Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ọrịa AIDS Agbasaa n’Africa

Ọrịa AIDS Agbasaa n’Africa

Ọrịa AIDS Agbasaa n’Africa

“Anyị na-alụso ihe yiri oké ọdachi nke oge a ọgụ.”

OKWU ndị ahụ Stephen Lewis, bụ́ onyeozi pụrụ iche nke òtù UN maka HIV/AIDS n’Africa kwuru, na-egosipụta nchegbu ọtụtụ ndị nwere banyere ọnọdụ e nwere ná mba Africa ndị dị n’ebe ndịda Sahara banyere ọrịa AIDS.

Ọtụtụ ihe na-ekere òkè ná mgbasa nke nje HIV. Ọrịa AIDS, n’aka nke ya, emewo ka nsogbu ndị ọzọ ka njọ. Ọnọdụ ndị e nwere n’ala ụfọdụ n’Africa nakwa n’akụkụ ndị ọzọ nke ụwa bụ́ ebe ọrịa AIDS na-agbasa, na-adaberekarị n’ihe ndị na-esonụ.

Omume. Ebe ọ bụ inwe mmekọahụ bụ ụzọ bụ́ isi e si ebute nje HIV, o doro anya na enweghị ụkpụrụ omume doro anya na-enyere mgbasa nke ọrịa a aka. Otú ọ dị, ọtụtụ ndị na-eche na ọ bụ ihe na-agaghị ekwe omume ịkwalite omume nke enweghị mmekọahụ n’ebe ndị na-alụbeghị di ma ọ bụ nwunye nọ. “Nanị ịdọ ndị nọ n’afọ iri na ụma aka ná ntị izere mmekọahụ agaghị enwe ihe ịga nke ọma,” ka Francois Dufour dere na The Star, bụ́ akwụkwọ akụkọ e nwere na Johannesburg, South Africa. “Kwa ụbọchị, ha na-ahụ ọtụtụ onyinyo ndị na-akpali agụụ mmekọahụ bụ́ ndị na-egosi otú ha kwesịrị ịdị ma ọ bụ otú ha kwesịrị isi na-akpa àgwà.”

O yiri ka àgwà ndị na-eto eto ọ̀ na-akwado nkọwa a e nyere. Dị ka ihe atụ, otu nnyocha e mere n’otu mba gosiri na ihe dị ka otu ụzọ n’ụzọ atọ nke ndị na-eto eto bụ́ ndị nọ n’agbata afọ 12 na 17 enwewo mmekọahụ.

A kọwawo ndina n’ike dị ka nsogbu e nwere ná mba South Africa. Otu akụkọ gbara n’akwụkwọ akụkọ bụ́ Citizen nke Johannesburg kwuru na o “jupụtara ebe nile nke na ọ karịrị ihe ize ndụ ahụ́ ike ọ bụla ọzọ nke chere ndị inyom mba a ihu, nakwa n’ụzọ na-arịwanye elu, ụmụaka ndị nọ na ya.” Akụkọ ahụ kwukwara, sị: “Idina ụmụaka n’ike amụbawo okpukpu abụọ n’oge ndị a . . . O yiri ka à na-eme omume ndị a n’ihi ịnọgide na-enwe echiche ụgha bụ́ na onye bu nje HIV nke dinara nwa agbọghọ na-amaghị nwoke n’ike ga-enweta ọgwụgwọ.”

Ọrịa a na-ebute site ná mmekọahụ. E nwere ọ̀tụ̀tụ̀ dị elu nke ọrịa ndị a na-ebute site ná mmekọahụ n’ógbè ahụ. Magazin bụ́ South African Medical Journal kwuru, sị: “Ịdị adị nke ọrịa ndị a na-ebute ná mmekọahụ na-amụba ohere mmadụ nwere ibute ụdị nje HIV-1 okpukpu 2 ruo 5.”

