Akụkụ Abụọ nke Ọkụ
Akụkụ Abụọ nke Ọkụ
SITE N’AKA ONYE EDEMEDE TETA! N’AUSTRALIA
ỌKỤ pụrụ ịbụ enyi ma ọ bụ onye iro. Ọkụ pụrụ ime ka ihe pupụtaghachi n’ala ma ọ bụ bibie ya. Nnukwu ọkụ pụrụ ịmalite ịkpa ike n’ụzọ ga-esi nnọọ ike ịchịkwa.
Otu ihe atụ nke ike ọjọọ ọkụ kpara bụ ihe ahụ mere n’Indonesia na 1997. N’afọ ahụ, ọkụ repịara ọhịa dị ná mba ahụ, na-akpata mbibi dị ukwuu n’ala, n’ahụ́ ike ụmụ mmadụ, nakwa n’akụ̀ na ụba. Anwụrụ ọkụ na-ebibi ihe bụ́ nke sitere n’ọkụ ahụ gbasaruru mba ndị ha na ya gbara agbata obi—asatọ n’ọnụ ọgụgụ—na-emetụta mmadụ e mere atụmatụ na ha dị nde 75. Akụkọ na-egosi na a gwọrọ nde mmadụ 20 nsogbu ndị dị ka ụkwara ume ọkụ, ọrịa emphysema, ọrịa obi nakwa nsogbu anya na nke akpụkpọ ahụ́.
Na Singapore, mmetọ ikuku rịrị elu n’ụzọ dị egwu. Anwụrụ ọkụ kpuchiri obodo ukwu ahụ. “Anyị nile bụ ndị mkpọrọ n’ụlọ anyị,” ka otu onye bi n’obodo ahụ kwuru, bụ́ onye na-atụ ụjọ isi n’ọnụ ụlọ ya nwere ntụ oyi pụta. N’ụbọchị ndị ọ kasị njọ, ndị mmadụ apụghịdị isi n’anwụrụ ọkụ lefere anya iji hụ anyanwụ.
N’afọ sochirinụ, bụ́ 1998, a manyere mmadụ 8,000 bi na British Columbia, Canada, isi n’ụlọ ha kwapụ ka ọkụ na-ere ajọ orire ji ike na-abịa. Ọkụ ahụ bụ nanị otu n’ime ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ otu puku ọkụ gbara na Canada n’afọ ahụ—e lere 115 n’ime ọkụ ndị ahụ anya n’oge ụfọdụ dị ka ndị a na-apụghị imenyụ emenyụ. Ọkụ gbara n’ebe ugwu Alberta, Canada, repịara oké ọhịa dị hekta 90,000. Otu onye bi n’obodo ahụ kwuru, sị: “Ọ dị ka a ga-asị na bọmbụ nuklia gbawara. Anwụrụ ọkụ ojii kpuchiri ógbè ahụ.”
Akụkụ Dị Ize Ndụ nke Ọkụ
Ọkụ bụ otu n’ime ihe ndị e kere eke na-akpa ike. Nnukwu ọkụ nke na-agba n’ọhịa pụrụ ịgbanwe ọdịdị ala, gbanwee ụdị osisi ndị dịbu na ya, gbanweekwa ụdị anụ ndị bibu na ya ma metụta ndụ na ihe onwunwe n’ụzọ dị njọ.
Ọkụ na-ere ajọ orire pụrụ ime ka e nwee nrichapụ nke elu ala. Mgbe e nwere oké mmiri ozuzo, bụ́ nke na-esochikarị oge okpomọkụ, ọ na-erichapụ ájá na-enweghị ihe ndị kpuchiri ya. Nke a na-emetụta ákụ́kụ́ dị iche iche. Ụfọdụ n’ime ákụ́kụ́ ndị ọ na-emetụtakarị na-akpọnwụ, ebe ọ na-amara ndị ọzọ ahụ́ nke ọma. N’ụzọ dị mwute, ndị nke na-eto nke ọma na-abụkarị ahịhịa nkịtị, bụ́ ndị na-anwa itoju ebe ndị ahụ ákụ́kụ́ dịbu.
