Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Nne Ma Ọ Bụ Nna Nanị Ya Na-azụ Ụmụ, Ma Ọ Nọghị Nanị Ya

Nne Ma Ọ Bụ Nna Nanị Ya Na-azụ Ụmụ, Ma Ọ Nọghị Nanị Ya

Nne Ma Ọ Bụ Nna Nanị Ya Na-azụ Ụmụ, Ma Ọ Nọghị Nanị Ya

“Mgbe ụmụ m lọtara ma bie m ọma ma gwa m na ha hụrụ m n’anya, nke ahụ bụ akụkụ kasị mma nke ịbụ nne.”—DORIS, NNE NANỊ YA NA-AZỤ ỤMỤ ABỤỌ.

NDỊ nne ma ọ bụ nna nanị ha na-azụ ụmụ pụrụ inweta mmesighachi obi ike n’okwu Bible bụ́: “Ụmụ bụ ngọzi na onyinye sitere n’aka ONYENWE anyị.” (Abụ Ọma 127:3, Contemporary English Version) Mgbe a zụlitere ụmụaka n’ezinụlọ nwere nanị nne ma ọ bụ nna, ha adịghị adị ala karịa ndị ọzọ n’anya Chineke. Onye Okike anyị chọrọ ịhụ ka ezinụlọ ndị nwere nanị nne ma ọ bụ nna na-enwe ihe ịga nke ọma. Bible na-ekwu banyere ya, sị: “Nwa mgbei na nwanyị di ya nwụrụ ka Ọ na-eme ka ha guzo ọtọ.” (Abụ Ọma 146:9) Ndị nne ma ọ bụ nna nanị ha na-azụ ụmụ pụrụ ijide n’aka na Chineke dị njikere ịkwado ha.

Ọ bụ ihe ruuru nwatakịrị ịbụ onye a zụlitere na gburugburu ebe e nwere ịhụnanya, ebe dị nchebe bụ́ nke ga-enyere ya aka ito eto n’ụzọ anụ ahụ́, n’ụzọ mmetụta uche, nakwa n’ụzọ ime mmụọ. Ọ bụ ọrụ na ihe ùgwù dịịrị nne ma ọ bụ nna ọ bụla ịbụ onye Chineke ji eme ihe n’ịzụlite nwatakịrị.

Ọtụtụ ndị nne ma ọ bụ nna nanị ha na-azụ ụmụ achọpụtawo na ikpesi ekpere ike, itinye ụkpụrụ Bible n’ọrụ mgbe nile, na ịdabere n’ebe Jehova nọ kpam kpam, dị mkpa iji nwee ihe ịga nke ọma. Nke a kwekọrọ n’agbamume dị n’Abụ Ọma 55:22: “Tụkwasị Jehova ihe O nyeworo gị dị ka ibu, Ya onwe ya ga-anagidekwa gị.”

Site n’oge ruo n’oge, ndị nne na nna ochie, ndị okenye ọgbakọ, na ndị nne na nna nwere ahụmahụ n’ọgbakọ Ndị Kraịst pụrụ ịnọ ya iji nyere ezinụlọ nwere nanị nne ma ọ bụ nna aka ime ihe banyere ọnọdụ ndị tara akpụ. N’eziokwu, ndị òtù ezinụlọ na ndị ha na ha na-efekọ ofufe pụrụ inye nnọọ aka n’ịkwado ndị nne ma ọ bụ nna nanị ha na-azụ ụmụ, ma ibu ọrụ bụ́ isi Chineke nyere dị n’ubu ndị mụrụ nwatakịrị. *

N’ụzọ na-enye obi ụtọ, ọtụtụ ndị nne ma ọ bụ nna nanị ha na-azụ ụmụ enwewo ike ịnagide ihe ịma aka ndị pụrụ iche nke ọnọdụ ha na-eweta ma zụlite ụmụ ndị na-akpa ezi àgwà ma na-atụ egwu Chineke. Teta! sooro ọtụtụ n’ime ha kwurịta okwu. Nke a bụ ụfọdụ n’ime ihe ndị nne ma ọ bụ nna ndị a nwekọrọ ọnụ:

• Ilekọta ezinụlọ n’ụzọ na-aga nke ọma. Ndị nne ma ọ bụ nna nanị ha na-azụ ụmụ, bụ́ ndị na-enwe ihe ịga nke ọma na-agbalịsi ike ịbụ ndị haziri ndụ ha nke ọma ma na-arụsi ọrụ ike n’ịhazi usoro ihe omume ha. Ime atụmatụ na ịhazi ihe nke ọma dị oké mkpa. Bible na-ekwu, sị: “Echiche nile nke onye dị nkọ na-eduba nanị n’uru.”—Ilu 21:5.

