Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Site n’Ịbụ Onye Na-eme Mkpọsa Maka Mgbanwe Ọchịchị gaa n’Ịbụ Onye Kraịst Nọpụrụ Iche

Site n’Ịbụ Onye Na-eme Mkpọsa Maka Mgbanwe Ọchịchị gaa n’Ịbụ Onye Kraịst Nọpụrụ Iche

Site n’Ịbụ Onye Na-eme Mkpọsa Maka Mgbanwe Ọchịchị gaa n’Ịbụ Onye Kraịst Nọpụrụ Iche

DỊ KA LADISLAV ŠMEJKAL SI KỌỌ

Mgbe a masịrị m ikpe, e dughachiri m n’ọnụ ụlọ mkpọrọ m. Amalitere m ozugbo izi enyi m nọ n’okpukpu ụlọ nke abụọ ozi nzuzo site n’ịkụ aka n’ahụ́ ụlọ. Ọ nọ na-eche ịnụ mkpọrọ afọ ole a tụrụ m.

“Afọ iri na anọ,” ka m gwara ya site n’ịkụrụ ya aka n’ahụ́ ụlọ.

O juru ya anya. N’ihi ya, ọ jụrụ m, sị: “Ị̀ sịrị ọnwa iri na anọ?”

“Ee e,” ka m zara. “Afọ iri na anọ.”

Ọ BỤ n’afọ 1953. Ebe o mere—Liberec, Czechoslovakia (ebe bụzi Czech Republic). Mgbe ahụ, adị m afọ 19 ma na-eme mkpọsa maka mgbanwe ọchịchị. Anyị, bụ́ ndị na-eme mkpọsa maka mgbanwe ọchịchị, kpọsara echiche anyị site n’ikesa mpempe akwụkwọ ndị na-akatọ Òtù Ọchịchị Kọmunist, bụ́ nke na-achị n’oge ahụ. E lere ihe anyị na-eme anya dị ka ajọ mgba okpuru—ọ bụ ya mere e ji maa m ikpe ịga mkpọrọ ruo ogologo oge.

Anọọla m rịị ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ otu afọ n’ebe a na-edebe ndị e ji eji tupu a maa m ikpe. Tupu a maa ndị mkpọrọ ikpe, a na-etinye ha abụọ abụọ n’otu ọnụ ụlọ mkpọrọ, sitekwa n’oge ruo n’oge, a na-abịa kpọrọ ha, kechie ha anya ka e wee gbaa ha ajụjụ. A dịghị ekwe ka anyị kwuo okwu mgbe anyị nọ n’ọnụ ụlọ mkpọrọ anyị, n’ihi ya anyị na-atakwunyere ibe anyị ihe ma ọ bụ na-ekwurịta okwu nzuzo site n’ịkụ aka n’ahụ́ ụlọ.

N’oge na-adịghị anya, achọpụtara m na ọtụtụ n’ime ndị nọ n’ụlọ mkpọrọ ahụ bụ Ndịàmà Jehova. N’ụlọ mkpọrọ anyị, a na-agbanwekarị ndị mkpọrọ nọ n’ụlọ mkpọrọ ndị ahụ kwa ọnwa ma ọ bụ kwa ọnwa abụọ. Ebe ọ bụ na m nwere mmasị na Bible, enwere m obi ụtọ mgbe e mesịrị tinyekọta mụ na otu Onyeàmà n’otu ọnụ ụlọ mkpọrọ. Ka oge na-aga, amalitere m isoro Ndịàmà na-amụ Bible.

Echere m na ị pụrụ ịkọwa nkwurịta okwu anyị dị ka ọmụmụ Bible, n’agbanyeghị na anyị enweghị Bible ma ọ bụ akwụkwọ e ji amụ Bible. N’eziokwu, ahụtụbeghị m Bible ná ndụ m nile. Ma anyị na-ekwurịta okwu—Onyeàmà ahụ na-akọwa isiokwu Bible ndị o bu n’isi—mụ ana-edetụkwa ihe ndị ọ na-ekwu. Anyị na-eme ihe ndị a nile ka anyị nọ onwe anyị nso, na-atakwunyere onwe anyị ihe.

