Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndị Nne Ma Ọ Bụ Nna Nanị Ha Na-azụ Ụmụ, Ọtụtụ Ihe Ịma Aka Ha Na-enwe

Ndị Nne Ma Ọ Bụ Nna Nanị Ha Na-azụ Ụmụ, Ọtụtụ Ihe Ịma Aka Ha Na-enwe

Ndị Nne Ma Ọ Bụ Nna Nanị Ha Na-azụ Ụmụ, Ọtụtụ Ihe Ịma Aka Ha Na-enwe

“M na-enwekarị mwute. N’ọtụtụ abalị, ana m anọ n’ọnụ ụlọ ịsa ahụ́ na-ebe ákwá. Ọnọdụ a siri ike.”JANET, NNE NANỊ YA NA-AZỤ ỤMỤ ATỌ.

IHE ndị na-eme ka mmadụ ghọọ nne ma ọ bụ nna nanị ya na-azụ ụmụ dị ọtụtụ. Ezinụlọ ụfọdụ nwere nanị nne ma ọ bụ nna n’ihi agha, ọdachi na-emere onwe ya, ma ọ bụ ọrịa.

Ndị nne na nna nke ụmụaka ụfọdụ na-ekpebi na ha agaghị alụ onwe ha. Dị ka ihe atụ, na Sweden, ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ ọkara nke ụmụaka ndị nọ n’ebe ahụ bụ ndị a mụrụ n’alụghị di ma ọ bụ nwunye. Ịgba alụkwaghịm na-emekwa ka e nwee ezinụlọ ndị nwere nanị nne ma ọ bụ nna. Nnyocha e mere na-egosi na ihe karịrị pasent 50 nke ụmụaka ndị America ga-ebi n’ezinụlọ nwere nanị nne ma ọ bụ nna n’oge ụfọdụ nke ịbụ ụmụaka ha.

Ịghọta Ihe Ịma Aka Ndị Ọ Na-eweta

Ndị nne bụ́ ndị di ha nwụrụ n’oge na-adịbeghị anya nwere ibu arọ pụrụ iche ha ga-ebu. Ha aghaghị ịmalite ibu ibu ọrụ nke ezinụlọ ha mgbe ha ka na-eru újú di ha nwụrụ anwụ. Ọ pụrụ iwe ọtụtụ ọnwa, ọbụna ọtụtụ afọ, tupu ọrụ a amara ha ahụ́, ka ha na-agbalị imeri ihe ịma aka nke akụ̀ na ụba na ibu ọrụ nke ịkasi ụmụ ha obi. Nne ahụ di ya nwụrụ pụrụ ịhụ ya dị ka ihe sigburu onwe ya n’ike iburukwu ibu ọrụ ndị a. Nke a pụrụ ime ka nwatakịrị ghara inweta ọzụzụ n’ụzọ zuru ezu n’oge nlebara anya na mmesighachi obi ike dị ya nnọọ mkpa.

Ndị nne na-alụghị nna nwa ha na-abụkarị ndị ka na-eto nnọọ eto na ndị na-enweghị ahụmahụ. E nwere ike ha enwetaghị ohere ịgụcha akwụkwọ. N’ịbụ ndị na-enweghị nkà ọrụ zuru ezu, o yikarịrị ka hà ga-abụ ndị ogbenye na ndị na-arụ ọrụ n’ebe a na-akwụ obere ụgwọ. Ọ bụrụ na ha enwetaghị enyemaka nke ndị ikwu ha, dị ka nke nne na nna ha, ha ga-enwekwu ibu ọrụ nke ilekọta nwa ha n’ụzọ kwesịrị ekwesị kwa ụbọchị. Nne ahụ nke na-alụghị di pụkwara ịdị na-enwe ihe mgbu mmetụta uche, dị ka ihere na owu ọmụma. Ụfọdụ pụrụ ịtụ egwu na ọ bụrụ na nwa ha anọrọ ya, na ọ ga-eme ka ha ghara inweta di kwesịrị ekwesị. Ka ụmụaka nọ n’ezinụlọ dị otú ahụ na-etolite, ha onwe ha kwa pụrụ inwe nchegbu n’ihi ajụjụ ndị a na-azabeghị banyere onye bụ nna ha nakwa n’ihi na ọ dị ha mkpa ịbụ ndị nna ha nabatara.

