-akụ akụ. “Iteta eteta na-eweta nkwụsịtụ iku ume a ná njedebe, bụ́ mgbe nwatakịrị ahụ tetara ma ọ bụ tetatụ ụra [ma] kuru ume ole na ole tupu ọ maliteghachi ihi ụra.” Ihe ndị dị otú ahụ pụrụ ime ọtụtụ narị ugboro kwa abalị ma mee ka nwatakịrị nwee ike ọgwụgwụ mgbe o tetara.
Òtù Na-ahụ Maka Nsogbu Ihi Ụra n’America na-atụ aro ka e nwee ọnụ ụlọ ihi ụra jụrụ oyi, ma gbaa itiri, bụ́ nke a na-enweghị ihe ndọpụ uche ndị dị na ya, dị ka telivishọn ma ọ bụ kọmputa. Inwe oge a na-agbasochi anya maka ihi na iteta ụra ga-enyekwara ụmụaka na ndị nọ n’afọ iri na ụma aka ihi ụra nke ọma n’abalị. Ụfọdụ ndị, bụ́ ndị nwere nsogbu nke mkpachi okpo iku ume n’oge ha na-ehi ụra ejiwo ígwè ọrụ na-adịghị anyụ anyụ mee ihe, bụ́ nke na-anọgide na-eji nwayọọ nwayọọ ekunye ha ikuku n’oghere imi nakwa n’ọnụ iji mee ka azụ akpịrị ha ghere oghe n’oge ha na-ehi ụra. Otu ọkà n’ọrịa ụmụaka kwuru, sị: “Ụra dị mkpa karịa nri anyị na-eri. Ọ dị mkpa karịa mmega ahụ́. Ụra na-achịkwa mmiri ọgwụ ahụ́ bụ́ hormone, mmetụta uche anyị na usoro ahụ́ anyị ji alụso ọrịa ọgụ.”