Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

“Ọrịa Na-efe Efe nke Kasị Mebie Ihe n’Akụkọ Ihe Mere Eme nke Mmadụ”

“Ọrịa Na-efe Efe nke Kasị Mebie Ihe n’Akụkọ Ihe Mere Eme nke Mmadụ”

“Ọrịa Na-efe Efe nke Kasị Mebie Ihe n’Akụkọ Ihe Mere Eme nke Mmadụ”

SITE N’AKA ONYE EDEMEDE TETA! NA SOUTH AFRICA

“Ọ dịbeghị agha a lụworo n’ụwa nke bibiri ihe dị ka ọrịa AIDS nke gbasazuru ebe nile.”—ODEAKWỤKWỌ UKWU MBA UNITED STATES, BỤ́ COLIN POWELL.

MGBE mbụ gọọmenti kwuru banyere ọrịa AIDS (acquired immunodeficiency syndrome) bụ na June 1981. “Ọ dịghị onye ọ bụla n’ime anyị nke so na-eme ihe banyere ọrịa Aids n’oge ahụ ọ malitere nke pụrụ ichetụwo n’echiche na ọrịa a ga-agbasaru otú ọ gbasaruworo,” ka Peter Piot, bụ́ onyeisi ntụzi ọrụ nke Ihe Omume E Jikọrọ Ọnụ nke Mba Ndị Dị n’Otu Maka HIV/AIDS (UNAIDS) kwuru. N’ime afọ 20, ọ ghọwo ọrịa kasị gbasaa ebe nile bụ́ nke e nwetụrụla, ihe àmà na-egosikwa na ọ ga-anọgide na-agbasa.

A na-eme atụmatụ na ihe karịrị nde mmadụ 36 bu nje HIV (human immunodeficiency virus), nakwa na nde 22 ọzọ anwụwo n’ihi ihe ndị ọrịa AIDS kpatara. * N’afọ 2000, ọrịa AIDS gburu nde mmadụ atọ gburugburu ụwa, bụ́ ọnụ ọgụgụ kasị elu e nwetụworo n’otu afọ kemgbe ọrịa ahụ malitere na-agbasa. Nke a na-eme n’agbanyeghị ojiji a na-eji usoro ọgwụ ndị na-alụso nje virus ọgụ eme ihe, karịsịa ná mba ndị bara ọgaranya karị.

Ọrịa AIDS Agbasaa n’Africa Nile

Mba Africa ndị dị n’ebe ndịda Sahara, bụ́ ebe e mere atụmatụ na e nwere nde mmadụ 25.3 buteworo ọrịa ahụ, aghọwo ebe ọrịa a na-agbasanụ kasị akpa ike ọjọọ. N’ógbè a nanị, ihe ndị ọrịa AIDS kpatara gburu nde mmadụ 2.4 n’afọ 2000, nke bụ́ pasent 80 nke ọnụ ọgụgụ ndị o gburu n’ụwa nile. Ọrịa AIDS bụ ihe kasị akpata ọnwụ n’ógbè ahụ. *

South Africa nwere ọnụ ọgụgụ kasị elu nke ndị buteworo ọrịa ahụ ná mba ọ bụla n’ụwa, e mere atụmatụ na ha dị nde mmadụ 4.7. N’ebe a, a na-amụ ụmụaka 5,000 bu nje HIV kwa ọnwa. N’okwu o kwuru n’Agba nke 13 nke Nzukọ Mba Nile Maka Ọrịa AIDS, bụ́ nke e nwere na Durban na July 2000, onye bụbu President South Africa bụ́ Nelson Mandela kwuru, sị: “Ọ wụrụ anyị akpata oyi n’ahụ́ ịmata na na South Africa, ọrịa AIDS ga-egbu 1 onye n’ime mmadụ 2 ọ bụla, ya bụ, ọkara, nke ndị na-eto eto anyị. Ihe kasị emenye ụjọ bụ na ọrịa a nile a na-ebute, bụ́ nke ihe ndekọ ọnụ ọgụgụ na-eme ka anyị mata banyere ya, nakwa nhụsianya ọ na-akpatara ndị mmadụ . . . pụrụ ịbụwo nke e gbochiri, bụrụkwa nke a pụrụ igbochi egbochi.”

Mwakpo nke Ọrịa AIDS ná Mba Ndị Ọzọ

Ọ̀tụ̀tụ̀ e ji ebute ọrịa a na-arịkwa elu n’Ebe Ọwụwa Anyanwụ Europe, Eshia, nakwa na Caribbean. Ná ngwụsị afọ 1999, ọnụ ọgụgụ ndị butere ya n’ebe Ọwụwa Anyanwụ Europe dị 420,000. Ka ọ na-erule ná ngwụsị afọ 2000, e mere atụmatụ dịtụgodị ala na ọnụ ọgụgụ ahụ rịgoruru 700,000.

Nnyocha e mere n’obodo ukwu isii dị n’America gosiri na e nwere pasent 12.3 nke ndị ikom na-edina ụdị onwe ha bu nje HIV. Ọzọkwa, ọ bụ nanị pasent 29 nke ndị bu nje HIV maara na ha bu ya. Onye ọkachamara n’ihe banyere mgbasa ọrịa nke duziri nnyocha ahụ kwuru, sị: “O wutere anyị nnọọ ịchọpụta na ọ bụ nnọọ ndị ikom ole na ole bu nje HIV maara na ha bu ya. Ọ pụtara na ndị butere ya ọhụrụ na-ebunye ndị ọzọ nje ahụ n’amaghị ama.”

N’otu nzukọ nke ndị ọkachamara n’ihe banyere ọrịa AIDS nwere na Switzerland na May 2001, a kpọrọ ọrịa a “ọrịa na-efe efe nke kasị mebie ihe n’akụkọ ihe mere eme nke mmadụ.” Dị ka e kwuru, mwakpo nke ọrịa AIDS siri ike karịsịa ná mba Africa ndị dị n’ebe ndịda Sahara. Isiokwu anyị na-esonụ ga-atụle ihe kpatara ya.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

^ par. 5 Ọnụ ọgụgụ ndị e ji mee ihe bụ atụmatụ e mere nke òtù UNAIDS bipụtara.

^ par. 7 Lee Teta! nke March 8, 2001, peeji nke 12-13.

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 3]

“Ihe kasị emenye ụjọ bụ na ọrịa a nile a na-ebute . . . nakwa . . . nhụsianya ọ na-akpatara ndị mmadụ, pụrụ ịbụwo nke e gbochiri, bụrụkwa nke a pụrụ igbochi egbochi.””—NELSON MANDELA

[Foto dị na peeji nke 2, 3]

Ọtụtụ ndị bu nje HIV amaghị na ha bu ya

[Ebe E Si Nweta Foto Dị na peeji 3]

UN/DPI Photo 198594C/Greg Kinch