N’otu aka ahụ, ndị nne ma ọ bụ nna gbara alụkwaghịm na-enwe nchegbu dị ukwuu. Nne ma ọ bụ nna ụfọdụ pụrụ ịdị na-ewe oké iwe n’ihi alụkwaghịm a gbara ha. Mmetụta nke ịbụ ndị na-abachaghị n’ihe na iche nnọọ na a jụrụ ha ajụ pụkwara ịnapụ nne ma ọ bụ nna ụfọdụ ikike nke igbo mkpa mmetụta uche nke ụmụ ha. Ndị nne bụ́ ndị ọ dị mkpa ịmalite ịrụ ọrụ ego na nke mbụ ya, pụrụ inwe ihe isi ike ịnagide ibu ọrụ nke ilekọta ezinụlọ. Ha pụrụ iche na ha enweghị ma oge ma ume iji lebara mkpa pụrụ iche nke ụmụ ha anya, bụ́ ndị ọ dị mkpa n’onwe ha ịnagide mgbanwe ndị dị ukwuu e nwere ka nne na nna ha gbasịrị alụkwaghịm.

Ihe Ịma Aka Ndị Pụrụ Iche Ndị Nne Ma Ọ Bụ Nna A Gbara Alụkwaghịm Na-enwe

Ndị nne ma ọ bụ nna nanị ha na-azụ ụmụ na-aghọta na mkpa ụmụ ha n’otu n’otu na-adịgasị iche iche ma na-agbanwe mgbe nile. N’ebe ndị nne ma ọ bụ nna a gbara alụkwaghịm nọ, iwepụta ohere ndị dị mma maka nduzi ime mmụọ pụrụ iweta ihe ịma aka ndị pụrụ iche.

Dị ka ihe atụ, ụfọdụ ndị nne ma ọ bụ nna a gbara alụkwaghịm bụ́ Ndịàmà Jehova nwere ike ghara inweta ikike nke ịkpọrọ ụmụ ha. Ha emewo atụmatụ ka oge ụmụ ha ga na-abịa eleta ha bụrụ oge pụrụ ịgụnye ịga nzukọ Ndị Kraịst. Ndokwa a e mere maka ime nleta ga-eme ka nwata ahụ na-eso ọgbakọ Ndị Kraịst akpachi anya, bụ́ nke bara oké uru nye ụmụaka nke ndị gbara alụkwaghịm.

Ndị nne ma ọ bụ nna a gbara alụkwaghịm bụ́ ndị na-enwechaghị ohere ịdị na-eru ụmụ ha nso mgbe mgbe kwesịrị ịchọ ụzọ isi mesie ha obi ike na ha hụrụ ha n’anya. Iji nwee ihe ịga nke ọma, ọ dị mkpa ka nne ma ọ bụ nna na-echebara mkpa mmetụta uche na-agbanwe agbanwe nke nwa ya echiche. Ọ na-adị otú a karịsịa mgbe nwata ahụ ruru oge uto ma na-enwewanye mmasị ná ntụrụndụ nakwa n’ebe ndị enyi ya nọ.

Nne ma ọ bụ nna nke na-enwe ihe ịga nke ọma na-aghọtakwa ikike, àgwà, na ụzọ iche echiche nke nwatakịrị ahụ. (Jenesis 33:13) Nne ma ọ bụ nna na nwa ya na-enwe mkparịta ụka na mkpakọrịta chiri anya na nke ịhụnanya. Ụzọ nkwurịta okwu na-eghere oghe. Nwatakịrị na-ekere òkè ná ndụ nne ma ọ bụ nna ya, nne ma ọ bụ nna na-ekerekwa òkè ná ndụ nwa ya.

Mkpa Ọ Dị Inwe Ezi Uche

Mgbe a gbasịrị alụkwaghịm, ụmụaka na-erite uru site n’ịhụ nne na nna ha mgbe mgbe. Were ya na nne na nna ahụ nwere nkwenkwe okpukpe dịgasị iche iche; otu onye bụ otu n’ime Ndịàmà Jehova ma onye nke ọzọ abụghị. Nkwurịta okwu ghere oghe a na-enwe mgbe mgbe na-enye aka eme ka e zere esemokwu na-enweghị isi. “Ka inwe ezi uche unu bụrụ nke mmadụ nile maara,” ka Pọl onyeozi dere. (Ndị Filipaị 4:5) E kwesịrị ịkụziri ụmụaka ịkwanyere oruru o ruuru nne na nna ahụ ikpe okpukpe ha, ùgwù.