Ịda ogbenye. Ọtụtụ mba ndị dị n’Africa dara ogbenye, nke a na-emekwa ka e nwee ọnọdụ na-akwalite mgbasa nke ọrịa AIDS. Ihe ndị a pụrụ ile anya dị ka ihe ndị bụ́ isi dị mkpa ná mba ndị mepere emepe, adịghị n’ihe ka n’ọtụtụ ala ndị ka na-emepe emepe. Obodo ndị buru ibu enweghị ọkụ eletrik, ha enweghịkwa mmiri ọṅụṅụ dị ọcha. N’ime ime obodo dị iche iche, ma ọ́ bụghị na ụzọ ha adịghị mma ọ bụrụ na ụzọ adịghị adị. Ọtụtụ ndị bi na ha adịghị eri ihe ndị na-edozi ahụ́, e nweghịkwa ụlọ ọgwụ zuru ezu.

Ọrịa AIDS na-enwe mmetụta dị njọ n’achụmnta ego nakwa n’azụmahịa. Ka ọtụtụ ndị ọrụ na-ebute ọrịa ahụ, ọ na-emetụta ụlọ ọrụ ndị na-egwupụta akụ̀ ndị dị n’ime ala n’ihi mbelata nke mmepụta ihe. Ụlọ ọrụ ụfọdụ na-atụle ụzọ ndị ha pụrụ isi tinyekwuo ígwè ọrụ dị iche iche iji nọchie anya ndị ọrụ a na-enweghịzi. N’afọ 2000, e mere atụmatụ na n’otu ebe a na-egwupụta akụ̀ bụ́ platinum n’ala, ọnụ ọgụgụ nke ndị na-arịa ọrịa AIDS n’etiti ndị ọrụ mụbara ruo ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ okpukpu abụọ, ihe dịkwa ka pasent 26 n’ime ndị ọrụ butere nje ahụ.

Ihe dị mwute ọrịa AIDS na-akpata bụ ọnụ ọgụgụ buru ibu nke ụmụaka bụ́ ndị na-aghọ ụmụ mgbei mgbe ọrịa ahụ gburu nne na nna ha. Tụkwasị n’ịbụ ndị nne na nna ha nwụnahụrụ, nakwa n’ịbụ ndị na-enweghịzi ego, ụmụaka ndị a aghaghị ịnagide ihere ọrịa AIDS na-akpata. Mgbe mgbe, ma ọ́ bụghị na ndị ikwu na ibe ma ọ bụ ndị obodo dara ogbenye gabiga ókè inye aka ọ bụrụ na ha achọghị ime otú ahụ. Ọtụtụ ụmụ mgbei na-akwụsị ịga akwụkwọ. Ụfọdụ na-amalite ịgba akwụna ma si otú ahụ na-eme ka mgbasa nke ọrịa ahụ rịa elu. Ọtụtụ mba eguzobewo usoro ihe omume gọọmenti ma ọ bụ nke ndị nkịtị iji nyere ụmụ mgbei ndị a aka.

Amaghị nke a na-akọ. Ọnụ ọgụgụ buru ibu nke ndị bu nje HIV amaghị na ha bu ya. Ọtụtụ ndị achọghị ka e lee ha ahụ́ n’ihi ihere ọrịa ahụ na-akpata. “A pụrụ ịjụ inye ndị bu, ma ọ bụ ndị e chere na ha bu nje HIV, ọgwụgwọ n’ụlọ ọgwụ dị iche iche, jụ inye ha ụlọ na ọrụ, ndị enyi ha na ndị ha na ha na-arụkọ ọrụ pụrụ ịgbahapụ ha, ụlọ ọrụ ịnshọransị pụrụ ịjụ ha, e nwekwara ike a gaghị ekwe ka ha banye ná mba ọzọ,” ka otu akụkọ nke Ihe Omume E Jikọrọ Ọnụ nke Mba Ndị Dị n’Otu Maka HIV/AIDS (UNAIDS) wepụtaara ndị nta akụkọ kwuru. Ọbụna e gbuwo ụfọdụ ndị mgbe a chọpụtara na ha bu nje HIV.

Ọdịbendị. N’ọtụtụ ọdịbendị Africa, ụmụ nwanyị adịghị enwe ọnụ okwu ma ọ bụrụ na di ha esoro nwanyị ọzọ nwee mmekọahụ, ha apụghị ịjụ iso di ha nwee mmekọahụ, ma ọ bụ tụọ aro ụzọ na-adịghị ize ndụ karị isi nwee mmekọahụ. Nkwenkwe ọdịbendị na-egosikarị na ha amaghị nke a na-akọ ma ọ bụ na ha ekwetaghị na ọrịa AIDS dị adị. Dị ka ihe atụ, a pụrụ ikwu na ọ bụ ndị amoosu kpatara ọrịa ahụ, a pụkwara ịchọ enyemaka nke ndị dibịa afa.

