Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ngwá Agha Ndị Na-arụ Ọrụ Na Nzuzo—Ọ̀ Bụ Ihe Iyi Egwu N’ezie?

Ngwá Agha Ndị Na-arụ Ọrụ Na Nzuzo—Ọ̀ Bụ Ihe Iyi Egwu N’ezie?

Ngwá Agha Ndị Na-arụ Ọrụ Na Nzuzo—Ọ̀ Bụ Ihe Iyi Egwu N’ezie?

MGBALỊ ndị a na-eme iji ọrịa gbuo ndị mmadụ n’oge agha abụghị ihe ọhụrụ. Na narị afọ nke 14, n’Ebe Ọwụwa Anyanwụ Europe, e si n’elu mgbidi tụba ndị ọnwụ ojii gburu n’ime otu obodo ukwu ndị agha nọchibidoro. N’ihe mere mgbe afọ 400 gasịrị, ndị ọchịchị Britain kpachaara anya nye Ndị American Indian blanket ndị nje na-akpata kịtịkpa dị na ha n’otu nnọkọ udo e nwere n’oge Agha France na India. Ihe a kpatara ntiwapụ nke ọrịa bụ́ nke so mee ka ndị Indian chilie aka elu. Otú ọ dị, ọ bụ ná ngwụsị narị afọ nke 19 ka a bịaziri chọpụta na ụmụ nje na-akpata ọrịa na-efe efe. Nghọta a mere ka e nwee ohere ọhụrụ na-emenye egwu nke iji ọrịa mere ngwá agha.

N’ezie, ọganihu ndị e nweworo na nkà ọgwụ na sayensị emewokwa ka e mepụta ọgwụ na ọgwụ mgbochi ọrịa dị iche iche. Ha adịwo nnọọ irè n’ịgwọta nakwa n’igbochi ọrịa. Ma, n’agbanyeghị ọganihu ndị a, ọrịa na-efe efe ka bụ onye iro na-emenye ụjọ, nke na-egbu ihe karịrị nde mmadụ 17 kwa afọ—ihe dị ka mmadụ 50,000 kwa ụbọchị. Ọ bụ eziokwu na-enye nsogbu n’obi: Ọ bụ ezie na ndị ikom na ndị inyom nwere nnọọ ọgụgụ isi ararawo ndụ ha nye n’imeri ọrịa na-arịa ụmụ mmadụ, ndị ọzọ ndị nwekwara ịnụ ọkụ n’obi na nkà dị ka ha elekwasịwo anya n’iji ọrịa na-emeri ụmụ mmadụ.

Mgbalị Ndị E Mere Ịmachibido Ngwá Agha Ndị Nwere Nje Na-akpata Ọrịa

Ruo ihe karịrị afọ 25, United States, ebe bụbu Soviet Union, na ọtụtụ mba ndị ọzọ ji oké ọchịchọ na-arụ ọrụ maka mmepụta nke ngwá agha ndị nwere nje ndị na-akpata ọrịa. Ma n’afọ 1972, mba nile kwekọrịtara ịmachibido ngwá agha ndị a iwu. Otú ọ dị, mba ụfọdụ nọgidere na-emepụta ma na-eme nnyocha banyere ya na nzuzo, na-akwakọju nje ndị na-egbu egbu, na-emepụtakwa ihe ndị e ji agbapụ ha.

Gịnị mere gọọmenti ji machibido ngwá agha ndị dị otú ahụ iwu? Dị ka e si chee ná mmalite afọ ndị 1970, nje, ọ bụ ezie na ha na-egbu nnọọ egbu, bụ ngwá agha na-adịghị akpa ike n’ọgbọ agha. Otu ihe kpatara nke a bụ na mmetụta ha adịghị apụta ìhè ozugbo—ọ na-ewe oge tupu mgbaàmà ha apụtawa ìhè. Ihe ọzọ kpatara ya bụ na ịdị irè ha na-adabere ná mgbanwe nke ikuku na ihu igwe. Ọzọkwa, mba nile ghọtara na ọ bụrụ na otu mba ejiri ngwá agha ndị nwere nje ndị na-akpata ọrịa gbaa mba ọzọ, o yikarịrị ka mba ahụ a gbara ya ọ̀ ga-eji ngwá agha ndị nwere nje ndị na-akpata ọrịa ma ọ bụ ngwa agha nuklia, bụ́ ndị ha kwakọbara gbagwara. N’ikpeazụ, ọtụtụ ndị bịara kpọọ mmadụ ịma ụma gbapụ ihe ndị dị ndụ iji kwarụọ ma ọ bụ gbuo mmadụ ibe ya asị.

