Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Olileanya Maka Udo Ọ̀ Na-adakpọ Adakpọ?

Olileanya Maka Udo Ọ̀ Na-adakpọ Adakpọ?

Olileanya Maka Udo Ọ̀ Na-adakpọ Adakpọ?

“Taa ọ na-adị anyị ka anyị na-ebi . . . n’etiti oké ifufe, bụ́ ọdachi na-enweghị atụ.”—Akwụkwọ akụkọ bụ́ “La Repubblica,” nke Rom, Ịtali.

MGBE ndị na-eyi ọha egwu wakposịrị New York City nakwa Washington, D.C. n’afọ gara aga, ọtụtụ ndị chewere banyere ihe ga-abụ ọdịnihu nke ihe a kpọrọ mmadụ karịa mgbe ọ bụla ọzọ. Ọtụtụ ugboro, ụlọ ọrụ TV egosiwo Ụlọ Elu Abụọ ahụ Yiri Ibe Ha ka ha na-ere ọkụ ma na-adakpọ—nakwa ọnọdụ ndakpọ olileanya nke ndị lanarịrịnụ. Onyinyo ndị ahụ ewetaworo ndị mmadụ gburugburu ụwa obi mgbawa. E nwewo obi mgbawa tinyere mmetụta na ụwa enwewo mgbanwe dị ịrịba ama. Ò nwewo?

Agha dara mgbe ihe ahụ mere na September 11, 2001 gasịrị. N’oge na-adịghị anya, mba ndị na-esebu okwu jikọtara aka iji gbochie iyi ọha egwu. Ná ngụkọta, ọnụ ọgụgụ ndị nwụworonụ na ihe ndị e bibiri adịwo ukwuu. Ma, ikekwe, mgbanwe nke pụtara ìhè karị n’anya ọtụtụ ndị n’ụwa nile abụwo mmetụta nke anọkwaghị ná nchebe, mmetụta na-esiwanye ike na ọ dịghị onye ọ bụla nọ ná nchebe n’ezie, n’ebe ọ bụla.

Ndị ndú ụwa na-eche ọtụtụ nsogbu ihu. Ndị odeakụkọ na ndị na-akọwa ihe na-emenụ na-eche banyere ụzọ a pụrụ isi mee ka iyi ọha egwu ghara ịgbasa ngwa ngwa, ebe o yiri ka ọ̀ bụ ịda ogbenye na ịnụbigara ihe ọkụ n’obi ókè na-akwalite ya—nsogbu yiri ka ọ dịghị onye ọ bụla maara ụzọ e si agwọta ya. Ikpe na-ezighị ezi jupụtara nnọọ n’ụwa nke na ihe ọ bụla pụrụ ịkpata ọgba aghara. Ụdị mmadụ nile na-eche ma ọ̀ dị mgbe a ga-ewepụ nsogbu ndị ụmụ mmadụ na-enwe. Ọ̀ dị mgbe agha—ya na nhụsianya, ọnwụ, na mbibi ọ na-akpata—ga-akwụsị?

Ọtụtụ nde ndị mmadụ na-eburu ajụjụ ndị a abanye ná njikọ okpukpe dị iche iche. Ma, ndị ọzọ na-enwe obi abụọ karị. Olee banyere gị? Ì chere na ndị ndú okpukpe pụrụ ịza ajụjụ ndị dị otú ahụ? Hà pụrụ n’ezie inye aka mee ka e nwee udo site n’ekpere ha?