Nke a na-emetụtakwa ụmụ anụmanụ n’ụzọ dị njọ bụ́ ndị na-enweta ihe oriri site n’ụdị ákụ́kụ́ ụfọdụ kpọmkwem. N’Australia, anụmanụ ndị na-enye nwa ara n’ógbè ahụ, ndị dị ka koala na possum nke nwere ọdụdụ yiri brọsh bụ ụdị anụmanụ ndị nọ n’ihe ize ndụ bụ́ ndị pụrụ ịpụ n’anya n’ụzọ dị mfe ma ọ bụrụ na ọkụ ebibie ihe dị nnọọ ukwuu n’ebe obibi ha. N’ime afọ 200 gara aga, pasent 75 n’ime oké ọhịa ndị dị na kọntinent Australia, pasent 66 n’ime osisi ndị dị na ya, ụdị anụmanụ 19 na-enye nwa ara, na pasent 68 nke ụdị ákụ́kụ́ ya dị iche iche, bụ́ ndị a na-adịghị ahụ ihe ka ọtụtụ n’ime ha n’ebe ọzọ n’ụwa, pụrụ n’anya.
Ka obodo ukwu dị iche iche gbasaruru n’ọhịa ndị gbara ha gburugburu, ndị mmadụ na-abụwanye ndị mbibi nke ọkụ na-agba n’ọhịa pụrụ imetụta. Na December 1997, ọkụ gbara ihe karịrị hekta 250,000 ka a nọ na-enwe ọtụtụ ọkụ ọgbụgba n’ógbè dịpụrụ adịpụ nke Sydney, dị n’Australia,
nakwa n’ọtụtụ obodo nta ndị ọzọ gbara ugwu Blue Mountain gburugburu. Ihe karịrị ọkara nke ọkụ ndị ahụ gbara ruo n’ókè na-ekweghị mmenyụ. Onyeisi ndị ọrụ mmenyụ ọkụ kwuru na ha bụ ọkụ kasị njọ ọ hụtụrụla n’ime afọ 30. A manyere ọtụtụ narị ndị mmadụ ịkwapụ n’ebe obibi ha, ọkụ gbakwara ụlọ ụfọdụ ndị. Ọkụ ndị ahụ gbagbukwara mmadụ abụọ. Malite ná ngwụsị December 2001, ọkụ ndị gbara n’ọhịa bụ́ ndị e chere na ọ bụ ndị na-eme mpụ ịgba ihe onwunwe ọkụ sunyere ha, gbapịara ọhịa dị hekta 753,000.Mgbe Ọkụ Malitere Iyi Egwu
Ọtụtụ ihe pụrụ ime ka ọkụ gbaa n’ụzọ na-ekweghị mmenyụ. Otu ihe sitere n’okike na-akpata ya bụ ọdịdị ihu igwe nke El Niño kpatara, bụ́ ọnọdụ ihu igwe nke na-eme ka e nwee okpomọkụ, na ọnọdụ ịkpọ nkụ gburugburu ụwa. Ala ọ bụla bụ́ ebe e nwere ọnọdụ okpomọkụ a na-akpọ El Niño na ya n’oge ndị ọ na-ekwesịghị, pụrụ ịkpata ọkụ ọgbụgba.
Mgbe mgbe karị, ọ bụ omume ụmụ mmadụ na-eme n’ebughị ụzọ chee echiche na-akpatakarị ọkụ ọgbụgba. N’ọtụtụ mba, a na-ele mmadụ ịma ụma sunye ọkụ n’ọhịa anya dị ka mpụ. E mewo atụmatụ na ọ bụ ndị na-eme mpụ nke ịgba ihe onwunwe ọkụ ma ọ bụ ihe mberede kpatara ihe karịrị ọkara nke ọkụ gbara n’ọhịa ndị gọọmenti nwe na New South Wales, Australia.
