Ònye Ga-eweta Udo Na-adịgide Adịgide?
Ònye Ga-eweta Udo Na-adịgide Adịgide?
GỊNỊ mere Chineke azabeghị ekpere ndị ndú okpukpe dị iche iche nke ụwa kpere? Bible na-enye azịza na-akpali akpali. Ọ bụghị na Chineke enweghị mmasị n’udo—o nwere ọchịchọ siri ike maka udo karịa ndị ụkọchukwu ahụ na-ekpe ekpere maka ya. N’eziokwu, Chineke emeworị ndokwa doro anya iji weta udo n’ụwa. O meworị ihe ndị dị mkpa iji mezuo nzube ahụ. O mewo ka ihe a kpọrọ mmadụ mara banyere nzube ya n’ụzọ doro anya. Otú ọ dị, n’ụzọ dị mwute, okpukpe ndị dị n’ụwa elegharawo ihe Chineke kwuru anya n’ụzọ dị ukwuu.
Ogologo oge gara aga, Chineke kwere nkwa maka “mkpụrụ,” onye ọchịchị, bụ́ onye Bible nyere nkọwa banyere ya nke nta nke nta, na-enyekwu ihe ọmụma banyere onye ọ ga-abụ. (Jenesis 3:15; 22:18; 49:10) Aịzaịa onye amụma, bụ́ onye a maara maka amụma ndị dị ịrịba ama o buru banyere Mezaịa, dere na Onye Ndú a e buru n’amụma ga-aghọ “Onyeisi Udo” n’ụwa nakwa na n’oge ọchịchị ya, ọ dịghị ‘ọgwụgwụ ọ bụla udo Ya ga-agwụ.’ (Aịsaịa 9:6, 7) Dị ka Onye Ọchịchị eluigwe, ọ ga-eme ihe iji kpochapụ ajọ omume na iji mee ka ụwa ghọọ paradaịs, ikpe na-ezighị ezi, ọrịa, ịda ogbenye, ma ọ bụ ọnwụ agaghịzi adị. Udo na ndụ agwụghị agwụ ga-adịgide. (Abụ Ọma 72:3, 7, 16; Aịsaịa 33:24; 35:5, 6; Daniel 2:44; Mkpughe 21:4) Olee mgbe nke a ga-eme?
Udo Ụwa Dị Nso
Jizọs gwara ndị na-eso ụzọ ya na a ga-ebu ụzọ nwee ọtụtụ ihe omume dị ịrịba ama ndị ga-eme ka ụwa maa jijiji, bụ́ ndị ga-eme n’otu oge, tupu ajọ usoro ihe a abịa ná njedebe, e wee nwee ọha mmadụ ọhụrụ. (Matiu 24:3, 7-13) Site n’oge ruo n’oge, e nwewo ọtụtụ n’ime ihe omume ndị a—agha, ụkọ nri, ala ọma jijiji, iji hota nanị ole na ole—n’ọgbọ ọ bụla. Ma, ọ dịbeghị mgbe ọ bụla ihe a kpọrọ mmadụ nwere ha nile n’otu oge n’ụwa nile dị ka e nwere ha n’ọgbọ anyị a. Mmetụta nke ọdachi ndị dị otú ahụ na-enwe na-adịkwa njọ ugbu a karịa ka ha na-adịbu n’ihi na ụwa jupụtara ná ndị mmadụ karị.