• Itinye uche n’ibu ọrụ. Ndị nne ma ọ bụ nna nanị ha na-azụ ụmụ bụ́ ndị na-enwe ihe ịga nke ọma na-eme ka ndụ ezinụlọ ha bụrụ otu n’ime ihe ndị ha na-ebute ụzọ. Ha na-elekwasị anya n’ibute mkpa nke ụmụ ha ụzọ tupu nke ha.—1 Timoti 5:8.

• Ụzọ ime ihe nke kwesịrị ekwesị. Ndị nne ma ọ bụ nna nanị ha na-azụ ụmụ bụ́ ndị na-enwe ihe ịga nke ọma adịghị eme ka nsogbu yie obere ihe ma ọ bụ oké ihe; ha na-achọ ihe ngwọta. Ha na-anakwere ihe isi ike ma gbalịa imeri ha n’erughịrị onwe ha újú ma ọ bụ na-enwe obi ilu.

• Ezi nkwurịta okwu. Ndị nne ma ọ bụ nna nanị ha na-azụ ụmụ bụ́ ndị na-enwe ihe ịga nke ọma na-akwalite nkwurịta okwu. Ha na-akwalite nkwupụta echiche na mmetụta n’ụzọ doro anya nakwa n’ezochighị ihe ọ bụla n’ime ezinụlọ. Otu nna nanị ya na-azụ ụmụ kwuru banyere ụmụ ya, sị: “Ana m agwa ha okwu n’ohere ọ bụla dapụtaranụ. Anyị na-enwe ‘mmekọrịta chiri anya’ mgbe anyị na-akwadebe nri anyasị. Ọ bụ mgbe ahụ ka ha na-agwa m ihe nzuzo ha n’ezie.”

• Ilekọta onwe onye. N’agbanyeghị oge ọ na-ewe, ndị nne ma ọ bụ nna nanị ha na-azụ ụmụ bụ́ ndị na-enwe ihe ịga nke ọma na-aghọta na igbo mkpa ime mmụọ, nke mmetụta uche, na nke anụ ahụ́ nke ha onwe ha dị mkpa. Ethel, bụ́ nne a gbara alụkwaghịm nke nanị ya na-azụ ụmụ abụọ, kọwara, sị: “Ana m agbalị iwepụtara onwe m oge. Dị ka ihe atụ, mgbe otu enyi m na-akụziri ụmụ m egwú, nke ahụ na-enye m otu awa iji lebara onwe m anya. Ana m anọdụ ala n’agbanyeghị TV agbanye.”

Inwe nchekwube. Ndị nne ma ọ bụ nna nanị ha na-azụ ụmụ bụ́ ndị na-enwe ihe ịga nke ọma na-anọgide na-ele ịzụ ụmụ na ndụ n’ozuzu ya anya n’ụzọ ziri ezi. Ha na-ahụ akụkụ ndị dị mma n’ọnọdụ ndị na-akpata nrụgide. Otu nne nanị ya na-azụ ụmụ kwuru, sị: “Amatawo m na ịbụ nne nanị ya na-azụ ụmụ abụchaghị ihe na-akụda mmụọ.”

Ndị Nwere Ihe Ịga nke Ọma

Ụkpụrụ ndị a hà dị irè? Ee, dị ka a pụrụ ịhụ site n’ọtụtụ akụkọ banyere ndị nne ma ọ bụ nna nanị ha na-azụ ụmụ bụ́ ndị nwere ihe ịga nke ọma. Gloria, bụ́ nne a gbara alụkwaghịm nọ n’England nke nanị ya na-azụ ụmụ, bụrụkwa onye na-arụ ọrụ, bụ́ onye a kpọtụrụ aha n’isiokwu nke mbụ, zụlitere ụmụ ndị ikom abụọ na otu nwanyị. Ha atọ tolitechara ma ghọọ Ndị Kraịst bụ́ ndị ozi oge nile, na-etinye ndụ ha n’ịkwalite mmụta Bible. Mgbe a jụrụ ya otú o si nwee ihe ịga nke ọma, Gloria kọwara, sị: “Ihe ịma aka mbụ m nwere bụ ịnọgide na-eduzi ọmụmụ ihe ezinụlọ chiri anya ma na-akpali mmasị. Achọrọ m ka ụmụ m nwee obi ụtọ, ka ha nwee obi iru ala, ka ha na-enwe afọ ojuju, ka e chebekwa ha pụọ n’ọnyà. Achọtara m ọrụ abalị. Nzube m bụ ka mụ na ụmụ m na-anọ mgbe ọ bụla o kwere m mee. Tupu mụ agaa ọrụ, anyị na-ekpe ekpere dị ka ezinụlọ, mụ enyiwekwa ha n’ihe ndina. Nwanne nne m nke nwanyị na-anọ n’ụlọ ma m gaa ọrụ.”