Ọ dịghị nke ọ bụla n’ime ihe ndị a nke yiri ka ọ̀ ga-egbochi ndị kpọrọ nnọọ ndị ọzọ asị ma dị njikere ileghara ụkpụrụ omume ndị dịbu adị anya. Ngwá agha ndị nwere nje ndị na-akpata ọrịa na-adọrọ nnọọ mmasị nke ndị kpebisiri ike igbu ndị mmadụ aghara aghara. A pụrụ iji ụzọ nzuzo mepụta ma gbapụ ngwá agha ndị nwere nje ndị na-akpata ọrịa. A pụrụ izochi onye gbara ya, ọ bụrụkwa na a mata onye ọ bụ, ọ dịghị mfe ịgbagwara òtù ndị na-eyi ọha egwu bụ́ ndị nwere ndị òtù ha n’ọtụtụ mba. Ọzọkwa, mwakpo e ji nje ndị na-akpata ọrịa, bụ́ ndị a na-ezo ezo, a na-adịghị ahụ anya, ndị mmetụta ha na-adịghị apụta ìhè ngwa ngwa nakwa ndị na-egbu egbu, mee pụrụ ịkpata ọgba aghara n’etiti ndị mmadụ nanị n’ihi egwu ọ kpalitere. Mwakpo ndị e mere n’ihe ọkụkụ ma ọ bụ anụ ụlọ pụrụ ịkpata ụkọ nri na ndakpọ akụ̀ na ụba.

Ihe ọzọ na-akpali ha bụ ịdịtụ ọnụ ala nke mmepụta ngwá agha ndị nwere nje ndị na-akpata ọrịa. Otu nnyocha gbakọrọ ihe iji ngwá agha dịgasị iche iche gbuo ndị nkịtị na-enweghị ihe nchebe n’ógbè dị otu square kilomita na-efu. Ihe e mere atụmatụ ọ ga-efu ma e jiri ngwá agha nkịtị mee ihe bụ $5,000, $2,000 maka ngwá agha nuklia, $1,500 maka ngwá agha nwere ikuku gas na-emetụta akwara, $2.50 maka ngwá agha ndị nwere nje na-akpata ọrịa.

Ihe Isi Ike Ndị Metụtara Nkà na Ụzụ Nye Ndị Na-eyi Ọha Egwu

Akụkọ ndị a kọrọ n’usoro mgbasa ozi na-ekwu na ụfọdụ òtù ndị na-eyi ọha egwu anwalewo ngwá agha ndị nwere nje ndị na-akpata ọrịa. Ma, e nwere nnukwu ọdịiche n’etiti ịnwale ngwá agha ndị nwere nje ndị na-akpata ọrịa na iji ha eme mwakpo gara nke ọma.

Iji nwee ihe ịga nke ọma, onye na-eyi ọha egwu ma ọ bụ òtù na-eyi ọha egwu aghaghị imeri ihe ịma aka ndị tara akpụ bụ́ ndị metụtara nkà na ụzụ. Nke mbụ, onye na-eyi ọha egwu aghaghị inweta ụdị nje na-egbu nnọọ egbu. Nke abụọ, ọ ghaghị ịmata ụzọ ziri ezi ma dị nchebe e si elekọta ma na-edebe nje ahụ. Nke atọ, ọ ghaghị ịmata otú e si eme ka ọ mụbaa. Ọnụ ọgụgụ dị nta nke nje ndị a na-apụghị iji anya nkịtị hụ na-egbu nnọọ egbu nke na ha pụrụ ibibi ala ubi, ìgwè anụmanụ, ma ọ bụ obodo mmadụ jupụtara na ya, ma ọ bụrụ na a gbara nje ahụ kpọmkwem n’ebe a chọrọ ya. Otú ọ dị, nje ndị na-egbu egbu adịghị adịgidekebe ndụ ma ha si n’ụlọ ime nnyocha pụta. N’ezie, ọ bụ nanị akụkụ ụfọdụ nke nje ndị na-egbu egbu ga-erute ndị a gbara ya, n’ihi ya a ga-achọ ọ̀tụ̀tụ̀ buru nnọọ ibu nke nje iji mee mwakpo ga-ebibi ihe.

