Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ị̀ Maara?

Ị̀ Maara?

Ị̀ Maara?

(A pụrụ ịchọta azịza nye ajụjụ ndị a n’akụkụ Bible ndị e zoro aka na ha, e bipụtakwara ndepụta zuru ezu nke azịza ha na peeji nke 20. Iji nwetakwuo ihe ọmụma, lee akwụkwọ bụ́ “Insight on the Scriptures,” nke Ndịàmà Jehova bipụtara.)

1. Ná nrọ Eze Nebukadneza rọrọ, gịnị ka mmụọ ozi ahụ kwuru na a ga-enye nnukwute osisi ahụ e gbuturu egbutu, gịnịkwa ka nke a pụtara? (Daniel 4:16)

2. Gịnị ka Samsin nyere ndị Filistia n’oriri agbamakwụkwọ ya, bụ́ nke mesịrị mee ka o gbuo ndị Filistia 30 n’Ashkelọn? (Ndị Ikpe 14:12-19)

3. N’ihi iwu nke a na-apụghị ịgbanwe agbanwe, olee onye ọchịchị Babilọn nke a manyere ịtụba Daniel n’ime olulu ọdụm? (Daniel 6:9)

4. Ndị ọnaozi ole ka Eze Ahasuerọs zipụrụ ije kpọtara ya Eze nwanyị Vashti ka o wee nwee ike igosi ịma mma ya? (Esta 1:10)

5. Dị ka Jems si kwuo, olee ihe abụọ Chineke na-achọ ‘n’ofufe nke dị ọcha, nke a na-emerụghịkwa emerụ’? (Jems 1:27)

6. Ọ bụrụ na onye Hibru bụ́ ohu achọghị ka a tọhapụ ya inwere onwe ya pụọ n’aka onye nwe ya, gịnị ka a chọrọ ka onye nwe ya mee? (Ọpụpụ 21:6)

7. Olee mmadụ abụọ bụ́ ụmụ Eliab onye Reuben, bụ́ ndị kwadoro Kora ná nnupụisi ya megide Mozis na Erọn? (Ọnụ Ọgụgụ 16:1-3)

8. Olee akara a na-egbunye n’akpụkpọ ahụ́ nke a machibidoro ndị Izrel iwu ime? (Levitikọs 19:28)

9. Ònye bụ nne Eze Hezekaịa? (2 Ndị Eze 18:2; 2 Ihe E Mere 29:1)

10. Dị ka Solomọn si kwuo, gịnị ka “ihe ọ bụla a na-eme n’okpuru eluigwe” nwere? (Eklisiastis 3:1)

11. Gịnị ka Jehova nyere Jeremaịa iwu ka o mee mgbe Eze Jehoiakim gbara akwụkwọ mpịakọta ahụ ọkụ mgbe ọ nụrụ ụfọdụ n’ime okwu ọmụma ikpe dị n’ime ya? (Jeremaịa 36:27-32)

12. Ònye ka a maara dị ka onye nchụàjà nakwa odeakwụkwọ nwere nkà? (Nehemaịa 8:9)

13. N’ihi gịnị ka ụmụ Jekọb ji jụ arịrịọ nna ha rịọrọ ha ka ha gaghachi Ijipt gaa zụtakwuo nri n’oge ụnwụ nri? (Jenesis 43:1-5)

14. N’ụzọ dị aṅaa ka e si mee Adam “n’oyiyi Chineke”? (Jenesis 5:1)

15. Olee mkpá akwụkwọ na-esi oké ísì nke Jizọs kpọtụrụ aha mgbe ọ na-ezo aka n’omume nke ịgbasosi iwu inye otu ụzọ n’ụzọ iri ike nke ndị Farisii, bụ́ ndị leghaara “ihe ndị ka mkpa n’Iwu ahụ anya”? (Matiu 23:23)

16. Olee ụzọ Jeremaịa si nwalee nrubeisi nke ndị Rikab? (Jeremaịa 35:3-6)

17. Olee otú ụmụnne iri nke Josef si ghọgbuo Jekọb iwere ya na ọ bụ anụ ọhịa gburu Josef? (Jenesis 37:31-33)

18. Ọ bụ ezie na ụfọdụ pụrụ ịka ya, ònye bụ dike a ma ama karịsịa nke a kpọtụrụ aha n’ime Bible? (1 Samuel 17:4)

19. N’elu ugwu dị aṅaa ka Mozis nọrọ nwụọ mgbe o kirisịrị Ala Nkwa ahụ? (Deuterọnọmi 32:49, 50)

20. Olee ebe ụlọikwuu nakwa ụlọ nsọ ndị e mesịrị wuo chere ihu? (Ọnụ Ọgụgụ 3:38)

Azịza Nye Ajụjụ

1. “Obi anụ ọhịa.” Ọ pụtara na isi ga-emebi Nebukadneza na ọ ga-emekwa omume ka anụ ọhịa

2. Ilu

3. Daraịọs

4. Asaa

5. “Ilekọta ụmụ mgbei na ụmụ nwanyị di ha nwụrụ ná mkpagbu ha, na mmadụ idebe onwe ya n’enweghị ntụpọ n’ebe ụwa dị”

6. Ime ka ọ bịaruo nso n’ọnụ ụzọ ma ọ bụ nso awara ụzọ ma were “ahà hapuo ntị ya”

7. Detan na Abaịram

8. Egbugbu ọkụ

9. Abaịja, ma ọ bụ Abi ná mkpọbiri

10. “Oge”

11. Ide nke ọhụrụ na nke toro ogologo ọbụna karị

12. Ezra

13. Onye ọchịchị nọ n’Ijipt gwara ha ka ha ghara ịlaghachi, ọ gwụla ma ha kpọtara nwanne ha nwoke nke kasị ntakịrị, bụ́ Benjamin

14. O nwere ọgụgụ isi na ikike karịrị nke ihe ndị ọzọ nile e kere eke n’ụwa nwere, dị ka àgwà ndị nke Chineke na echiche nke ihe bụ́ ihe ọma na ihe ọjọọ

15. Mint

16. O busaara ha mmanya ma gwa ha ka ha ṅụọ ya, bụ́ nke megidere ihe nna nna ha nyere ha n’iwu

17. Ha sụnyere uwe nwụda Josef n’ime ọbara ewu ma gosi ya Jekọb

18. Gọlaịat

19. Nebo

20. N’Ihu Anyanwụ