Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

N’ihi Gịnị Ka Nne Ma Ọ Bụ Nna M Na-ejighị Hụ M n’Anya?

N’ihi Gịnị Ka Nne Ma Ọ Bụ Nna M Na-ejighị Hụ M n’Anya?

Ndị Na-eto Eto Na-ajụ, Sị . . .

N’ihi Gịnị Ka Nne Ma Ọ Bụ Nna M Na-ejighị Hụ M n’Anya?

“Tupu papa m agbaa mama m alụkwaghịm, anyị na-aga n’ụsọ mmiri, na-eri nri n’ụlọ oriri, ma na-eji ụgbọala ya aga ebe dị iche iche. E mesịa, ọ kwụsịrị kpam kpam. Papa m gbanwere. Ọ dị m ka ọ̀ gbahapụkwuru mụ onwe m.”—Karen. *

ỌNỤ ọgụgụ dị nnọọ ukwuu nke ndị na-eto eto na-enwe mmetụta yiri nke ahụ. Dị ka Karen, ọ na-adị ha ka nne ma ọ bụ nna ha ahụghịzi ha n’anya—ma ọ bụ na ọ dịbeghị mgbe ọ hụrụ ha n’anya. Anyị adịghị ekwu n’ebe a banyere iwe ndị na-adịghị adịte aka bụ́ ndị pụrụ ibilite n’etiti ndị ntorobịa na nne na nna ha n’ihi esemokwu nwa oge; anyị adịghịkwa ezo aka n’iwe na-ebilite mgbe ụfọdụ ná mmeghachi omume maka ịdọ aka ná ntị nne na nna. Kama nke ahụ, n’ọnọdụ ụfọdụ, ụta na-adịrị ndị nne na nna maka ileghara nnọọ ụmụ ha anya, ha adịghị elebara ha anya ma nye ha ịdọ aka ná ntị bụ́ ndị dị ha mkpa. N’ọnọdụ ndị ọzọ, a na-enwe usoro nke ajọ mmeso aka ike, ikekwe na-agụnye okwu ọjọọ ma ọ bụ iti ihe.

Ọ dịghị ihe na-akpata mmerụ ahụ́ mmetụta uche karịa mmadụ ịbụ onye nne ma ọ bụ nna ya jụrụ. “O mere ka m nwee mmetụta nke ịbụ onye a na-achọghị na onye a jụrụ ajụ,” ka Karen na-ekwu. Ọ bụrụ na ị nọtụwo n’ọnọdụ dị otú ahụ tara akpụ, tụlee aro ụfọdụ banyere otú ị pụrụ isi nagide mmetụta gị. Mara na ọ bụrụgodị na nne ma ọ bụ nna gị enyeghị gị nkwado, ị pụrụ inwe ihe ịga nke ọma ná ndụ!

Ịghọta Nne Gị Ma Ọ Bụ Nna Gị

Nke mbụ, o kwesịrị ekwesị ka ị tụọ anya ka nne gị ma ọ bụ nna gị hụ gị n’anya. Ịhụnnanya nne ma ọ bụ nna na-enwe n’ebe nwa ya nọ kwesịrị ịbụ nke e bu pụta ụwa na nke a pụrụ ịdabere na ya dị nnọọ ka ọwụwa nke anyanwụ. Chineke na-atụ anya ka ndị nne na nna na-egosipụta ịhụnanya dị otú ahụ. (Ndị Kọlọsị 3:21; Taịtọs 2:4) Ya mere, n’ihi gịnị ka ndị nne na nna na-eji eleghara ụmụ ha anya, na-agbahapụ ha, ma ọ bụ na-emegbu ha mgbe ụfọdụ?

Otu ihe na-eso akpata ya pụrụ ịbụ ahụmahụ ha onwe ha nwere ná ndụ. Jụọ onwe gị, sị, ‘Olee ebe nne na nna m mụtara otú e si azụlite ụmụaka?’ N’ọtụtụ ọnọdụ, ndị nne na nna pụrụ ịmụta ya n’aka nne na nna ha mgbe ha dị obere. N’ụwa anyị a nke siri ike, bụ́ nke e nwere ọnụ ọgụgụ na-enweghị atụ nke ndị “na-enweghị obi mmadụ,” ọzụzụ dị otú ahụ na-enwekarị ntụpọ dị ukwuu. (2 Timoti 3:1-5) Mgbe ụfọdụ, ihe na-esi na ya apụta bụ ajọ ihe na-akpata ọzọ, bụ́ ebe ndị nne na nna na-emegbu ụmụ ha otú e si megbuo ha.

