Ikiri Ụwa
Ikiri Ụwa
“Echiche Efu Banyere Akụ̀ na Ụba”
Oké mkpọsa ihe eduhiewo ọtụtụ ndị ogbenye ikwere na ha ga-enwere onwe ha pụọ n’ịda ogbenye site n’ịgba chaa chaa, n’agbanyeghị na ohere e nwere irite ego buru ibu dị nnọọ obere n’ezie, ka akwụkwọ akụkọ bụ́ Times of Zambia na-akọ. Dị ka isiokwu ahụ si kwuo, “ime mkpọsa maka lọtrị na-akpali echiche efu banyere akụ̀ na ụba, ndụ ndị oké ozu na ịmalite ibi ndụ na-enweghị nsogbu n’otu ntabi anya,” ebe “a na-adịghị akpọtụkarị ohere dị nta e nwere irite ihe aha.” Akwụkwọ akụkọ ahụ kwubiri, sị: “N’agbanyeghị arụmụka ọ bụla mmadụ chepụtara, ịgba chaa chaa bụ ohi anya ọcha, e kwesịkwara ịmachibido ya iwu n’obodo ọ bụla nwere ụkpụrụ omume ziri ezi.”
Ịtụ Ọchịchịrị Egwu
“Ụmụaka na-atụ ọchịchịrị egwu karịa ka nne na nna ha tụrụ n’ihi na ka ha na-anọwanye n’ebe e nwere ìhè aka mere, ọ pụtara na ha adịghị anọkebe n’ebe gbara ọchịchịrị kpam kpam,” ka otu akụkọ gbara n’akwụkwọ akụkọ bụ́ The Times nke London na-akọ. Ọkà n’akparamàgwà mmadụ na onye na-ede akwụkwọ bụ́ Aric Sigman tụlere nnyocha e mere nke na-egosi na ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ ụzọ abụọ n’ime ụzọ atọ nke ụmụaka na-erubeghị afọ iri na-esi ọnwụ na ha ga-eji ọkụ ehi ụra n’abalị. Ọ na-azọrọ na ikike nchepụta ihe nke ụmụaka na-ebelata n’ihi anọghị n’ọchịchịrị—ọbụna n’elu ihe ndina n’abalị. “E kwesịrị inye ikike nchepụta ihe nke ụmụaka ohere ito,” ka akụkọ ahụ na-ekwu. “Ọ pụrụ ịbụrụ ha ihe na-akpali akpali igwuri egwu na ịtụrụ ndụ n’ọchịchịrị, n’ihi na onyinyo nile ha ga-ese n’uche ha ga-apụ iche.” Ma taa, “onyinyo ndị telivishọn, sinima na egwuregwu kọmputa na-akụnye n’uche ụmụaka” na-emenye ha egwu. Dr. Sigman kwuru, sị: “Ọ na-ada ka ndụmọdụ oge ya gafeworo bụ́ ikwu sị, gụkwuo akwụkwọ ma belata ikiri telivishọn, ma ọ dị mkpa ka e kwughachi ya.”