Ụlọ ọgwụ na-ezughị ezu. Ụlọ ọgwụ ole na ole e nwere enwe abụrụwo ndị e ji eme ihe gabiga ókè ọbụna karị n’ihi ọrịa AIDS. Akụkọ sitere n’ụlọ ọgwụ ukwu abụọ na-ekwu na ihe karịrị ọkara ndị ọrịa e nyere àkwà bucha nje HIV. Onyeisi nlekọta ahụ́ ike nke otu ụlọ ọgwụ dị na KwaZulu-Natal kwuru na ngalaba nlekọta ndị ọrịa ya nwere ọnụ ọgụgụ ndị ọrịa ji pasent 40 karịa otú o kwesịrị. Mgbe ụfọdụ, ndị ọrịa abụọ aghaghị idina n’otu àkwà, onye nke atọ edinara n’ala n’okpuru ya!—Magazin bụ́ South African Medical Journal.

N’agbanyeghị na ọnọdụ ahụ adịworịị njọ n’Africa, ihe àmà na-egosi na ọ pụrụ ịka njọ. “Anyị ka nọ ná mmalite nke ọrịa a na-efe efe,” ka Peter Piot nke UNAIDS kwuru.

O doro anya na ná mba ụfọdụ, a na-etinye mgbalị ime ihe banyere ọrịa a. Na nke mbụ ya kwa, na June 2001, Nzukọ Ezumezu nke Òtù Mba Ndị Dị n’Otu nwere nzukọ iji kwurịta maka HIV/AIDS. Mgbalị ụmụ mmadụ ọ̀ ga-eweta ihe ịga nke ọma? Olee mgbe a ga-emesị kwụsị mgbasa na-egbu egbu nke ọrịa AIDS?

[Igbe/Foto dị na peeji nke 5]

ỌGWỤ ỌRỊA AIDS BỤ́ NEVIRAPINE NA ỌNỌDỤ AMAGHỊ IHE A GA-EME EME NKE SOUTH AFRICA NỌ NA YA

Gịnị bụ Nevirapine? Dị ka odeakụkọ bụ́ Nicole Itano si kwuo, ọ bụ “ọgwụ na-alụso nje virus ọgụ bụ́ nke nnwale e mere na-egosi na ọ pụrụ ibelata ohere [nne] nwere ibufe nwa ya ọrịa AIDS ruo ọkara.” Otu ụlọ ọrụ Germany na-emepụta ọgwụ kwuru ka ya nye South Africa ọgwụ ahụ n’efu ruo afọ ise na-esonụ. Ma, ka ọ na-erule August 2001, gọọmenti mba ahụ anabatabeghị ọchịchọ ahụ a chọrọ inyere ha aka. Gịnị bụ nsogbu?

South Africa nwere nde mmadụ 4.7 bu nje HIV, karịa mba ọ bụla ọzọ n’ụwa. Magazin bụ́ The Economist nke London kọrọ na February 2002 na President Thabo Mbeki nke South Africa “na-enwe obi abụọ banyere echiche ahụ e nwere n’ebe nile bụ́ na nje HIV na-akpata ọrịa AIDS” nakwa na ọ “na-enwe obi abụọ banyere ọnụ ahịa, ịdị nchebe na abamuru nke ọgwụ ndị na-alụso ọrịa AIDS ọgụ. Ọ machibidobeghị ha iwu, ma a na-agwa ndị dọkịta nọ na South Africa ka ha ghara iji ha eme ihe.” N’ihi gịnị ka nke a ji bụrụ ihe bụ́ isi na-emenye egwu? Ọ bụ n’ihi na a na-amụ ọtụtụ puku ụmụaka bu nje HIV kwa afọ na South Africa, pasent 25 nke ndị inyom dị ime bukwa nje ahụ.

