Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ezinụlọ Ndị Nwere Nanị Nne Ma Ọ Bụ Nna Na-amụba

Ezinụlọ Ndị Nwere Nanị Nne Ma Ọ Bụ Nna Na-amụba

Ezinụlọ Ndị Nwere Nanị Nne Ma Ọ Bụ Nna Na-amụba

“Ọtụtụ abalị, ana m eji anya mmiri ekpegara Chineke ekpere sị: ‘Amaghị m ihe m ga-eme echi.’”—GLORIA, NNE NANỊ YA NA-AZỤ ỤMỤ ATỌ.

EZINỤLỌ ndị nwere nanị nne ma ọ bụ nna aghọwo ihe a nọgidere na-ahụ n’ọtụtụ obodo taa. * Ka ụdị ndị ọzọ nke ezinụlọ na-anọchizi anya ezinụlọ nke di, nwunye, na ụmụ mejupụtara bụ́ nke dịwara kemgbe gboo, ndị ọkà n’ihe banyere ụbara mmadụ na ndị ọkà mmụta mmekọrịta ọha na eze n’ọtụtụ akụkụ nke ụwa na-ajụ ihe kpatara ya.

Ndị profesọ na nkà mmụta mmekọrịta ọha na eze bụ́ Simon Duncan na Rosalind Edwards kwuru na “mgbanwe ndị na-adịte aka na-ewere ọnọdụ ná ndokwa ezinụlọ nakwa ná mmekọrịta ndị ikom na ndị inyom.” Ọ̀ bụ n’ihi gịnị? Ụfọdụ ndị na-ekiri ihe na-emenụ na-ekwu na nke a bụ n’ihi ụzọ ndị mmadụ na-ahọrọ isi bie ndụ ha mgbe e nwere mgbanwe n’ọnọdụ akụ̀ na ụba, ọdịnala, nakwa n’etiti ọha na eze.

Ka anyị tụlee ụfọdụ n’ime mgbanwe ndị a, nakwa nhọrọ ndị a na-eme. Nrụgide ndị a na-enwe ná ndụ bụ isi ihe na-emetụta ndụ ndị mmadụ. Ihe ndị na-eme gburugburu ndị mmadụ na-emetụta ndụ ha malite n’oge ha tetara ụra ruo n’oge ha ga-ehi ụra. A na-ejizi oge ndị a na-etinye n’ihe omume ezinụlọ eme ihe n’ịchọ ihe n’Intanet, n’ikiri TV, n’ịkpọ fon, n’ịkwọ ụgbọala, na-esi n’otu ihe agafe n’ọzọ.

Ajọ ọnọdụ akụ̀ na ụba na-ewetakwa ihe isi ike nke ya. Ọ na-efu oké ego iji nweta ihe ndị e ji atụsara ahụ́ n’oge a, ya mere, ọnụ ọgụgụ ka ukwuu nke ndị nne na nna na-aga ọrụ. Ịbụ akụkụ nke ọha na eze nke nwere ike isi n’otu ebe gaa n’ebe ọzọ emewo ka ọtụtụ ndị hapụ ikwu na ibe ha bụ́ ndị pụrụ inyere ha aka gaa biri ma na-arụ ọrụ n’ebe dị anya, n’ọnọdụ ụfọdụkwa, ọbụna nọrọ n’ebe dị anya site n’ebe di ma ọ bụ nwunye ha nọ. N’ọtụtụ ala, ihe ntụrụndụ ndị na-ewu ewu na-eme ka ihe ka njọ, ebe ọ bụ na ha na-eledakarị njikọ ndị na-eme ka a kwụsie ike anya, ndị dị ka alụmdi na nwunye na ezinụlọ. *

Ụdị Nne Ọhụrụ Nanị Ya Na-azụ Ụmụ

Nne nanị ya na-azụ ụmụ taa abụchaghị ụdị ahụ e nwere na mbụ bụ́ onye nọ n’afọ iri na ụma na-alụghị di, bụ́ onye ndị ọchịchị na-enyere aka. Ịbụ nne n’alụghị di adịchaghịzi eme ihere, ọbụna ndị a ma ama e ji mere ihe nlereanya emewo ka o yie ihe dị mma. Tụkwasị na nke ahụ, ọtụtụ ndị inyom abụwo ndị gụtakwuru akwụkwọ ma nwekwuo ike ịkwado onwe ha—ya mere alụmdi na nwunye abụghịzi ihe dị mkpa iji nweta ego maka ịbụ nne.