Iji Ihe Eme Ihe n’Ụzọ Na-ahaghị Nhata
Pasent 20 nke ndị bi n’ụwa na-eji pasent 86 nke ngwá ahịa na ozi ndị dị n’ụwa eme ihe ugbu a, ka akwụkwọ bụ́ The State of World Population 2001 na-ekwu. Akụkọ ahụ, bụ́ nke Òtù Na-ahụ Maka Ụba Mmadụ nke Mba Ndị Dị n’Otu, na-adọ aka ná ntị banyere “ndịrịta iche dị ukwuu ‘n’iji ihe eme ihe’” n’etiti ndị bi ná mba ndị mepere emepe na ndị bi ná mba ndị ka na-emepe emepe. Dị ka ihe atụ, “nwatakịrị a mụrụ taa ná mba mepere emepe ga-eji ihe eme ihe ma kpata mmetọ n’ụzọ ka ukwuu n’oge ndụ ya karịa ụmụaka 30 ruo 50 a mụrụ ná mba ndị ka na-emepe emepe. Ka ọ dị ugbu a, otu ụzọ n’ụzọ ise nke ndị bi n’ụwa bụ́ ndị bi ná mba ndị mepere emepe na-ekubanye ihe karịrị ọkara nke carbon dioxide n’ikuku, ebe otu ụzọ n’ụzọ ise nke ndị kasị daa ogbenye na-ekupụta nanị pasent 3,” ka akụkọ ahụ na-ekwu. Ọzọkwa, obosara ala na-emepụta ihe ma ọ bụ oké osimiri bụ́ nke dị mkpa iji kwado ụzọ ndụ nke otu onye bi ná mba ndị mepere emepe fọrọ nke nta ka o jiri okpukpu anọ karịa nke a chọrọ iji kwado ndị bi n’ala ndị ka na-emepe emepe.
Ihe Omume Mbara Igwe nke China
N’April 1, 2002, ụgbọ mbara igwe China bụ́ Shenzhou nke Atọ bụ́ nke mmadụ na-eduzighị feturu n’enweghị nsogbu na Inner Mongolia mgbe otu izu gasịrị kemgbe e zipụrụ ya, ka Akụkọ Ụwa BBC kwuru. Ụgbọ mbara igwe ahụ bu “mmadụ aka mere”—ihe a tụrụ atụ nke e tinyegasịrị ihe mgbaàmà maka ịgụkọ ọ̀tụ̀tụ̀ ikuku oxygen na ọ̀tụ̀tụ̀ okpomọkụ na ịjụ oyi, dị ka ihe nnwale nke usoro ígwè ọrụ ndị na-akwado ndụ bụ́ ndị a pụrụ iji mee ihe n’ụgbọ mbara igwe mmadụ ga-eduzi n’ọdịnihu. Ndị ọrụ mbara igwe nke China ekwupụtawo atụmatụ ha maka iziga mmadụ na mbara igwe tupu afọ 2005 agafee. “Ihe mgbaru ọsọ na-adịte aka karị nke ụlọ ọrụ mbara igwe nke China setịpụrụ n’onwe ya bụ iziga ụmụ mmadụ n’Ọnwa ka ọ na-erule afọ 2010,” ka akụkọ ahụ na-ekwu.
Ọgwụ na Ndị Agadi
“Ndị gaferela afọ 60 na-aṅụ ná nkezi ụdị ọgwụ atọ, bụ́ nke ji okpukpu atọ karịa nke ndị ọrịa na-emebeghị agadi na-aṅụ,” ka magazin Germany bụ́ Der Spiegel, na-ekwu. “Otú ọ dị, ihe ize ndụ nke ngwakọta nke [ọgwụ], nakwa nke mmetụta na-adịghị mma ọ na-enwe n’ahụ́, na-arịwanye elu nke ukwuu dabere n’ọgwụ ole a ṅụrụ.” Nsogbu ọzọ pụrụ ịdapụta bụ na “mgbe mgbe, ndị dọkịta ezinụlọ . . . adịghị echebara mbelata nke akụrụ na-ebelata ịrụ ọrụ n’oge mmadụ kara nká echiche.” Ihe na-esi na ya apụta bụ na ọgwụ pụrụ ịkarị mmadụ akarị n’ahụ́. N’ihi ya, “ọ̀tụ̀tụ̀ ọgwụ dị mma maka onye dị afọ 40 pụrụ imerụ onye dị afọ 70 ahụ́,” ka Der Spiegel na-akọwa. “Ọtụtụ ndị agadi na-eme ka ihe ka njọ site n’aṅụghị mmiri nke ọma.” Nanị mmiri ịgwụ n’ahụ́, ka akụkọ ahụ na-agbakwụnye, pụrụ ịkpata mmetụta ndị na-adịghị mma bụ́ ndị yiri nke ọgwụ ndị na-akwụsị ahụ́ mgbu, ndị na-akụjụ ahụ́, na ndị na-akwụsị ọbara mgbali elu na-akpata. Mgbaàmà ya pụrụ ịgụnye ntigharị anya, uche mkpasasị, na anya ajụ̀, bụ́ ndị a na-ewerekarị nnọọ dị ka akụkụ nke ịka nká.