N’ihi echiche ndị a megiderịtara ibe ha, a gbara akwụkwọ n’ụlọikpe dị iche iche iji manye gọọmenti ikesa nevirapine. Ụlọikpe Ihe Ndị Metụtara Iwu nke South Africa kwupụtara echiche ya n’April 2002. Dị ka Ravi Nessman si kwuo n’ihe o dere n’akwụkwọ akụkọ bụ́ The Washington Post, ụlọikpe ahụ kpebiri na “gọọmenti aghaghị ime ka ọgwụ ahụ ruo ụlọ ọgwụ ndị pụrụ iji ha mee ihe aka.” Ọ bụ ezie na gọọmenti South Africa anọwo na-ekesa ọgwụ ahụ n’ebe 18 ná mba ahụ iji nwalee ya, a sịrị na mkpebi ikpe ọhụrụ a emewo ka ndị inyom nile dị ime bụ́ ndị bu nje HIV ná mba ahụ nwee olileanya.

[Igbe/Foto dị na peeji nke 6]

NJE Dị AGHỤGHỌ AGHỌGBUO MKPỤRỤ NDỤ

Jiri nwa oge tụlee ihe banyere nje virus nke na-ebelata ikike ahụ́ mmadụ ji alụso ọrịa ọgụ (nje HIV) bụ́ nke pere nnọọ mpe. Otu ọkà mmụta sayensị kwuru, sị: “Mgbe m jisịworo ígwè ọrụ e ji ahụ ihe anya nkịtị na-apụghị ịhụ nyochaa nje virus ruo ọtụtụ afọ, m ka na-enwe ihe ijuanya na mkpali banyere ụzọ kwekọrọ nnọọ ekwekọ na nke dị mgbagwoju anya e si kee ihe dị nnọọ obere.”

Nje virus dị obere karịa nje bacteria, bụ́ nke n’aka nke ya dị nnọọ obere karịa mkpụrụ ndụ mmadụ hà otú o kwesịrị. Dị ka otu akwụkwọ si kwuo, nje HIV dị nnọọ ntakịrị nke na “nde [nje HIV] 230 ga-aba na kpọm nke dị ná ngwụsị ahịrịokwu a.” Nje virus apụghị ịmụba ọ gwụla ma ọ banyere n’ime mkpụrụ ndụ ma na-achịkwazi ngwá ọrụ nke mkpụrụ ndụ ahụ.

Mgbe nje HIV banyere n’ahụ́ mmadụ, ọ ghaghị ịlụ ọgụ megide ngwá ọgụ dị ukwuu nke e nwere n’usoro ahụ́ ji alụso ọrịa ọgụ. * Ọ bụ n’ụmị ọkpụkpụ ka a na-emepụta ihe nchebe bụ́ nke mkpụrụ ndụ ọbara ọcha mejupụtara. Mkpụrụ ndụ ọbara ọcha gụnyere ụdị lymphocyte abụọ bụ́ isi, bụ́ ndị a maara dị ka mkpụrụ ndụ T na mkpụrụ ndụ B. A na-akpọ ụfọdụ mkpụrụ ndụ ọbara ọcha ndị ọzọ phagocyte, ma ọ bụ “ndị na-eri mkpụrụ ndụ.”

Ụdị mkpụrụ ndụ T dị iche iche nwegasịrị ọrụ ha na-arụ. Ndị a na-akpọ mkpụrụ ndụ T inyeaka na-ekere òkè dị ukwuu n’usoro ha ji alụ ọgụ. Mkpụrụ ndụ T inyeaka na-enye aka n’ịmata ihe ndị si esi wabata ma nye ntụziaka maka mmepụta nke mkpụrụ ndụ ndị ga-alụso onye iro ahụ ọgụ ma bibie ya. Ná mwakpo ya, nje HIV na-elekwasị mkpụrụ ndụ T inyeaka ndị a anya karịsịa. A na-atụte mkpụrụ ndụ T, bụ́ ndị na-egbu mkpụrụ ndụ, ka ha bibie mkpụrụ ndụ ndị buteworo ọrịa. Mkpụrụ ndụ B na-emepụta ihe ndị na-alụso ọrịa ọgụ bụ́ ndị a na-eji eme ihe n’ọgụ ahụ a na-alụ megide ibute ọrịa.