E nwere ihe isi ike ndị ọzọ. Onye ahụ na-eyi ọha egwu aghaghị ịghọta ụzọ isi mee ka nje ahụ dịgide ndụ ma nwee ikike ịrụ ọrụ mgbe a ga-eburu ya site n’ebe e debere ya ruo n’ebe a ga-agbapụ ya. N’ikpeazụ, ọ dị ya mkpa ịmata ụzọ isi gbapụ nje ahụ n’ụzọ gara nke ọma. Nke a na-agụnye ịhụ na a gbara nje ahụ ebe a chọrọ ịgbaga ya n’ókè kwesịrị ekwesị, ịhụ na a gbapụrụ ya n’ógbè buru ibu otú kwesịrịnụ, nakwa na a gbapụrụ nke ga-ezu ime ka ndị mmadụ bute ọrịa n’ìgwè. O were ìgwè ndị nnyocha a zụrụ nke ọma bụ́ ndị na-ahụ maka iji nje alụ agha na United States ihe karịrị afọ iri iji chepụta ụzọ a pụrụ ịdabere na ya isi gbapụ ngwá agha ndị nwere nje ndị na-akpata ọrịa. Ozugbo a gbapụrụ nje ndị na-egbu egbu n’ikuku, ìhè anyanwụ na ọ̀tụ̀tụ̀ ikpo ọkụ na ịjụ oyi dịgasị iche iche na-emetụta ya, bụ́ nke pụrụ ime ka nje ahụ a na-apụghị iji anya nkịtị hụ nwụọ. N’ihi ya, mmadụ iji nje mere ngwá agha pụtara na onye ahụ aghaghị ịmatacha otú nje ahụ na-esi arụ ọrụ n’ikuku.

N’ihi ọtụtụ ihe isi ike metụtara nkà na ụzụ bụ́ ndị dị na ya, ọ bụghị ihe ijuanya na ọ bụ mwakpo ole na ole ka ndị na-eyi ọha egwu jiworo ngwá agha ndị nwere nje ndị na-akpata ọrịa mee. Ọzọkwa, mwakpo ndị ahụ gburu mmadụ ole na ole. N’oge na-adịbeghị anya, akwụkwọ ozi ndị e tinyere ntakịrị nje anthrax gburu mmadụ ise na United States. Ọ kpatara ọdachi, ma o gburu ọnụ ọgụgụ mmadụ dị nta karịa ka a gaara egbu ma ọ bụrụ na e ji obere bọmbụ ma ọ bụ ọbụna égbè mee ihe. Ndị nnyocha na-eme atụmatụ na kemgbe 1975, n’ime pasent 96 nke mwakpo ndị e mere gburugburu ụwa bụ́ ndị e ji mmiri ọgwụ ma ọ bụ nje mee, e gburu ma ọ bụ merụọ ihe na-akarịghị mmadụ atọ ahụ́ ná mwakpo nke ọ bụla.

