À Ga-akwụsị Ọrịa AIDS? Ọ Bụrụ Otú ahụ, Ọ̀ Bụ n’Ụzọ Dị Aṅaa?
À Ga-akwụsị Ọrịa AIDS? Ọ Bụrụ Otú ahụ, Ọ̀ Bụ n’Ụzọ Dị Aṅaa?
RUO oge ụfọdụ, e nwewo ọtụtụ ndị ná mba Africa ụfọdụ bụ́ ndị na-ekwetaghị na ọrịa AIDS dị adị. Ọ bụ isiokwu ụfọdụ ndị na-agaghị achọ ikwurịta. Otú ọ dị, n’afọ ndị na-adịbeghị nnọọ anya, e mewo mgbalị ịkụziri karịsịa ndị na-eto eto banyere ya nakwa ịgba ume ka a na-enwe ezi nkwurịta okwu banyere ya. Mgbalị ndị a enwewo ihe ịga nke ọma a kpaara ókè. Ụzọ ndụ na omenala ndị mmadụ gbanyesiri mkpọrọgwụ ike, o sikwara ike ịgbanwe ya.
Ọganihu Nkà Mmụta Ọgwụ
A bịa na nkà mmụta ọgwụ, ndị ọkà mmụta sayensị amụtawo ihe dị ukwuu banyere nje HIV, ha emepụtawokwa ọgwụ ndị gbatịworo ndụ ọtụtụ ndị. E jiriwo ngwakọta nke ma ọ dịkarịa ala ụdị ọgwụ atọ ndị na-alụso nje retrovirus ọgụ, bụ́ nke a kpọrọ usoro ọgwụgwọ na-akpa oké ike n’ịlụso nje retrovirus ọgụ, mee ihe n’ụzọ dị irè.
Ọ bụ ezie na ọgwụ ndị a adịghị agwọ ya agwọ, ha enwewo ihe ịga nke ọma n’ibelata ọnụ ọgụgụ ndị bu nje HIV na-anwụnụ, karịsịa ná mba ndị mepere emepe. Ọtụtụ ndị na-eme ka mkpa ọ dị inye
mba ndị ka na-emepe emepe ọgwụ ndị a pụta ìhè. Otú ọ dị, ọgwụ ndị ahụ dị oké ọnụ, ihe ka ọtụtụ ná ndị nọ n’ala ndị a enweghịkwa nnọọ ego ha ga-eji azụrụ ha.Nke a ewelitewo ajụjụ bụ́: Uru ego ọ̀ dị mkpa karịa ndụ mmadụ? Onye ntụzi ọrụ nke usoro ihe omume Brazil banyere HIV/AIDS, bụ́ Dr. Paulo Teixeira kwetara na e nwere ọnọdụ dị otú ahụ: “Anyị apụghị ịhapụ ọtụtụ puku mmadụ ka ha nọrọ n’enweghị enyemaka n’ihi enwetaghị ọgwụ ndị pụrụ ime ka ha dịgide ndụ, nanị iji rite uru ndị karịrị nnọọ nke a na-eritekarị.” Ọ gbakwụnyere, sị: “Ana m enwe nnọọ nchegbu na a pụrụ ibute uru ahịa ụzọ kama ibute omume ọma na ichebara ndị mmadụ echiche ụzọ.”
Mba ole na ole ekpebiwo ileghara ikike ụfọdụ ụlọ ọrụ ukwu ndị na-emepụta ọgwụ nwere imepụta na ire ọgwụ ndị ahụ nanị ha anya ma mepụta ma ọ bụ tụbata ụfọdụ ụdị ha a na-edeghị aha ụlọ ọrụ mmepụta ọgwụ ọ bụla n’ọnụ ego dị nnọọ ala karị. * Dị ka otu nnyocha gosiri, “a chọpụtara na ọnụ ego ndị kasị ala [nke ọgwụ ndị na-ebughị aha ụlọ ọrụ mmepụta ọgwụ ọ bụla] ji 82% dị ala karịa ọnụ ego ndị mba United States setịpụrụ,” ka magazin bụ́ South African Medical Journal na-akọ.