Ejighị gburugburu ebe obibi kpọrọ ihe bụ ihe ọzọ pụrụ ịkpata ajọ ọkụ ọgbụgba. Site n’igbukpọsị oké ọhịa na igbutu osisi, oké ọhịa dị iche iche na-aghọwanye ndị ọkụ pụrụ ịgba. Iberibe osisi ndị dapụsịrị adapụsị mgbe a na-egbutu osisi na-amụbakwu ihe ndị kpọrọ nkụ bụ́ ndị dị mkpa iji mee ka ọ na-ere. Igbutu osisi na-agbawa ala ọtọ, na-eme ka ìhè anyanwụ na-achakwasị ihe ndị ahụ pụrụ inwuru ọkụ, na-eme ka ha kpọọ nkụ. Ozugbo ọkụ bara n’ihe ndị ahụ na-aghọrọ ọkụ ngwa ngwa, ọkụ ya pụrụ n’ụzọ dị mfe ịmalite ịgba n’ụzọ na-agaghị ekwe mmenyụ.
Ihe ndị metụtara akụ̀ na ụba pụkwara ime ka nsogbu nke nnukwu ọkụ ka njọ. N’Indonesia, e jiriwo usoro ọrụ ugbo nke ịsụcha ọhịa na isu ya ọkụ mee ihe ruo ọtụtụ afọ n’enwechaghị mmetụta n’ebe ihe ndị e kere eke dị. Mgbe ndị ọrụ ugbo kpachapụrụ anya jiri ọkụ mee ihe n’ụzọ a chịkwara achịkwa, mmetụta ọ na-enwe na gburugburu ebe obibi na nke ọkụ gbara n’onwe ya na-enwe, na-afọ nke nta ka ọ bụrụ otu ihe. Otú ọ dị, n’oge ndị na-adịbeghị anya, usoro ọrụ ugbo ọdịnala nke ịsụcha ọhịa na isu ya ọkụ amụbawo, ghọọkwa nke ụlọ ọrụ
dị iche iche ji eme ihe. N’ihi ọchịchọ na-arịwanye elu a na-achọ ihe ndị dị ka mmanụ nkwụ, e suwo ọhịa dị iche iche ọkụ iji jiri ákụ́kụ́ ndị e ji akpata ego bụ́ ndị na-eto ngwa ngwa kụchie ha. Ụzọ kasị mfe ma dị ọnụ ala karị isi sụchaa ala bụ isu ahịhịa ndị dị n’ala ọkụ. N’ihi ya, ndị mmadụ na-esu ọtụtụ hekta ala ọkụ n’echeghị echiche nke ọma banyere uru ndị na-adịte aka dị n’ịhapụ ebe ụfọdụ ka ha bụrụ ọhịa.Akụkụ Bara Uru nke Ọkụ
Ọ bụ ezie na ọkụ pụrụ ịkpata ọgba aghara na mbibi, ọ pụkwara inwe mmetụta dị nnọọ mma n’ọtụtụ ákụ́kụ́ na anụmanụ dịgasị iche iche. N’ezie, ọ pụrụ ọbụna ikere òkè dị oké mkpa n’ime ka ụdị ihe ndị e kere eke dịgide. Olee otú ọ na-esi eme nke a?
Ọkụ bụ otu n’ime enyi ndị kasị ochie nke mmadụ. Ọ nọwo na-eme ka ahụ́ kpoo mmadụ ọkụ, na-enye ya ìhè, ma na-esiri ya nri. Ụmụ amaala Australia ejiriwo ọkụ mee ihe mgbe dum kwa ụbọchị ruo ọtụtụ narị afọ. Ọkụ dị nnọọ mkpa nye ndị Yanyuwa nke na ha nwere ọtụtụ okwu ha ji akọwa ọkụ dịgasị iche iche na mmetụta ha. Dị ka ihe atụ, ha pụrụ iji okwu bụ́ kambambarra mee ihe mgbe ha na-ekwu banyere ọkụ na-agba n’ọhịa ma ọ bụ ọkụ na-ere ajọ orire. A na-eji okwu bụ́ warrman akọwa ógbè rere ọkụ nke ọma, bụ́ nke dị mma maka ịchụ nta. A maara anwụrụ ọkụ na-akwụli elu ma na-eme ka e nwee urukpuru dị ka rrumarri.
