Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Fon A Na-eji Agagharị Agagharị Ọ̀ Dị M Mkpa?

Fon A Na-eji Agagharị Agagharị Ọ̀ Dị M Mkpa?

Ndị Na-eto Eto Na-ajụ Sị . . .

Fon A Na-eji Agagharị Agagharị Ọ̀ Dị M Mkpa?

“Ahụ́ anaghị eru m ala, iwe na-ewekwa m ma ọ bụrụ na ejighị m fon a na-eji agagharị agagharị.”—Akiko. *

FON ndị a na-eji agagharị agagharị na-ewu nnọọ ewu karị n’ọtụtụ ala. Ha na-eru mmadụ aka ngwa ngwa. Ndị enyi gị na ndị mụrụ gị nwere ike ịkpọ gị mgbe ọ bụla, n’ebe ọ bụla—i nwekwara ike ịkpọ ha. Ụdị ha ụfọdụ na-ekwe ka i zipụ nakwa ka e zitere gị ozi e dere ede dị mkpirikpi, nke “bụ́ ụzọ kasị ọhụrụ ndị na-eto eto ji emeju agụụ ha nwere maka izirịta ozi,” ka magazin bụ́ The Times nke London kwuru. E nwere fon a na-eji agagharị agagharị ndị nwere ike ime ka ị mara ihe ndị dị n’Intanet, na-enye gị ohere izipụ ozi E-mail na inweta enweta.

Eleghị anya i nweworị otu, ma ọ bụ na-eme atụmatụ inweta ya. Ma ì nweela, ma ị̀ ka na-eme atụmatụ inweta ya, chebara okwu a echiche: “Ihe nwere uru, nwekwara ọghọm.” Fon a na-eji agagharị agagharị pụrụ inwe nnọọ abamuru ụfọdụ. Otú ọ dị, ọ dị mma ka i chee echiche banyere ọghọm ndị dị na ya, n’ihi na ọ bụrụgodị na i kpebie ịzụrụ otu, ịmatacha ọghọm ndị pụrụ ịdị na ya ga-enyere gị aka iji ya na-eme ihe n’ụzọ ziri ezi.

“Gbakọọ Ihe Ọ Ga-efu”

Jizọs setịpụrụ ụkpụrụ amamihe dị na ya bụ́ na mmadụ kwesịrị ‘ịgbakọ ihe ọ ga-efu’ tupu ya amalite ọrụ dị mkpa. (Luk 14:28) À pụrụ iji ụkpụrụ ahụ mee ihe n’ihe metụtara fon a na-eji agagharị agagharị? N’ezie, a pụrụ. Ọ bụ eziokwu na i nwere ike ịzụta fon ahụ n’ọnụ ego dị nnọọ ala ma ọ bụ ọbụna nweta ya n’efu. Otú ọ dị, dị ka Henna bụ́ onye dị afọ 17 chọpụtara, “ụgwọ a na-akwụ maka iji ya na-eme ihe pụrụ ịrị elu nke ukwuu na mberede.” A pụkwara inwe nrụgide na-adịgide adịgide nke inweta ihe omume ndị ọzọ nakwa ịzụta ụdị ndị dị oké ọnụ karị. Ya mere, Hiroshi kwuru, sị: “Ana m arụ ọrụ nwa oge ma na-edokọ ego iji na-azụta ụdị ka dị ọhụrụ kwa afọ.” Ọtụtụ ndị ntorobịa na-eme otu ihe ahụ. *

Ọ bụrụgodị na ndị mụrụ gị ekwere ịdị na-akwụrụ gị ụgwọ ya, ọ ka dị mkpa ka ị tụlee ego ọ na-efu. Otu Onye Kraịst bụ́ onye ozi na-ejegharị ejegharị na Japan kwuru, sị: “Ụfọdụ ndị nne na-ewegharakwu ọrụ nwa oge nanị iji na-akwụrụ ụmụ ha ụgwọ fon ha na-eji agagharị agagharị, bụ́ nke na-adịchaghị mkpa na ha ga-enwe.” N’ezie, ị gaghị achọ ibokwasị ndị mụrụ gị ibu arọ dị otú ahụ!