Nanị ihe anyị nwere bụ akwụkwọ e ji aga mposi na mbọ́. Ana m eji mbọ́ ahụ edetu ihe n’akwụkwọ ahụ e ji aga mposi. Ebuuru m ọtụtụ n’ime akụkụ Akwụkwọ Nsọ ndị anyị tụlere n’isi. Ndịàmà duziiri m ọmụmụ ihe kụzikwaara m abụ Alaeze. Otu Onyeàmà gwara m, sị: “Ị nọ n’ụlọ mkpọrọ ugbu a dị ka onye na-emegide ọchịchị, ma n’ọdịnihu a pụrụ ịtụ gị mkpọrọ maka ịbụ otu n’ime Ndịàmà Jehova.”

N’ikpeazụ, mgbe a gbasịrị m ọtụtụ ajụjụ, a mara m ikpe ma kpọga m n’ogige ọrụ mmanye dịdewere obodo bụ́ Jáchymov. Ka ọ na-erule mgbe ahụ, ekwenyesiri m ike na otu ụbọchị aga m aghọ otu n’ime Ndịàmà Jehova.

Ịnọ na Mkpọrọ Ruo Ọtụtụ Afọ

Mgbe m rutere n’ogige ahụ a na-egwupụta akụ̀ dị n’ime ala bụ́ uranium, amalitere m ozugbo ịchọ Ndịàmà. Ma n’oge na-adịghị anya achọpụtara m na a kpọgawo ha ebe ọzọ. Otú ọ dị, a hapụrụ otu Onyeàmà n’ihi na ọ bụ osi ite. Ọ gbazinyere m otu Bible kaworo nnọọ nká bụ́ nke e zoworo n’ọtụtụ ebe. Ya mere agụrụ m akụkụ Akwụkwọ Nsọ ndị m bu n’isi. Ka m na-agụ ha, anọgidere m na-agwa onwe m, sị: ‘Ehee, ọ bụ kpọmkwem ihe ụmụnna ahụ kụziiri m.’

Mgbe ihe dị ka otu ọnwa gasịrị, a kpọfere m n’otu ogige a na-akpọ Bytiz, nke dị nso n’obodo Příbram. Ezutere m Ndịàmà ndị ọzọ n’ebe ahụ. Na Bytiz anyị na-enweta mgbe mgbe akwụkwọ ndị e ji amụ Bible bụ́ ndị e zobatara ezobata. Ọ bụ ezie na ndị na-elekọta ogige ahụ gbalịrị ịchọpụta ụzọ ọ na-esi erute anyị aka, ha achọpụtaghị ya ma ọlị. Anyị nwere ihe ruru ndị mkpọrọ 14 na-ekerechi òkè anya n’ịgbara ndị ọzọ àmà. Ọkara n’ime ha bụ Ndịàmà e mere baptizim, ọkara nke ọzọ bụ ndị ọ dị otú ọ dị m, ndị nabatara nkwenkwe Ndịàmà n’ụlọ mkpọrọ.

Ọtụtụ n’ime anyị chọrọ igosipụta nrara anyị raara onwe anyị nye Chineke site na baptizim ime mmiri. Ma n’ihi na mmiri adịghị—ma ọ bụ, n’ịkpọ ihe aha, n’ihi enweghị arịa mmiri buru ibu otú kwesịrị ekwesị—imikpu mmadụ ná mmiri adịghị mfe. N’ihi ya, n’oge ahụ, ọtụtụ ndị aghaghị ichere ruo mgbe a tọhapụrụ ha tupu e mee ha baptizim. Otú ọ dị, n’ogige Bytiz ahụ, e nwere nnukwute ụlọ ndị dị elu ndị na-eme ka ígwè na-ewebata ikuku n’ebe a na-egwupụta coal jụọ oyi. N’etiti afọ ndị 1950, e mere ọtụtụ n’ime anyị baptizim na tank mmiri dị n’otu n’ime ụlọ elu ndị ahụ.