Ihe Mkpọbi Ụkwụ E Nwere n’Ọgwụgwọ
Ka oge na-aga, ụlọ ọrụ ndị na-emepụta ọgwụ bụ́ ndị buru ibu malitere inye mba ndị ka na-emepe emepe, bụ́ ndị ọ dị mkpa, ọgwụ ọrịa AIDS n’ọnụ ego ndị dị nnọọ ala. A bịara nwee olileanya na n’ụzọ dị otú a, ọtụtụ mmadụ karị pụrụ iji ọgwụ ndị ahụ na-eme ihe. Otú ọ dị, e nwere ihe mkpọbi ụkwụ ndị bụ́ isi a ga-emeri iji mee ka ọgwụ ndị dị otú ahụ ruo ala ndị ka na-emepe emepe aka. Otu n’ime ha bụ ọnụ ego ha. Ọbụna n’ọnụ ego ndị e gbudatara nnọọ egbudata, ọgwụ ndị ahụ ka dị nnọọ oké ọnụ nye ihe ka ọtụtụ ná ndị ọ dị mkpa.
Nsogbu ọzọ bụ na ọ dịghị adị mfe inye ọgwụ ndị ahụ. A ghaghị ịṅụ ọtụtụ mkpụrụ kwa ụbọchị, n’oge ndị a kapịrị ọnụ. Ọ bụrụ na a ṅụghị ha n’ụzọ kwesịrị ekwesị ma ọ bụ ọ bụrụ na a kwụsị usoro ịṅụ ọgwụ ndị ahụ, nke a pụrụ iduga n’inwe ụdị nje HIV ndị na-eguzogide ọgwụ. O siri ike ijide n’aka na ndị ọrịa na-anọgide na-aṅụ ọnụ ọgụgụ mkpụrụ ọgwụ kwesịrị ekwesị n’ọnọdụ ndị e nwere n’Africa, bụ́ ebe a pụrụ inwe obere nri, mmiri dị ọcha na-ezughị ezu, na ụlọ ọgwụ ole na ole.
Ọzọkwa, a ghaghị ilegide ndị na-aṅụ ọgwụ ahụ anya. Ọ bụrụ na nje ndị ahụ amalite iguzogide ọgwụ ndị ahụ, a ghaghị ịgbanwe ngwakọta ọgwụ ndị a na-enye ha. A chọrọ ndị ọrụ ahụ́ ike maara nke a na-akọ iji mee nke a, ile ahụ́ ndị a na-eme maka ya na-adịkwa oké ọnụ. Ọzọkwa, ọgwụ ndị ahụ na-enwe mmetụta ndị na-adịghị mma, e nwewakwala ụdị nje virus ndị na-eguzogide ọgwụ.
Na June 2001, ná nnọkọ pụrụ iche nke Nzukọ Ezumezu nke òtù UN nwere maka ọrịa AIDS, e mere atụmatụ inwe Akpa Ego Ụwa Nile Maka Ahụ́ Ike iji nyere mba ndị ka na-emepe emepe aka. E mere atụmatụ na a chọrọ ego dị n’agbata ijeri $7 na ijeri $10. Ngụkọta nke nkwa ego e kwere erutụghịdị nnọọ ego ole e mere atụmatụ ya.
Ndị ọkà mmụta sayensị na-enwe olileanya siri ike na ha ga-achọpụta ọgwụ a ga-eji gbochie ya, a na-anwalekwa ndị dịgasị iche iche ná mba dị iche iche. Ọ bụrụgọdị na mgbalị ndị a agaa nke ọma, ọ ga-ewe ọtụtụ afọ tupu a chọpụta ọgwụ a ga-eji gbochie ya, nwalee ya, ma nwapụta ma ọ́ gaghị adị ize ndụ iji ya na-eme ihe n’ebe nile.