“Ihe Na-Eri Oge”

Ọtụtụ ndị, bụ́ ndị malitere iji fon eme ihe n’ụzọ kwesịrị ekwesị pụrụ ịchọpụta na ọ na-eri ha oge karịa otú ha tụrụ anya ya—na-anapụ ha oge maka ihe ndị ka mkpa. Mika na ndị ezinụlọ ya na-adịbu anọkọ ọnụ ruo ogologo oge n’oge nri abalị. O kwuru, sị: “Ugbu a, anyị richaa nri anyị na-akpara [fon ndị a na-eji agagharị agagharị] n’aka laghachi n’ọnụ ụlọ anyị.”

Akwụkwọ akụkọ bụ́ The Guardian nke London na-akọ, sị: “Otu ụzọ n’ụzọ atọ nke ndị na-eto eto nọ n’agbata afọ 16 na 20 na-ahọrọ ide ozi ha ede na fon karịa ụzọ nile ọzọ e si ezipụ ozi e dere ede.” Ide ozi gị ede pụrụ iwe gị obere ego karịa iji ọnụ na-akparịta ụka, ma ọ na-ewe oge ka ukwuu idebanye ozi gị na fon. Mieko kwetara, sị: “Ọ bụrụ na mmadụ ezite ozi sị m ‘ka chi foo,’ m na-azaghachi ya ‘ka ọ bọọ.’ Mgbe ahụ, anyị na-amalite izirịta ozi ruo otu awa. Ọ dịghị ihe bara uru anyị ga na-ekwu.”

Ọ ga-eju ọtụtụ ndị nwere fon a na-eji agagharị agagharị anya ma ha kwụsịtụ wee gbakọọ oge nile ha na-etinye n’iji fon ha eme ihe n’otu ọnwa. Otu nwa agbọghọ dị afọ 19, bụ́ Teija, kwetara, sị: “Nye ọtụtụ ndị, fon a na-eji agagharị agagharị bụ ihe na-eri oge kama ịbụ ihe na-echekwa oge.” Ọ bụrụgodị na o kwesịrị ka i nwee fon a na-eji agagharị agagharị n’ihi ọnọdụ gị, ọ dị mkpa ka i chebara oge echiche mgbe i ji ya na-eme ihe.

Otu nwa agbọghọ bụ́ Onye Kraịst aha ya bụ Marja na-ekwu, sị: “Ná mgbakọ Ndị Kraịst, ọtụtụ ndị na-eto eto na-anọgide na-ezigara ndị ọzọ ozi ndị na-adịghị mkpa. Ọ bụ ihe a na-ahụkarị!” A hụwo àgwà yiri nke a n’etiti ndị na-eto eto mgbe ha na-ekere òkè n’ozi Ndị Kraịst. Bible na-adụ Ndị Kraịst ọdụ ka ha na-azụpụtara onwe ha oge maka ihe ime mmụọ. (Ndị Efesọs 5:16) Lee nnọọ ihe mwute ọ bụ ma ọ bụrụ na ịkparịta ụka na telifon eweghara oge dị oké mkpa dị otú ahụ!

Nkwurịta Okwu Nzuzo

Marie kwuru banyere ọnyà ọzọ dị na ya, sị: “Ebe ọ bụ onye ahụ n’onwe ya ka ozi na-abịara, ọ dịghị abịa n’ụlọ, e nwere ihe ize ndụ na ndị nne na nna agaghị amata ndị ụmụ ha na-agwa okwu na fon ma ọ bụkwanụ ma hà na-agwa mmadụ okwu na fon ma ọ bụ ma ha anaghị agwa.” Ya mere, ụfọdụ ndị ntorobịa na-eji fon ndị a na-eji agagharị agagharị amalite mkpakọrịta nzuzo ha na ndị na-abụghị nwoke ma ọ bụ nwanyị ibe ha. Ụfọdụ akwụsịwo ịnọ na nche, na-eleghara ụkpụrụ dị iche iche anya bụ́ ndị ha na-ekwesịghị ileghara anya mgbe ha na ndị ọzọ na-ekwurịta okwu. Ò si aṅaa dị otú ahụ?

“Ide ozi ede na fon pụtara na e nweghị onye pụrụ ileba anya n’ihe [ndị na-eto eto] na-eme,” ka akwụkwọ akụkọ bụ́ The Daily Telegraph nke London kwuru. Ahụghị onye gị na ya na-ezirịta ozi ma ọ bụ na-anụ olu ya pụrụ imetụta gị. “Ụfọdụ na-eche na ide ozi ede na fon bụ ụzọ mmadụ pụrụ isi soro onye ọzọ kwurịta okwu n’abịaghị kwụrụ onye ahụ n’ihu,” ka Timo na-ekwu. “Ụfọdụ nwere ike idenye n’ozi ha ihe ndị ha ga-ewere dị ka ihe na-ekwesịghị ekwesị ịgwa mmadụ ihu na ihu.”