Mgbe afọ ole na ole gasịrị, na March 1960, onye uwe ojii na-elekọta ndị a tụrụ mkpọrọ n’ihi ndọrọ ndọrọ ọchịchị kpọrọ m òkù. O kwuru na ọ bụrụ na mụ agwa ya banyere ihe ndị mkpọrọ ndị ọzọ na-eme, na ya ga-eme ka e belata afọ ole m ga-anọ n’ụlọ mkpọrọ. Mgbe m jụrụ ime otú ahụ, ọ malitere ịkpọ m iyi. “Ị jụrụ ohere nke inwere onwe gị,” ka o tiri ná mkpu. “M ga-ahụ na ị nọgidere n’ebe a! Ị ga-anwụ n’ebe a.” Otú ọ dị, mgbe ọnwa abụọ gasịrị, gọọmenti nyere iwu ka a gbaghara m, mgbe m nọsịkwara ngụkọta nke afọ asatọ n’ụlọ mkpọrọ, alara m.

Nnwere Onwe Na-adịteghị Aka

A machibidowo ọrụ Ndịàmà Jehova iwu na Czechoslovakia kemgbe April 1949, n’ihi ya, n’oge na-adịghị anya, achọpụtara m na mmadụ ife Chineke n’ọnọdụ a kpọrọ nke nnwere onwe yitụkwara mmadụ ime otú ahụ mgbe ọ nọ n’ụlọ mkpọrọ. Ugbu a a tọhapụsịrị m, echere m nsogbu ọzọ ihu. N’oge ahụ, ọ bụ iwu na nwoke ọ bụla nọ ná mba ahụ ga-abụ onye agha ruo afọ abụọ.

A gụpụrụ ụfọdụ ndị ikom na-arụ ọrụ n’ụlọ ọrụ achụmnta ego ụfọdụ nke gọọmenti n’ije ozi agha. Dị ka ihe atụ, a gụpụrụ ndị na-arụ ọrụ n’ebe ndị a na-egwupụta coal. Ebe ọ bụ na arụtụwo m ọrụ igwupụta coal, enwetara m ọrụ n’otu n’ime ebe ndị ahụ a na-egwupụta coal. A nabatara m n’ụzọ na-ekpo ọkụ n’ebe ahụ. “Echegbula onwe gị banyere ịbụ onye agha,” ka a gwara m. “Ọ gaghị esiri anyị ike ime ka ị ghara ije ozi agha.”

Mgbe ọnwa abụọ gasịrị, kemgbe e nyere m akwụkwọ na-ekwu na e debawo aha m n’òtù ndị agha, ndị na-elekọta ebe ahụ a na-egwupụta coal mesighachiri m obi ike, sị: “Echegbula onwe gị, ọ ghaghị ịbụ na ha mehiere ihe. Anyị ga-edegara ndị agha akwụkwọ, okwu ebie.” Ma okwu ahụ ebighị. Ka oge na-aga, otu onyeisi nọ n’ebe ahụ bịakwutere m ma rịọ mgbaghara, sị: “Nke a bụ nke mbụ ọ na-eme, ma ị ghaghị ịga hụ ndị agha.” Mgbe m jụrụ ije agha, n’ihi akọ na uche m, e jidere m ma kpụga m n’ogige ndị agha kasị nso.—Aịsaịa 2:4.

Iche Òtù Ikpe Ihu

Mgbe a tụsịrị m mkpọrọ n’obodo Kladno na January 1961, a gbalịrị ime ka m kweta ịghọ onye agha. Onyeisi ndị agha na-elekọta ebe ahụ haziri nzukọ. A kpọgara m n’ụlọ ezumezu nwere nnukwute tebụl dị gburugburu bụ́ nke nwere nnukwute oche ndị nwere aka bụ́ ndị e ji akpụkpọ anụ mee. N’oge na-adịghị anya ndị ọfisa ahụ malitere irute ma na-anọdụ ala gburugburu tebụl ahụ. Onyeisi ha gwara m aha ha n’otu n’otu. Ya anọdụzie ala ma kwuo, sị: “Ugbu a, gwa anyị banyere okpukpe gị a.”

Mgbe m kpesịrị ekpere n’ime obi m ngwa ngwa, amalitere m ịgwa ha okwu. N’oge na-adịghị anya, mkparịta ụka ahụ gafere n’evolushọn, ha sịrị na evolushọn dabeere n’eziokwu sayensị. N’otu ogige ọrụ mmanye m nọrọ tupu a kpọta m n’ebe a, amụwo m akwụkwọ nta bụ́ Evolution Versus the New World. * N’ihi ya, o juru ndị isi ndị agha ahụ anya na m nwere ike inye ha ihe àmà na-egosi na evolushọn bụ nchepụta a na-anwapụtaghị anwapụta.