Olee otú Gloria si nyere ụmụ ya aka ibute ihe ndị kwesịrịnụ ụzọ? Ọ gara n’ihu ikwu, sị: “Nzube m kasịnụ bụ ibute ihe ime mmụọ ụzọ. Anyị enweghị nnukwu ego, ezoghịrị m ya ụmụ m ezo. Ihe ọ bụla m gwara ha mee ka m na-eme n’onwe m, ha nile na-akwadokwa m.” N’icheta otú o si nwee ezinụlọ dị n’otu, Gloria kwuru, sị: “Isi ihe kpatara ya bụ imekọ ihe ọnụ. Ọ dịghị onye na-anọpụrụ onwe ya iche n’ọnụ ụlọ nke ya. Anyị na-ejikọ aka esi nri, na-ehicha ihe, ma na-achọ ụlọ mma. Anyị mere ka ihe ndị anyị na-eme dị otú kwesịrị ekwesị. Ana m ahụ mgbe nile na anyị nwekwara ntụrụndụ.”

Carolyn, bụ́ nne nanị ya na-azụ nwata nwoke aha ya bụ́ Joseph, nwere obi ụtọ n’ụzọ o si eto. Olee ụzọ o si mee ya? “Anyị na-agụkọ Bible ọnụ n’oge anyị na-alakpu ụra,” ka ọ na-ekwu, “mgbe ahụ ana m ajụ ya ajụjụ banyere ihe ndị ọ mụtaworo. Tụkwasị na nke ahụ, anyị na-atụle paragraf ụfọdụ a họtara n’akwụkwọ ndị dabeere na Bible ma kwuo ebe ndị o metụtara anyị. Nke a na-enyere Joseph aka mgbe o chere nsogbu ihu, dị ka ụmụ akwụkwọ na-achọ okwu.” Carolyn kwetara na ndụ adịghịrị ya mfe n’ezie, ma ọ dịghị eche na ọ nọ nanị ya. O kwuru, sị: “Ọ bụ ndọlị na-aga n’ihu, ma echere m na Jehova enyeworo m aka n’ezie. Ana m enwetakwa agbamume dị ukwuu n’ọgbakọ Ndị Kraịst.”

Akụkọ banyere ọtụtụ puku ndị nne ma ọ bụ nna nanị ha na-azụ ụmụ bụ́ ndị nwere ihe ịga nke ọma, ndị dị ka Gloria na Carolyn, na-egosi na ndị nne na nna taa pụrụ ịdabere n’ụkpụrụ Bible ndị a nwapụtaworo eri oge iji zụlite ezigbo ụmụ ndị siri ike n’ụzọ ime mmụọ. (Ilu 22:6) O kwere omume inwe ihe ịga nke ọma! Mmadụ ịzụ ụmụ nanị ya na-eweta ọtụtụ ihe ịma aka bụ́ ndị na-emeghe ohere maka uto na ikerịta ihe. Ịdabere kpam kpam n’ebe Chineke nọ na ikwenye na ọ ga-enye aka bụ ụzọ kasị mma isi nagide nrụgide nile nke ịbụ nne ma ọ bụ nna nanị ya na-azụ ụmụ.—Abụ Ọma 121:1-3.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 6 Iji nwetakwuo ihe ọmụma banyere otú ndị nne ma ọ bụ nna nanị ha na-azụ ụmụ pụrụ isi nwee ihe ịga ọma, lee Isi Ihe Na-akpata Obi Ụtọ Ezinụlọ, isi nke 9, nke Ndịàmà Jehova bipụtara.

[Foto ndị dị na peeji nke 11]

Ọmụmụ Bible ezinụlọ enyeworo ụmụ Gloria atọ aka ịghọ Ndị Kraịst bụ́ ndị ozi oge nile. N’ebe a, ha na-ele akwụkwọ ozi sitere n’aka nwa ya nwoke kasị okenye na foto ya, bụ́ onye na-eje ozi ugbu a dị ka onye ozi ala ọzọ

[Foto ndị dị na peeji nke 12]

Carolyn na nwa ya nwoke, bụ́ Joseph