Mgbe Keiko, nwa agbọghọ bụ́ Onye Kraịst dị afọ 17, malitere iji fon a na-eji agagharị agagharị eme ihe, ọ gwara ọtụtụ n’ime ndị enyi ya nọmba fon ya. N’oge na-adịghị anya, ya na otu nwa okorobịa nọ n’ọgbakọ ya malitere izirịta ozi kwa ụbọchị. Keiko na-ekwu, sị: “Na mbụ anyị na-ekwurịta banyere otú ihe si aga, e mesịa anyị malitere ịkọrịta banyere nsogbu ndị anyị nwere. Anyị ji fon anyị na-eji agagharị agagharị na-ebiri onwe anyị ndụ.”

Ọ bụ ihe obi ụtọ na o nwetara enyemaka site n’aka ndị mụrụ ya na Ndị Kraịst bụ́ ndị okenye tupu ihe adị oké njọ. Ugbu a o kwetara, sị: “Ọ bụ ezie na tupu ndị mụrụ m enye m fon a na-eji agagharị agagharị, ha dọrọ m aka ná ntị nke ukwuu banyere mụ na onye na-abụghị nwanyị ibe m izirịta ozi, m na-ezigara ya ozi kwa ụbọchị. Ọ bụghị ụzọ kasị mma isi jiri fon na-eme ihe.” *

Bible na-adụ anyị ọdụ ka anyị ‘nwee ezi akọ na uche.’ (1 Pita 3:16) Nke a pụtara na mgbe i ji fon a na-eji agagharị agagharị na-eme ihe, ị ghaghị ijide n’aka na, dị ka Koichi si kwuo, “i nweghị ihe ị ga-emere ihere,” ọ bụrụgodị na onye ọzọ ahụ ozi gị ma ọ bụ nụpere ihe ị na-ekwu. Na-echeta mgbe nile na e nweghị ihe ndị zoro ezo n’ebe Nna anyị nke eluigwe nọ. Bible na-akọwa, sị: “Ọ dịghịkwa ihe e kere eke nke na-apụtaghị ìhè n’anya [Chineke], ma ihe nile gba ọtọ ma bụrụ ndị e kpughepụrụ ekpughepụ n’anya onye ahụ anyị ga-aza ajụjụ.” (Ndị Hibru 4:13) Gịnịzi mere ị ga-eji na-anwa ịnọ na-enwe mkpakọrịta nzuzo?

Kpaara Ya Ókè

Ọ bụrụ na ị na-eche echiche inweta fon a na-eji agagharị agagharị, gịnị ma i buru ụzọ jiri nlezianya tụlee ọnọdụ gị iji mata ma ọ̀ dị gị mkpa n’ezie? Gị na ndị mụrụ gị kwurịta ya. Ụfọdụ na-ele ihe anya dị ka nwa agbọghọ bụ́ Jenna si lee ya, bụ́ onye sịrị: “Fon a na-eji agagharị agagharị bụụrụ ọtụtụ ndị na-eto eto nnukwu ibu ọrụ.”

Ọ bụrụgodị na i kpebie inwe fon dị otú ahụ, ọ dị mkpa ịchịkwa ya achịkwa. N’ụzọ dị aṅaa? Kpaara ya ókè n’ụzọ ezi uche dị na ya. Dị ka ihe atụ, kpaara ihe dị iche iche dị na fon gị ndị ị na-eji eme ihe ókè ma ọ bụ oge na ego ọ na-efu gị. Ebe ọ bụ na ọtụtụ ụlọ ọrụ na-enye fon na-enye ndekọ zuru ezu nke otú i si jiri ya na-eme ihe, gị na ndị mụrụ gị nwere ike tụlee ego ole ị kpọtara site n’oge ruo n’oge. Ọ na-adịrị ụfọdụ ndị mfe inweta fon a na-eji agagharị agagharị ndị e buru ụzọ kwụọ ụgwọ ha ka ha wee belata otú ha si eji ya eme ihe.