Mgbe nke ahụ gasịrị, otu mejọ, onye o doro anya na o kpetụrụ okpukpe Katọlik, kwuru okwu. “Gịnị ka i chere banyere Nwa Agbọghọ Na-amaghị Nwoke bụ́ Meri?” ka ọ jụrụ. “Oleekwa otú i si ele Mas dị nsọ anya?” Azara m ajụjụ ya, ma kwuzie, sị: “Nna Anyị Ukwu, achọpụtawo m na o nwere okpukpe ị na-ekpe, n’ihi na ajụjụ gị dị iche na nke ndị ọzọ.”

“Mba! Mba! Mba! Enweghị m okpukpe m na-ekpe!” ka o ji olu dara ụda kwuo. Ná mba ahụ nọ n’okpuru Ọchịchị Kọmunist, ọ na-esi ike ịkwanyere ndị na-ekwu na ha bụ Ndị Kraịst ùgwù ma ọ bụ inye ha ibu ọrụ. N’ihi ya, mgbe m zasịrị ajụjụ ndị ahụ ọ jụrụ, onye ọfịsa ahụ etinyeghị ọnụ ọzọ ná nkwurịta okwu ahụ. Enwere m nnọọ ekele maka inweta ohere iji kọwaara ndị ikom ahụ nkwenkwe Ndịàmà Jehova.

Ohere Ndị Ọzọ Dapụtaranụ Iji Gbaa Àmà

Mgbe ụbọchị ole na ole gasịrị, a kpọgara m n’otu ụlọ ndị agha dị na Prague, e debekwara m n’ebe ndị agha ga na-eche m nche. Usoro pụrụ iche e ji na-eche m nche tụrụ onye agha nke mbụ bu égbè e kenyere ka ọ na-eche m nche n’anya. “Nke a bụ nke mbụ anyị na-eche mmadụ nche n’onwe anyị,” ka ọ gwara m. Ya mere, akọwaara m ya ihe mere e ji tụọ m mkpọrọ. Nke a masịrị ya nke ukwuu nke na ọ nọdụrụ ala—tinye égbè ya n’etiti ụkwụ ya abụọ—ma gee m ntị. Mgbe awa abụọ gasịrị, onye agha ọzọ nọchiri ya, ọ jụkwara m ajụjụ ndị yiri nke onye nke mbụ ahụ jụrụ m, anyị nwekwara nkwurịta okwu dabeere na Bible nke yiri nke mbụ ahụ.

N’ime ụbọchị ndị sochirinụ, enwere m ohere ịgwa ma ndị na-eche m nche ma ndị mkpọrọ ndị ọzọ okwu mgbe ndị nche nyere ikike ime otú ahụ. Ọbụna ndị nche ahụ na-emepe ọnụ ụlọ mkpọrọ ma kwe ka ndị mkpọrọ zukọta maka nkwurịta okwu dabeere na Bible! Ka oge na-aga, amalitere m inwe nchegbu na a ga-amata banyere nnwere onwe ahụ ndị nche ahụ mere ka m nwee ịgwa ndị mkpọrọ ndị ọzọ okwu nakwa na ọ ga-akpata nsogbu. Ma e zochiri ihe nile ahụ.

Mgbe e mesịrị kpụga m n’ụlọikpe ka a maa m ikpe, ndị m gwara okwu banyere nkwenkwe m gbara m ume. A mara m ikpe ịga mkpọrọ afọ abụọ, bụ́ nke a gbakọtara ya na afọ isii ahụ m nọfọrọ n’ihi mgbaghara a gbaghaara m n’ikpe mbụ ahụ a mara m. Nke a pụtara na m nwere ihe dị ka afọ asatọ m ga-anọ n’ụlọ mkpọrọ.

Ahụrụ M Enyemaka Chineke

Ọtụtụ mgbe, ahụrụ m enyemaka Chineke ka m na-esi n’otu ogige agafe n’ogige ọzọ nakwa site n’otu ụlọ mkpọrọ agafe n’ụlọ mkpọrọ ọzọ na Czechoslovakia. Mgbe m rutere n’ụlọ mkpọrọ dị na Valdice, ọchịagha ebe ahụ jụrụ m ihe mere e ji tụọ m mkpọrọ n’ebe ahụ. “Ajụrụ m ije agha,” ka m zaghachiri. “Ịlụ agha megidere nkwenkwe m.”