N’ịghọta otú o si sie ike ịgbapụ ngwá agha ndị nwere nje ndị na-akpata ọrịa n’ụzọ gara nke ọma, Kansụl Na-ahụ Maka Ihe Ọmụma Ndị Metụtara Nchebe nke Britain na America kwuru, sị: “Ọ bụ ezie na a na-eyi gọọmenti dị iche iche egwu iji mmiri ọgwụ ma ọ bụ nje ndị na-akpata ọrịa wakpoo ha, ihe ka ọtụtụ ná ndị nnyocha chere na n’agbanyeghị na ọ pụrụ ikwe omume inwe ọdachi ndị mmadụ ga-anwụ na ha n’ìgwè, o yikebeghị nnọọ ka ọ ga-eme eme.” Ma ọ bụ ezie na ọ pụrụ iyi ihe ga-esi ike omume, ihe ga-esi n’ụdị mwakpo ahụ pụta pụrụ ịdị oké njọ.

Akụkọ Ọjọọ Ndị Dị na Ya

Ka ọ dị ugbu a, anyị akọwo akụkọ ọma: Ma ihe isi ike ndị metụtara nkà na ụzụ ma ihe ndị mere n’oge gara aga na-egosi na o yighị ka a ga-enwe mwakpo e ji nje ndị na-akpata ọrịa mee bụ́ nke ga-akpata ọdachi. Akụkọ ọjọọ dịnụ, n’ikwu ya hoo haa, bụ na: Ihe ndị mere n’oge gara aga adịghị eme ka a matazuo ihe ga-eme n’ọdịnihu. Ọ bụ ezie na mwakpo gara aga akụwo afọ n’ala ọtụtụ mgbe, ndị a ga-eme n’ọdịnihu pụrụ ịga nke ọma.

Egwu dị. Ọnụ ọgụgụ na-arịwanye elu nke ndị na-eyi ọha egwu yiri ka ha ekpebisiwo ike igbu ọnụ ọgụgụ buru ibu nke ụmụ mmadụ. Ọ bụghị nanị na nkà na ụzụ nke òtù ndị na-eyi ọha egwu na-abụwanye ọkpọka kamakwa ụfọdụ òtù ndị na-eyi ọha egwu nwere akụ̀ na ụba na ngwá ọrụ ndị ha ka nke ụfọdụ gọọmenti nwere.

O yighị ka ọ na-echegbu ndị ọkachamara na mba ụfọdụ pụrụ inye òtù ndị na-eyi ọha egwu ngwá agha ndị nwere nje ndị na-akpata ọrịa. Otu onye na-eme nnyocha kwuru, sị: “N’agbanyeghị otú gọọmenti dị iche iche nweruru obi ọjọọ, oké ọchịchọ, ma na-akpa aghara, ha agaghị ekwe inye òtù ndị na-eyi ọha egwu bụ́ ndị ha na-apụghị ịchịkwata, ngwá agha ndị pụrụ iche; a pụrụ ịnwa gọọmenti ndị ahụ iji ngwá agha ndị dị otú ahụ mee ihe n’onwe ha ma ọ bụrụ na a wakpoo ha na nke mbụ ya, ma o yikarịrị ka hà ga-eji ha yie ndị mmadụ egwu kama iji ha lụọ agha kpọmkwem.” Ihe na-echegbu ndị ọkachamara bụ na a pụrụ ịrabanye ndị ọkà mmụta sayensị a zụrụ nke ọma n’òtù ndị na-eyi ọha egwu site n’ikwe ha nkwa ego buru ibu.

Ọrịa E Mepụtara Emepụta

Ọganihu ndị a na-enwe na nkà na ụzụ banyere ihe ndị dị ndụ bụkwa ihe na-akpata nchegbu. Ndị ọkà mmụta sayensị amatalarị otú e si emegharị nje ndị e nwere ka ha na-egbu nnọọ egbu ma dịkwuo mfe nlekọta. Ha pụrụ imegharị mkpụrụ ndụ ihe nketa nke nje ndị a na-apụghị iji anya nkịtị hụ, bụ́ ndị na-adịghị emerụ ahụ́, iji mepụta nsí. A pụkwara imegharị ọdịdị nke nje dị iche iche ka ha ghara ịbụ ndị a chọpụtara site n’ụzọ ndị bụ́ ọkpọka. Ọzọkwa, a pụrụ imegharị nje ndị a na-apụghị iji anya nkịtị hụ otú ọgwụ nje, ọgwụ mgbochi ọrịa ndị bụ́ ọkpọka, na usoro ọgwụgwọ dị iche iche na-apụghị igbu ha. Dị ka ihe atụ, ndị ọkà mmụta sayensị ndị gbahapụrụ ebe bụbu Soviet Union zọọrọ na ha mepụtara otu ụdị ọnwụ ojii nke ọgwụ nje 16 na-adịghị egbu.