Mba ụfọdụ, ndị dị ka Brazil, Thailand, na Uganda, enwewo ọganihu pụtara ìhè n’usoro ọgwụgwọ ha. Site n’iji ọgwụ ndị ha mepụtara ná mba ha mee ihe, Brazil ebelatawo ọnụ ọgụgụ ndị ọrịa AIDS na-egbu okpukpu abụọ. Obere mba bụ́ Botswana, bụ́ nke nwere ego iji mee ya, na-etinye mgbalị ime ka ọgwụ ndị na-alụso nje retrovirus ọgụ ruo ndị nile chọrọ ya ná mba ahụ aka, ọ na-agbalịkwa iwu ebe ndị a na-elekọta ahụ́ ike bụ́ ndị dị oké mkpa.
Imeri Ọrịa AIDS
Ọrịa AIDS dị iche n’ebe ọrịa ndị ọzọ na-efe efe dị n’otu ụzọ dị mkpa: A pụrụ izere ya ezere. Ọ bụrụ na ndị mmadụ dị njikere ịgbaso ụkpụrụ ndị bụ́ isi nke Bible, ha pụrụ n’ọtụtụ ọnọdụ, ma ọ bụrụ na ọ bụghị n’ọnọdụ nile, izere ibute ya.
Ụkpụrụ omume Bible doro anya. Ndị na-alụbeghị di ma ọ bụ nwunye kwesịrị izere inwe mmekọahụ. (1 Ndị Kọrint 6:18) Ndị lụrụ di ma ọ bụ nwunye kwesịrị ịdị na-ekwesị ntụkwasị obi nye di ma ọ bụ nwunye ha ma ghara ịkwa iko. (Ndị Hibru 13:4) Irube isi na ndụmọdụ Bible bụ́ izere ọbara na-enyekwa aka echebe mmadụ.—Ọrụ 15:28, 29.
Ndị buteworo ya pụrụ inweta ọṅụ na nkasi obi dị ukwuu site n’ịmụ banyere ụwa nke ọrịa na-agaghị adị na ya bụ́ nke Chineke kwere ná nkwa maka ọdịnihu dị nso nakwa site n’ime ihe ndị Chineke chọrọ.
Bible na-emesi anyị obi ike na n’ikpeazụ, nhụjuanya nile nke ihe a kpọrọ mmadụ, gụnyere ọrịa, ga-abịa ná njedebe. E kwere nkwa a n’akwụkwọ Mkpughe: “M wee nụ ka otu oké olu si n’ocheeze ahụ na-asị: ‘Lee! Ụlọikwuu nke Chineke na-adịnyere ihe a kpọrọ mmadụ, ya na ha ga-ebikwa, ha ga-abụkwa ndị nke ya. Chineke n’onwe ya ga-anọnyekwara ha. Ọ ga-ehichapụkwa anya mmiri ọ bụla n’anya ha, ọnwụ agaghị adị ọzọ, iru újú ma ọ bụ mkpu ákwá ma ọ bụ ihe mgbu agaghịkwa adị ọzọ. Ihe mbụ agabigawo.’”—Mkpughe 21:3, 4.
Mmesi obi ike ahụ adịrịghị nanị ndị pụrụ ịzụtali ọgwụ ndị dị oké ọnụ. E mesighachiri nkwa ahụ e buru n’amụma ná Mkpughe isi nke 21 ike n’Aịsaịa 33:24: “Onye obibi ya agaghị asị, Ana m arịa ọrịa.” Mgbe ahụ, ndị nile bi n’elu ala ga-agbaso iwu Chineke, ha ga-enwekwa ahụ́ ike zuru ezu. Ya mere, a ga-akwụsị mgbasa na-egbu egbu nke ọrịa AIDS—na ọrịa nile ọzọ—ruo mgbe ebighị ebi.