“Ọ gaara adị mma ma a sị na mmadụ nile nwere echiche dị otú ahụ,” ka o ji ọmịiko zaghachi. Ma mgbe o chesịrị echiche banyere ya ruo obere oge, o kwuru, sị: “Otú ọ dị, ebe ọ bụ na ihe ka ọtụtụ ná ndị mmadụ taa adịghị eche echiche otú ahụ, anyị aghaghị inye gị ntaramahụhụ—ntaramahụhụ siri nnọọ ike!”

E tinyere m ná ngalaba na-akanye ihe n’ugegbe, bụ́ ngalaba ntaramahụhụ. Leenụ, n’agbanyeghị na a mara m ikpe n’ihi na m jụrụ ije agha ebe ọ bụ na m bụ otu n’ime Ndịàmà Jehova, a ka lekwara m anya dị ka onye nọ n’ụlọ mkpọrọ n’ihi ndọrọ ndọrọ ọchịchị, n’ihi ya kwa, e nyere m ọrụ ndị siri ike karị. Ịkanye ihe n’ugegbe a na-eji eme ọkụ eletrik na nke e ji emepụta ihe ndị oké ozu ndị ọzọ e ji ugegbe eme bụ ọrụ siri nnọọ ike n’ihi na a ghaghị ime ihe ndị dị otú ahụ n’ụzọ na-enweghị ntụpọ. Dị ka ọ na-adịkarị, ndị mkpọrọ na-eweta ọrụ ndị ha rụcharala ma chọpụtazie n’echi ya na e weghachila ọkara n’ime ha ka e mezie ha. Ya mere ọ na-esi nnọọ ike ịrụzu ole a chọrọ ka a rụzuo.

Ụbọchị m batara ná ngalaba ahụ na-akanye ihe n’ugegbe, ebu m ụzọ chere ka onyeisi ngalaba ahụ bịa. Mgbe o rutere, ọ malitere ịbara ndị mkpọrọ o chere na ha adịghị arụsi ọrụ ike otú kwesịrịnụ mba. O si n’ebe ahụ bịakwute m ma jụọ, sị: “Gịkwanụ? Gịnị mere na ọ dịghị ọrụ ị na-arụ?”

Akọwara m na abụ m onye mkpọrọ e kenyere ọrụ ọhụrụ. Ọ kpọọrọ m gaa n’ọfịs ya ma jụọ m ajụjụ ndị a na-ajụkarị, na-ajụ ihe mere e ji tụọ m mkpọrọ. Mgbe m kọwasịịrị ya ọnọdụ m, o kwuru, sị: “Ya bụ na ị bụ otu n’ime Ndịàmà Jehova?”

“Ee,” ka m zara.

Omume ya gbanwere. “Echegbula onwe gị,” ka o kwuru. “Anyị enwewo ọtụtụ Ndịàmà Jehova n’ebe a. Anyị na-akwanyere ha nile ùgwù, n’ihi na ha na-arụsi ọrụ ike ma na-akpa ezi àgwà. M ga-ahụ na a na-ekenye gị ole ị ga-arụchali.”

Mgbanwe àgwà nke onyeisi ọrụ ahụ tụrụ m nnọọ n’anya. Ekelere m Jehova na ndị kwere ekwe ibe m ahụ m na-amaghị, bụ́ ndị mere ka Ndịàmà nwee aha ọma n’ụlọ mkpọrọ ahụ. N’eziokwu, ahụrụ m enyemaka ịhụnanya nke Jehova n’oge nile ahụ m nọrọ n’ụlọ mkpọrọ.

N’agbanyeghị otú ọnọdụ m si bịa sie ike, anọgidere m na-enwe obi ike na m ga-emesị zute ụmụnna m Ndị Kraịst. Mgbe ahụ aga m ahụ ezi mmụmụ ọnụ ọchị ha ma nweta agbamume ha. E wezụga ha, ọ gaara esiri m ike karị ịnagide mkpọrọ ahụ a tụrụ m.