Ọdụm Ndị Na-apụ n’Anya
“Ọdụm pụrụ ịpụ n’anya n’oge na-adịghị anya n’akụkụ dị ukwuu nke Africa,” ka magazin bụ́ New Scientist na-akọ. A ga-achọ otu ụdị ọdụm dị 500 ruo 1,000 iji nweta ihe dị ka ọdụm 200 nke ihe mejupụtara ya bụ oké na nne, oké na nne—nke zuru nnọọ ezu iji zere oké ọdụm ịgba nne ọdụm otu nne ji ya na ya. Dị ka Òtù Na-ahụ Maka Nchekwa Ụwa si kwuo, ọdụm ndị bi n’Ebe Ọdịda Anyanwụ nakwa n’Etiti Africa erughị nnọọ ọnụ ọgụgụ ahụ. “Ọ bụ ọnọdụ tara akpụ,” ka Hans Bauer nọ na Mahadum Leiden nke dị na Netherlands na-ekwu. “Ọ dịghị otu ụdị nke anyị ji n’aka na ọ ga-anọgide n’ebe ahụ.” Isi ihe kpatara mbelata ahụ bụ mwakpo ụmụ mmadụ na-awakpo ebe obibi ụmụ anụmanụ ahụ. Ọdụm chọrọ ebe sara mbara ha ga na-achụ nta—ihe ruru square kilomita 200 maka otu oké ọdụm. “Ọdụm bụ anụ ụmụ anụmanụ ụfọdụ na-adabere na ya,” ka Bauer na-adọ aka ná ntị. “Nke a bụ ihe mgbaàmà—eziokwu ahụ bụ́ na ọdụm na-eche mkpochapụ ihu ugbu a pụrụ ịpụta na ụmụ anụmanụ ndị ọzọ pụrụ iche mkpochapụ ihu n’afọ 20 ruo 30 na-abịanụ.”
Ịkpọ Iyi n’Ebe Ọrụ
Okwu rere ure aghọwo ihe a na-anụkarị n’ọtụtụ ebe ọrụ, ka akwụkwọ akụkọ bụ́ The Gazette nke Montreal, Canada na-akọ. Ụfọdụ ndị ọkachamara na-ekwu na ịkpọ iyi na-eme ka nrụgide a na-enwe n’ebe ọrụ dị ukwuu. Karen Harlos, bụ́ prọfesọ n’akparamàgwà n’ụlọ ọrụ na Mahadum McGill, kwuru, sị: “Ọ bụrụ na okwu rere ure bụ akụkụ nke nkatọ na-adịghị mma, ọ pụrụ inwe mmetụta dị njọ n’ihe onye ọrụ na-arụpụta, n’ùgwù onwe onye ya ma ọ bụ n’ahụ́ ike ya.” Dị ka akwụkwọ akụkọ ahụ si kọọ, “ọ bụ onyeisi na-esetịpụkarị ihe nlereanya” n’ebe ọrụ bụ́ nke ndị ọzọ na-agbaso. Ọ bụrụ na ị na-enwe nchegbu banyere ịkpọ iyi nke na-ewere ọnọdụ n’ebe ọrụ gị, The Gazette na-atụ aro ka i buru ụzọ gakwuru “onye ahụ i chere na-ekwu ihe ị na-achọghị ma jiri olu ọma rịọ ya ka ọ kwụsị ịkpọ iyi n’ebe ị nọ.”
