Ịchọ Ihe Ngwọta Ya
Ịchọ Ihe Ngwọta Ya
MALITE n’afọ 1972, ihe karịrị otu narị mba bịanyere aka ná nkwekọrịta mba nile nke machibidoro imepụta na ịkwakọba ngwá agha ndị nwere nje ndị na-akpata ọrịa. Nkwekọrịta a, nke a kpọrọ Nkwekọrịta Megide Ngwá Agha Ndị Nwere Nje Ndị Na-akpata Ọrịa na Ndị Nwere Ihe Ndị Na-egbu Egbu (BTWC), bụ nke mbụ machibidotụworo otu ụdị ngwá agha. Ntụpọ o nwere bụ na o meghị ka e nwee ụzọ isi chọpụta ma mba dị iche iche hà na-erube isi n’iwu ndị ahụ.
O siri ike ịchọpụta ma mba dị iche iche hà na-emepụta ngwá agha ndị nwere nje ndị na-akpata ọrịa, ebe ọ bụ na a pụrụ iji otu ụzọ ahụ na ihe ọmụma ahụ e jiri mee ihe maka udo mepụtakwa ngwá agha ndị nwere nje ndị na-akpata ọrịa. Ojiji a a na-eji nkà na ụzụ banyere ihe ndị dị ndụ ‘eme ihe ụzọ abụọ’ na-eme ka ọ dị mfe izochi mmepụta a na-emepụta ngwá agha n’ụlọ ọrụ a na-eji nje eme ka ihe gbakaa nakwa n’ụlọ ime nnyocha ndị yiri ka e ji ha na-arụ ezi ọrụ maka ndị nkịtị.
Iji dozie ihe isi ike ndị dị n’ime nchọpụta, ndị si mba dị iche iche gaa nnọkọ ahụ malitere inwe nkwurịta okwu n’afọ 1995 maka nkwekọrịta a ga-agbasosi ike. Ruo ihe karịrị afọ isii, ha tụlere ihe ndị a pụrụ ime kpọmkwem iji hụ na mba nile rubere isi ná nkwekọrịta BTWC. Na December 7, 2001, nnọkọ nkwurịta okwu nke mmadụ 144 bụ́ ndị so ná nkwekọrịta nke afọ 1972 ahụ bịara, jedebere n’ọgba aghara. Nsogbu bụ na United States ekwetaghị n’aro ndị bụ́ isi a tụrụ maka ụzọ isi chọpụta ma mba nile ha na-erube isi ná nkwekọrịta BTWC ahụ. United States kwuru na ikwe ka ndị si mba ọzọ nyochaa ngwá agha na ụlọ ọrụ ha ga-eme ka e ledowe ha.
Ihe Ga-eme n’Ọdịnihu
Nkà na ụzụ banyere ihe ndị dị ndụ pụrụ imepụta nnukwu ihe ọma na ihe ọjọọ. E jirichawo nkà na ụzụ ndị ọzọ bụ́ isi—nkà na ụzụ banyere ígwè, banyere ihe ndị na-agbawa agbawa, banyere ịkpọ mmanụ na ikuku ọkụ n’ime injin, banyere imepụta na ịnya ụgbọelu, banyere ngwá electronic—mee ihe, ọ bụghị nanị maka ihe ndị metụtara udo kamakwa maka agha. Ọ̀ bụ otú a ka ọ ga-adị n’ebe nkà na ụzụ banyere ihe ndị dị ndụ dị? Ọtụtụ nde mmadụ kwenyere na azịza ya bụ ee.
Otu akụkọ Òtù Na-ahụ Maka Nchebe nke Mba United States wepụtara na 1999 kwuru, sị: “Ndị mmadụ n’otu n’otu nakwa òtù dị iche iche . . . ga-enweta ikike, ọtụtụ ga-enwekwa ụzọ ndị dị egwu e si ebibi ihe. . . . A ga-enwekwu òtù ndị e guzobere maka otu nzube kpọmkwem na ndị mmadụ n’otu n’otu, bụ́ ndị ịnụ ọkụ n’obi nke okpukpe, nkwenkwe nke òtù ndị yiri ndị ezi uche na-adịghị na ha, ma ọ bụ oké iwe, ga-akwali mgbe mgbe. Ndị na-eyi ọha egwu pụziri iji nkà na ụzụ ndị nanị mba ndị bụ́ isi na-ejibu eme ihe mee ihe, ha pụkwara ịwakpo ebe ndị e nwere ọnụ ọgụgụ dị ukwuu nke ndị mmadụ.”
Ọ bụ ezie na anyị amaghị ihe ga-eme n’ọdịnihu dị nso, anyị maara ihe Chineke bu n’uche maka ihe a kpọrọ mmadụ. Bible na-ekwe nkwa na oge ga-abịa mgbe ndị nọ n’ụwa “ga-ebi ná ntụkwasị obi, ọ dịghịkwa onye ga na-eme ka ha maa jijiji.” (Ezikiel 34:28) Iji matakwuo banyere nkwa ahụ na-akasi obi, kpọtụrụ Ndịàmà Jehova nọ n’ógbè gị ma ọ bụ deta akwụkwọ n’adres dị na peeji nke 5 na magazin a.
[Foto dị na peeji nke 26]
Ndị nnyocha na-echepụta ụzọ dị iche iche isi mee ka “anthrax” ghara ịkpa ike
[Ebe E Si Nweta Foto]
Foto sitere n’ikike a natara Sandia National Laboratories
[Foto dị na peeji nke 26]
Nnọkọ Nkwurịta Okwu Maka Ngwá Agha Ndị Nwere Nje Ndị Na-akpata Ọrịa, nke e nwere na November 19, 2001, na Switzerland
[Ebe E Si Nweta Foto]
AP Photo/Donald Stampfli
[Foto ndị dị na peeji nke 27]
Bible na-ekwe nkwa oge mgbe mmadụ nile ‘ga-ebi ná ntụkwasị obi’