O yiri ka ọ̀ bụ nanị imegwara mmeso obi ọjọọ e mesoro ha ka ọtụtụ ndị mkpọrọ na-eche. Ma ọ dịtụghị mgbe m chere otú ahụ. Aghọtara m na m na-ata ahụhụ maka irube isi n’ụkpụrụ ezi omume nke Chineke. N’ihi ya, amatara m na maka ụbọchị ọ bụla m nọrọ n’ụlọ mkpọrọ, Jehova gụnyeere m ọtụtụ ụbọchị ndị dị ebube bụ́ ndị a na-apụghị ịgụta ọnụ, n’ụwa Paradaịs ọhụrụ ya.—Abụ Ọma 37:29; 2 Pita 3:13; Mkpughe 21:3, 4.

Enwere M Ekele Maka Ngọzi Ndị M Na-enweta Taa

Na May 1968, mgbe m nọsịrị ihe karịrị afọ 15 n’ụlọ mkpọrọ, a tọhapụrụ m n’ikpeazụ. Ná mmalite, o siiri m ike ịgwa ndị mmadụ okwu, bụ́ otú ọ na-adịkarị ndị nọworo n’etiti ndị mkpọrọ ma ọ bụ ndị lekọtara ndị mkpọrọ n’ihe dị ukwuu n’oge ndụ ha. Ma n’oge na-adịghị anya, ụmụnna m Ndị Kraịst nyeere m aka ịmalite ikere òkè n’ọrụ nkwusa, bụ́ nke a ka nọ na-arụ n’okpuru mmachibido iwu.

N’ime izu ole na ole mgbe a tọhapụsịrị m, ezutere m Eva. N’agbanyeghị mmegide kpụ ọkụ n’ọnụ ezinụlọ ya megidere ha, ya na nwanne ya nwoke ejiriwo obi ike guzosie ike maka eziokwu Bible n’ihe dị ka afọ atọ gara aga. N’oge na-adịghị anya, anyị malitere ikerekọ òkè n’ọrụ nkwusa. Anyị rụkwara ọrụ n’ibipụta akwụkwọ ndị e ji amụ Bible. E biri ha n’ebe obibi akwụkwọ dị nzuzo n’okpuru ala. E mesịa, na November 1969, anyị lụrụ.

Na 1970, a mụrụ nwa mbụ anyị, bụ́ Jana. Ka oge na-aga, amalitere m ịdị na-eleta ọgbakọ dị iche iche ná ngwụsị izu dị ka onye ozi na-ejegharị ejegharị nke Ndịàmà Jehova, na-eleta ha iji gbaa ha ume n’ụzọ ime mmụọ. Mgbe m na-arụ ọrụ a na 1975, e jidere m ma tụọ m mkpọrọ ọzọ. Ma na nke oge a, anọrọ m nanị ọnwa ole na ole n’ebe ahụ. E mesịa, na 1977, a mụrụ nwa anyị nwoke, bụ́ Štěpán.

N’ikpeazụ, na September 1, 1993, Czech Republic nyere Ndịàmà Jehova nkwado iwu. N’afọ sochirinụ, nwa anyị nwanyị, bụ́ Jana, lụrụ Dalibor Dražan, Onye Kraịst bụ́ okenye. E mesịa, na 1999, nwa anyị nwoke, bụ́ Štěpán, bụ́ ohu na-eje ozi, lụrụ Blanka, bụ́ onye na-eje ozi oge nile. Ugbu a, anyị nile nọ n’ọgbakọ ndị dị na Prague. Anyị nile na-atụ anya mgbe a ga-enwe ụwa ọhụrụ—ma ọ na-agụsi m agụụ ike karịsịa ịhụ mgbe a na-agaghị enwe ụlọ mkpọrọ n’ebe ọ bụla.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 24 Nke Ndịàmà Jehova bipụtara na 1950.

[Foto ndị dị na peeji nke 26]

Eji m mbọ́ isi na-edetu akụkụ Bible dị iche iche

[Foto dị na peeji nke 27]

Ogige ahụ dị na Bytiz, bụ́ ebe a tụrụ m mkpọrọ ma mesịa mee m baptizim

[Foto dị na peeji nke 29]

Ụbọchị agbamakwụkwọ anyị

[Foto dị na peeji nke 29]

Mụ na Eva, Štěpán na Blanka n’aka ekpe nakwa Jana na Dalibor n’aka nri