Ụmụ amaala a na-eme ihe a kpọworo ịkpọ ala ọkụ n’asụghị asụ iji lekọta ala ha bi na ya. Ha na-eji ọkụ ndị na-adịghị eresi ike eme ihe iji belata njụpụta nke mkpá akwụkwọ na akụkụ ihe ọkụkụ ndị kpọrọ nkụ, bụ́ ndị kasị eme ka ọkụ nọgide na-ere ajọ orire. Iji ọkụ eme ihe n’ụzọ a chịkwara achịkwa otú a emewo ka ndị Aborigine nwee ike iji ala ha na-akpara afọ ha n’ụzọ gara nke ọma n’ebibighị ebe ákụ́kụ́ na-epu nke bụ́kwa ebe obibi ụmụ anụmanụ. O belatawokwa ihe ize ndụ nke ụmụ mmadụ ịbụ ndị ọkụ ndị dị ize ndụ na-ere ajọ orire rebidoro.
Uru Ịkpọ Ihe Ọkụ n’Ụzọ A Chịkwara Achịkwa Bara
Mgbe ndị bi na Europe bịara Australia ihe ji nke nta karịa afọ 200 gara aga, a malitere imebi nguzozi a chọrọ nlezianya nke dị n’etiti mmadụ, ihe ndị e kere eke, na ọkụ. Site n’ụzọ ndị Europe si na-ele ya anya, ọkụ bụ ihe e kwesịrị imenyụ emenyụ. Ọkụ ọgbụgba ghọrọ ihe a na-adịghịzi ahụkebe, ma n’ihi njupụta nke ihe ndị kpọrọ nkụ, ọkụ ndị gbaranụ bịara dị ukwuu ma sie ike mmenyụ. Otú ọ dị, n’oge ndị na-adịbeghị anya, gọọmenti amụtawo ihe site n’ihe ụmụ amaala Australia na-eme, ha echepụtawokwa usoro a kpọrọ ịkpọ ihe ọkụ n’ụzọ a chịkwara achịkwa. Usoro a na-eme ka ọkụ na-ere n’ụzọ a chịkwara achịkwa iji gbochie ọkụ ọgbụgba ndị na-akpata ọdachi karị. A na-esunyegasị obere ọkụ n’oge a na-adịghị enwekebe ọkụ ọgbụgba n’ọhịa. Ọkụ ndị a na-ere nwayọọ nwayọọ, irè ha adịghị ala elu, ha na-erechapụkwa ihe ndị dasịchara n’ala n’ereghị osisi. Dị ka ọ na-adịkarị, igirigi nke uhuruchi na-emenyụ ha.
Ebumnobi e ji esu ihe ọkụ n’ụzọ a chịkwara achịkwa bụ iji chebe ndụ na ihe onwunwe ma nọgidekwa na-enwe ụdị ákụ́kụ́ na ụmụ anụmanụ dị iche iche. Ịkpọ ihe ọkụ n’ụzọ a chịkwara achịkwa na-ebelatakwa
mgbasa dị ngwa nke ahịhịa ndị sitere n’ebe ọzọ. Ọ na-enyekwa aka eme ka a nọgide na-enwe ebe obibi dịgasị iche iche bụ́ ndị dị mkpa iji chekwaa ụmụ anụmanụ dị n’ógbè ahụ.O yiri ka ụdị ákụ́kụ́ ụfọdụ hà na-adabere n’ọkụ iji nyere mkpụrụ ha aka ipu ome. Ụfọdụ nwere mkpo siri nnọọ ike nke na ọkụ ga-adị mkpa iji mee ka ha gbawaa ka mmiri wee banye n’ime ha. Nnyocha e mere na-egosi na anwụrụ ọkụ na-enyekwara mkpụrụ ákụ́kụ́ aka ipu ome. E nwere ihe dị ka ihe 70 mejupụtara anwụrụ ọkụ bụ́ ndị e chere na ha pụrụ ime ka mkpụrụ ákụ́kụ́ puo ome, otu nke dị mkpa bụ nitrogen dioxide.