A na-atụ anya na ọganihu ndị a ga-enwe n’ọdịnihu na nkà na ụzụ banyere ihe ndị dị ndụ nakwa na nkà mgbanwe mkpụrụ ndụ ihe nketa ga-emeghekwu ohere ndị ọzọ. Ndị ọkà mmụta sayensị pụrụ ịhazigharị mkpụrụ ndụ ihe nketa iji megharịa ọdịdị ma ọ bụ mepụta ọtụtụ ngwá agha ndị nwere nje ndị na-akpata ọrịa—ndị na-egbu egbu karị, ndị siri ike karị, na ndị dị mfe mmepụta na mgbapụ. A pụrụ imegharị ha ka e wee nwee ike ikwu otú mmetụta ha ga-adị ma chịkwaa ha n’ụzọ dị mfe karị. A pụrụ imepụta nje ndị ga-anwụ mgbe mkpụrụ ndụ ha kewasịrị ruo ugboro ole a chọrọ—ha ga-egbu ndị mmadụ ma pụzie n’anya.

A pụkwara imepụta ngwá agha ndị pụrụ iche bụ́ ndị na-arụ ọrụ na nzuzo n’ọdịnihu. Dị ka ihe atụ, ngwá agha ndị e mere ịrụ otu ihe kpọmkwem pụrụ ibelata ikike nke usoro ahụ́ ji alụso ọrịa ọgụ—kama ịbụ onye butere otu ọrịa kpọmkwem, onye ahụ ga-abụzi onye e kpughepụrụ nye ọtụtụ ọrịa. Ọ bụrụ na nje na-egbu egbu nke yiri AIDS apụta, ònye ga-amata ma o sitere ná mgbanwe ebumpụta ụwa nke mkpụrụ ndụ ihe nketa ka ọ bụ mgbanwe nke mkpụrụ ndụ ihe nketa e mere n’ụlọ ime nnyocha nke ndị iro?

Ọganihu ndị e nwere na nkà na ụzụ agbanwewo otú ndị agha si eche echiche. Otu onye agha ụgbọ mmiri nke United States dere, sị: “Ndị na-emepụta ngwá agha ka malitere nnọọ ịchọpụta ihe ndị pụrụ isi ná mgbanwe ndị dị ịrịba ama nke nkà na ụzụ banyere ihe ndị dị ndụ pụta. Ọ bụ ihe na-akpali iche echiche ịghọta na a ga-enwe ọganihu dị nnọọ ukwuu n’ọdịnihu karịa ka e nwere n’oge gara aga.”

[Igbe dị na peeji nke 22]

Gịnị Bụ Iji Nje Alụ Agha?

Okwu bụ́ “iji nje alụ agha” na-ezo aka n’ịma ụma agbasa ọrịa n’etiti ndị mmadụ, anụmanụ, ma ọ bụ ihe ọkụkụ. Ọrịa ahụ na-emetụta ndị mmadụ mgbe nje ndị dị ndụ a na-apụghị iji anya nkịtị hụ banyere n’ahụ́ ndị a gbara ya. Nje ndị a na-amụba (ụfọdụ na-emepụta nsí), ka oge na-agakwa mgbaàmà nke ọrịa ha na-akpata na-apụta ìhè. Ụfọdụ ngwá agha ndị nwere nje ndị na-akpata ọrịa na-akpata nkwarụ, ndị ọzọ na-akpata ọnwụ. A pụkwara iji nje ndị ọzọ wakpoo ma ọ bụ bibie ihe ndị a kụrụ akụ.