[Ihe e dere n’ala ala peeji]
^ par. 7 Ọgwụ ndị a na-edeghị aha ụlọ ọrụ mmepụta ọgwụ ọ bụla bụ ọgwụ ndị e mepụtara site na nke ụlọ ọrụ ndị ọzọ na-emepụta ọgwụ bụ́ ndị e nyere ikike imepụta ha. Mba ndị so n’Òtù Na-ahụ Maka Azụmahịa Ụwa pụrụ ileghara ikike ụlọ ọrụ ndị na-emepụta ọgwụ nwere imepụta na ire otu ụdị ọgwụ nanị ha anya n’ụzọ iwu kwadoro n’ọnọdụ ndị chọrọ ime ihe ngwa ngwa.
[Igbe/Foto ndị dị na peeji nke 9, 10]
NKE A BỤ EZI ỌGWỤGWỌ M NỌ NA-ACHỌ
Ebi m n’ebe ndịda Africa, adịkwa m afọ 23. Echetara m ụbọchị m chọpụtara na ebu m nje HIV.
Mụ na nne m nọ n’ọnụ ụlọ a na-ahụ dọkịta mgbe dọkịta ahụ gwara m ya. Ọ bụ ihe kasị ewute ewute m nụtụrụla ná ndụ m. Ụwa gbara m gharịị. Ekwetalighị m ya. Echere m na ma eleghị anya, ụlọ nnyocha ahụ́ ahụ emetaghị nnyocha ahụ. Amaghị m ihe m ga-ekwu ma ọ bụ mee. Ọ dị m ka m bewe ákwá, ma anya mmiri ekweghị apụta. Dọkịta ahụ na nne m kwurịtawara banyere ọgwụ ndị na-alụso nje retrovirus ọgụ na ihe ndị ọzọ, ma ibobo wụrụ m nnọọ n’ahụ́ nke na apụghị m ịghọta ihe ọ bụla.
Aghọtara m na otu onye nọ na mahadum m na-agụ akwụkwọ na ya pụrụ ibunyewo m nje ahụ. Achọsiri m nnọọ ike ịgwa onye pụrụ ịghọta ọnọdụ m okwu, ma ọ dịghị onye m chetara. Amalitere m inwe mmetụta nke onye na-abaghị n’ihe na nke onye dara ada. Ọ bụ ezie na ezinụlọ m nyere m nkwado, echere m na olileanya adịrịghị m, ụjọ tụwakwara m. Dị ka onye ntorobịa ọ bụla ọzọ, enwere m ọtụtụ atụmanya. Ọ fọdụrụ nanị afọ abụọ ka m gụchaa akwụkwọ ma nweta akara ugo mmụta bachelor nke sayensị, ma olileanya ahụ kụrụ afọ n’ala.
Amalitere m ịṅụ ọgwụ ndị na-alụso nje retrovirus ọgụ bụ́ ndị a sịrị ka m na-aṅụ, gakwurukwa ndị na-enye ndụmọdụ banyere ọrịa AIDS, ma anọgidere m na-enwe ịda mbà n’obi. Ekpegaara m Chineke ekpere ka o gosi m ezi Iso Ụzọ Kraịst tupu mụ anwụọ. Abụ m onye òtù nke otu n’ime chọọchị Pentikọstal, ma ọ dịghị onye ọ bụla si na chọọchị ahụ bịadịrị ọbụna leta m. Achọrọ m ịmara eziokwu banyere ebe m ga-aga mgbe m nwụsịrị.
Otu ụtụtụ ná mmalite August 1999, mmadụ abụọ n’ime Ndịàmà Jehova kụrụ aka n’ọnụ ụzọ m. Ọrịa jisiri m aka ike n’ụbọchị ahụ, ma ejisiri m ike bilite ma nọrọ ọdụ na palọ. Ndị inyom abụọ ahụ kọwara onwe ha ma kwuo na ha na-enyere ndị mmadụ aka ịmụ Bible. Lee obi iru ala m nwere ịhụ ka a zara ekpere m n’ikpeazụ. Ma n’oge ahụ, enweghị m nnọọ ume nke na apụghị m ịgụ ihe ma ọ bụ tinye uche n’ihe ruo ogologo oge.