Ala e suru ọkụ ọhụrụ na-eme ka ájá nwee nri ala ndị dị ka nitrogen na phosphorus. Ọkụ na-ewepụta nri ala ndị dị na mkpá akwụkwọ ndị dasịsịrị n’ala, na-eme ka ìhè anyanwụ na-erukwu n’ala, na-emekwa ka e nwee ájá dị mma nke ákụ́kụ́ ga-agbanye mkpọrọgwụ na ya. Dị ka ihe atụ, mkpụrụ osisi wattle, ma ọ bụ acacia na-ada n’ala ma puliteghachi mgbe ọkụ gbasịrị ha, ha na-emekarịkwa nke ọma n’ọnọdụ ndị a na-enwe mgbe ọkụ gbasịrị.
O yikwara ka ọtụtụ ụmụ anụmanụ hà na-erite uru site n’ọnọdụ ndị a na-enwe mgbe ọkụ gbasịrị, karịsịa site n’ahịhịa ndị na-etolite ọhụrụ, bụ́ ndị na-adịrị ha nro ma na-ekwe ha ọtịta karị. Ụdị ụfọdụ nke anụ kangaroo na wallaby na-ahọrọkarị ọhịa ndị ọkụ na-agba ugboro ugboro, a sịkwara na ọ bụ otú ahụ ka ha si enweta ihe oriri. Nke a bụ n’ihi na ákụ́kụ́ ndị ha na-adabere na ha maka nri na ndo, na-adaberekwa n’ọkụ maka mpuliteghachi na uto.
A Ka Nwere Ihe Dị Ukwuu A Ga-amụta
A ghọtawala akụkụ abụọ nke ọkụ n’ụzọ dị mma karị, ma mmetụta ọkụ na-enwe na gburugburu ebe obibi dị mgbagwoju anya, a ka nwekwara ihe dị ukwuu a ga-amụta. Ọ dị mkpa ịmụkwu banyere otú ọkụ si emetụta kpọmkwem ụdị ụfọdụ nke ákụ́kụ́ na ụmụ anụmanụ. Ọ dịkwa mkpa ka e mekwuo nnyocha banyere otú ọkụ si emetụta ihe ndị dị ndụ na gburugburu ebe obibi n’ụzọ sara mbara karị. Ajụjụ ụfọdụ a ga-aza bụ: Ọkụ ọ̀ na-eso akpata ịrị elu nke okpomọkụ ụwa? Mmetụta dị aṅaa ka anwụrụ ọkụ na-enwe n’ọnọdụ ihu igwe? Olee otú ọkụ si ere?
Ka ọ dị ugbu a, e nwere ihe omume kọmputa, ndị a na-akpọ model, bụ́ ndị a rụrụ ịkọwa otú ọkụ si ere. Ha na-arụ ọrụ site n’inye nkọwa banyere ihe ndị na-aghọrọ ọkụ ngwa ngwa nakwa ọ̀tụ̀tụ̀ ikpo ọkụ na ịjụ oyi, ọ̀tụ̀tụ̀ ọsọ ifufe, na ọnọdụ ihu igwe ndị ọzọ. N’ụzọ dị mwute, ka ọ dị ugbu a, ihe omume kọmputa ahụ bụ́ model adịghị ezi ezi mgbe nile, ha apụghịkwa ime ka e buru ụzọ mara banyere ihe omume ndị na-adịghị emekebe dị ka ọkụ ịmalite ịgba na mberede ma ọ bụ ọkụ inwusi nnọọ ike na mberede. N’ọkụ ndị gbara na Sydney na 1997, ndị ọrụ mgbanyụ ọkụ abụọ nweworo ahụmahụ tufuru ndụ ha n’ihi otu n’ime ọnọdụ ndị a nke ọkụ ịmalite gbawa na mberede, bụ́ nke a kpọrọ “mkpịsị aka ọnwụ” n’ụzọ ziri ezi.