Tụkwasị na nke ahụ, ọ pụrụ ịbụ na obi adịghị nne na nna ụtọ n’ihi ihe dịgasị iche iche. Ụfọdụ na-anwa ịgbanahụ nhụsianya na nkụda mmụọ site n’imikpu onwe ha n’ọrụ, n’ịṅụ mmanya na-aba n’anya, ma ọ bụ n’ịṅụ ọgwụ ọjọọ. Dị ka ihe atụ, William na Joan nwere nna bụ́ onye aṅụrụma mgbe ha na-etolite. “Ọ na-esiri nna m ike ịja anyị mma,” ka Joan na-ekwu. “Otú ọ dị, nke kasị njọ bụ iwe ọ na-ewe kemgbe ọ ṅụwara mmanya. Ọ na-abara nne m mba n’anyasị dum. Ụjọ na-atụkarị m.” Ọ bụrụgodị na ọ pụtaghị ìhè na nne na nna na-emeso ụmụ ha n’ụzọ dị njọ, akparamàgwà nne na nna pụrụ ime ka ha nwee nnọọ ike ọgwụgwụ igosi ụmụ ha ịhụnanya na mmasị dị ha mkpa.

William chere na ya ghọtara ihe kpatara nna ya ji akpa àgwà na-edoghị anya mgbe ụfọdụ. “Nna m toro na Berlin, Germany, n’oge Agha Ụwa nke Abụọ,” ka ọ na-akọwa. “N’oge ọ bụ nwa okoro, ọ hụrụ ọtụtụ ihe ndị na-emenye oké egwu ma hụ ọtụtụ ndị nwụrụ anwụ. Ọ ghaghị itinye ndụ ya n’ihe ize ndụ kwa ụbọchị nanị iji nweta ihe ọ ga-eri. Echere m na ihe nna m gabigara metụtara ya nke ukwuu.” N’eziokwu, Bible kwetara na ndị na-enweta ajọ mmegbu pụrụ ime omume mgbe ụfọdụ n’ụzọ ezi uche na-adịghị na ya.—Eklisiastis 7:7.

William na Joan hà chere na ihe nna ha gabigara mere ka ụta ghara ịdịrị ya maka ụzọ o si emeso ha? “Ee e,” ka William na-ekwu. “Ebe ọ nọ too adịghị eme ka oké aṅụrụma na àgwà ya na-adịghị mma zie ezi. Otú ọ dị, ịma banyere ya enyeworo m aka ịghọtakwu akparamàgwà nna m.”

Ịnakwere eziokwu ahụ bụ́ na nne na nna gị bụ ndị na-ezughị oké na ịmata banyere nzụlite ha pụrụ ime ihe dị ukwuu n’inyere gị aka ịghọta ha. Ilu 19:11 na-ekwu, sị: “Ezi uche mmadụ na-eme ka ọ ghara iwe iwe ọsọ ọsọ.”

Ịnagide Mmetụta Ị Na-enwe

E nwere mmetụta ndị ọzọ na-adịghị mma bụ́ ndị ị pụrụ inwe n’ihi ọnọdụ e nwere n’ụlọ unu. Dị ka ihe atụ, anya nne na nna Patricia na-adịghị elebara ya mere ka o nwee mmetụta nke ịbụ “onye na-abaghị n’ihe na onye a na-apụghị ịhụ n’anya.” O siiri LaNeisha ike ịtụkwasị ndị ikom obi n’ozuzu ha mgbe nna ya gbahapụsịrị ha n’oge ọ dị nanị afọ asatọ. Shayla bịaziri hụ na ya na-achọsi nnọọ ike ka ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ onye ọ bụla o zutere nwee mmasị n’ebe ọ nọ, nanị iji mechie oghere nne ya hapụrụ bụ́ onye “ọgwụ ọjọọ na-achịkwa” ndụ ya.

Iwe na ekworo pụkwara ịbụ nsogbu. Mgbe Karen hụrụ ka nna ya lụgharịrị nwunye na-egosi ezinụlọ ọhụrụ ya ịhụnanya, bụ́ nke ya onwe ya chọsiri ike, o mere ka o nwee “nnọọ ekworo n’otu oge.” Mgbe ụfọdụ, ọbụna Leilani chere na ya kpọrọ nne na nna ya asị. “Mụ na ha na-arụ ụka mgbe mgbe,” ka ọ na-ekwu.