Ụfọdụ ndị nne nanị ha na-azụ ụmụ, karịsịa ụmụ ndị toworo eto ndị nne na nna ha gbara alụkwaghịm, na-anọgide n’alụghị di n’ihi na ha achọghị ka ụmụ ha nwee ihe mgbu nke ịhụ ka nna ha gbahapụrụ ha. Ndị inyom ndị ọzọ na-aghọ ndị nne nanị ha na-azụ ụmụ n’ihi na a gbahapụrụ ha, ọ bụghị na ha chọrọ ya otú ahụ. “Ịbụ nne ma ọ bụ nna nanị ya na-azụ ụmụ adịghị abụkarị ihe e ji ọdịmma onwe onye nanị mara ụma họrọ,” ka Joseph Rowntree Foundation nke Britain na-ekwu, “ụmụ ndị nọ n’ezinụlọ ndị nwere nanị nne ma ọ bụ nna abụghị ndị a na-eleghara anya na ndị na-adịghị enwe nsọpụrụ.”

Ma, njupụta nke ezinụlọ ndị nwere nanị nne ma ọ bụ nna na-akpata nchegbu n’ihi na ndị nne ma ọ bụ nna nanị ha na-azụ ụmụ na ụmụ ha pụrụ inwe nchekasị, mkpa ego, na ụkọ ihe ụfọdụ. Ụfọdụ ndị pụrụ iche ma ọ̀ bụkwa ihe ga-ekwe omume nne ma ọ bụ nna ịzụlite ụmụ nanị ya n’ụzọ gara nke ọma. Olee ihe ịma aka ụfọdụ pụrụ iche bụ́ ndị ezinụlọ ndị nwere nanị nne ma ọ bụ nna na-eche ihu? Olee otú Onye Kraịst bụ́ nne ma ọ bụ nna nanị ya na-azụ ụmụ pụrụ isi merie ihe ịma aka nke ịzụlite ụmụaka?

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

^ par. 3 Ndị ọkà mmụta mmekọrịta ọha na eze na-ekwu na ọnụ ọgụgụ ndị nne nanị ha na-azụ ụmụ ‘karịrị nnọọ ọnụ ọgụgụ ndị nna nanị ha na-azụ ụmụ.’ N’ihi ya, isiokwu ndị a na-ekwu n’ụzọ bụ́ isi banyere ndị nne nanị ha na-azụ ụmụ. Otú ọ dị, ụkpụrụ ndị a tụlere na ya na-emetụtakwa ndị nna nanị ha na-azụ ụmụ.

^ par. 6 Iji nweta ebe a tụlere ihe ịma aka nke ịbụ nne n’ụzọ zuru ezu, lee “Ịbụ Nne—Ọ̀ Chọrọ Nwanyị Nwere Ike Pụrụ Iche?” nke dị ná mbipụta Teta! nke April 8, 2002.

[Igbe dị na peeji nke 4]

Nkọwa Ụfọdụ

A na-eji okwu dị iche iche akọwa ndị nne nanị ha na-zụ ụmụ n’ụwa nile. Ná mba ụfọdụ, a na-eji okwu bụ́ “ndị nne nanị ha na-azụ ụmụ” eme ihe n’izo aka n’ebe ndị nne na-alụtụbeghị di nọ, ma n’ala ndị ọzọ, “ndị nne nanị ha na-azụ ụmụ” na-agụnye ụdị ndị nne dịgasị iche iche bụ́ ndị na-azụ ụmụ n’enweghị di n’ezinụlọ ha. Ndị nne dị otú ahụ pụrụ ịbụ ndị a gbara alụkwaghịm, ndị kewara ekewa, ma ọ bụ ndị di ha nwụrụ, ma ọ bụkwanụ ọ pụrụ ịbụ na ha alụtụbeghị di.

N’usoro isiokwu a, anyị ji okwu ndị bụ́ “nne ma ọ bụ nna nanị ya na-azụ ụmụ” na “nne nanị ya na-azụ ụmụ” eme ihe n’izo aka n’ebe ndị nne ma ọ bụ nna bụ́ ndị na-azụlite ụmụ n’enweghị di ma ọ bụ nwunye, nọ.