Ka o sina dị, agwara m ha na m chọrọ ịmụ Bible, mụ na ha yikwara agba. N’ụzọ dị mwute, tupu oge ahụ eruo, a kpọgara m n’ụlọ ọgwụ a na-agwọ ndị isi mgbaka n’ihi ịda mbà n’obi m. Alọtara m mgbe izu atọ gasịrị ma nwee obi iru ala mgbe m chọpụtara na Ndịàmà ahụ echefubeghị m. Echetara m na otu n’ime ha nọgidere na-akpọtụrụ m iji mata otú m mere. Agbaketụrụ m ma malite ịmụ Bible ná ngwụsị nke afọ ahụ. Otú ọ dị, ọ dịghịrị m mfe n’ihi na ahụ́ ike m nọ na-eme ya dịtụ mma ya akakwa njọ. Ma onye nọ na-amụrụ m ihe ghọtara ọnọdụ m ma nwee ndidi.
Enwere m mkpali dị ukwuu mgbe m mụrụ banyere Jehova na àgwà ya dị iche iche n’ime Bible, nakwa ihe ọ pụtara n’ezie bụ́ ịmara ya na ịtụ anya ndụ ebighị ebi. Na nke mbụ ya, aghọtakwara m ihe mere mmadụ ji ata ahụhụ. O wetaara m ọṅụ dị ukwuu ịmụ banyere Alaeze Chineke, bụ́ nke ga-anọchi ọchịchị nile nke ụmụ mmadụ n’oge na-adịghị anya. Ọ kpaliri m ịgbanwe ụzọ ndụ m kpam kpam.
Nke a bụ ezi ọgwụgwọ m nọ na-achọ. Lee ka o si bụrụ ihe na-akasi obi ịmara na Jehova ka hụrụ m n’anya ma na-elekọta m! Echeburu m na Chineke kpọrọ m asị nakwa na ọ bụ n’ihi nke a ka m ji bute ọrịa a. Ma amụtara m na Jehova ji ịhụnanya mee ndokwa maka mgbaghara mmehie ná ndabere nke àjà mgbapụta Jizọs Kraịst. Amataziri m na Chineke na-echebara anyị echiche, dị ka 1 Pita 5:7 na-ekwu: “Na-atụkwasị nchegbu nile unu n’ebe ọ nọ, n’ihi na ọ na-eche banyere unu.”
Site n’ịmụ Bible kwa ụbọchị na ịga nzukọ n’Ụlọ Nzukọ Alaeze, ana m agbalịsi nnọọ ike ịbịaru Jehova nso otú m nwere ike. Ọ bụ ezie na ọ dịbeghịrị m mfe mgbe nile, ana m awụkwasị Jehova nchegbu m nile n’ekpere ma na-arịọ ka o nye m ume na nkasi obi. Ndị òtù ọgbakọ dịkwa njikere inyere m aka, ya mere enwere m obi ụtọ.
Ana m eso ọgbakọ anyị ekere òkè mgbe nile n’ọrụ izisa ozi ọma. Achọrọ m inyere ndị ọzọ aka n’ụzọ ime mmụọ, karịsịa ndị nọ n’ọnọdụ yiri nke m. E mere m baptizim na December 2001.
[Foto]
O nyere m ọṅụ dị ukwuu ịmụta banyere Alaeze Chineke
[Foto dị na peeji nke 8]
Ìgwè na-enye ndụmọdụ banyere ọrịa AIDS na Botswana
[Foto dị na peeji nke 10]
N’ụwa Paradaịs ahụ, mmadụ nile ga-enwe ahụ́ ike zuru ezu