Mmetụta ndị a nile kwere nghọta n’iburu n’uche ihe ndị kpatara ha. Otú ọ dị, olee otú ị pụrụ isi nagide mmetụta uche ndị dị otú ahụ na-ezighị ezi n’ụzọ ga-eme ka ihe ka mma? Tụlee aro ndị na-esonụ.

Bịaruo Jehova Nso. (Jems 4:8) Ị pụrụ ime nke ahụ site n’ọgụgụ Bible onwe onye nakwa iso ndị ya na-akpachi anya. Ka ị na-ahụ ụzọ Jehova si emeso ndị ọzọ ihe, ị ga-abịa mara na ọ bụ onye na-eguzosi ike n’ihe. Ị pụrụ ịtụkwasị ya obi. “Nwanyị, ọ̀ ga-echezọ nwa ya na-aṅụ ara, wee ghara inwe obi ebere n’ahụ́ nwa afọ ya?” ka Jehova jụrụ ụmụ Izrel. “Eleghị anya ndị a ga-echezọ, ma Mụ onwe m agaghị echezọ gị,” ka o kwere ná nkwa. (Aịsaịa 49:15) Ya mere na-ekpeku Chineke ekpere mgbe nile. Echegbula onwe gị banyere itinye okwu n’ebe ndị o kwesịrị kpọmkwem. Ọ na-aghọta ihe ị na-ekwu. (Ndị Rom 8:26) Ghọta na Jehova hụrụ gị n’anya ọbụna mgbe o yiri ka ọ dịghị onye ọzọ hụrụ gị n’anya.—Abụ Ọma 27:10.

Kọọrọ Onye Meworo Okenye Bụ́ Onye Ị Tụkwasịrị Obi. Mee ndị tozuru okè n’ụzọ ime mmụọ enyi. Kọọrọ ha mmetụta gị na nchegbu gị n’ezoghị ọnụ. N’ọgbakọ Ndị Kraịst nke Ndịàmà Jehova, ị pụrụ inweta ndị nne na nna ime mmụọ. (Mak 10:29, 30) Otú ọ dị, ọ pụrụ ịdị mkpa ka i bute ụzọ n’ịkọrọ ha ihe gị na ya na-alụ. Ndị ọzọ agaghị amata mmetụta ị na-enwe ọ gwụla ma ị gwara ha. Ahụ́ iru ala nke na-abịa site n’ibupụ ibu arọ n’obi gị pụrụ iwetara gị ezi nkasi obi.—1 Samuel 1:12-18.

Jiri Ọrụ n’Aka Site n’Imere Ndị Ọzọ Ihe. Iji zere ihe ize ndụ nke iruru onwe gị újú, gbalịa ịghara ịdị na-elekwasị anya n’akụkụ na-adịghị mma nke ọnọdụ gị. Kama nke ahụ, mụta inwe ekele maka ihe i nwere. Megheere onwe gị ohere dịgasị iche iche site ‘n’ilekwasị anya, ọ bụghị n’igosi mmasị onwe onye nanị n’ihe ndị metụtara gị, kamakwa n’igosi mmasị onwe onye n’ihe ndị metụtara ndị ọzọ.’ (Ndị Filipaị 2:4) Setịpụ ihe mgbaru ọsọ ime mmụọ, jirizie obi ike rụsie ọrụ ike iru ha. Ijere ndị ọzọ ozi n’ozi Ndị Kraịst bụ ụzọ magburu onwe ya isi nọgide na-elekwasị anya n’ebe ndị ọzọ nọ kama ilekwasị anya n’ebe onwe gị nọ.

Nọgide Na-akwanyere Nne na Nna Gị Ùgwù. Na-echeta mgbe nile ịgbasochi ụkpụrụ Bible anya. Nke ahụ na-agụnye ịsọpụrụ nne na nna gị. (Ndị Efesọs 6:1, 2) Nsọpụrụ dị otú ahụ ga-eme ka ị ghara inwe àgwà nke imegwara ihe. Cheta na ọ dịghị ókè ọ bụla i chere na nne ma ọ bụ nna gị mejọruru gị nke ga-eme ka i zie ezi imejọ ha. Ya mere hapụrụ Jehova okwu ahụ. (Ndị Rom 12:17-21) Ọ “na-ahụ ezi ikpe n’anya,” nweekwa mmetụta dị ike nke ichebe ụmụ ya. (Abụ Ọma 37:28; Ọpụpụ 22:22-24) Ka ị nọgidere na-akwanyere nne na nna gị ùgwù kwesịrị ekwesị, gbalịa ịzụlite mkpụrụ nke mmụọ nsọ Chineke—karịsịa, nke ịhụnanya.—Ndị Galeshia 5:22, 23.