Ọ pụrụ isi ike karịsịa ịma ihe nnukwu ọkụ pụrụ ime n’ihi na ha pụrụ ịkpali ọnọdụ ihu igwe nke ha, gụnyere oké ifufe, urukpuru, na ọbụna égbè eluigwe. Ifufe ha pụrụ ịgbanwe ụzọ ha ma ọ bụ ọ̀tụ̀tụ̀ ọsọ ha na mberede, na-eme ka ọkụ ahụ ghara ịdị n’otu ebe. Ndị nchọpụta nwere olileanya ime ka ihe omume kọmputa ahụ bụ́ model e nwere ugbu a ka mma site n’itinye ya ihe ndị a na ihe ọmụma ndị ọzọ, dị ka ọdịdị na mkpọda nke ala nakwa ebe ndị e nwegasịrị ihe ndị na-aghọrọ ọkụ ngwa ngwa.
Ụlọ Ọrụ Na-enyocha Ikuku nke dị na Colorado amalitewo otu atụmatụ ọrụ a chọrọ iji mezuo nke a na United States. Ụlọ ọrụ a etinyewo ngwá ọrụ sayensị ndị bụ́ ọkpọka na ógbè kọmputa asaa n’otu ụgbọelu njem bụ́ C-130, bụ́ nke e ji ihe fachichaa iji chekwaa ha. A rụrụ ụgbọelu ahụ ifefe ọkụ na-eresi ike na iji ihe mgbaàmà ndị e tinyere na nku ya abụọ nweta ihe ọmụma. A na-ezigazi ihe ọmụma a na kọmputa ndị ahụ maka ịkọwapụta ha. Ụgbọelu ahụ nwere kamera na-ewepụta ụzarị a na-akpọ Thermacam, bụ́ nke pụrụ igosi ókè akụkụ nke ọ bụla nke ọkụ ahụ na-eresiru ike. N’ụzọ ndị a, ndị sayensị nọ n’ụlọ ọrụ ahụ na-amụ banyere ime ka ihe omume kọmputa bụ́ model nke na-egosi otú ọkụ si ere ka mma.
E nwere olileanya na ihe omume kọmputa ndị a bụ́ model bụ́ ndị e mere ka ha ka mma ga-eme ka ndị ọkachamara nwee ike ịchịkwa ọkụ n’ụzọ dị nchebe karị. Inwe ike ịkọwa n’ụzọ zuru ezu ihe ọkụ ga-eme pụkwara ibelata ihe ize ndụ ndị ọrụ mgbanyụ ọkụ na-eche ihu iji chebe obodo.
Ee, ọkụ pụrụ ịbụ onye iro na-ebibi ihe mgbe a na-apụghị ịchịkwa ya, ma ọ pụkwara ịbụ ezi enyi. Ọ bụ ihe dị oké mkpa n’ime ihe ndị Onye Okike meworo ka ha dịrị iji mee ka elu ala anyị nwee ike ịdị na-enwetaghachi onwe ya nakwa ime ka e nwee ọ̀tụ̀tụ̀ kwesịrị ekwesị nke ụdị ákụ́kụ́ na anụmanụ dị iche iche.
[Foto dị na peeji nke 29]
Mgbada anya tigharịrị ezere ọkụ na-agba na ndagwurugwu Oké Osimiri “Montana Bitterroot”
[Ebe E Si Nweta Foto]
John McColgan, BLM, Ụlọ Ọrụ Mgbanyụ Ọkụ Alaska
[Foto dị na peeji nke 30]
Ịkpọ ihe ọkụ n’ụzọ a chịkwara achịkwa n’Australia
[Ebe E Si Nweta Foto]
Foto nke e nwetara site n’ikike nke Ụlọ Ọrụ Mgbanyụ Ọkụ Ime Obodo nke Queensland