Nne ma ọ bụ nna nke na-abụghị Onyeàmà pụrụ isi ọnwụ na ọ ga-akpọ nwatakịrị ahụ aga ihe omume okpukpe na chọọchị ya. Gịnị ka onye nke bụ́ otu n’ime Ndịàmà Jehova pụrụ ime? Ọ pụkwara iso nwatakịrị ahụ kwurịta nkwenkwe okpukpe ya. Ka oge na-aga, nwatakịrị ahụ pụrụ ime mkpebi nke ya banyere okpukpe ọ ga-ekpe, dị ka nwatakịrị bụ́ Timoti mere, bụ́ onye o yiri ka ọ bụ nne ya na nne ya ochie kụziiri ya ụkpụrụ Bible. (2 Timoti 3:14, 15) Ọ bụrụ na nwatakịrị ahụ adịghị enwe ahụ́ iru ala n’ikpe okpukpe ọzọ, ikekwe, ọ pụrụ ịtụle onye a kpọtụrụ aha na Bible, bụ́ Neaman, bụ́ onye mgbe ọ ghọsịrị ezi onye na-efe ofufe nọgidere na-arụ ọrụ ya site n’isonyere eze bụ́ onye nọ na-efe ofufe n’ụlọ Rimọn. Ihe ndekọ a pụrụ imesighachi nwatakịrị ahụ obi ike na Jehova hụrụ ya n’anya ma na-aghọta ya n’agbanyeghị ọnụnọ ọ na-anọ n’ebe a na-eme ememe okpukpe bụ́ nke na-amaghị ya ahụ́.—2 Ndị Eze 5:17-19.

Nne ma ọ bụ nna nke na-enwe ihe ịga nke ọma na-enwe ike ịkpụzi echiche nwatakịrị ma ọ bụ ụmụaka ahụ nakwa ịghọta mmetụta ha. (Deuterọnọmi 6:7) N’eziokwu, ndị nne ma ọ bụ nna na-alụghị di ma ọ bụ nwunye pụrụ ime ihere n’ihi ụzọ ndụ ha gara aga. Otú ọ dị, ọ dị nne ma ọ bụ nna dị otú ahụ mkpa icheta na ụmụaka nwere nne, nweekwa nna. Ụmụaka na-achọ ịmara banyere nne na nna ha, ọ na-adịkwa ha mkpa inwe mmetụta nke ịbụ ndị a hụrụ n’anya na ndị a chọrọ, ọ bụghị nnọọ ndị a mụrụ n’ọghọm. Site n’ikwu okwu n’ụzọ nkwanye ùgwù banyere nne ma ọ bụ nna ahụ nke na-anọkwaghị ya na ịza ya ihe ndị onye nọ n’afọ ndụ nwatakịrị ahụ pụrụ ịghọta, ma ọ bụ ihe ndị ọ dị ya mkpa ịmara, nne ma ọ bụ nna ahụ pụrụ imesighachi nwatakịrị ahụ obi ike n’ụzọ ịhụnanya.

Ndị nne na nna kwesịrị ịghọta na ihe mbụ nwatakịrị ga-amata banyere ịhụnanya, ịbụisi, na ike ga-abụ nke mmekọrịta dị n’etiti ya na nne ya ma ọ bụ nna ya ga-ekpebi. Site n’igosipụta ịbụisi na ike ya n’ụzọ ịhụnanya, nne ma ọ bụ nna bụ́ Onye Kraịst pụrụ ime ihe dị ukwuu n’ịkwadebe nwatakịrị ahụ iso Jehova na-enwe mmekọrịta ịhụnanya nakwa ịkwanyere ndokwa ọgbakọ ùgwù.—Jenesis 18:19.

Nkwado Ụmụaka Dị Oké Mkpa

Ọ dịkwa ụmụaka ndị bi n’ezinụlọ nwere nanị nne ma ọ bụ nna mkpa ịghọta na nkwado ha dị oké mkpa iji mee ka ezinụlọ nwee ihe ịga nke ọma. (Ndị Efesọs 6:1-3) Ha irubere ịbụisi nne ma ọ bụ nna ha isi na-egosi na ha hụrụ ya n’anya ma na-akwanyere mgbalị ọ na-etinyekwu iji mee ka e nwee ezinụlọ dị nchebe na nke obi ụtọ, ùgwù. Ebe nkwurịta okwu bụ onye kwuo ibe ya ekwuo, ụmụaka nọ n’ezinụlọ nwere nanị nne ma ọ bụ nna kwesịrị icheta na ha aghaghị ịdị njikere ịkwado mgbalị nke nne ma ọ bụ nna ha na-eme iji hụ na a nọgidere na-enwe ezi nkwurịta okwu n’ezinụlọ.—Ilu 1:8; 4:1-4.