Ị Pụrụ Inwe Ihe Ịga nke Ọma

Obi abụọ adịghị ya na enweghị ịhụnanya nke nne ma ọ bụ nna pụrụ ịkpata ihe mgbu. Ma ọ dịghị mkpa na ọdịda nne ma ọ bụ nna gị dara n’ime ihe ruuru ya ga-ekpebi ụdị mmadụ ị ga-aghọ. Ị pụrụ ịhọrọ inweta obi ụtọ na ihe ịga nke ọma site n’itinye ụkpụrụ Bible ndị e hotara n’elu n’ọrụ ná ndụ gị.

William, bụ́ onye e hotara ihe o kwuru na mbụ, bụ onye ọrụ afọ ofufo oge nile n’otu alaka ụlọ ọrụ nke Ndịàmà Jehova. Ọ na-ekwu, sị: “Jehova enyewo anyị ọtụtụ ngwá ọrụ iji nyere anyị aka ịnagide ọnọdụ ndị a dị njọ. Lee ihe ùgwù ọ bụ inwe Nna nke eluigwe na-ahụ n’anya otú ahụ!” Nwanne ya nwanyị, bụ́ Joan, bụ onye ozi ọsụ ụzọ oge nile, nke na-eje ozi n’ebe e nwere mkpa ka ukwuu maka ndị na-esiza ozi ọma. “Ka anyị na-etolite, anyị hụrụ ọdịiche pụtara ìhè ‘n’etiti onye na-efe Chineke na onye na-adịghị efe Ya,’” ka Joan kwuru. (Malakaị 3:18) “Ahụmahụ anyị mere ka anyị kpebisie ike ịlụrụ eziokwu ahụ ọgụ na ime ka ọ bụrụ nke anyị.”

Ị pụkwara inwe ihe ịga nke ọma dị otú ahụ. “Ndị ji anya mmiri agha mkpụrụ ga-eji iti mkpu ọṅụ wee ihe ubi,” ka Bible na-ekwu. (Abụ Ọma 126:5) Olee otú amaokwu ahụ si kwekọọ n’ihe a na-ekwu? Ọ bụrụ na ị rụsie ọrụ ike iji tinye ụkpụrụ ndị ziri ezi n’ọrụ n’ọnọdụ ndị tara akpụ, n’ikpeazụ, a ga-eji ọṅụ dochie anya mmiri gị mgbe ị malitere inweta ngọzi Chineke.

Ya mere, nọgide na-arụsi ọrụ ike n’ịbịarukwu Jehova Chineke nso. (Ndị Hibru 6:10; 11:6) Ọ bụrụgodị na i nwewo nchegbu, nkụda mmụọ, na obi amamikpe, mmetụta ndị a pụrụ iji nke nta nke nta pụọ ma bụrụ nke e ji “udo nke Chineke nke karịrị echiche nile” dochie.—Ndị Filipaị 4:6, 7.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 3 A gbanwewo aha ụfọdụ.

[Igbe dị na peeji nke 21]

Ọ̀ Na-adị Gị Ka . . .

• Ị bachaghị uru?

• Ọ̀ bụ ihe ize ndụ na nke ezi uche na-adịghị na ya ịtụkwasị ndị ọzọ obi?

• Ì nwere mkpa maka mmesighachi obi ike mgbe nile?

• Iwe ma ọ bụ ekworo gị ọ̀ gafeela ókè?

Ọ bụrụ na azịza gị nye ajụjụ ndị dị otú ahụ bụ ee, soro nne gị ma ọ bụ nna gị, onye okenye, ma ọ bụ enyi gị tozuru okè n’ụzọ ime mmụọ kwurịta ya ozugbo o kwere mee.

[Foto ndị dị na peeji nke 18]

Were nzọụkwụ ndị bara uru iji nagide mmetụta gị