[Igbe/Map dị na peeji 4, 5]

ỊBỤ NNE MA Ọ BỤ NNA NANỊ YA NA-AZỤ ỤMỤ —IHE JUPỤTARA N’ỌTỤTỤ ALA

United States: “Ọnụ ọgụgụ ndị nne nanị ha na-azụ ụmụ mụbara n’agbata 1970 na 2000, site na nde 3 ruo nde 10; n’otu oge ahụkwa, ọnụ ọgụgụ ndị nna nanị ha na-azụ ụmụ mụbakwara, site na 393,000 ruo nde 2.”—Ụlọ Ọrụ Na-ahụ Maka Ọnụ Ọgụgụ Mmadụ na United States.

Mexico: Dị ka akwụkwọ akụkọ bụ́ La Jornada si kwuo, ndị nne dị afọ iri na ụma mejupụtara ihe dị ka pasent 27 nke ngụkọta ọnụ ọgụgụ ndị na-atụrụ ime ná mba ahụ.

Ireland: Ọnụ ọgụgụ ezinụlọ ndị nwere nanị nne ma ọ bụ nna mụbara site na pasent 5.7 na 1981 ruo pasent 7.9 na 1991. “Ntisa nke alụmdi na nwunye nọgidere na-abụ isi ihe na-akpata ịbụ nne nanị ya na-azụ ụmụ.”—Akwụkwọ bụ́ Single Mothers in an International Context, 1997.

Britain: “Nkezi nke ezinụlọ ndị nne ma ọ bụ nna nanị ha na-azụ ụmụ agafeela pasent 25 na nke mbụ ya, na-egosi uto dị ukwuu n’ọnụ ọgụgụ ndị nne na-alụtụbeghị di nakwa ịrị elu pụtara ìhè n’ọ̀tụ̀tụ̀ ịgba alụkwaghịm n’ime afọ 30 gara aga.”—Akwụkwọ akụkọ bụ́ The Times, London, March 2, 2000.

France: “Kemgbe ngwụsị afọ ndị 1970, nkezi nke ezinụlọ ndị nwere nanị nne ma ọ bụ nna ejiriwo ihe karịrị pasent 50 rịa elu.”—Akwụkwọ bụ́ Single Mothers in an International Context, 1997.

Germany: ‘Ọnụ ọgụgụ ndị nne ma ọ bụ nna nanị ha na-azụ ụmụ amụbawo n’ime iri afọ abụọ gara aga. Ọ fọrọ nke nta ka ọ bụrụ ndị nne ka e nwere n’ezinụlọ nile otu onye na-azụ ụmụ na ha.’—Akwụkwọ bụ́ Single Mothers in an International Context, 1997.

Japan: ‘Ezinụlọ ndị nwere nanị nne anọwo na-arị elu kemgbe afọ ndị 1970.’ Na 1997, pasent 17 nke ezinụlọ nile e nwere bụ nke ndị nne nanị ha na-azụ ụmụ.—Akwụkwọ ndị bụ́ Single Mothers in an International Context, 1997; The World’s Women 2000: Trends and Statistics.

Gris: “Kemgbe 1980, ọnụ ọgụgụ ndị nne na-alụghị di nọ na [Gris] ejiriwo pasent 29.8 rịa elu. Dịkwa ka ihe ndekọ Njikọ nke Mba Ndị Dị na Europe wepụtara si gosi, na 1997, pasent nke ụmụaka a mụrụ n’alụghị di ma ọ bụ nwunye dị pasent 3.3, ebe na 1980, ọ dị nanị pasent 1.1.”—Akwụkwọ akụkọ bụ́ Ta Nea, Athens, September 4, 1998.

Australia: Ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ 1 n’ime ụmụaka 4 ọ bụla so nanị nne ma ọ bụ nna ha biri. Nke a na-abụkarị n’ihi ndakpọ alụmdi na nwunye ma ọ bụ mmekọrịta na-adịghịzi mma nke nne na nna ha. E mewo atụmatụ na ezinụlọ ndị nwere nanị nne ma ọ bụ nna ga-amụba n’agbata pasent 30 na pasent 66 n’ime afọ 25.—Ụlọ Ọrụ Australia Na-ahụ Maka Ndekọ Ọnụ Ọgụgụ.