A na-achọkarị ka ụmụaka dị otú ahụ buwa ibu ọrụ ngwa ngwa karịa ndị nke bi n’ezinụlọ ndị nwere ma nne ma nna. Site n’iji ịhụnanya na ndidi na-enye ha ntụziaka, ụmụ okoro na ụmụ agbọghọ ga-enweta obi ike onwe onye, nweekwa ùgwù onwe onye ka ha na-enweta nkà ndị dị mkpa ná ndụ n’oge ha ka dị obere. Ọzọkwa, a pụrụ ikenye ụmụaka ọrụ ụlọ ụfọdụ ka ha wee nye aka n’ilekọta ezinụlọ anya n’ụzọ dị n’usoro.

Nke a apụtaghị na ebumnobi nne ma ọ bụ nna ahụ nanị ya na-azụ ụmụ bụ ime ka ụmụ ya bụrụ obere ndị okenye ihe nile zuuru bụ́ ndị nduzi nke nne na nna na-adịghịzi mkpa. N’ezie, ọ bụ ihe ezi uche na-adịtụghị na ya bụ́ ịhapụ nwatakịrị nanị ya ma ọ bụ n’elebaraghị ya anya.

Ndị nne ma ọ bụ nna nanị ha na-azụ ụmụ na-abụkarị ndị e mere ka ha chee n’ụzọ hiere ụzọ na ha na ụmụ ha aghaghị ime ka hà bụ ndị ibe ma ọ bụ ọgbọ. Ọ bụ ezie na mmekọrịta chiri anya dị mkpa, ndị nne ma ọ bụ nna nanị ha na-azụ ụmụ kwesịrị iburu n’uche na ihe dị ụmụaka mkpa bụ nne ma ọ bụ nna, nakwa na nwatakịrị etozubeghị okè n’ụzọ mmetụta uche ịbụ onye ha ga na-akọrọ ihe nzuzo ma ọ bụ na-emeso ya dị ka ọgbọ ya. Ọ dị ụmụ gị mkpa ka ị na-eme omume dị ka nne ma ọ bụ nna.

Ndị nne ma ọ bụ nna nanị ha na-azụ ụmụ na ụmụ ha bụ́ ndị na-emekọ ihe ọnụ n’ụzọ ịhụnanya pụrụ inye aka n’iwulite ezinụlọ na-aga nke ọma. Ka a na-azụlite ọnụ ọgụgụ na-arịwanye elu nke ụmụaka n’ezinụlọ ndị nwere nanị nne ma ọ bụ nna, onye ọ bụla kwesịrị ịmara kpọmkwem ihe ịma aka ndị na-eche ndị nne ma ọ bụ nna nanị ha na-azụ ụmụ na ụmụ ha ihu ma dị njikere iji ịhụnanya nye ha agbamume na nkwado.

[Igbe/Foto dị na peeji nke 9]

Mmetụta Ọ Na-enwe n’Ahụ́ Ụmụaka

Ndị nne ma ọ bụ nna nanị ha na-azụ ụmụ n’ozuzu ha pụrụ inwe oge dị nta maka ilebara nwa nke ọ bụla anya karịa ka ma nne ma nna gaara enwe. Mgbe ụfọdụ, nne ma ọ bụ nna nanị ya na-azụ ụmụ na-eso onye na-abụghị di ma ọ bụ nwunye ya ebikọ. Otú ọ dị, ibikọ ọnụ adịghị esi ike dị ka alụmdi na nwunye. Ụmụaka ndị bi n’ezinụlọ ndị dị otú ahụ yikarịrị ka hà ga-etolite bụrụ ndị nwere ndị toworo eto dị iche iche keere òkè ná ndụ ha.

Dị ka nnyocha ụfọdụ si gosi, “ná nkezi, ụmụaka ndị si n’ezinụlọ ndị nwere nanị nne ma ọ bụ nna yikarịrị ka hà ga-ebi ndụ na-adịchaghị mma karịa ụmụaka ndị sitere n’ezinụlọ ndị nwere nne na nna.” Otú ọ dị, nnyocha e ji nlezianya ka ukwuu mee na-egosi na ụkọ ego pụrụ ịbụ “otu ihe kasị akpata ndịrịta iche ndị e nwere ná ntolite nakwa n’àgwà ụmụaka sitere ná ndokwa ezinụlọ dịgasị iche iche.” N’ezie, nke a apụtaghị na ụmụaka ndị si n’ezinụlọ nwere nanị nne ma ọ bụ nna agaghị enwe ihe ịga nke ọma. Ọ bụrụ na e nye ha nduzi na ọzụzụ kwesịrị ekwesị, ha pụrụ imeri mmetụta ndị na-adịghị mma.