[Igbe/Foto ndị dị na peeji nke 24, 25]

Ihe Ọmụma Banyere Ngwa Agha Ndị Nwere Nje Na-akpata Ọrịa

Ọrịa Anthrax: Ọrịa na-efe efe bụ́ nke otu nje nke na-ekewa onwe ya na-akpata. Mgbaàmà ndị mbụ nke ọrịa anthrax a na-esi n’ikuku ebute pụrụ iyi azụ̀zụ̀. Mgbe ọtụtụ ụbọchị gasịrị, mgbaàmà ya na-aghọzi ekutaghị ume nke ọma na inwe nkụnwụ ahụ́. Ụdị ọrịa anthrax a na-egbukarị mmadụ.

A pụrụ ime ka ndị kuuru nje anthrax ghara ịrịawa ya site n’inye ha ọgwụ nje. Ịmalite n’oge gwọwa ya dị oké mkpa; igbu oge na-ebelata ohere onye na-arịa ya nwere ịgbake.

O yikebeghị nnọọ ka mmadụ ọ na-ebufe onye ọzọ ọrịa anthrax, o nwere ike ọ gaghịkwa eme ma ọlị.

Ná ngwụsị narị afọ nke 20, ọtụtụ mba, gụnyere United States na ebe bụbu Soviet Union, jiri nje anthrax mepụta ngwá agha. Ọnụ ọgụgụ mba ndị e chere na ha nwere ngwá agha ndị nwere nje ndị na-akpata ọrịa arịwo elu site na 10 n’afọ 1989 ruo 17 n’afọ 1995. A machaghị mba ole n’ime mba ndị a ndị na-eji nje anthrax eme ihe. Dị ka otu nnyocha nke gọọmenti United States mere gosiri, ịgbapụ anthrax dị 100 kilogram n’arọ n’ime otu obodo ukwu pụrụ igbu egbu dị ka bọmbụ hydrogen.

Botulism: Ọrịa na-eme ka uru ahụ́ kpọnwụọ bụ́ nke otu nje na-emepụta nsí na-akpata. Mgbaàmà nke botulism na-esite n’ihe oriri gụnyere ịhụ ihe abụọ abụọ ma ọ bụ inyoghi inyoghi, mbubere anya na-eme tabi tabi, ikwu ihe na-edoghị anya, inwe ihe isi ike n’ilo ihe, na ọnụ ịkpọ nkụ. Ịdị nro nke uru ahụ́ na-esite n’ubu gbadata n’ahụ́. Mkpọnwụ nke uru ahụ́ ndị na-eme ka a na-eku ume pụrụ ịkpata ọnwụ. Mmadụ anaghị ebufe onye ọzọ botulism.

Ọ bụrụ na a gbaa mmadụ ọgwụ na-abịanyu ikike nsí n’ezi oge, ọ na-ebelata ịdị njọ nke mgbaàmà ya na ohere onye ọrịa ahụ nwere ịnwụ.

Nsí botulinum bụ ihe a kasị ahọrọ dị ka ngwá agha nwere nje ndị na-akpata ọrịa ọ bụghị nanị n’ihi na ọ bụ otu n’ime ihe ndị kasị egbu egbu a maara kamakwa ọ bụ n’ihi na ọ na-adịtụ mfe mmepụta na ibugharị ya. Ọzọkwa, ndị butere ya ga-achọ ka e nye ha nlekọta dị ukwuu ruo ogologo oge. A na-enyo ọtụtụ mba enyo dị ka ndị na-emepụta nsí botulinum maka iji ya mere ngwá agha.

Ọnwụ Ojii: Ọrịa na-efe nnọọ efe bụ́ nke nje na-akpata. Mgbaàmà mbụ nke ọnwụ ojii na-emetụta akpa ume bụ ahụ́ ọkụ, isi ọwụwa, ike ọgwụgwụ, na ụkwara. Ihe na-esochi ya bụ ahụ́ nkụnwụ, ọ bụrụkwa na a maliteghị n’oge jiri ọgwụ nje gwọwa ya, o yikarịrị ka onye ahụ ọ ga-anwụ.

Ọrịa ahụ na-esite n’otu onye gafere n’onye ọzọ site n’asọ mmiri.