Usoro Dị Aghụghọ

Nje HIV so n’ìgwè nje ndị a na-akpọ retrovirus. Ụkpụrụ mkpụrụ ndụ ihe nketa nke nje HIV dị n’ụdị RNA (ribonucleic acid) ọ bụghị n’ụdị DNA (deoxyribonucleic acid). Nje HIV so n’ìgwè nta nke nje virus ndị nwere RNA bụ́ ndị a maara dị ka lentivirus n’ihi na ọ pụrụ ịdị n’ahụ́ n’akpaghị ike ruo ogologo oge tupu mgbaàmà ndị siri ike nke ọrịa apụta ìhè.

Mgbe nje HIV banyere n’ime mkpụrụ ndụ, ọ pụrụ iji usoro ọrụ nke mkpụrụ ndụ ahụ rụzuo ihe ọ chọrọ ịrụ. Ọ “na-agbanwe ihe ọmụma” dị na DNA nke mkpụrụ ndụ ahụ iji wee mepụtaghachi ọtụtụ nje HIV. Ma tupu o nwee ike ime nke a, nje HIV aghaghị iji “asụsụ” dị iche mee ihe. Ọ ghaghị ịgbanwe RNA nke ya ka ọ ghọọ DNA ka usoro ọrụ nke mkpụrụ ndụ ahụ ọ banyere na ya wee nwee ike ịgụ ma ghọta ya. Iji mezuo nke a, nje HIV na-eji nje enzyme a na-akpọ reverse transcriptase eme ihe. Ka oge na-aga, mkpụrụ ndụ ahụ na-anwụ, mgbe o busịworo ụzọ mepụta ọtụtụ puku nje HIV ndị ọhụrụ. Nje ndị a e mepụtara ọhụrụ na-abanye ná mkpụrụ ndụ ndị ọzọ.

Ozugbo ọnụ ọgụgụ mkpụrụ ndụ T inyeaka belatara nnọọ, ọrịa ndị ọzọ pụrụ ịkarị ahụ́ ike n’enweghị ihe ga-alụso ha ọgụ. Ahụ́ na-ebutezi ụdị ọrịa dị iche iche. Onye ahụ butere nje ahụ enweela ọrịa AIDS zuru ezu. Nje HIV enwewo ihe ịga nke ọma n’ibibi usoro nile nke ahụ́ ji alụso ọrịa ọgụ.

Nke a bụ nkọwa e mere ka ọ dị mfe. A ghaghị iburu n’uche na e nwere ọtụtụ ihe ndị nnyocha na-amaghị, ma banyere usoro ahụ́ ji alụso ọrịa ọgụ ma banyere otú nje HIV si arụ ọrụ.

N’akụkụ ka ukwuu nke iri afọ abụọ, ndị nnyocha ahụ́ ike a ma ama gburugburu ụwa ejiriwo ihe dị ukwuu n’ọgụgụ isi na akụ̀ na ụba mee ihe n’inyocha obere nje virus a, nke a akpatawokwa mmefu ego dị ukwuu. N’ihi ya, a mụtawo ihe dị ukwuu banyere nje HIV. Dr. Sherwin B. Nuland, bụ́ dọkịta na-awa ahụ́, kwuru n’afọ ụfọdụ gara aga, sị: “Ọ̀tụ̀tụ̀ ihe ọmụma e nwetaworo . . . banyere nje virus nke na-ebelata ikike ahụ́ mmadụ ji alụso ọrịa ọgụ nakwa ọganihu e nweworo n’ịlụso mwakpo ya ọgụ na-atụ nnọọ n’anya.”

Ka o sina dị, mgbasa na-egbu egbu nke ọrịa AIDS anọgidewo na-aga n’ihu n’ọ̀tụ̀tụ̀ na-emenye ụjọ.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 26 Lee Teta! (Bekee) nke February 8, 2001, peeji nke 13-15.

[Foto]

Nje HIV na-awakpo “lymphocyte” nke usoro ahụ́ ji alụso ọrịa ọgụ ma gbanwee ihe ọmụma dị na ha iji mepụta nje HIV

[Ebe E Si Nweta Foto]

CDC, Atlanta, Ga.

[Foto dị na peeji nke 7]

Ọtụtụ puku ndị na-eto eto na-adị ndụ n’ụzọ kwekọrọ n’ụkpụrụ Bible