Ọzọkwa, chee echiche nke ọma banyere oge na otú i si azaghachi mgbe a kpọrọ gị nakwa mgbe e ziteere gị ozi. Nwee ụkpụrụ nduzi kwesịrị ekwesị nke gị. Shinji na-akọwa, sị: “Ana m emepe ebe m na-enweta ozi nanị otu ugboro n’ụbọchị, m na-azaghachikarịkwa ozi ndị m nwetara nanị mgbe ha dị mkpa. N’ihi nke a, ndị enyi m akwụsiwo izitere m ozi ndị na-enweghị isi. Ọ bụrụ na e nwere nnọọ nsogbu chọrọ ka e mee ihe ngwa ngwa maka ha, ha ga-akpọ m.” Karịsịa, họrọ ndị gị na ha ga na-ezirịta ozi. Kpachara anya banyere otú i si enye nọmba fon gị. Gbasoo otu ụkpụrụ ndị ị na-eji eme ihe mgbe nile banyere ezi mkpakọrịta.—1 Ndị Kọrint 15:33.

Bible na-ekwu, sị: “Ihe ọ bụla nwere oge, . . . mgbe ịgba nkịtị na mgbe ikwu okwu.” (Eklisiastis 3 :1, 7) N’ụzọ doro anya, e nwekwara mgbe fon ndị a na-eji agagharị agagharị ‘ga-agba nkịtị.’ Nzukọ na ozi Ndị Kraịst anyị bụ “oge” maka ofufe Chineke, ọ bụghị maka iji fon eme ihe. Ndị manịja ụlọ nri na ebe a na-eme ihe nkiri na-arịọkarị ndị ahịa ha ka ha zere iji fon a na-eji agagharị agagharị na-eme ihe n’ebe ndị ahụ. Anyị na-eji nrubeisi na-ekwenyere arịrịọ ndị ahụ. N’ezie, Eze eluigwe na ala kwesịkwara ma ọ dịghị ihe ọzọ ka e nye ya nsọpụrụ dị otú ahụ!

Ọ bụrụ na ha anaghị atụ anya ozi dị oké mkpa, ụfọdụ na-ahọrọ ịgbanyụ fon ha, ma ọ bụ ha agbanye ya ebe ọ na-agaghị eme mkpọtụ mgbe ha na-arụ ọrụ ndị dị mkpa. Ụfọdụ na-edebe fon ha na-eji agagharị agagharị n’ebe aka ha na-agaghị eru ya ngwa ngwa. E kwuwerị, ọ̀ bụ na a pụghị ilebara ihe ka ọtụtụ n’ime ozi nile ahụ anya mgbe e mesịrị?

Ọ bụrụ na i kpebie inweta fon a na-eji agagharị agagharị, kpebisie ike ịchịkwa ya achịkwa, ọ bụghị ikwe ka ọ chịkwaa gị. N’ụzọ doro anya, i kwesịrị ịmụrụ anya ma debe ihe ndị i kwesịrị ibute ụzọ n’ọnọdụ ha. Bible na-agba anyị ume, sị: “Ka inwe ezi uche unu bụrụ nke mmadụ nile maara.” (Ndị Filipaị 4:5) Ọ bụrụ na i kpebie inwe fon a na-eji agagharị agagharị, kpebisie ike igosi ezi uche gị n’ụzọ i si eji ya eme ihe.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

^ par. 3 A gbanwewọ aha ụfọdụ.

^ par. 7 Iji nweta ebe a tụlere banyere ịrụ ọrụ ma a gbasaa akwụkwọ, biko lee isiokwu bụ́ “Ndị Na-Eto Eto Na-Ajụ Sị—Gịnị Dị Njọ n’Ịkpa Ego?” ná mbipụta Teta! nke October 8, 1997.

^ par. 18 Ịgwa onye na-abụghị nwoke ma ọ bụ nwanyị ibe gị okwu ma ọ bụ gị na ya izirịta ozi mgbe nile na fon pụrụ ịbụ otu ụdị nke iyi oge mkpapụ. Biko lee isiokwu bụ́ “Ndị Na-eto Eto Na-ajụ Sị—Gịnị Dị Njọ na Mmadụ na Ibe Ya Ikwurịta Okwu” ná mbipụta Teta! (Bekee) nke August 22, 1992.

[Foto ndị dị na peeji nke 16]

Ụfọdụ ndị ntorobịa na-eji fon a na-eji agagharị agagharị enwe mkpakọrịta nzuzo