Ihe omume ọzọ Bible buru n’amụma bụ mbibi na-aga n’ihu nke ihe a kpọrọ mmadụ na-ebibi Mkpughe 11:18) Ọzọkwa, tupu ọgwụgwụ ahụ e buru n’amụma abịa, a ghaghị ịrụzu ọrụ ịdọ aka ná ntị n’ụwa nile, bụ́ nkwusa nke ‘ozi ọma nke alaeze ahụ.’ Taa, Ndịàmà Jehova na-arụ ọrụ ahụ n’ụwa nile.—Matiu 24:14.
gburugburu ebe obibi. (Mmezu nke amụma ndị ahụ bụụrụ ihe a kpọrọ mmadụ na-ekwesị ntụkwasị obi ozi ọma. Ụwa ọhụrụ e buru n’amụma nke a ga-enwe udo zuru ezu na ya dị nso! Nke ahụ ga-eme ka ịkpọasị na iyi ọha egwu pụọ n’anya kpam kpam. Bible na-akọwa, sị: “Ha agaghị eme ihe ọjọọ, ha agaghị ebibikwa, n’ugwu nsọ m nile: n’ihi na ihe ọmụma Jehova ga-ejupụta ụwa, dị ka mmiri si ekpuchi oké osimiri.”—Aịsaịa 11:9.
Ekpere Ndị Chineke Na-anụ
Ikpegara Chineke ekpere abụghị ihe efu ma ọ bụ ememe na-enweghị isi ma ọlị. Na Bible, a kpọrọ Jehova “Onye na-anụ ekpere.” (Abụ Ọma 65:2) N’ihi ya, n’oge ọ bụla, ọ na-ege ntị n’ọtụtụ ekpere ndị nwere obi eziokwu nọ n’ụwa na-ekpe. Otú ọ dị, ọ̀ dị ihe ndị a ga-achọrịrị ka mmadụ mee ka ekpere ya wee bụrụ nke a ga-anụ? Bible na-egosi na ọ dị mkpa ka ndị nwere obi eziokwu bụ́ ndị na-amụ eziokwu Bible banyere Chineke mee ihe ndị a, wee ghọọ “ndị na-efe ezi ofufe,” bụ́ ndị na-efe ya “n’ime mmụọ na n’eziokwu.” (Jọn 4:23) Ọ dịghị aza ekpere nke ndị na-adịghị eme uche ya: “Onye na-ewezụga ntị ya n’ịnụ iwu [Chineke], ọbụna ekpere ya bụ ihe arụ.”—Ilu 28:9.
N’ụzọ dị mwute, ọtụtụ ndị ndú okpukpe taa adịghị ezi ma ọ bụ na-ekpe ekpere banyere nzube Chineke maka iweta udo. Kama nke ahụ, ha na-arịọ ka ọchịchị ụmụ mmadụ gwọta nsogbu ndị dị otú ahụ, ebe ọ bụkwanụ na Okwu Chineke kwuru n’ụzọ doro anya na “ọ bụghị onye ọ bụla nke na-eje ije nwe ime ka nzọụkwụ ya guzosie ike.”—Jeremaịa 10:23.
E buru n’amụma na “n’ikpeazụ nke ụbọchị ndị a,” n’ọgbọ anyị a, ndị hụrụ udo n’anya ga-eruba ‘n’ugwu [ihe atụ] nke ụlọ Jehova’—ya bụ, n’ezi ofufe. Ndị dị otú ahụ ga-eme mgbanwe dị ukwuu ná ndụ ha: “Ha ga-akpụgharịkwa mma agha ha nile ka ha bụrụ mma ogè, na ube ha nile ka ha bụrụ mma ịkwa osisi: mba agaghị ebuli mma agha megide mba, ha agaghị amụtakwa agha ọzọ.”—Aịsaịa 2:2-4.
Ọ̀ dị ìgwè ọ bụla nke ndị na-efe ofufe nke na-agbalị ibi ndụ n’ụzọ kwekọrọ n’okwu ndị ahụ? Ka okpukpe nile hà na-ekwu nanị okwu ọnụ banyere udo ebe ha na-akwado ibu agha? Oge ọzọ i zutere Ndịàmà Jehova, anyị na-agba gị ume ka i soro ha kwurịta okwu banyere udo ma mata okpukpe nke na-akụziri ndị mmadụ isoro mmadụ nile na-adị n’udo.