“Ọdọ Mmiri Ndị Dị Elu” Dị n’Ihe Ize Ndụ
Ọkara nke ndị bi n’ụwa na-adabere ná mmiri dị mma bụ́ nke na-esi n’ugwu asọdata, ka akwụkwọ akụkọ bụ́ The Toronto Star nke Canada na-akọ. Usoro ugwu ndị a, bụ́ ndị a kpọrọ “ọdọ mmiri ndị dị elu nke ụwa” n’otu akụkọ nke òtù Mba Ndị Dị n’Otu wepụtara iji kaa akara Afọ Òtù UN Maka Ugwu, bụ ndị a na-etinye nnọọ n’ọnọdụ dị ize ndụ. Dị ka Star si kọọ, ọ bụ “mgbanwe nke ihu igwe, mmetọ, agha, mmụba nke ọnụ ọgụgụ ụmụ mmadụ, mgbukpọsị nke oké ọhịa na ojiji ụlọ ọrụ ndị na-arụ ọrụ ugbo, ndị na-egwupụta akụ̀ ndị dị n’ime ala na ndị na-arụ ebe ndị a na-eme njem nleta na-eji ala emebiga ihe ókè,” na-akpata mmebi ahụ. Akụkọ ahụ dọrọ aka ná ntị na “mmebi a a na-emebi ala ga-akpatakwu idei mmiri, ala ozize na ụnwụ nri,” ka akwụkwọ akụkọ ahụ kọrọ.
Iri Ahụ́ nke Mmanya Na-aba n’Anya
Otu onye n’ime mmadụ 13 ọ bụla nọ na Britain bụ onye mmanya na-aba n’anya riri ahụ́, ka akwụkwọ akụkọ bụ́ The Independent nke London na-akọ, bụ́ nke mere ka iri ahụ́ nke mmanya na-aba n’anya bụrụ nke “ji okpukpu abụọ karịa iri ahụ́ nke ọgwụ ndị iwu megidere ma ọ bụ ọgwụ ndị dọkịta na-edepụtara mmadụ.” Site na 1994 ruo 1999, ọnwụ ndị a na-ekwu na ọ bụ iji mmanya na-aba n’anya eme ihe n’ụzọ na-ezighị ezi kpatara ha kpọmkwem—gụnyere ndị ọrịa obi, ọrịa imeju, na nsí aṅụrụma na-eme n’ahụ́ kpatara—ji ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ pasent 43 rịa elu. Ihe mberede ndị e nwere n’ihi ndị mmadụ ịkwọ ụgbọala mgbe mmanya na-egbu ha rịrị elu site na 10,100 n’afọ 1998 ruo 11,780 n’afọ 2000, ọ bụkwa ya kpatara onwụ nke 1 onye n’ime mmadụ 7 ọ bụla nwụrụ n’okporo ụzọ. Pasent 60 nke ndị a na-arụrụ ọrụ na-enwe nsogbu n’ebe ndị ha were n’ọrụ bụ́ ndị na-aṅụ oké mmanya nọ, pasent 40 nke ndị na-eme mpụ ihe ike, na-eme otú ahụ mgbe ha ṅụrụ mmanya na-aba n’anya. Eric Appleby, bụ́ onye ntụzi ọrụ nke òtù ọrụ ebere a na-akpọ Òtù Na-ahụ Maka Iji Mmanya Na-aba n’Anya Eme Ihe n’Ụzọ Na-ezighị Ezi kwuru, sị: “Ọ̀tụ̀tụ̀ nke nsogbu ndị ahụ ruworo n’ihe banyere mmetụta ha na-enwe n’ahụ́ ike, mmekọrịta na ego ndị mmadụ, n’ekwughị maka mmetụta ọ na-enwe n’ozi ndị a na-ejere ọha na eze, . . . na-emesi ike mkpa ọ dị ịgbakọ aka mee ihe ngwa ngwa.”