Na narị afọ nke 14, ọnwụ ojii gburu ihe dị ka nde mmadụ 13 na China na ihe dị ka nde mmadụ 20 ruo nde mmadụ 30 na Europe n’ime afọ ise.

N’ime afọ ndị 1950 nakwa n’afọ ndị 1960, ma United States ma ebe bụbu Soviet Union mepụtara ụzọ dị iche iche isi gbasaa ọnwụ ojii nke na-emetụta akpa ume. E chere na ọtụtụ puku ndị ọkà mmụta sayensị arụwo ọrụ n’iji ọnwụ ojii mepụta ngwá agha.

Kịtịkpa: Ọrịa na-efe nnọọ efe nke nje na-akpata. Mgbaàmà ndị mbụ a na-enwe gụnyere oké ahụ́ ọkụ, ike ọgwụgwụ, isi ọwụwa na azụ mgbu. Ọ nọkata, ọnyá akpụkpọ ahụ́ ndị na-afụ ụfụ bụ́ ndị na-ejupụta n’abụ na-apụta. Otu onye n’ime mmadụ atọ rịara ya na-anwụ.

E kpochapụrụ kịtịkpa n’ụwa nile n’afọ 1977. A kwụsịrị ọgwụ mgbochi ọrịa a na-agba site n’oge ruo n’oge maka kịtịkpa n’etiti afọ ndị 1972. A machaghị ókè ndị a gbara ọgwụ mgbochi ọrịa ahụ tupu mgbe ahụ nweruru ike iguzogide ya, ma ọ bụrụdị na ha pụrụ iguzogide ya. E nweghị ọgwụgwọ a nwapụtaworo na ọ na-adị irè maka kịtịkpa.

Ọrịa ahụ na-agbasa site n’otu onye gaa n’onye ọzọ site n’asọ mmiri. Uwe ma ọ bụ ákwà ihe ndina nje ahụ dị na ya pụkwara ịgbasa ya.

Malite na 1980, Soviet Union malitere ihe omume gara nke ọma iji mepụta kịtịkpa buru ibu na iji megharịa ya otú mgbọ ogbunìgwè ndị na-esi n’otu kọntinent gaa n’ọzọ, ga-enwe ike ibu ya. E tinyekwara mgbalị iji mepụta ụdị kịtịkpa ndị dị njọ ma na-efe efe karị.

[Foto]

Nje “anthrax” na mkpụrụ ndụ dị gburugburu

[Ebe E Sigasị Nweta Foto]

Ebe ndị e si nweta ya: Ụlọ Ọrụ Na-ahụ Maka Nchịkwa na Mgbochi Ọrịa na United States, Ụlọ Ọrụ Johns Hopkins nke Na-amụ Banyere Ichebe Ndị Nkịtị Pụọ ná Ngwá Agha Ndị Nwere Nje Ndị Na-akpata Ọrịa.

Onye na-arịa anthrax: CDC, Atlanta, Ga.; nje na-akpata anthrax: ©Dr. Gary Gaugler, Photo Researchers; nje botulism: CDC/Site n’ikike a natara Larry Stauffer, nke Ụlọ Ime Nnyocha Ahụ́ Ike Ọha na Eze nke Oregon State

Nje na-akpata ọnwụ ojii: Copyright Dennis Kunkel Microscopy, Inc.; nje na-akpata kịtịkpa: ©Meckes, Gelderblom, Eye of Science, Photo Researchers; onye na-arịa kịtịkpa: CDC/NIP/Barbara Rice

[Foto dị na peeji nke 23]

N’oge na-adịbeghị anya, akwụkwọ ozi ndị e tinyere ntakịrị nje “anthrax” kpaliri egwu zuru ebe nile

[Ebe E Si Nweta Foto]

AP Photo/Axel Seidemann

[Foto dị na peeji nke 23]

Bọmbụ ndị ụgbọelu na-atụ bụ́ ndị nwere mmiri ọgwụ nakwa nje ndị na-akpata ọrịa bụ́ ndị e bibiri mgbe a lụsịrị Agha Gulf

[Ebe E Si Nweta Foto]

AP Photo/MOD